Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 20 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 In the first month the whole community of Israel entered the Wilderness of Zin; the people stayed at Kadesh. Miriam died there and was buried there. Ụmụ Izrel, bụ nzukọ ahụ niile rutere nʼọzara Zin nʼọnwa nke mbụ. Ha manyere ụlọ ha na Kadesh. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Miriam nwụrụ. E lie ya.
2 Now there was no water for the community, so they gathered together against Moses and Aaron. Ma mmiri ọṅụṅụ adịghị nye ndị nzukọ ahụ. Ya mere na ha gbakọtara imegide Mosis na Erọn.
3 The people argued with Moses: "If only we'd died when our brothers died in our Father's presence! Ha sesịrị Mosis okwu sị, “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ mgbe ụmụnna anyị nwụrụ nʼihu Onyenwe anyị.
4 Why bring our Father's assembly into this wilderness to die here, us and our livestock? Gịnị mere i ji kpọbata ọgbakọ nke Onyenwe anyị nʼime ọzara a, ime ka anyị na anụ ụlọ anyị niile nwụọ nʼebe a?
5 Why did you bring us up from Egypt to this evil place? No grain, figs, vines, or pomegranates—no water to drink." Gịnị mere i ji si nʼala Ijipt kpọpụta anyị, kpọbata anyị nʼebe ọjọọ a? O nweghị mkpụrụ ọghịgha maọbụ fiig, enweghị mkpụrụ vaịnị maọbụ mkpụrụ pomegranet. Ọ dịghị mmiri dị nke ha ga-aṅụ.”
6 Moses and Aaron went from before the assembly to the entrance of the tent of meeting, fell facedown, and the glory of our Father appeared to them. Mosis na Erọn si nʼebe ọgbakọ ahụ nọ tụgharịa gaa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, daa kpụọ ihu ha nʼala. E mee ka ha hụ ebube Onyenwe anyị anya.
7 Our Father said to Moses, Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
8 "Take the staff, gather the community—you and Aaron your brother—and speak to the rock before their eyes; it will give its water. Bring water from the rock for them, and give the community and their livestock drink." “Were mkpara ahụ, gị na nwanne gị Erọn kpọkọta nzukọ Izrel niile. Gwa nkume ahụ okwu nʼihu ha, ọ ga-asọpụta mmiri ya. Unu ga-eme ka mmiri si na nkume ahụ sọpụta nye ọgbakọ ahụ, ka ha na igwe anụ ụlọ ha, ṅụọ mmiri.”
9 So Moses took the staff from before our Father, as he had commanded him. Ya mere Mosis sitere nʼihu Onyenwe anyị weere mkpara ahụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere ya si dị.
10 Moses and Aaron gathered the assembly in front of the rock. He said, "Listen, you rebels—must we bring water for you out of this rock?" Emesịa, Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel niile nʼihu nkume ahụ. Mgbe ha bịaruru nso, Mosis gwara ha okwu sị ha, “Geenụ ntị unu ndị nnupu isi! Ọ bụ site na nkume a ka anyị ga-enye unu mmiri?”
11 Moses raised his hand and struck the rock twice with his staff; water gushed out abundantly, and the community and their livestock drank. Mgbe ahụ Mosis weliri aka ya elu jiri mkpara ahụ tie nkume ahụ ugboro abụọ. Mmiri sitere na ya sọpụta. Ọgbakọ Izrel niile na igwe anụ ụlọ ha ṅụkwara mmiri.
12 But our Father told Moses and Aaron, "Because you did not trust me enough to honor me as holy before the Israelites, you will not bring this assembly into the land I have given them." Ma Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ebe ọ bụ na unu jụrụ ikwenye nʼokwu m, jụkwa ido m nsọ nʼihu ndị Izrel niile, unu agaghị edubata ọgbakọ ndị a nʼala ahụ m na-aga inye ha.”
13 These are the waters of Meribah, where the children of Israel quarreled with our Father, and he showed himself holy among them. A kpọrọ ebe ahụ mmiri Meriba, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Izrel wesoro Onyenwe anyị iwe. O gosikwara ha ịdị nsọ ya.
14 Moses sent messengers from Kadesh to Edom's king: "Your brother Israel says: You know all the hardship that has found us. Mosis sitere nʼọzara Kadesh, zipụ ndị ozi ka ha gakwuru eze Edọm, sị ya, “Otu a ka nwanne gị bụ Izrel na-ekwu: Ị nụla akụkọ ihe nhụju anya niile dakwasịrị anyị.
15 Our ancestors went down to Egypt; we lived in Egypt many years, and the Egyptians mistreated us and our ancestors. Nna anyị gara biri nʼala Ijipt. Anyị biri nʼebe ahụ ọtụtụ afọ. Ndị Ijipt mekpara anyị na nna nna anyị ha ahụ.
16 So we cried out to our Father; he heard our voice, sent a messenger, and brought us out of Egypt. Now we're at Kadesh, a town on your border's edge. Ma mgbe anyị tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ nụrụ akwa anyị, zitere anyị mmụọ ozi ya, onye dupụtara anyị site nʼala Ijipt. “Ugbu a, anyị nọ na Kadesh obodo dị nso nʼoke ala gị.
17 Please let us pass through your land. We won't cross field or vineyard, or drink well water. We'll stay on the King's Highway, not turning right or left, until we've passed through your territory." Biko kwere ka anyị si nʼala gị gafee. Anyị ga-akpachara anya hụ na anyị esiteghị nʼubi ihe ọkụkụ gị maọbụ nʼubi vaịnị gị gafee. Anyị agaghị aṅụ mmiri ọbụla site nʼolulu mmiri gị. Anyị ga-anọgide naanị nʼokporoụzọ eze. Anyị agaghị ahapụ ya, chee ihu akụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, tutu ruo mgbe anyị gafechara oke ala gị.”
18 Edom said to him, "You will not pass through me, or I'll come out against you with the sword." Ma eze Edọm zara sị, “Unu amanyela ụkwụ; ọ bụrụ na unu anwaa anwa bata nʼala m, aga m eji ndị agha m zute unu.”
19 Israel's people told him, "We'll take the highway. If we or our herds drink your water, we'll pay for it. Just let us cross on foot, nothing more." Ma ndị Izrel zara ozi o ziri sị ya, “Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-esi gafee. Ọ bụrụ na anyị maọbụ anụ ụlọ anyị a ṅụọ mmiri dị nʼala gị, anyị ga-akwụ ọnụahịa ya. Naanị mkpa anyị bụ ịgafe. Ọ dịghị ihe ọzọ anyị chọrọ.”
20 But he said, "You will not pass through." Edom came against him with great numbers and a strong hand. Ma eze Edọm aṅaghị ntị, ọ gwaghere ha ọnụ sị, “Unu agaghị esite nʼala gabiga.” Edọm chịkọtara ọtụtụ ndị agha dị ike duru ha pụọ ịga izute ha.
21 So Edom refused to let Israel pass through his territory, and Israel turned away from him. Ebe ọ bụ na ndị Edọm ekweghị ka ndị Izrel si nʼoke ala ha gafee, ndị Izrel tụgharịrị azụ hapụ isi ụzọ ahụ.
22 The whole community of the children of Israel set out from Kadesh and came to Mount Hor. Ọgbakọ Izrel niile sitere na Kadesh bulie ije gagide rute nʼugwu Hor.
23 At Mount Hor, on Edom's border, our Father said to Moses and Aaron, Nʼugwu Hor, nʼoke ala Edọm, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,
24 "Aaron will be gathered to his people; he will not enter the land I gave the Israelites, because you both rebelled against my command at the waters of Meribah. “Oge eruola mgbe Erọn ga-anwụ. Ọ gaghị abanye nʼala ahụ m nyere ụmụ Izrel, nʼihi na unu abụọ nupuru isi nʼiwu m na mmiri Meriba.
25 Take Aaron and Eleazar his son, and bring them up Mount Hor. Ugbu a, kpọrọ Erọn na nwa ya nwoke Elieza, duru ha gaa nʼugwu Hor.
26 Strip Aaron of his garments, dress Eleazar his son in them; Aaron will be gathered to his people and die there." Nʼebe ahụ ka ị ga-eyipụ Erọn uwe onye nchụaja o yi, yikwasị ha Elieza nwa ya nwoke. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Erọn ga-anọ nwụọ.”
27 Moses did as our Father commanded, and they went up Mount Hor as the whole community watched. Ya mere Mosis mere dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu. Ha atọ rigoro nʼugwu Hor mgbe nzukọ Izrel niile nọ na-ele ha anya.
28 Moses stripped Aaron's garments and dressed his son Eleazar in them. Aaron died there atop the mountain; Moses and Eleazar went down. Mgbe ha ruru nʼelu ugwu ahụ, Mosis yipụrụ Erọn uwe onye nchụaja ya yikwasị ha nwa ya nwoke Elieza. Erọn nọkwa nʼebe ahụ, nʼelu ugwu ahụ nwụọ. Emesịa, Mosis na Elieza tụgharịrị site nʼugwu ahụ lọghachi.
29 The whole community saw Aaron had died, and Israel's whole house mourned him thirty days. Mgbe ọgbakọ Izrel nụrụ ihe banyere ọnwụ Erọn ha ruru ụjụ nʼihi ya iri ụbọchị atọ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]