Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ecclesiastes 6 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

1Ọ dị ihe ọjọọ ọzọ nke m hụrụ nʼokpuru anyanwụ, nke na-anyịdo ụmụ mmadụ. 2Chineke na-enye mmadụ akụnụba, na ihe nnweta, na nsọpụrụ, na-emekwa ka ha nwee ihe niile ha chọrọ, ma ọ dịghị enye ha ike ịnụ ụtọ ha; ma onye ọzọ na-anụ ụtọ ha. Nke a bụ ihe efu, bụrụkwa ihe jọgburu onwe ya.

3Mmadụ nwere ike mụta narị ụmụ, o nwekwara ike nwee ndụ ogologo ruo agadi, ma ọ bụrụ na o nweghị ike ịnụ ụtọ akụnụba ya, ọ bụrụkwa na o nwetaghị ụdị olili ruru ya, ana m asị, na nwa nwụrụ nʼafọ dị mma karịa ya. 4Ọbịbịa ya e nweghị isi, nʼọchịchịrị ka ọ na-ala, ọ bụkwa ọchịchịrị ka e kpuchiri aha ya. 5Ọ bụ ezie na ọ gaghị ahụ ihe anwụ anya, ọ makwaghị ihe ọbụla, o nwere izuike karịa nwoke ahụ. 6A sịkwarị na o biri ndụ puku afọ, okpukpu abụọ, ma ọ nụghị ụtọ akụnụba ya. Ọ bụghị nʼotu ebe ka ha niile na-ala?

7Ndọgbu niile mmadụ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ bụ ka o rijuo afọ,ma o nweghị onye na-enweta ihe na-ezuru ya.

8Olee ụzọ onye maara ihe si dị mma karịa onye nzuzu?Gịnị bụ uru dịịrị onye ogbenyena ọ maara otu e si akpa ezi agwa nʼihu ndị dị ndụ?

9Ihe eji anya hụka mma karịa oke ọchịchọ!Nke a bụkwa ihe efuna ịchụso ifufe.

10Ihe ọbụla dị ugbu a, ka akpọrọ aha na mgbe gara aga.Amakwaara ihe mmadụ bụ,mmadụ ọbụla apụghị ịlụsoonye ka ya ike ọgụ.

11Okwu na-aba ụba,nghọta na-adị nta.O nwere uru nke a bara?

12Onye mara ihe dịrị mmadụ mma na ndụ, nʼụbọchị ole na ole nke na-abaghị uru o nwere ịgabiga ndụ a dịka onyinyo? Onye pụrụ ịgwa ya ihe ga-eme nʼokpuru anyanwụ, mgbe ọ nwụsịrị?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]