Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Philippians 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 So if any encouragement in Christ, any comfort from love, any deep communion in the Holy Spirit, any tenderness and compassion exist, Ya mere, ọ bụrụ na e nwere nkasiobi ọbụla dịrị anyị nʼihi njikọta e jikọtara anyị na Kraịst, ọ bụrụkwa na e nwere inyeaka ọbụla site nʼịhụnanya ya, ọ bụrụkwa na ọ dị nnwekọ ọbụla anyị na Mmụọ na-enwekọ, ọ bụrụ na unu nwere obi nro na ọmịiko,
2 complete my joy: think alike, love alike, unite in spirit, one in purpose. meenụ ka ọṅụ m zuo oke, site nʼinwe nkwekọta nʼihe ọbụla, site nʼịhụrịta onwe unu nʼanya, sitekwa nʼinwekọ otu mmụọ, na otu uche.
3 Do nothing out of selfish ambition or empty conceit, but in humility consider others better than yourselves. Emela ihe ọbụla nʼihi naanị ọdịmma nke gị, maọbụ bie ndụ nʼụzọ ịdọtara onwe gị otuto efu. Kama bụrụ onye wedara onwe ya ala, onye na-ahụ ndị ọzọ dị ka ndị ka ya mma.
4 Each of you should attend not only to your own interests, but also to others'. Echela echiche banyere naanị ihe metụtara gị, kama, na-eleba anya nʼihe banyere ndị ọzọ.
5 Have this mindset among yourselves—one that is yours in Christ Jesus, Na mmekọrịta unu na ibe unu, nweenụ ụdị uche ahụ nke dị nʼime Jisọs Kraịst:
6 who, existing in the form of our Father, did not consider equality with our Father something to be grasped, Onye ọ bụ ezie na o nwere ụdịdị Chineke site na mmalite ma ọ gụghị ụdịdị ya dị ka Chineke dị ka ihe ọ ga-ejidesi aka ike.
7 but emptied himself by taking on the form of a servant and being born in human likeness. Kama, ọ gụrụ onwe ya dị ka ihe efu, site na ịnara ụdịdị nke onye bụ ohu, onye nke a mụrụ dị ka mmadụ.
8 And appearing as a human being, he humbled himself by becoming obedient to death—even death on a cross. Ebe ahụrụ ya ka ọ dịka mmadụ nʼoyiyi, o wedakwara onwe ya ala, site nʼirube isi ruo ọnwụ, bụ ọnwụ nke obe.
9 Therefore our Father exalted him to the highest place and gave him the name that is above every name, Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke ji bulie ya elu nʼebe kachasị elu, nyekwa ya aha kachasị aha niile elu.
10 so that at the name of Jesus every knee should bow, in heaven and on earth and under the earth, Ka ọ ga-abụ mgbe ọbụla a kpọrọ aha Jisọs ka ikpere niile ọbụla gbuo nʼala, ihe niile dị nʼeluigwe, ndị niile bi nʼụwa, na ndị bi nʼokpuru ụwa.
11 and every tongue confess that Jesus Christ is Lord, to the glory of our Father. Ka ire niile ọbụla kwupụta na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, maka inye Chineke bụ Nna, otuto.
12 So, my dear ones, as you've always obeyed—not only in my presence but now much more in my absence—keep working out your salvation with fear and trembling, Ya mere, ezi ndị enyi m, dị ka unu na-erube isi mgbe niile, ọ bụghị naanị mgbe m nọ, ma karịsịa ugbu a m na-anọghị unu nso, gaanụ nʼihu ịrụpụta nzọpụta unu site nʼịtụ egwu na ịma jijiji.
13 for our Father works in you, giving both the will and the work for his good purpose. Nʼihi na ọ bụ Chineke nʼonwe ya na-arụ ọrụ nʼime unu, inyere unu aka ịchọ ime ihe ọ chọrọ ka unu mee, na inyere unu aka ime ihe ahụ ọ chọrọ.
14 Do everything without grumbling or arguing, Nʼihe ọbụla unu na-eme, wezuganụ ntamu na ịrụ ụka nʼetiti unu.
15 so you may be blameless and pure, faultless children of our Father amid a crooked and depraved generation—shining among them like stars in the world, Bienụ ndụ unu dị ka ụmụ Chineke, ndị a na-apụghị ịta ụta, ndị dị ọcha na ndị a na-apụghị ibo ebubo nʼime ụwa ọjọọ a, nʼetiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ, na nʼetiti ndị nwere obi nʼazụ. Mgbe ahụ, unu ga-enwupụta nʼetiti ha dị ka kpakpando nʼime ụwa!
16 holding firmly to the word of life, so I can boast on Christ's day that I didn't run or work for nothing. Na-echekwanụ nʼihu ha okwu ahụ na-enye ndụ. Ka ọ bụrụ na mgbe Kraịst bịara ọzọ, aga m aṅụrị ọṅụ, nʼihi na ọrụ m rụrụ nʼetiti unu abụghị ihe efu.
17 But even if I'm poured out as a drink offering on the sacrifice and service of your faith, I'm glad and rejoice with you all. Nʼezie, ọ bụrụ na-awụpụ m dị ka aja ihe ọṅụṅụ nʼelu aja nʼife ofufe nke sitere na Chineke nʼihi okwukwe unu. E, a si na e gbuo m nʼihi unu, aga m aṅụrị ọṅụ na-esorokwa unu niile nwe obi ụtọ
18 So you too should be glad and rejoice with me. otu aka ahụ, unu onwe unu kwesiri inwe obi ụtọ ma sorokwa m ṅụrịa ọṅụ.
19 I hope, in the Lord Jesus, to send Timothy to you soon, so I too may be encouraged, knowing how you are. Enwere m olileanya nʼime Onyenwe anyị Jisọs na m ga-ezitere unu Timoti nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, ka m site nʼozi ọ ga-anata banyere unu nwee obi ụtọ.
20 I have no one else like him, who will genuinely care for your welfare. Enweghị m onye ọzọ dị ka ya, onye ga-eche ezi echiche maka ọdịmma unu.
21 For they all look after their own interests, not those of Jesus Christ. Nʼihi na ndị ọzọ na-echegbu onwe ha maka ọdịmma nke ha, ma ọ bụghị maka ọdịmma Jisọs Kraịst.
22 You know Timothy's proven worth—like a son with a father, he served with me in the gospel work. Ma unu niile maara otu Timoti si dị oke mkpa. Ọ dị nnọọ dị ka nwa m, site nʼinyeaka ọ na-enyere m nʼọrụ izisa oziọma.
23 So I hope to send him as soon as I see how things go with me, Enwere m olileanya nʼezie izitere unu ya. M ga-emekwa nke a ma ọ bụrụ na m chọpụta ihe ọnọdụ m nʼebe a ga-abụ.
24 and I am confident in the Lord that I myself will come soon. Nʼezie, enwere m olileanya na site nʼinyeaka Onyenwe anyị, mụ onwe m ga-abịakwutekwa unu na mgbe na-adịghị anya.
25 I thought it necessary to send Epaphroditus back to you—my brother, coworker, and fellow soldier, your messenger and servant for my needs. Otu ọ dị, echere m na ọ dị mkpa ugbu a izighachiri unu Epafroditọs, nwanna m na onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, onye mụ na ya na-ebukọ agha, onyeozi nke unu zitere ka ọ bịa nyere m aka nʼọnọdụ mkpa m.
26 He has longed for you all, and is troubled that you heard he was sick. Ugbu a, ana m eziteghachiri unu ya, nʼihi na ọ na-agụsị ya agụụ ike ịhụ unu anya. O wutekwara ya nke ukwuu, na e mere ka unu mara na ọ dara ọrịa nʼoge gara aga.
27 Indeed he was sick, and nearly died. But our Father had mercy on him—not only him but me too, sparing me sorrow upon sorrow. Nʼezie, ọ fọdụrụ nnọọ ntakịrị ka o site nʼọrịa ahụ daa nʼụra ọnwụ. Ma Chineke meere ya ebere. Ọ bụghị naanị ya, kama o mekwaara m ebere, nʼihi na o kweghị ka a tụkwasịrị m ihe mwute nʼelu ihe mwute.
28 So I'm more eager to send him, so seeing him again you'll rejoice and I'll worry less. Nʼihi nke a, ọ na-anụ m ọkụ nʼobi izite ya nʼebe unu nọ. Nʼihi na amaara m na ọbịbịa ọ ga-abịakwute unu ga-eme ka unu ṅụrịa ọṅụ. Ọ ga-emekwa ka ọnọdụ nchegbu m dị mfe.
29 Welcome him in the Lord with all joy, and honor people like him, Ya mere, arịọ m unu, werenụ ọṅụ nabata ya nke ọma nʼime Onyenwe anyị, na-asọpụkwaranụ ndị dị ka ya.
30 because he neared death for Christ's work, risking his life to make up your missing help to me. Nʼihi na ọ fọdụrụ nwantịị ka o nwụọ, nʼihi ọrụ nke Kraịst, tinye ndụ ya nʼihe egwu iji mezuo ọrụ unu nʼebe m nọ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]