Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 24 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Balaam saw that it pleased our Father to bless Israel, so he did not seek omens as before, but turned toward the wilderness. Nʼoge a, Belam aghọtala nʼuche ya na ọ masịrị Onyenwe anyị ịgọzi Izrel. Ya mere, ọ họrọghị ịgba afa dịka o mere nʼoge ndị gara aga, kama o chere ihu ya nʼọzara.
2 Balaam looked up and saw Israel camped tribe by tribe; then the Spirit of our Father came on him. Mgbe Belam lepụrụ anya ọ hụrụ ụmụ Izrel dịka ha si maa ụlọ ikwu nʼebo nʼebo. Mgbe ahụ kwa, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị ya.
3 He lifted his oracle and said: "The oracle of Balaam son of Beor, the oracle of the man whose eye is opened, O buru amụma ndị a sị, “Okwu si nʼọnụ Belam nwa Beoa pụta, okwu onye ahụ anya ya saghere asaghe.
4 the oracle of one who hears the words of our Father, who sees the vision of the Almighty, bowing down with eyes wide open: Okwu onye ahụ na-anụ okwu Chineke onye na-ahụ ọhụ site nʼaka onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-ada nʼala ma anya ya na-eghe oghe.
5 How lovely are your tents, Jacob, your dwelling places, Israel! “Lee ka ebe obibi gị si maa mma, gị Jekọb, ebe obibi gị niile, gị Izrel!
6 Like valleys stretching far, like gardens beside a river, like aloes our Father has planted, like cedars beside the waters. “Dịka ndagwurugwu dị iche iche ka ha gbasapụrụ, dịka ubi a gbara ogige dị nʼakụkụ osimiri, dịka osisi aloos nke Onyenwe anyị kụrụ, dịka osisi sida dị nʼakụkụ mmiri.
7 Water will flow from his buckets, and his descendants will have abundant water. His king will be higher than Agag, and his kingdom will be exalted. Mmiri ga-esi nʼite mmiri ha na-erupụta, mkpụrụ ha ga-enwekwa mmiri dị ukwuu. “Eze ha ga-adị ukwuu karịa Agag, a ga-ebulikwa alaeze ha elu.
8 Our Father brings Israel out of Egypt; Israel is like the horns of the wild ox to them. Israel will devour the nations who oppose them, break their bones, and pierce them with arrows. “Chineke sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha. Ha nwere ike dịka atụ. Ha ga-eripịa mba niile na-ebili imegide ha. Ha ga-anyajisi ọkpụkpụ ha niile, jirikwa ọtụtụ àkụ ha gbatuo ha.
9 He crouches, he lies down like a lion, like a lioness—who dares rouse him? Blessed are those who bless you, and cursed are those who curse you." Ha na-amakpuru, dinara ala dịka ọdụm, dịka nne ọdụm, onye pụrụ ịkpọte ha? “Ngọzị na-adịrị onye ọ bụla na-agọzi gị, ma ọbụbụ ọnụ na-adịrị onye ọbụla na-akọcha gị.”
10 Balak's anger flared against Balaam, and he clapped his hands. Balak said to Balaam, "I called you to curse my enemies, but you've blessed them three times now! Iwe Balak dị ọkụ megide Belam nʼoge a. Ọ kụkọtara aka ya abụọ nʼiwe. Tie mkpu sị Belam, “Akpọrọ m gị ka ị bịa bụọrọ m ndị iro m ọnụ. Ma ị gọziela ha ugboro atọ a.
11 Now flee home! I said I would richly honor you, but God has kept you from honor." Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị! Laghachi nʼụlọ gị! Akwadobere m inye gị ọnọdụ dị elu, ma Onyenwe anyị e gbochiela gị inweta ụgwọ ọrụ a.”
12 Balaam answered Balak, "Did I not tell the messengers you sent me, Belam zara Balak sị, “Ọ bụ na m agwaghị ndị ozi gị niile, bụ ndị ị zitere m,
13 'Even if Balak gave me his house full of silver and gold, I couldn't go beyond my God's command to do good or bad on my own; I can only say what my God tells me'? ‘na a sịkwarịị na Balak enye m ọlaọcha na ọlaedo niile nke dị nʼụlọeze ya, apụghị m ime ihe ọbụla nʼike aka, maọbụ ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ, ị gabiga iwu Onyenwe anyị. Ọ bụkwa naanị ihe Onyenwe anyị na-ekwu ka m ga-ekwu’?
14 And now I am going back to my people. Come, let me warn you what this people will do to your people in the days to come." Ugbu a, ana m alakwuru ndị m, ma bịa, ka m dọọ gị aka na ntị banyere ihe ndị a ga-eme ndị gị nʼụbọchị ndị a na-abịa nʼihu.”
15 Then he lifted his oracle, saying: "Oracle of Balaam son of Beor, oracle of the man whose eye is opened, Ya mere Belam kwuru okwu ndị a: “Amụma Belam nwa Beoa, amụma nke onye ahụ anya ya nʼahụ ụzọ nke ọma,
16 the oracle of one who hears the words of our Father, who knows the knowledge of the Most High, who sees the vision of the Almighty, bowing down with eyes wide open: amụma onye ahụ nke na-anụ okwu Chineke, onye ihe ọmụma ya si nʼebe Onye kachasị ihe niile elu na-abịa. Onye na-ahụ ọhụ site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-ada nʼala, ma anya ya abụọ ghekwa oghe.
17 I see him, but not now; I gaze on him, but not near. A star will come out of Jacob, and a scepter will rise out of Israel; it will crush the brow of Moab and break down all the sons of Sheth. “Ana m ahụ ya, ma ọ bụghị ugbu a, ana m ele ya anya, ma ọ nọghị nso. Otu kpakpando ga-esi nʼime Jekọb zolie. Mkpara eze ga-esi nʼetiti Izrel bilie. Ọ ga-etipịa egedege ihu ndị Moab, na okpokoro isi ndị ikom Shet niile.
18 Edom will be conquered, and Seir, his enemies, will be conquered, while Israel grows strong. A ga-emeri Edọm, Sia, onye iro ya, ka a ga-emeri nʼagha. Ma Izrel ga-eto, ghọọ onye dị ike.
19 One from Jacob will rule, and will destroy the survivors of the city." Otu onye ọchịchị ga-esi na Jekọb pụta. Bibie ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ.”
20 Then Balaam saw Amalek, took up his message, and said: "Amalek was first among the nations, but his end is utter destruction." Mgbe ahụ, Belam lepụrụ anya legide ụlọ ndị Amalek niile, buo amụma banyere ha sị: “Amalek bụ mba mbụ nʼetiti mba niile, ma ikpeazụ ya bụ mbibi!”
21 He looked at the Kenite, took up his oracle, and said: "Your dwelling place is firm, your nest set in the rock. Ọ hụrụ ndị Ken anya, kwuo okwu ya: “E, i bi ugbu a nʼebe e wusiri ike, akwụ gị dị nʼime oke nkume ahụ!
22 Yet Kain will be consumed when Asshur takes you away captive." Ma, a ga-ebibi unu ndị Ken niile, mgbe Ashọ ga-adọta unu nʼagha.”
23 He took up his oracle and said: "Who can live when God does this? Ndị a bụ okwu o ji mechie amụma ya: “Onye ga-adị ndụ mgbe Chineke ga-eme ihe ndị a?
24 Ships will come from the coasts of Kittim; they will afflict Asshur and afflict Eber, but they too will come to utter destruction." Ụgbọ mmiri ga-esi nʼọnụ mmiri Saiprọs bịa. Ha ga-eji ike dobe ndị Eba na ndị Ashọ nʼokpuru ha, ma a ga-ebibikwa ha onwe ha.”
25 Then Balaam rose and went back to his home, and Balak also went on his way. Emesịa, Belam biliri laghachi nʼụlọ ya, ma Balak gbasoro ụzọ nke ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]