Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 23 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Balaam told Balak, "Build me seven altars here, prepare seven bulls and seven rams for me here." Belam sịrị, “Wuoro m ebe ịchụ aja asaa nʼebe a. Kwadokwaara m oke ehi asaa na ebule asaa.”
2 Balak did as Balaam said; Balak and Balaam offered a bull and a ram on each altar. Balak mezuru dịka Belam gwara ya. Ha abụọ gburu otu oke ehi na otu nwa ebule nʼebe ịchụ aja asaa ahụ nʼotu na otu.
3 Balaam told Balak, "Stand by your burnt offering while I go; maybe God will meet me, and I'll tell you whatever he shows me." Then he went to a bare height. Mgbe ahụ, Belam gwara Balak sị, “Guzoro nʼebe a nʼakụkụ aja gị ka m gaa nʼihu chọpụta ma eleghị anya Onyenwe anyị ga-ezute m. Aga m agwa gị ihe ọbụla o kpughere m.” Ya mere, Belam rigooro nʼebe ọhịa na-adịghị.
4 Our Father met Balaam, who said to him, "I have set up seven altars and offered a bull and ram on each altar." Chineke zutere ya nʼebe ahụ. Belam gwara ya sị, “Edoziela m ebe ịchụ aja asaa, gbukwaa otu oke ehi na otu ebule nʼelu ha niile nʼotu na otu.”
5 Our Father put a word in Balaam's mouth: "Return to Balak and say this." Nʼoge a, Onyenwe anyị tinyere Belam ozi nʼọnụ sị ya, “Laghachi gaa zie Balak ozi a.”
6 He went back to Balak—there Balak stood beside his burnt offering, with all the princes of Moab. Mgbe Belam lọghachiri ọ hụrụ ya ka o guzoro nʼakụkụ ihe aja ya ndị ahụ, ya na ndịisi Moab niile.
7 He took up his oracle and said: "From Aram Balak brought me, Moab's king from the eastern mountains: Come, curse Jacob for me; come, denounce Israel. Nke a bụ ozi Belam ziri: “Balak esitela nʼobodo Aram kpọta m. Eze Moab esitela nʼọwụwa anyanwụ nke ugwu ahụ kpọta m. Ọ sịrị m, bịa bụọrọ m Jekọb ọnụ bịa kwutọọ Izrel.
8 How can I curse those our Father has not cursed? How can I denounce those our Father has not denounced? M ga-esi aṅaa bụọ onye Chineke na-abụghị ọnụ ọnụ? M ga-esi aṅaa kọchaa onye Onyenwe anyị na-akọchaghị?
9 From the top of the rocks I see them, from the hills I look on them: a people dwelling alone, not counting itself among the nations. Esitela m nʼelu nkume ndị a hụ ha. Elegidere m ha anya site nʼugwu ahụ, hụ na ha bụ ndị biri onwe ha, ndị dị iche site nʼetiti mba niile ọzọ.
10 Who can count the dust of Jacob or number even a fourth of Israel? Let me die as the upright die, and let my end be like theirs!" Onye pụrụ ịgụta ole uzuzu Jekọb dị? Maọbụ gụta ole otu ụzọ nʼime nkewa anọ nke Izrel dị. Ọ ga-atọ m ụtọ ịnwụ ụdị ọnwụ ndị na-eme ezi omume. Ka ọgwụgwụ ndụ m bụrụ ihe nwere ike iyi nke ha!”
11 Balak said to Balaam, "What have you done to me? I brought you to curse my enemies, and look—you've only blessed them!" Balak sịrị Belam, “Gịnị bụ ihe a i mere m? Akpọtara m gị ka ị bụọrọ m ndị iro m ọnụ, ma ugbu a, ọ dịghị ihe ọzọ i mere karịa naanị ịgọzi ha!”
12 He answered, "Must I not be careful to say what God puts in my mouth?" Ma Belam zaghachiri sị ya, “Ọ bụghị ihe Onyenwe anyị tinyere m nʼọnụ ka m ga-ekwu?”
13 Then Balak said, "Please come with me to another place where you can see them. You will see only their outer edge, not all of them, and curse them for me from there." Mgbe ahụ, Balak sịrị ya, “Soro m bịa nʼebe ọzọ ebe ị ga-ahụ ha; ọ bụ naanị nsọtụ ọmụma ụlọ ikwu ha ka ị ga-ahụ, ị gaghị ahụ ha niile. Site nʼebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.”
14 He took him to the field of Zophim, to the top of Pisgah, built seven altars, and offered a bull and a ram on each. Ya mere, eze Balak duuru Belam gaa nʼọhịa Zofim, nʼelu ugwu Pisga, wuo ebe ịchụ aja asaa nʼebe ahụ. O jikwa otu oke ehi, otu oke ehi, na otu ebule, otu ebule, chụọ aja nʼebe ịchụ aja ndị ahụ.
15 Balaam said to Balak, "Stand here by your burnt offering while I meet with him over there." Belam sịrị Balak, “Guzoro nʼebe a nʼakụkụ ihe aja gị, ebe mụ onwe m ga-ezute ya nʼofe nke ọzọ.”
16 Our Father met Balaam, put a word in his mouth, and said, "Return to Balak and say this." Ma Onyenwe anyị zutere Belam gwa ya ihe ọ ga-ekwu sị ya, “Laghachikwuru Balak zie ya ozi a.”
17 He came to him—there, standing by his burnt offering, with Moab's princes. Balak said to him, "What has God spoken?" Ya mere, ọ lọghachiri azụ nʼebe ahụ Balak na ụmụ eze Moab guzoro nʼakụkụ ihe aja ha. Balak jụrụ ya sị, “Gịnị ka Onyenwe anyị sịrị?”
18 He took up his oracle: "Rise, Balak, and hear; listen to me, son of Zippor: Ma Belam zaghachiri sị ya: “Bilie ọtọ Balak, nụrụ ozi. Ṅaa ntị nʼokwu m, gị nwa Zipoa.
19 Our Father is not a man, that he should lie, nor a son of man, that he should change his mind. Has he ever said something and not done it? Has he ever spoken and not fulfilled it? Chineke agaghị agha ụgha, nʼihi na ọ bụghị mmadụ. Ọ gaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị nwa mmadụ. O kwuola okwu, ma ghara ime ihe o kwuru? O kwela nkwa ma ghara imezu nkwa o kwere?
20 Look, I have received a command to bless. He has blessed, and I cannot revoke it. Chineke enyela m iwu sị m gọzie ha. Ọ gọziela ha, a pụghịkwa ịgbanwe ya!
21 He has seen no misfortune in Jacob, nor seen trouble in Israel. Our Father is with him, and the shout of a King is among them. “O nweghị ajọ ihe nke ahụrụ nʼime Jekọb, ahụghịkwa mwute ọbụla nʼIzrel. Onyenwe anyị Chineke ha nọnyeere ha. Iti mkpu nke Eze dịkwa nʼetiti ha.
22 Our Father, who brought them out of Egypt, is for them like the horns of the wild ox. Chineke kpọpụtara ha site nʼIjipt. Ha dị ike dịka ehi ọhịa.
23 There is no enchantment against Jacob, no divination against Israel. Now it will be said of Jacob and of Israel, 'See what our Father has done!' Ọ dịghị mgbaasị ga-emegide ha. Ọ dịkwaghị ịgba afa a pụrụ iji megide Izrel. Nʼihi na ugbu a, ihe dị otu a ka a ga-ekwu banyere Jekọb na Izrel. ‘Lee, ihe Chineke mere ha.’
24 Look, a people rising up like a lioness, rousing itself like a lion; it will not lie down until it devours the prey and drinks the blood of the slain." Ha na-ebili ọtọ dịka nne ọdụm, ha na-enugharị onwe ha dịka ọdụm, nke na-adịghị edina ala tutu o richaa ihe o gburu, ma ṅụọkwa ọbara ihe ahụ o tigburu!”
25 Balak said to Balaam, "Don't curse them at all, and don't bless them at all!" Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Abụla ha ọnụ ma ọlị, ma ọ bụkwanụ gọzie ha ma ọlị.”
26 But Balaam answered Balak, "Didn't I tell you I must do all that God says?" Ma Belam zaghachiri, “Ọ bụ na m agwaghị gị, ihe ọbụla nke Onyenwe anyị ga-ekwu ka m ga-eme?”
27 Balak said to Balaam, "Come, let me take you elsewhere. Maybe God will let you curse them for me from there." Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Bịa, aga m akpọrọ gị gaa nʼebe ọzọ. Eleghị anya ọ ga-amasị Chineke ka i si nʼebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.”
28 So Balak took Balaam to the top of Peor, which overlooks the wasteland. Ya mere, Balak duuru Belam gaa nʼelu ugwu Peoa nke na-elegide ọzara ahụ anya.
29 Balaam told Balak, "Build me seven altars here, and prepare seven bulls and seven rams here." Belam gwara Balak okwu sị ya, “Wuoro m ebe ịchụ aja asaa ọzọ. Doziekwa ụmụ oke ehi asaa na ebule asaa e ji achụ aja.”
30 Balak did as Balaam had said, and offered a bull and a ram on each altar. Balak mere dịka Belam gwara ya. O ji otu oke ehi na otu ebule chụọ aja nʼebe ịchụ aja ahụ nʼotu na otu.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]