Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 25 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 While Israel lived in Shittim, the people began sexual sin with Moab's daughters. Mgbe Izrel bi na Shitim, ndị ikom ha malitere isoro ndị inyom Moab na-akwa iko.
2 They invited the people to their gods' sacrifices; the people ate and bowed to their gods. Ndị inyom a kpọrọ ha ka ha bịa soro na mmemme ịchụ aja nye chi ha niile. Ndị Izrel riri nri ihe aja ahụ, kpọọkwa isiala nye chi ndị a niile.
3 So Israel joined himself to Baal of Peor, and the anger of our Father burned against Israel. Ya mere, ndị Izrel sonyere na-akpọ isiala nye chi Baal nke Peoa. Nke a mere ka iwe Onyenwe anyị nwuru ọkụ megide ha.
4 Our Father said to Moses, "Take all the people's leaders and execute them before me in daylight, so my burning anger turns away from Israel." Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Duru ndị ndu ebo niile nke Izrel gbuo ha ma kwụnye ha nʼosisi nʼihu Onyenwe anyị nʼetiti ehihie, ka oke iwe Onyenwe anyị dị ọkụ ghara ịbịakwasị ndị Izrel.”
5 Moses told Israel's judges, "Each of you kill his men joined to Baal of Peor." Ya mere, Mosis sịrị ndị ọkaikpe Izrel, “Onye ọbụla nʼime unu aghaghị igbu ndị unu, bụ ndị jikọtara onwe ha na Baal nke Peoa.”
6 Then an Israelite man brought a Midianite woman to his brothers in front of Moses and Israel's whole assembly, while they wept at the entrance of the tent of meeting. Mgbe ahụ, otu nwoke onye Izrel kpọbatara nʼime ụlọ ikwu otu nwanyị onye Midia, nʼihu Mosis na nzukọ Izrel niile, mgbe ha niile nọ na-akwa akwa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
7 Phinehas son of Eleazar, son of Aaron the priest, saw this, rose from the assembly, and took a spear in his hand. Mgbe Finehaz na Elieza, nwa Erọn, onye nchụaja hụrụ ihe a, ọ hapụrụ ọgbakọ Izrel. O were ùbe nʼaka ya,
8 He followed the Israelite man into the chamber and pierced them both—the Israelite man and the woman, through her belly. Then the plague against the Israelites stopped. soro nwoke ahụ baa nʼime ụlọ, ebe ya na nwaagbọghọ ahụ dina. Ọ mara ha ùbe ahụ, nke si nʼahụ nwoke ahụ gafee mikpuo nʼafọ nwaagbọghọ ahụ. Nke a mere ka ihe otiti ahụ na-emegide ndị Izrel kwụsị.
9 Those who died in the plague were 24,000. Ma tupu ihe otiti ahụ akwụsị, ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha ruru iri puku abụọ na anọ (24,000) anwụọlarị.
10 Then our Father said to Moses, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
11 "Phinehas son of Eleazar, son of Aaron the priest, has turned my anger from the Israelites by his zeal for my zeal among them, so I didn't destroy the Israelites in my zeal. “Finehaz nwa Elieza, nwa Erọn, onye nchụaja, emeela ka iwe m megide Izrel dajụọ. Nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi dịka mụ onwe m banyere idebe nsọpụrụ m nsọ nʼetiti ha, ka m ghara isite nʼịnụ ọkụ nke obi m bibie ha.
12 Therefore say: I am giving him my covenant of peace. Ya mere, gwa ya, na m na-eme ka ọgbụgba ndụ udo m dịrị ya.
13 He and his descendants after him will have a covenant of lasting priesthood, because he was passionate for me and made atonement for the Israelites." Ya na ụmụ ụmụ ya ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke ịrụ ọrụ nchụaja ga-adịrị, nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi banyere nsọpụrụ nke Chineke ya, si otu a chụọrọ ndị Izrel aja ikpuchi mmehie.”
14 The name of the Israelite killed with the Midianite woman was Zimri son of Salu, a Simeonite clan leader. Aha nwoke Izrel ahụ e gburu ya na nwanyị onye Midia ahụ bụ Zimri, nwa Salu, onyendu otu ezinaụlọ nʼebo Simiọn.
15 The Midianite woman killed was named Cozbi, daughter of Zur, head of a clan in Midian. Aha nwanyị Midia ahụ e gburu bụ Kozbi, nwa nwanyị Zua, onye bụ otu nʼime ndịisi ezinaụlọ na Midia.
16 Then our Father said to Moses, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
17 "Treat the Midianites as enemies and strike them down, “Mesoo ndị Midia mmeso dịka ndị iro. Gbukwaa ha.
18 for they are your enemies through their trickery, by which they tricked you in the matter of Peor, and of Cozbi, daughter of Midian's leader, their sister, struck down on the day of the plague over Peor." Nʼihi na ha mesoro unu mmeso dịka ndị iro mgbe ha ji ụzọ aghụghọ ghọgbuo unu nʼokwu Peoa, na nʼokwu Kozbi nwanne ha nwanyị, bụ nwa nwanyị otu nʼime ndịisi Midia, onye e gburu mgbe ihe otiti ahụ bịara nʼihi okwu Peoa.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]