Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Hosea 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Say to your brothers, "My People," and to your sisters, "Shown Mercy." “Gwa ụmụnne gị ndị nwoke Ami, ‘nke pụtara ndị m,’ gwakwa ụmụnne gị nwanyị Ruhama, nke pụtara, ‘Unu ndị m hụrụ nʼanya.’
2 Plead with your mother, plead—for she is not my wife, and I am not her husband—that she put away her whoring from her face and her unfaithfulness from between her breasts, “Unu guzogidenụ nne unu, rịọọnụ ya, nʼihi na ọ bụghị nwunye m, mụ onwe m abụkwaghị di ya. Gwanụ ya ka o wezuga ịkwa iko site nʼihu ya, ya wezugakwa ịgba akwụna nke dị nʼetiti ara ya abụọ.
3 or I will strip her bare and leave her as naked as the day she was born; I will make her like a wilderness, turn her into a parched land, and let her die of thirst. Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ, aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya. Aga m eme ya ka ọ dị ka ọzara, ka ọ ghọọ nʼala kpọrọ nkụ, were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka ọ nwụọ.
4 I will show her children no compassion, for they are the children of whoring. Agaghị m egosi ụmụ ya ebere m, nʼihi na ha bụ ụmụ a kwatara nʼiko.
5 Their mother has prostituted herself; she who carried them acted in shame. She said, "I will chase after my lovers, who give me my bread and my water, my wool and my flax, my oil and my drink." Nʼihi na nne ha bụ onye na-akwa iko, ọ tụrụ ime ha nʼọnọdụ ihere. Site nʼikwu sị, ‘Aghaghị m ịgbakwuru ndị enyi nwoke hụrụ m nʼanya, ndị na-enye m nri na mmiri, ajị anụ m na akwa ọcha m, mmanụ oliv m na ihe ọṅụṅụ m.’
6 Therefore I am about to block her path with thorns; I will wall her in so she cannot find her paths. Nʼihi nke a, aga m eji ogwu na uke gbachie ya gburugburu; aga m agbachi ụzọ ya, mee ya ka ọ ghara ịma ebe ọ na-eje.
7 She will chase her lovers but not catch them; she will look for them but not find them. Then she will say, "I will go back to my first husband, for it was better for me then than now." Ọ ga-agbaso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya ma ọ gaghị achụkwute ha. Ọ ga-achọ ha ma ọ gaghị ahụ ha. Mgbe ahụ, ọ ga-asị, ‘Ka m gaa laghachikwuru di mbụ m, nʼihi na ọ dịrị m mma mgbe ahụ karịa ugbu a.’
8 She has not realized that it was I who gave her the grain, the new wine, and the oil, I who lavished silver and gold on her—which they spent on Baal. Ma ọ kwetaghị na ihe ndị a si nʼaka m, na ọ bụ mụ nyere ya ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv, na ọlaọcha, na ọlaedo ndị ahụ niile nke o ji na-efe Baal.
9 Therefore I will take back my grain when it ripens and my new wine in its season; I will reclaim my wool and my flax, given to cover her nakedness. “Ya mere, aga m ewerekwa ọka m mgbe ọ chara, na mmanya ọhụrụ m mgbe oge ya ruru. Aga m anapụkwa ya akwa ajị anụ m na akwa ọcha m, nke ekwesiri iji kpuchie ọtọ ya.
10 Now I will expose her shame before the eyes of her lovers, and no one will rescue her from my hand. Ugbu a, aga m ekpughe ọtọ ya nʼihu ndị ahụ na-ahụ ya nʼanya, ọ dịkwaghị onye nwere ike ịnapụta ya site nʼaka m.
11 I will put an end to all her rejoicing—her festivals, her New Moons, her Sabbaths, all her appointed festivals. Aga m eme ka obi ụtọ ya kwụsị; ọ bụladị mmemme nke afọ niile, mmemme ọnwa ọhụrụ, nke ụbọchị izuike na mmemme ndị ọzọ ahụ niile a kara aka.
12 I will lay waste her vines and fig trees, of which she said, "These are my wages that my lovers gave me." I will turn them into a thicket, and the wild animals will devour them. Aga m ala ubi vaịnị ya na osisi fiig ya niile nʼiyi, nke ọ sịrị bụ ụgwọ ọrụ ya site nʼaka ndị hụrụ ya nʼanya; aga m emekwa ka ha ghọọ oke ọhịa, anụ ọhịa ga-eripịa ha.
13 I will hold her accountable for the days she burned offerings to the Baals, when she decked herself with rings and jewelry and chased after her lovers—but me she forgot, declares our Father. Aga m enye ya ahụhụ maka ụbọchị niile bụ nke o surere ihe na-esi isi ụtọ nye chi Baal niile, ọ chịrị mgbaaka mkpịsịaka na ihe ịchọ mma niile, jikere onwe ya, pụọ chụso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya, ma chezọọ m,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
14 "Therefore, look, I am going to win her back: I will lead her into the wilderness and speak tenderly to her heart. “Nʼihi nke a, aga m arara ya, duba ya nʼime ọzara, jiri olu dị nro gwa ya okwu nʼebe ahụ.
15 There I will give her back her vineyards and make the Valley of Achor a doorway of hope. There she will respond as in the days of her youth, as on the day she came up out of Egypt." Ebe ahụ ka m ga-enyeghachi ya ubi vaịnị ya, gbanweekwa Ndagwurugwu Akọ, mee ka ọ ghọọ ọnụ ụzọ olileanya. Mgbe ahụ, ọ ga-azakwa m dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọbịa, nʼoge ahụ o si nʼala Ijipt pụta.
16 On that day, declares our Father, you will call me "my husband," and no longer will you call me "my Baal." “Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Ị ga-akpọ m ‘Di m,’ ị gaghị akpọkwa m ‘nna m ukwu,’ ọzọ.
17 I will remove the names of the Baals from her mouth; never again will they be invoked by name. Nʼihi na aga m ewepụkwa aha niile nke arụsị Baal nʼegbugbere ọnụ ya, ha gaghị akpọkwa ha aha ọzọ.
18 On that day I will make a covenant for them with the wild animals, the birds of the sky, and the creatures that move along the ground; I will banish bow and sword and war from the land, so that all may lie down in safety. Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka gị na ụmụ anụ ọhịa gbaa ndụ, meekwa ka gị na ụmụ nnụnụ, na ihe niile e kere eke nʼakpụgharị nʼala gbaa ndụ. Aga m emebi ngwa agha niile, agha niile ga-akwụsịkwa. Mgbe ahụ, a ga-eme ka ị dịnaa ala nʼudo na-enweghị nsogbu, na ụjọ.
19 I will betroth you to me forever; I will betroth you to me in righteousness and justice, in covenant love and compassion. Aga m ekwerekwa ịlụ gị dịka nwunye ruo ebighị ebi; aga m ekwerekwa ịlụ gị nʼezi omume na ikpe ziri ezi, nʼịhụnanya nke na-adịgide, nakwa obi ebere.
20 I will betroth you to me in faithfulness, and you will know your Father. Aga m eji ikwesi ntụkwasị obi kwere ịlụ gị. Ị ga-amatakwa Onyenwe anyị.
21 On that day I will respond, declares our Father—I will respond to the heavens, and they will respond to the earth; “Nʼụbọchị ahụ m ga-azaghachi,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “M ga-azaghachi eluigwe, ha ga-azaghachi ala.
22 and the earth will respond to the grain, the new wine, and the oil, and they will respond to Jezreel. Ala ga-azaghachi ọka na mmanya ọhụrụ na mmanụ oliv, mgbe ahụ ha ga-azaghachi Jezril.
23 I will plant her for myself in the land. I will show mercy to "No Mercy," and I will say to "Not My People," "You are my children"; and they will say, "You are my Father." Aga m akụkwa ya nye onwe m nʼala ahụ dịka mkpụrụ. Aga m egosi ịhụnanya m nʼahụ onye ahụ m kpọrọ, ‘Onye m na-ahụghị nʼanya.’ M ga-asịkwa ndị ahụ a kpọrọ, ‘Ndị na-abụghị ndị m,’ ‘Unu bụ ndị nke m,’ Ha ga-azakwa, ‘Chineke m ka ị bụ.’ ”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]