Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Hebrews 7 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 This Melchizedek, king of Salem, priest of the Most High, our Father, met Abraham returning from defeating the kings and blessed him. Melkizedek a bụ eze Salem, bụrụkwa onye nchụaja Chineke Onye kachasị ihe niile elu. Ọ zutere Ebraham mgbe o si na mmeri o meriri ọtụtụ ndị eze ahụ na-alọghachi, gọziekwa ya.
2 Abraham gave him a tenth of everything. His name means, first, king of righteousness, then also king of Salem—meaning king of peace. Ebraham nyekwara ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile. Ihe mbụ aha ya pụtara bụ, “eze ezi omume,” ọzọkwa bụ “eze nke Salem,” nke pụtara, “eze udo.”
3 Without father, without mother, without genealogy, no beginning of days or end of life, but like the Son of our Father, he remains a priest forever. O nweghị nna, o nwekwaghị nne, nke ọ na-enwe agbụrụ. O nweghị mmalite nke ụbọchị a mụrụ ya, maọbụ ọgwụgwụ ndụ, e mere ya dị ka Ọkpara Chineke. Ọ na-anọgide bụrụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.
4 Consider how great this man was: Abraham the patriarch gave him a tenth of the plunder. Leenụ otu o siri bụrụ onye dị ukwuu, ọ bụladị Ebraham bụ nna nna anyị nyere ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼihe ọ kwatara nʼagha!
5 Those descendants of Levi who become priests are commanded by the law to collect the tenth from the people—their own brothers—though they too descend from Abraham. Ma otu ọ dị, iwu kwadoro ka ụmụ Livayị bụ ndị ghọrọ ndị nchụaja na-anakọta otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼaka ndị ọzọ, ya bụ, site nʼaka ndị ụmụnna ha ndị Izrel, nʼagbanyeghị na ụmụnna ha ndị ahụ bụkwa ụmụ ụmụ Ebraham.
6 But he, though not descended from them, took a tenth from Abraham and blessed the one who held the promises. Ma nwoke a bụ onye na-esiteghị nʼagbụrụ naara otu ụzọ nʼụzọ iri site nʼaka Ebraham ma gọziekwa ya bụ onye ahụ nke natara nkwa ahụ.
7 It is beyond all dispute that the lesser is blessed by the greater. O nweghị ịrụrịta ụka ọbụla dị ya, na onye dị ukwuu na-agọzi onye dị nta.
8 In one case, tithes are received by mortal men; in the other, by one testified to be alive. Nʼotu aka ahụ, ndị na-anata otu ụzọ nʼụzọ iri bụ mmadụ na-anwụ anwụ, ma nʼaka nke ọzọ, onye na-anata ya bụ onye ahụ e kwupụtara na ọ na-adị ndụ.
9 One might even say Levi, who receives the tenth, paid it through Abraham, Mmadụ pụrụ isi na Livayị onye natara otu ụzọ nʼụzọ iri kwụrụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke ya site nʼaka Ebraham.
10 for he was still in his ancestor's body when Melchizedek met Abraham. Nʼihi na mgbe Melkizedek zutere ya, ọ ka nọ nʼafọ nna nna ya.
11 If the Levitical priesthood brought perfection—the people received the law under it—why was another priest needed, one in Melchizedek's order, not called after Aaron's order? Ọ bụrụ na a pụrụ ime ka mmadụ zuo oke site nʼọnọdụ ndị nchụaja ndị Livayị, nʼihi na ọ bụ site nʼiwu e nyere ndị mmadụ ka e ji hiwee ọnọdụ ndị nchụaja. Olee uru ọ bara ka onye nchụaja ọzọ bịa, dị ka usoro Melkizedek si dị, na-abụghị dị ka usoro nke Erọn?
12 For when the priesthood changes, the law must change as well. Ebe a gbanwere ọnọdụ ndị nchụaja, nʼotu aka ahụ, a ghaghị ịgbanwekwa iwu.
13 For he of whom these things are said belonged to another tribe, from which no one has ever served at the altar. Nʼihi na onye ahụ e kwuru ihe ndị a banyere ya sitere nʼagbụrụ ọzọ, nke ọ dịbeghị onye ọbụla sitere na ya rụrụ ọrụ dị nʼebe ịchụ aja.
14 Clearly our Lord descended from Judah; Moses said nothing about priests from that tribe. Ọ bụ ihe a mara nke ọma na Onyenwe anyị si nʼagbụrụ Juda pụta, Mosis nʼonwe ya akpọtụghị agbụrụ ahụ aha mgbe ọ na-ekwu banyere ndị nchụaja.
15 And this becomes even more evident when another priest arises in the likeness of Melchizedek, E meela ka a ghọta okwu anyị na-ekwu nke ọma, mgbe onye nchụaja ọzọ yiri Melkizedek pụtara.
16 who has become a priest not by a law of physical descent but by the power of an indestructible life. Onye ghọrọ onye nchụaja ma ọ bụghị site nʼusoro iwu nke ọmụmụ ndị nchụaja, kama site nʼike dị na ndụ nke na-apụghị ịla nʼiyi.
17 For it is testified about him, "You are a priest forever, in the order of Melchizedek." Nʼihi na-agbara akaebe banyere ya, sị, “Gị onwe gị, bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi, dị ka usoro Melkizedek si dị.”
18 On the one hand, a former commandment is set aside because of its weakness and uselessness. Nʼotu aka ahụ, e wezugala usoro iwu ochie ahụ nʼihi adịghị ike ya na nʼihi abaghị uru ya
19 The law perfected nothing; but a better hope is introduced, through which we draw near to our Father. (nʼihi na iwu ahụ emeghị ka ihe ọbụla zuo oke), ma nʼaka nke ọzọ, e webatala olileanya ka mma, bụ nke anyị na-esite na ya bịaruo Chineke nso.
20 This was not without an oath, for the others became priests without an oath, Ma e ji ịṅụ iyi mee ka ọnọdụ onyeisi nchụaja a guzosie ike. O nweghị iyi a ṅụrụ mgbe ndị ọzọ ghọrọ ndị nchụaja.
21 but he became a priest with an oath, by the one who said to him: "Our Father has sworn and will not change his mind, 'You are a priest forever.'" Ma onye nke a ghọrọ onye nchụaja site nʼịṅụ iyi mgbe onye ahụ gwara ya, “Onyenwe anyị aṅụọla iyi, ọ gaghị agbanwe obi ya, ‘Ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.’ ”
22 To that same degree, Jesus has become the guarantor of a better covenant. Nʼihi nke a, Jisọs aghọọla onye na-akwagide ọgbụgba ndụ ka mma.
23 The former priests were many, because death prevented them from continuing in office, Ihe ọzọ, ndị nchụaja nke ochie ahụ dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nʼihi na ọnwụ gbochiri ha ịga nʼihu nʼọrụ ha.
24 but he holds his priesthood permanently, because he continues forever. Ya mere, ebe ọ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ọ na-abụkwa onyeisi nchụaja mgbe niile.
25 So he can fully save those who come to our Father through him, since he always lives to plead their case. Ya mere o nwere ike ịzọpụta ruo mgbe niile ndị ahụ na-abịakwute Chineke site na ya, nʼihi na ọ na-adị ndụ ruo mgbe niile ịrịọ arịrịọ nʼihi ha.
26 Such a high priest suited us: holy, blameless, unstained, separated from sinners, raised above the heavens. Ya mere, ọ dị mkpa na anyị ga-enwe onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye dị nsọ, na onye na-enweghị ntụpọ, na onye dị ọcha, na onye e kewapụrụ site nʼebe ndị mmehie nọ, ma buliekwa ya elu karịa nʼeluigwe.
27 Unlike those high priests, he doesn't need to offer sacrifices daily—first for his own sins, then for the people's—since he did this once for all, offering himself. Ọ dịghị ka ndịisi nchụaja ndị ọzọ, nʼihi na ọ dịghị mkpa na ọ ga-achụ aja kwa ụbọchị, nʼihi mmehie nke aka ya, na nʼihi mmehie nke ndị ọzọ. Naanị otu aja nke dịrị mgbe niile ka ọ chụrụ maka mmehie mgbe o weere onwe ya nye dị ka aja.
28 The law appoints weak men as high priests, but the oath's word, coming after the law, appoints the Son, made perfect forever. Nʼihi na iwu na-ahọpụta dị ka ndịisi nchụaja ndị mmadụ na-adịghị ike. Ma okwu nke ịṅụ iyi ahụ, nke na-eso iwu nʼazụ, họpụtara Ọkpara, onye e mere ka o zuo oke ruo mgbe ebighị ebi.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]