Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 7 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

Ịdọ aka na ntị banyere nwanyị na-akwa iko

1Na-agbaso okwu m nwa m, nọgide na ya,dokwaa iwu m niile nʼime obi gị.

2Debe iwu m ka ị dị ndụ,chee ozizi m nche dịka ọ bụ mkpụrụ anya gị.

3Kee ha na mkpịsịaka gị,deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.

4Hụ amamihe nʼanya dịka nwaagbọghọ ị hụrụ nʼanya;hụkwa inwe nghọta nʼanya dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne gị.

5Kwee ka ha debe gị, ka ị ghara ijekwuru nwanyị na-akwa iko,ka ị gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ire ụtọ ya.

6Nʼihi na otu ụbọchị,esi m na oghereikuku dị nʼụlọ m lepụ anya,

7hụ nʼetiti ndị na-enweghị uche,ahụtara m otu nwokorobịa nʼetiti ha,onye amamihe kọrọ,

8ka ọ na-aga nʼụzọ dị nso ebe nkuku ụlọnʼakụkụ ụlọ nwanyị ihere na-adịghị eme,

9nʼoge anyasị, dịka chi na-eji,mgbe ọchịchịrị na-agbachi.

10Mgbe ahụ, nwanyị ahụ pụtara zute ya.O yi uwe dịka nwanyị akwụna, jiri aghụghọ na-abịakwute ya.

11(Ọ na-eme ụzụ na-aṅaghị ntị ịnụ ihe ọbụla.Ụkwụ ya anaghị anọgide nʼụlọ ya.

12Ọ na-akwụgharị ma nʼokporoụzọ ma nʼama;na-amịgharị nʼebe nzuzo niile.)

13O weere aka ya abụọ jikụọ nwokorobịa ahụ nʼolu, sutu ya ọnụ,were ihu nke ihere na-adịghị, sị:

14“Emezuru m nkwa niile m kwere taa,enwekwara m nri nke sitere nʼihe aja udo m chụrụ nʼụlọ m,

15Ọ bụ gị ka m na-achọkwute,lee gị ka ị na-abịa.

16Agbasaala m akwa mara mma nʼelu ihe ndina m,bụ akwa ọcha mara mma tụrụ ọtụtụ agwa nke e ji ogho ndị Ijipt kpaa.

17Efesakwala m mmanụ isi ọma nke máá, aloos na sinamọnnʼelu nʼihe ndina m.

18Bịa, ka anyị were ịhụnanya ṅụjụbiga afọ anyị;ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ site ugbu a ruo ụtụtụ echi.

19Nʼihi na di m anọghị nʼụlọo jeela njem dị anya.

20O ji akpa ego juru gaa njem,abalị ole na ole ga-agafekwa tupu ọ lọta.”

21Otu a ka o si jiri okwu ire ụtọ ya megharịa nwokorobịa ahụ isi tutu o kwenyere ya.O nwekwaghị ike ịnapụta onwe ya site nʼokwu nrafu nke nwanyị ahụ.

22O sooro nwanyị ahụ dịka ehia na-adọkpụ na-aga ebe a ga-egbu ya,dịka ele nke na-aba nʼọnya,

23nke na-eche ka e were àkụ gbata ya nʼobi.Nwoke ahụ dịka nnụnụ nke na-efeba nʼọnyana-amaghị ihe na-eche ya pụrụ iwepụ ndu ya.

24Geenụ ntị, ụmụ m, ma ọ bụghị naanị ige ntị,kama meekwanụ ihe m na-ekwu.

25Ekwela ka agụụ nke obi gị chịa gị;ejela nwanyị dị otu a nso; gbaara ya ọsọ, ka ọ ghara ịnwa gị nwetakwa gị.

26Nʼihi na o mebiela ndụ ọtụtụ mmadụ,ọtụtụ mmadụ amaala nʼọnya ya.

27Ụlọ ya bụ okporoụzọ nke na-eduba nʼili,nke na-edubakwa nʼala ọnwụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]