Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Philippians 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Paul and Timothy, servants of Christ Jesus, to all the holy ones in Christ Jesus at Philippi, with the overseers and deacons: Pọl na Timoti, ndị bụ ohu Kraịst Jisọs, Na-edegara unu ndị ụkọchukwu, ndị okenye na ndị nsọ niile nọ nʼụlọ nzukọ Kraịst Jisọs dị nʼobodo Filipai.
2 Grace to you and peace from our Father and the Lord Jesus Christ. Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
3 I thank my Father every time I remember you, Ana m ekele Chineke m ekele mgbe ọbụla m chetara unu.
4 always praying for all of you with joy in every prayer, Nʼime arịrịọ niile m na-arịọ ya mgbe niile nʼekpere m nʼihi unu, obi m na-ejupụta nʼọṅụ.
5 because of your partnership in the gospel from the first day until now. Nʼihi inyeaka niile unu na-enye, ime ka izisa oziọma na-aga nʼihu ọ bụladị ruo ugbu a.
6 I'm confident of this very thing: the one who began a good work in you will complete it until the day of Christ Jesus. Amaara m nʼezie, na onye ahụ malitere ọrụ ọma nʼime unu, ga-aga nʼihu ịrụzu ya ruo ụbọchị Kraịst Jisọs.
7 I'm right to feel this about you—I hold you in my heart, all of you sharing with me in grace, in my chains and in defending and confirming the gospel. Ọ bụ ihe ziri ezi nʼebe m nọ iche ụdị echiche dị otu a banyere unu niile, nʼihi na unu dị m nʼobi. Ma m nọ nʼagbụ maọbụ na m na-echekwa oziọma, na mgbe m na-eme ka o guzosie ike, unu niile esorola m keta oke nʼamara ahụ.
8 For our Father is my witness, how I long for you all with Christ Jesus's deep affection. Chineke bụ onye akaebe m, otu agụụ unu niile si agụsi m ike site nʼịhụnanya nke Kraịst Jisọs.
9 This is my prayer: that your love overflow more and more, with knowledge and all discernment, Nke a bụkwa ekpere m, ka ịhụnanya unu na-ahụrịta onwe unu na-ababiga ụba oke. Ka unu nwee ike ito eto, ruo nʼinwe mmazu na nghọta ihe niile.
10 so you can discern what is best, staying pure and blameless until the day of Christ. Ka unu nwee ike nwapụta ihe nke kachasị mma. Mgbe ahụ, unu ga-adị ọcha nʼenweghị ịta ụta ọbụla maka ụbọchị nke Kraịst.
11 Filled with the fruit of righteousness through Jesus Christ, to our Father's glory and praise. Ebe e mejupụtara unu na mkpụrụ nke ezi omume nke sitere na Jisọs Kraịst iji bulie Chineke elu ma nyekwa ya otuto.
12 I want you to know, brothers and sisters, that my circumstances have actually advanced the gospel, Ugbu a ụmụnna m, nke a bụ ihe m chọrọ ime ka unu ghọta, na nsogbu niile dakwasịrị m emeela ka ọrụ ikwusa oziọma na-aga nʼihu.
13 so my chains for Christ became known to the whole imperial guard and everyone else. Nʼihi na ọ pụtala ihe nye ndị nche nke ụlọeze ahụ na onye ọbụla ọzọ, na ọ bụ naanị nʼihi na m bụ onye na-eso Kraịst ka e ji tụọ m mkpọrọ.
14 Most of the brothers and sisters, made confident in the Lord by my chains, now dare more to speak the word fearlessly. Site na mkpọrọ a a tụrụ m, e meela ka ọtụtụ ụmụnna anyị bụrụ ndị nwere ezi ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị, nwekwa oke nkwuwa okwu, izisa oziọma ahụ na-atụghị egwu ọbụla.
15 Some, it is true, preach Christ out of envy and rivalry, but others out of goodwill. Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ji ekworo na anya ụfụ na-ekwusa Kraịst, ma ụfọdụ kwa na-ezisa ya site nʼọchịchọ obi ziri ezi.
16 These act from love, knowing I'm assigned to defend the gospel. Ndị ahụ ji ọchịchọ obi ziri ezi na-eme nke a nʼịhụnanya ebe ha matara na e tinyere m ebe a nʼihi izisa oziọma.
17 The others proclaim Christ out of selfish ambition, not sincerely, thinking to stir up trouble for me in my chains. Ndị mbụ ahụ na-ekwusa Kraịst site nʼọchịchọ obi nke onwe ha, ọ bụghị site nʼezi obi, ebe ha na-eche na ha ga-akpalị nsogbu nye m nʼime mkpọrọ.
18 What then? Only that in every way—whether in pretense or truth—Christ is proclaimed, and I rejoice in this. Yes, I will keep rejoicing. Gịnịkwa ka ogbochiri? Otu ọ dị, maọbụ nʼụzọ aghụghọ maọbụ nʼeziokwu, ihe dị mkpa bụ nʼụzọ ọbụla a na-ekwusa oziọma Kraịst, nʼihi nke a ka m na-aṅụrị ọṅụ. E, m ga-aṅụrịkwa ọṅụ mgbe niile.
19 For I know this will result in my rescue, through your prayers and the help of Jesus Christ's Spirit. Nʼihi na-amaara m na site nʼekpere unu, ya na ịgbaume nke Mmụọ Jisọs Kraịst ihe ndị a niile dakwasịrị m ga-emesi ghọọrọ m nzọpụta.
20 My eager expectation and hope: I will never be ashamed, but with full courage, now as always, Christ will be praised in my body, whether by life or by death. Nʼihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na ihere agaghị eme m nʼụzọ ọbụla, kama, aga m enwe ezi agbamume nke ga-eme ka e bulie Kraịst elu nʼahụ m, ma ugbu a ma mgbe niile, maọbụ na ndụ, ma ọ bụkwanụ nʼọnwụ.
21 For to me, to live is Christ, and to die is gain. Nʼihi na nʼebe m nọ, ịdị ndụ bụ Kraịst, ịnwụ ọnwụ bụkwa uru.
22 If I am to go on living in the body, this will mean fruitful work for me. Yet I don't know which to choose. Ma ọ bụrụ na ịdị ndụ nʼanụ ahụ, nke a buuru m ịrụpụta ọrụ bara uru, enweghị m ike ikwu nke m ga-ahọrọ.
23 Torn between the two, I want to leave and be with Christ—far better, Ụzọ ihe abụọ a na-eche m ihu: Ma ọchịchọ obi m bụ ịlakwuru Kraịst, nʼihi na ọ bụ nke kachasị mma.
24 but to remain in the body is more necessary for your sake. Ma ọ pụtara ihe na ọ dị mkpa nye unu ma ọ bụrụ na m adịrị ndụ nʼanụ ahụ.
25 Convinced of this, I know I'll remain and stay with you all, for your progress and joy in the faith, Ebe nke a doro m anya, amara m na mụ na unu niile ga-aga nʼihu ịnọ maka ọganihu na ọṅụ nke unu nʼime okwukwe.
26 so your boasting in Christ Jesus may overflow because of me, when I come to you again. Ka mgbe m ga-abịakwute unu ọzọ, unu ga-enwebiga ọṅụ oke nʼime Kraịst Jisọs nʼihi m.
27 Just live worthy of the gospel of Christ, so that whether I come and see you, or am absent, I hear you stand firm in one spirit, contending together with one mind for the gospel's faith, Ma nʼọnọdụ ọbụla, na-ebinụ ndụ kwesiri oziọma nke Kraịst, ma abịara m leta unu maọbụ na abịaghị m, ka a mata na unu guzosiri ike nʼotu mmụọ, werekwa otu obi na-agba mgba nʼokwukwe nke ikwusa oziọma,
28 and not scared of your opponents at all—proof to them of their destruction, but of your salvation, and that from our Father. na-atụghị ụjọ ihe ndị na-emegide unu ga-eme. Iguzosi ike unu ga-agbara ha ezi ama banyere ịla nʼiyi nke ga-abịakwasị ha. Ma nʼebe unu nọ, ọ ga-abụrụ unu nzọpụta pụtara ihe nke sikwa nʼebe Chineke nọ bịa.
29 For it has been graciously granted to you, for Christ's sake, not only to believe in him but also to suffer for him, Nʼihi na ohere ahụ e nyere unu, abụghị naanị ikwere na Kraịst, kama ọ bụkwa ịhụ ahụhụ nʼihi ya.
30 going through the same struggle you saw me face, and now hear that I still face. Unu nọ na-agabiga ụdị ibu agha ahụ unu hụrụ na m gabigara, nke unu na-anụkwa na m ka nọ nʼime ya ugbu a.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]