Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 22 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then the Israelites set out and camped in the plains of Moab beyond the Jordan, opposite Jericho. Ndị Izrel biliri njem bịarute nʼobosara ala Moab. Manye ụlọ ikwu ha nʼakụkụ Jọdan ebe chere ihu nʼobodo Jeriko.
2 Now Balak son of Zippor saw all that Israel had done to the Amorites. Ma Balak nwa Zipoa ahụlarị ihe niile Izrel mere ndị Amọrait.
3 Moab feared the people greatly, for they were many; Moab dreaded the Israelites. Oke ụjọ jidere ndị Moab nʼihi na ndị Izrel dị ọtụtụ. Nʼezie, oke ụjọ dị ukwuu jidere ndị Moab nʼihi ụmụ Izrel.
4 Moab said to Midian's elders, "This horde will lick up everything around us, as an ox licks up field grass." Balak son of Zippor was king of Moab then. Ndị Moab jekwuru ndị okenye Midia sị ha, “Igwe mmadụ ndị a ga-erichapụ ihe niile gbara anyị gburugburu. Ha ga-eripịa ha dịka ehi si erichapụ ahịhịa ndụ dị nʼala.” Ya mere, Balak nwa Zipoa, onye bụ eze ndị Moab nʼoge ahụ,
5 He sent messengers to Balaam son of Beor at Pethor, by the Euphrates in his people's land, to summon him. He said, "Look, a people has come out of Egypt. Look, they cover the face of the land, and have settled facing me. zigara ndị ozi ya ka ha jekwuru Belam, nwa Beoa onye bi nʼobodo ya bụ Petoa, nke dị nso nʼiyi ukwu Yufretis. O ziri ya sị, “Lee otu ndị sitere nʼIjipt pụta. Lee ka ha si kpuchie elu ala a; ugbu a, ha bi nʼakụkụ m.
6 Come, please curse this people for me—they are stronger than I am. Maybe then I can strike them and drive them from the land, for I know: whoever you bless is blessed, and whoever you curse is cursed." Ugbu a, bịa ka ị bụọrọ m ha ọnụ, nʼihi na ha dị ike karịa m. Ma eleghị anya aga m enwe ike merie ha, ma chụpụkwa ha site nʼala m. Nʼihi na amaara m na ndị ọbụla ị gọziri bụ ndị a gọziri agọzi, ndị ọbụla ị bụrụ ọnụ ga-anọgide bụrụ ndị a bụrụ ọnụ.”
7 The elders of Moab and elders of Midian went, fortune-telling fees in their hand, and came to Balaam and told him Balak's words. Ndị ozi o zigara bụ ndị okenye obodo Moab na Midia. Ha ji ego ịjụta ase nʼaka ha. Mgbe ha ruru, ha ziri Belam ozi Balak ziri.
8 He said to them, "Stay here tonight, and I'll bring back word as God speaks to me." So the officials of Moab stayed with Balaam. Belam gwara ha okwu sị, “Nọdụnụ nʼebe a nʼabalị a. Aga m ewetara unu ọsịsa ọbụla Onyenwe anyị nyere m.” Ya mere, ndị ozi ahụ si Moab nọnyeere ya.
9 Then our Father came to Balaam and said, "Who are these men with you?" Nʼabalị ahụ, Chineke bịakwutere Belam jụọ ya sị, “Ndị ikom ndị a bịara ileta gị, ha bụ ndị ole?”
10 Balaam said to our Father, "Balak son of Zippor, king of Moab, has sent word to me: Belam sịrị Chineke, “Balak nwa Zipoa eze Moab zitere m ozi sị m,
11 Look, the people who came out of Egypt cover the land's face. Come now, curse them for me—maybe I can fight against them and drive them out." ‘Otu ndị esitela nʼala Ijipt pụta, ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. Achọrọ m ka ị bịa bụọrọ m ha ọnụ. Ma eleghị anya aga m enwe ike lụso ha agha, ma chụpụkwa ha.’ ”
12 But our Father told Balaam, "Do not go with them. Do not curse the people, for they are blessed." Ma Chineke sịrị Belam, “Esola ha aga! Ị gaghị abụ ndị a ọnụ, nʼihi na ha bụ ndị a gọziri agọzi.”
13 Balaam got up that morning and told Balak's officials, "Return to your land—God has refused to let me go with you." Mgbe chi bọrọ, Belam biliri gwa ndị ozi Balak sị ha, “Laghachinụ nʼobodo unu nʼihi na Onyenwe anyị ekweghị ka m soro unu.”
14 Moab's officials got up, went to Balak, and said, "Balaam refused to come with us." Ya mere, ndị ozi Moab laghachikwuru Balak gwa ya sị, “Belam jụrụ iso anyị lọghachi.”
15 Then Balak sent officials again—more numerous and more honored than the first. Balak nwara ike ya ọzọ. Nʼoge a, o zipụrụ ụmụ eze ndị dị ọtụtụ na ndị a maara aha ha karịa ndị mbụ.
16 They came to Balaam and said, "Balak son of Zippor says: Let nothing keep you from coming to me, Ha jiri ozi a bịakwute Belam sị ya, “Ihe a ka Balak nwa Zipoa sị anyị zie gị, Ọ sị gị ekwela ka ihe ọbụla gbochie gị ịbịakwute m.
17 for I will honor you greatly, and do whatever you say to me. So please come and curse this people for me." Nʼihi na aghaghị ịsọpụrụ gị nʼebe ọ dị ukwuu m, mekwaa ihe ọbụla ị sị m mee. Naanị bịa ka ị bụọrọ m ndị a ọnụ.”
18 Balaam answered Balak's servants, "Even if Balak gave me his house full of silver and gold, I cannot go beyond God's command, to do small or great. Ma Belam zaghachiri sị, “Ọ bụrụ na Balak enye m ụlọeze ya nke juputara nʼọlaọcha na ọlaedo, apụghị m ime ihe ọbụla dị ukwuu maọbụ nke nta ịgabiga iwu Onyenwe anyị bụ Chineke m.
19 Now please, stay here tonight, you too, so I may learn what more our Father will say to me." Ma otu ọ dị, nọọnụ ka chị bọọ dịka ndị ọzọ ahụ mere ka m nwee ike chọpụta ma ọ dị ihe Onyenwe anyị ga-atụkwasị nʼihe o kwuru na mbụ.”
20 And our Father came to Balaam at night and said to him, "Since these men came to summon you, get up and go with them, but do only what I tell you." Nʼabalị ahụ, Chineke gwara Belam okwu sị ya, “Ebe ọ bụ na ndị a bịara ịkpọ gị oku, bilie soro ha gaa, kama jikere ikwu naanị okwu m ga-etinye gị nʼọnụ.”
21 So Balaam got up in the morning, saddled his donkey, and went with the officials of Moab. Ya mere, mgbe chi echi ya bọrọ, Belam rigooro nʼelu ịnyịnya ibu ya soro ụmụ eze Moab gaa.
22 But our Father's anger burned because he went, and our Father's messenger stood in the road as Balaam's adversary. Balaam was riding his donkey, with his two servants. Ma iwe were Chineke nʼihi na ọ na-aga, ma mmụọ ozi Onyenwe anyị guzochiri ụzọ igbochi ya. Belam na ndị odibo ya abụọ nọ na-elu ịnyịnya ibu ya.
23 The donkey saw the messenger of our Father standing in the road, his sword drawn in his hand, and she turned off the road into the field. So Balaam struck the donkey to turn her back onto the road. Mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka o guzochiri nʼụzọ, jide mma a mịpụtara amịpụta nʼaka ya, ịnyịnya ibu ahụ chigharịrị onwe ya hapụ okporoụzọ, tinye isi nʼọhịa. Ma Belam tiri ya ihe ịchụghachi ya nʼụzọ.
24 Then our Father's messenger stood in a narrow path between vineyards, a wall on each side. Nʼoge a, mmụọ ozi Onyenwe anyị guzochiri nʼụzọ dị warawara, nke dị nʼetiti mgbidi ogige ubi vaịnị abụọ.
25 The donkey saw the messenger of our Father, pressed against the wall, and pressed Balaam's foot against it, so he struck her again. Mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị, o tinyere isi nʼahụ mgbidi ogige ubi ahụ, chọọ isite nʼebe ahụ gafee. Mgbe ọ na-eme nke a, o mere ka mgbidi ahụ chihịapụ Belam ụkwụ. Ya mere Belam tiri ịnyịnya ibu ahụ ihe ọzọ.
26 The messenger of our Father went further and stood in a narrow place with no room to turn right or left. Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị gakwara nʼihu nʼokporoụzọ ahụ nọchie ụzọ ahụ ebe dị nnọọ mkpakọta, ebe ịnyịnya ibu ahụ na-agaghị enwe ike gafee, maọbụ ichigharị aka nri maọbụ aka ekpe.
27 When the donkey saw the messenger of our Father, she lay down under Balaam; his anger flared, and he struck her with his staff. Nʼihi nke a, mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị o dinara ala nʼokporoụzọ. Nʼoke iwe, Belam ji mkpara dị ya nʼaka tie ya ihe ọzọ.
28 Then our Father opened the donkey's mouth, and she said to Balaam, "What have I done to you, that you struck me these three times?" Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mere ka ịnyịnya ibu ahụ kwuo okwu. Ọ jụrụ Belam ajụjụ sị, “Gịnị ka m mere gị i ji tie m ihe ugboro atọ?”
29 Balaam said to the donkey, "You have mocked me! If I had a sword in my hand, I'd kill you now." Belam zara ịnyịnya ibu ahụ sị, “Ọ bụ nʼihi na i meela ka m dị ka onye nzuzu! Nʼezie, a sị na m ji mma agha nʼaka m, agaara m egbu gị.”
30 The donkey said to Balaam, "Am I not your donkey, the one you've ridden all your life until today? Have I ever treated you this way before?" He said, "No." Ịnyịnya ibu ahụ gwara Balam okwu ọzọ sị ya, “Ọ bụ na mụ onwe m abụghị ịnyịnya ibu gị nke ị na-anọ nʼelu ya ogologo oge ndị a niile? Ọ dịla mgbe m si otu a meso gị omume nʼime ndụ m niile?” Belam zara sị ya, “Ee.”
31 Then our Father opened Balaam's eyes, and he saw our Father's messenger standing in the road, sword drawn in hand, and he bowed low and fell facedown. Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị meghere anya Belam. Ọ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka o ji mma agha ya guzochie ụzọ. Belam dara nʼala, gbatịa onwe ya nʼala nʼihu ya.
32 The messenger of our Father said to him, "Why have you hit your donkey three times? I've come out as an adversary, because your way is reckless before me. Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ jụrụ Belam ajụjụ sị, “Gịnị mere i ji tie ịnyịnya ibu gị ihe ugboro atọ? Abịara m igbochi gị ka ịla nʼiyi dị na-eche gị ghara irute gị.
33 The donkey saw me and turned aside from me these three times. Had she not turned aside, I would have killed you by now and spared her life." Ugboro atọ ka ịnyịnya ibu a hụrụ m, ma site nʼihu m wezuga onwe ya. A sị na ọ bụghị ntụgharị ọ tụgharịrị site nʼebe m nọ, nʼezie, ugbu a, a gara m egbu gị ma hapụ ịnyịnya ibu gị ndụ.”
34 Balaam said to the messenger of our Father, "I have sinned—I didn't know you stood in the road to oppose me. Now if this is displeasing in your eyes, I'll turn back." Nʼoge a, Belam sịrị mmụọ ozi Onyenwe anyị, “Emehiela m. Amaghị m na i guzo nʼụzọ igbochi m. Ọ bụrụ iwe na-ewe gị, ejikeere m ịlaghachi azụ.”
35 The messenger of our Father told Balaam, "Go with the men, but say only what I tell you." So Balaam went on with Balak's officials. Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị sịrị Belam, “Soro ndị ikom a gaa, ma kwuo naanị ihe m sị gị kwuo.” Ya mere, Belam soro ndị ozi eze Balak gaa.
36 When Balak heard Balaam was coming, he went out to meet him at the city of Moab, on the Arnon border, at the border's edge. Mgbe Balak nụrụ na Belam nọ nʼụzọ na-abịa, ọ pụrụ gaa izute Belam nʼotu obodo Moab nke dị nʼọnụ mmiri Anọn, nke dị na ngwụcha oke ala ya.
37 Balak said to Balaam, "Didn't I send urgently to call you? Why didn't you come to me? Can I really not honor you?" Mgbe ọ bịarutere, Balak jụrụ Belam ajụjụ sị ya, “Eziri m gị ozi ka ị bịa ngwangwa, gịnị mere ị bịaghị? Ọ bụ na m enweghị ike ịsọpụrụ gị?”
38 Balaam told Balak, "Look, I've come to you now—but can I say just anything? I can only speak what God puts in my mouth." Belam zaghachiri, “Lee, Abịakwutelam gị ugbu a, ma enweghị m ike ikwu ihe ọbụla dị m mma. Ọ bụ naanị ihe Chineke tinyere m nʼọnụ ka m ga-ekwu.”
39 So Balaam went with Balak, and they came to Kiriath-huzoth. Belam sooro Balak gaa Kiriat Huzot.
40 Balak sacrificed cattle and sheep, sending shares to Balaam and the officials with him. Balak jiri ehi na atụrụ chụọ aja. O nyere Belam ụfọdụ, nyekwa ma ndị ozi eze ndị ya na ha nọ nʼebe ahụ.
41 In the morning Balak took Balaam and brought him up to Bamoth-baal, and from there he saw the edge of the people. Nʼụtụtụ echi ya, Balak kpọọrọ Belam, duru ya rigoo Bamot Baal. O sitere nʼebe ahụ hụ nsọtụ ọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]