Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Philippians 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Finally, brothers and sisters, rejoice in the Lord. Writing the same things again is no trouble for me, and it protects you. Na nchịkọta okwu ndị a niile, ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị. Ike adịghị agwụ m ịgwa unu ihe ndị a. Ọ bakwaara unu uru ịnụ ụdị okwu a mgbe niile.
2 Watch for the dogs, watch for the evil workers, watch for those who mutilate the flesh. Kpachapụrụnụ onwe unu anya nʼebe ndị mmadụ ọjọọ ahụ yiri nkịta nọ. Ndị ahụ na-eyiwasị ahụ ha.
3 We are the circumcision—worshiping by the Spirit of our Father, boasting in Christ Jesus, trusting nothing in the flesh, Nʼihi na ọ bụ anyị bụ ndị ezi obibi ugwu ahụ, ọ bụghị ha, nʼihi na anyị bụ ndị na-efe Chineke site na Mmụọ ya. Anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime Kraịst Jisọs. Anyị adịghị atụkwasị obi nʼihe e mere nʼanụ ahụ.
4 though I too could have confidence in the flesh. If anyone else thinks he has grounds for confidence in the flesh, I have more: Mụ onwe m nwere ike nwee ntụkwasị obi nʼihe ndị a. Nʼihi na e nwee onye chere na ọ pụrụ ịtụkwasị obi ya nʼanụ ahụ, mụ onwe m nwere ụdị ntụkwasị obi ahụ karịa onye ahụ:
5 Circumcised the eighth day; Israelite by birth, from Benjamin's tribe; Hebrew of Hebrews; a Pharisee under the law. e biri m ugwu nʼabalị nke asatọ site na mgbe a mụrụ m, abụ m onye Izrel, sitere nʼagbụrụ Benjamin; abụ m onye Hibru a mụrụ nʼetiti ndị Hibru; dị ka o si metụta iwu abụ m onye Farisii;
6 In zeal, persecuting the church; in righteousness under the law, blameless. igosi ịnụ ọkụ nʼobi m, akpagburu m chọọchị, nʼụzọ ezi omume nʼokpuru iwu, abụ m onye zuruoke.
7 But whatever was gain to me, I now count as loss for the sake of Christ. Ma ihe ndị a niile m gụrụ dịka ihe bara uru nʼoge gara aga, bụụrụ m ugbu a, ihe na-abaghị uru nʼihi Kraịst.
8 Yes, I count everything as loss because of the priceless worth of knowing Christ Jesus my Lord. For his sake I've lost all things, and count them garbage, so I may gain Christ, E, karịa nke a, akpọọla m ihe ndị a niile ihe efu, nʼihi na a pụghị iji ha tụnyere ịdị oke ọnụahịa nke ịmata Kraịst Jisọs, Onyenwe m. Nʼihi ya, etufuola m ihe ndị a niile, gụọ ha dị ka ihe na-abaghị uru, ka m nwee ike rite Kraịst nʼuru.
9 and be found in him, not having my own righteousness from the law, but that through faith in Christ—the righteousness from our Father based on faith, Ka e nwee ike hụ m nʼime ya. Enweghị m ezi omume nke aka m, nke dabere nʼiwu, kama ọ bụ nke sitere nʼokwukwe na Kraịst, ezi omume si na Chineke nke dabeere nʼokwukwe.
10 so I may know him, his resurrection's power, sharing his sufferings, becoming like him in death, Naanị ihe m chọrọ bụ ịmara Kraịst na ike dị na mbilite nʼọnwụ ya, na nnwekọ nke isoro ya keta oke nʼahụhụ ya, nakwa ka m yie ya nʼọnwụ.
11 if somehow I may attain to the resurrection from the dead. Ka m si otu a, ruo nʼogo nke inweta mbilite site nʼọnwụ.
12 Not that I have already obtained it, or am already perfected, but I press on to grasp that for which Christ Jesus grasped me. Anaghị m ekwu na m etozuola oke, maọbụ nwezuo ihe niile. Ma a na m agbalịsi ike ka m jide ihe ahụ nke Kraịst Jisọs jidere m nʼihi ya.
13 Brothers, I don't count myself as having grasped it yet. But one thing: forgetting what's behind, reaching for what's ahead, Ụmụnna m, nʼezie, abụbeghị m ihe ahụ m kwesiri ịbụ. Ma ihe m ji ike m niile na-eme bụ ichefu ihe niile ndị gara aga, na ilekwasị anya nʼihe ahụ m na-agbaso bụ nke dị m nʼihu.
14 I press toward the goal for the prize of our Father's heavenward call in Christ Jesus. Ana m agbasi ọsọ ike iji gbaruo nʼisi, maka irite ihe ahụ a na-agbata nʼọsọ, bụ ọkpụkpọ ịbanye na ndụ eluigwe ahụ nke Chineke kpọrọ m site na Jisọs Kraịst.
15 Let all of us who are mature think this way; if you think differently on anything, our Father will reveal that to you too. Ka anyị niile, bụ ndị tozuru oke nʼime mmụọ nwee uche dị otu a. Ọ bụrụkwa na ụfọdụ nʼime unu nwere uche ọzọ dị iche, Chineke ga-ekpughere unu nke a.
16 Only let us hold true to what we have already attained. Ka anyị jidesienụ aka ike naanị nʼihe ahụ anyị nweterela.
17 Brothers, imitate me together, and watch those who live by the pattern you have in us. Ụmụnna m, na-agbasonu ụdị ndụ m na-ebi, chọpụtakwanụ ndị ọzọ na-adị ndụ dị ka anyị si adị, mee ha ihe ilere anya unu.
18 Many live as enemies of Christ's cross—I've told you this often, and now say it in tears. Nʼihi na agwala m unu nke a ọtụtụ mgbe, na-achọkwa ịgwa unu ya ọzọ ugbu a. Lee, anya mmiri dị m nʼanya ugbu a m na-ekwu ya sị na e nwere ọtụtụ ndị na-ebi ndụ ha dị ka ha bụ ndị iro obe Kraịst nʼezie.
19 Their end is destruction, their god the stomach, their glory their shame, minds fixed on earthly things. Ọgwụgwụ ndị dị otu a ga-abụ ịla nʼiyi. Afọ ha bụ chi ha, ndị otuto ha dịkwa nʼihere ha. Ha na-atụkwasị uche naanị nʼihe nke ụwa.
20 But our citizenship is in heaven; from there we eagerly await a Savior, the Lord Jesus Christ, Ma ebe obibi anyị dị nʼeluigwe, ebe anyị na-atụsi anya ike na Onye nzọpụta bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-esi bịa.
21 who will transform our lowly body to match his glorious body, by the power that subjects all things to himself. Onye ga-agbanwe ahụ anyị dị ala ka ọ dị ka nke ya dị ebube, site nʼike nke mere ka o debe ihe niile nʼokpuru ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]