Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 21 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 When the Canaanite, king of Arad, living in the Negev, heard Israel was coming by the Atharim road, he fought Israel and took some captive. Mgbe eze Kenan, bụ Arad, onye bi na Negev nụrụ na ndị Izrel na-agbaso ụzọ ahụ na-aga obodo Atarim, ọ chịkọtara ndị agha ya, pụkwuru ndị Izrel, lụso ha agha. Ọ dọtara ụfọdụ nʼime ha nʼagha.
2 Israel made a vow to our Father: "If you truly give this people into my hand, I will destroy their cities completely." Mgbe ahụ, ndị Izrel kwere Onyenwe anyị nkwa sị, “Ọ bụrụ na ị ga-enyere anyị aka imeri eze Arad na ndị ya, anyị ga-ebibi obodo ha niile kpamkpam.”
3 Our Father heard Israel's voice and handed the Canaanites over; they destroyed them and their cities completely. So the place was named Hormah. Onyenwe anyị ṅara ntị nʼarịrịọ ha, nyere ha aka imeri ndị Kenan ahụ. Mgbe ahụ, ụmụ Izrel bibiri obodo ha niile, na ndị niile bi nʼime ya. Ya mere, aha a kpọrọ ebe ahụ niile bụ Homa.
4 They set out from Mount Hor toward the Red Sea to go around Edom's land, but the people grew impatient on the way. Mgbe ahụ, ụmụ Izrel sitere nʼugwu Hor bilie ije ha, si ụzọ gawara Osimiri Uhie, ka ha nwee ike gaa gburugburu ala ndị Edọm. Ma ndị Izrel enweghị ntachiobi oge niile ha nọ nʼije a.
5 The people spoke against our Father and against Moses: "Why did you bring us out of Egypt to die in the wilderness? No bread, no water, and we loathe this wretched food." Ha kwuru okwu megide Chineke na Mosis sị, “Gịnị mere i ji site nʼala Ijipt kpọpụta anyị ka anyị nwụsịa nʼọzara a? Lee na nri ọbụla adịghị nʼebe a, mmiri ọṅụṅụ adịghịkwa, ike iri mánà a na-enweghị isi agwụkwala anyị.”
6 Then our Father sent venomous serpents among the people; they bit the people, and many Israelites died. Ya mere, Onyenwe anyị zitere agwọ ọjọọ na-ata ata nʼetiti ha. Agwọ ndị a tagbukwara ọtụtụ nʼime ụmụ Izrel.
7 The people came to Moses and said, "We sinned by speaking against our Father and against you. Pray to him to remove the serpents from us." So Moses prayed for the people. Mgbe ahụ, ndị Izrel bịakwutere Mosis sị ya, “Anyị emehiela, nʼihi na anyị ekwuluola Onyenwe anyị, kwulukwaa gị onwe gị. Biko rịọrọ anyị Onyenwe anyị ka o wezugara anyị agwọ ọjọọ ndị a.” Mosis rịọrọ arịrịọ nʼihi ha.
8 Our Father told Moses, "Make a venomous snake, put it on a pole; anyone bitten who looks at it will live." Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Kpụọ otu agwọ yiri agwọ ndị a. Kwụba ya nʼọnụ ogologo osisi nke ị ga-amanye nʼala ebe mmadụ niile ga-ahụ ya anya. Onye ọbụla agwọ ọjọọ a tara ga-adị ndụ ma ọ bụrụ na ọ ga-ewelite anya ya elu lekwasị agwọ ahụ ị kwụbara nʼelu osisi ahụ.”
9 Moses made a bronze serpent and put it on a pole; whenever a serpent bit anyone, they looked at the bronze serpent and lived. Ya mere, Mosis ji bronz kpụta agwọ yiri otu nʼime agwọ ndị ahụ, tinye ya nʼọnụ osisi dị ogologo. Onye ọbụla kwa agwọ ahụ tara nke welitere anya ya elu lee agwọ bronz ahụ anya, dịkwara ndụ.
10 The Israelites set out and camped at Oboth. Ụmụ Izrel biliri njem, manye ụlọ ikwu ha na Obot.
11 They set out from Oboth and camped at Iye-abarim, in the wilderness facing Moab, eastward. Ha sikwa nʼObot bilie njem, maa ụlọ ikwu ha na Iye Abarim, nʼọzara ahụ nke chere ihu nʼobodo Moab, nʼụzọ ọwụwa anyanwụ.
12 From there they set out and camped in the Valley of Zered. Ha si nʼebe ahụ bilie njem, manye ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Zered.
13 From there they moved on and camped beyond the Arnon, in the wilderness that extends from Amorite territory; for the Arnon is Moab's border with the Amorites. Ha sitekwara nʼebe ahụ bilie njem, maa ụlọ ikwu ha nʼofe iyi Anọn nke dị nʼọzara ruru nʼoke ala ndị Amọrait. Iyi Anọn bụ oke ala Moab, nʼetiti ndị Moab na ndị Amọrait.
14 So the Book of the Wars of our Father says: "Waheb in Suphah, and the ravines of the Arnon, Nʼihi nke a, nʼAkwụkwọ Agha dị iche iche nke Onyenwe anyị na-asị, “Waheb nʼime Sufa ya na ndagwurugwu niile Anọn
15 and the slope of the ravines that bends toward the site of Ar and reaches to the border of Moab." na mgbadata ndagwurugwu ndị ahụ nke gbasapụrụ ruo nʼebe Ar dị, nke tọgbọrọ nʼoke ala Moab.”
16 From there they went to Beer, the well where our Father told Moses, "Gather the people—I'll give them water." Mgbe ahụ, ụmụ Izrel niile biliri njem bịarute Bịa bụ nʼolulu mmiri ahụ Onyenwe anyị nyere Mosis iwu sị, “Kpọkọtaa ndị Izrel niile, nʼihi na m na-aga inye ha mmiri.”
17 Then Israel sang this song: "Spring up, O well! Sing to it! Mgbe ahụ, ụmụ Izrel bụrụ abụ a. “Sọpụta gị olulu mmiri! Bụọnụ abụ banyere mmiri a!
18 The well that princes dug, that the nobles of the people dug out with their scepters and staffs." Then from the wilderness they went to Mattanah, Olulu mmiri ụmụ ndị eze gwuru nke ndị ndu anyị doziri. Mkpara eze ha na mkpara ha, ka ha ji gwuo ya.” Emesịa, ha hapụrụ ọzara ahụ, gaa nʼihu ruo nʼobodo Matana.
19 from Mattanah to Nahaliel, from Nahaliel to Bamoth, Ha si Matana jeruo Nahaliel, si Nahaliel jeruo Bamot.
20 and from Bamoth to the valley in Moab's plain, to Pisgah's peak overlooking the wasteland. Sitekwa Bamot rute na ndagwurugwu ahụ dị nʼọhịa Moab, ruo nʼugwu Pisga, nke chere ihu nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu.
21 Then Israel sent messengers to Sihon king of the Amorites, saying, Ndị Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Saịhọn, eze ndị Amọrait, sị ya,
22 "Let me pass through your land. We won't turn into field or vineyard, or drink well water. We'll go by the King's Highway until we've passed your border." “Biko, kwere ka anyị site nʼobodo gị gafee. Anyị agaghị atụgharị banye nʼime ala ubi gị maọbụ nʼubi vaịnị, maọbụ ṅụọ mmiri site nʼolulu mmiri ọbụla dị nʼala gị. Anyị ga-eje nʼokporoụzọ eze tutu ruo mgbe anyị ga-agabiga oke ala gị.”
23 But Sihon refused to let Israel cross his territory. He gathered all his people, marched into the wilderness against Israel, reached Jahaz, and fought Israel. Ma Saịhọn ekweghị na ụmụ Izrel ga-esi nʼoke ala ya gafee. Ọ chịkọtara ndị agha ya niile, zọpụ ije ibu agha megide ndị Izrel nʼime ọzara ahụ. Mgbe o rutere Jehaz, ọ lụsoro Izrel agha.
24 Israel struck him down with the sword, took his land from the Arnon to the Jabbok—up to the Ammonites, whose border was fortified. Ma Izrel jiri mma agha gbuo ya. Nwetara onwe ha ala ya, site nʼiyi Anọn ruo nʼiyi Jabọk, gamiekwa rute nʼoke ala ha na ndị Amọn, ha kwụsịrị nʼihi nʼoke ala ndị Amọn siri ike karịa.
25 Israel captured all these cities and settled in every Amorite city—Heshbon and all its surrounding villages. Ndị Izrel lụgburu obodo niile nke ndị Amọrait bichie nʼime ha, tinyere Heshbọn na obodo nta niile gbara ya gburugburu.
26 For Heshbon was the city of Sihon king of the Amorites, who fought the former king of Moab and captured all his land from him, up to the Arnon. Heshbọn bụ isi obodo Saịhọn, eze ndị Amọrait onye busoro eze naara achị Moab agha dọta ala ya niile nʼagha ruo Anọn.
27 So the poets say: "Come to Heshbon—let it be rebuilt, let Sihon's city be restored. Ọ bụ nke a mere ndị na-arọ abụ ji kwuo sị, “Bịa na Heshbọn ka e wukwaa ya, ka e mee ka isi obodo eze Saịhọn guzosie ike.
28 For fire went out from Heshbon, a flame from the city of Sihon. It consumed Ar of Moab, the lords of the heights of the Arnon. “Nʼihi na ọkụ esitela na Heshbọn pụọ. Ire ọkụ esitela nʼobodo ukwu Saịhọn, rechapụ obodo Ar, nke dị na Moab, ndị nwe ebe niile dị elu nke Anọn.
29 Woe to you, Moab! You are destroyed, people of Chemosh! He has made his sons fugitives and his daughters captives to Sihon king of the Amorites. Ahụhụ dịrị gị Moab! Ndị a lara nʼiyi ka unu bụ, unu ndị Kemosh. Ụmụ ya ndị ikom aghọọla ndị na-enweghị ebe obibi. A dọtala ụmụ ndị inyom nʼagha, nye Saịhọn eze ndị Amọrait.
30 But we struck them down; Heshbon perished as far as Dibon. We laid waste as far as Nophah, which reaches to Medeba." “Ma anyị ebibiela ha, bibie Heshbọn ruo rịị na Dibọn, bibie ha ruo Nofa, ruokwa rịị Medeba.”
31 So Israel settled in the land of the Amorites. Ya mere, ụmụ Izrel bichiri nʼala ndị Amọrait.
32 Moses sent men to scout Jazer; they captured its villages and drove out the Amorites there. Emesịa, Mosis zipụrụ ndị nnyopụta ka ha ga nyochaa Jeza. Ụmụ Izrel tigburu obodo niile dị gburugburu ya chụpụkwa ndị Amọrait bi nʼebe ahụ.
33 Then they turned and went up the Bashan road, and Og king of Bashan came out against them, with all his people, to fight at Edrei. Mgbe ahụ, ha chigharịrị gbagoo nʼụzọ gawara Bashan. Ma Ọg, eze Bashan, na ndị agha ya niile biliri chịrị agha pụọ izute ha na Edrei.
34 But our Father told Moses, "Don't fear him—I've given him, all his people, and his land into your hand. Do to him as you did to Sihon king of the Amorites, who lived in Heshbon." Ma Onyenwe anyị gwara Mosis okwu, sị, “Atụla ya egwu nʼihi na ewerela m ya na ndị agha ya niile, na ala ya, nyefee gị nʼaka. Mee ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọrait onyeisi obodo ya bụ Heshbọn.”
35 They struck him, his sons, and all his people, leaving no survivor, and took possession of his land. Ya mere, ha gburu ya, tinyere ụmụ ya na ndị agha ya niile, na-ahapụghị onye ọbụla ndụ nye ha. Ha nwetakwara ala ha, biri nʼime ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]