Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Hosea 8 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

Ụgwọ ọrụ mmehie

1“Tinye opi ike nʼọnụ gị!Nʼihi na ugo nʼefefe nʼelu ụlọ Onyenwe anyị,nʼihi na ha emebiela ọgbụgba ndụ m,nupu isi megide iwu m.

2Ugbu a ndị Izrel na-etiku m mkpu akwa,‘Chineke anyị, anyị bụ Izrel maara gị.’

3Ma Izrel ajụla ihe dị mma.Ugbu a, ndị iro ga-achụ ya ọsọ.

4Ha meere onwe ha ndị eze, ma ha ajụtaghị m ase;ha na-achọrọkwa ndị ọchịchị, ma ghara ịjụta ase nʼaka m.Ọlaọcha na ọlaedo haka ha ji na-akpụrụ onwe ha arụsị,nke ha ji ebibi onwe ha.

5Ajụla m arụsị nwa ehi a ị kpụrụ, O Sameria.Nʼihi na ọnụma m na-ere ọkụ megide ha.Ruo olee mgbe ka ha ga-anọ bụrụ ndị na-enweghị ike ịdị ọcha?

6Ọ bụ nʼIzrel ka ha si.Ọ bụ onye na-akpụ ụzụ kpụrụ ya;ọ bụghị Chineke.A ga-akụrisikwanwa ehi Sameria ahụ.

7“Ha akụọla ifufe,ha ga-aghọtakwa oke ifufe.Osisi ọka ha na-eguzona-enweghị okpo ọka ọbụla.A sịkwarị na ọ mịrị mkpụrụ,ndị mba ọzọ ga-atapịa ya.

8Elodala Izrel!Lee, ha nọ ugbu a nʼetiti ndị mba ọzọdịka mkpọkọrọ ite.

9Nʼihi na ha ejeela Asịrịadịka ịnyịnya ibu ọhịa na-awagharị naanị ya.Ifrem ewerela onwe ya resi ndị enyi ya.

10Ọ bụ ezie na ha ewerela onwe ha resi ọtụtụ mba dị iche iche,aga m achịkọta ha.Ha ga-atakwa ahụnʼihi ọnọdụ mmegbu nke eze na ndịisi ga-achị ha.

11“Nʼihi na Ifrem ewuola ọtụtụ ebe nchụaja maka ịchụ aja mmehie,ebe nchụaja ndị a abụrụla ebe a na-eme mmehie.

12E depụtaara m ha ọtụtụ ihe banyere iwu m,ma ha were ya dịka ihe e si na mba ọzọ webata.

13Ha na-achụ aja dịka onyinye nye m,ha na-erikwa anụ ndị ahụ ha jiri chụọ aja,ma na Onyenwe anyị enweghị mmasị nʼebe aja ha dị.Ugbu a, ọ ga-echeta ajọ omume ha,nye ha ntaramahụhụ nʼihi mmehie niile ha,ha ga-alaghachi nʼIjipt.

14Izrel echezọọla Onye kere hama wukwaa obi ndị eze dị iche iche.Juda ewukwaala obodo dị iche iche e wusiri ike.Nʼihi ya, aga m ezite ọkụ nʼobodo ha niile,ọkụ ga-erepịa obodo ha niile e wusiri ike.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]