Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Isaiah 20 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

Amụma e bụrụ banyere Ijipt na Kush

1Nʼafọ ahụ, Sagọn, eze Asịrịa, zipụrụ ọchịagha onye ọkwa ya kasị ukwuu, ka ọ gaa buso Ashdọd agha. Ọ gara meriekwa ya nʼagha. 2Nʼoge ahụ Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ Aịzaya nwa Emọz. Ọ sịrị ya, “Yipụ uwe mkpe iyi nʼahụ, ya na akpụkpọụkwụ dị gị nʼụkwụ.” O mere otu a, ọ gbaara ọtọ, jegharịakwa nʼụkwụ efu.

3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Dị ka ohu m Aịzaya si gbara ọtọ jegharịa nʼụkwụ efu afọ atọ ndị a niile, ọ bụ ihe ama na ihe ịdọ aka na ntị na-egosi ihe gaje ịbịakwasị ndị Ijipt na ndị Kush. 4Nʼihi na otu a ka eze Asịrịa ga-esi kpụrụ ndị Ijipt na ndị Kush ọ dọtara nʼagha. Ha ga-agba ọtọ na-ejegharị nʼụkwụ efu, ma nwantakịrị ma okenye. Otule ha gba ọtọ ga-abụrụ Ijipt ihe ihere. 5Egwu ga-ejide ndị ahụ niile nwere nchekwube nʼike Kush, na ndị ahụ niile jiri Ijipt nyaa isi ga-ada mba. Ihere ga-emekwa ha. 6Nʼụbọchị ahụ, ndị ahụ dịnyeere ha, bụ ndị bi nʼọnụ mmiri ha ga-asị, ‘Ọ bụrụ na ihe dị otu a dakwasịrị ndị Ijipt anyị tụkwasịrị obi inyere anyị aka, na ịnapụta anyị site nʼaka eze Asịrịa, ebeekwanụ ka anyị ga-agbaga?’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]