Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 19 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father spoke to Moses and Aaron, saying: Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,
2 "This is the statute of the law our Father commanded: Tell the Israelites to bring you a red heifer, flawless, with no defect, never yoked. “Ndị a bụ ụkpụrụ dị nʼiwu ahụ Onyenwe anyị nyere. Gwa ụmụ Izrel ka ha wetara gị nwa nne ehi na-acha uhie uhie nke na-enweghị ntụpọ, na nke ụdọ yoku na-agabeghị nʼolu ya.
3 Give it to Eleazar the priest; it is to be led outside the camp and slaughtered before him. Nye ya Elieza onye nchụaja, ka ọ kpụrụ ya pụọ nʼazụ ogige, ebe otu onye ga-egbu ya mgbe ọ nọ na-ele ya anya.
4 Eleazar the priest is to dip his finger in its blood and sprinkle it seven times toward the front of the tent of meeting. Elieza bụ onye nchụaja ga-arụrụ ụfọdụ nʼime ọbara ya na mkpịsịaka ya, fesa ya na ncherita ihu ụlọ nzute ahụ ugboro asaa.
5 The heifer is to be burned as he watches—hide, flesh, blood, and waste together. Mgbe ahụ, onye ọzọ ga-akpọ nwa nne ehi ahụ ọkụ mgbe Elieza nọkwa na-ele ya anya. Ọ ga-akpọ akpụkpọ ya, anụ ya, ọbara na mgbịrị afọ ya ọkụ.
6 The priest must take cedar wood, hyssop, and scarlet yarn, and throw them into the fire burning the heifer. Onye nchụaja ga-ewere osisi sida, na osisi hisọp, na ogho uhie, tụba ha nʼetiti ebe ahụ a kpọrọ nwa nne ehi ahụ ọkụ.
7 The priest must wash his clothes, bathe his body in water, then enter the camp—but remains unclean until evening. Emesịa, onye nchụaja ahụ ga-asacha uwe niile o yi; sakwaa ahụ ya. Ọ ga-alọghachikwa azụ nʼime ogige ahụ ebe ọ ga-anọ dịka onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi.
8 He who burns it must wash his clothes in water, bathe his body in water, and remain unclean until evening. Onye ahụ kpọrọ nwa ehi ahụ ọkụ aghaghị ịsa uwe ya niile, sakwaa ahụ ya. Ọ ga-anọkwa ọnọdụ onye na-adịghị ọcha ruo anyasị.
9 "A clean man will gather the heifer's ashes and put them in a clean place outside the camp. Israel's community will keep them for water of cleansing—it removes sin. “Mgbe ahụ, onye nke dị ọcha, ga-ekpokọta ntụ ozu nwa nne ehi ahụ, wụnye ya nʼebe dị ọcha nʼazụ ogige ahụ. Ebe ahụ ka nzukọ Izrel ga-edebe ya maka ikporo wụnye na mmiri e ji asachapụ adịghị ọcha. Ọ bụ maka nsacha pụọ na mmehie.
10 The one gathering the heifer's ashes must wash his clothes and remain unclean until evening. This is a permanent law for Israelites and the foreigner living among them. Ma onye ahụ ga-ekpokọta ntụ nsure ọkụ nwa nne ehi ahụ aghaghị ịsa uwe ya niile, sakwaa ahụ ya, nọkwaa dịka onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi. Iwu a ga-adịgidere ndị Izrel na ndị ọbịa binyere ha site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
11 "Whoever touches the dead body of any person is to be unclean for seven days. “Onye ọbụla metụrụ ozu mmadụ aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa.
12 He must purify himself with it on days three and seven; then he'll be clean. If he doesn't purify himself on days three and seven, he won't be clean. Ha aghaghị iji mmiri e ji asachapụ adịghị ọcha saa ahụ ha nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa. Mgbe ahụ, ha ga-adị ọcha. Ma ọ bụrụ na ha asaghị ahụ ha nʼụbọchị nke atọ nakwa nʼụbọchị nke asaa, ha ga-anọgide bụrụ ndị na-adịghị ọcha ọ bụladị mgbe ụbọchị asaa ahụ gafesịrị.
13 Anyone who touches a corpse—the body of someone who died—and doesn't purify himself makes the tabernacle of our Father unclean; that person is cut off from Israel. Since the water of purification wasn't sprinkled on him, he stays unclean; his uncleanness remains on him. Onye ọbụla metụrụ ozu mmadụ aka ma ọ saghị ahụ ya dịka usoro a si dị, o merụọla ebe nsọ Onyenwe anyị. A ga-ewezuga onye dị otu a site nʼetiti ndị Izrel. Ebe ọ bụ na a wụsaghị ya mmiri nsacha ahụ; ọ ga-anọgide bụrụ onye na-adịghị ọcha.
14 "This is the law: when someone dies in a tent, everyone entering it and everyone in it is unclean seven days. “Mgbe mmadụ nwụrụ nʼụlọ ikwu, ndị a ga-abụ iwu unu ga-eso. Ndị nọ nʼime ụlọ ikwu ahụ mgbe ọ nwụrụ na onye ọbụla banyere nʼụlọ ikwu ahụ, ga-abụ ndị na-adịghị ọcha ụbọchị asaa.
15 And every open vessel that has no lid fastened on it is to be unclean. Ihe ọbụla nke ghere oghe, nke na-enweghị ihe mkpuchi eriri e ji kechie elu ya, ga-abụ ihe na-adịghị ọcha.
16 "Whoever touches, in an open field, one killed by the sword, one who has died naturally, a human bone, or a grave, becomes unclean seven days. “Onye gara nʼọhịa metụ onye e gburu nʼagha aka, maọbụ onye nwụrụ nʼụzọ ọzọ dị iche, ma ọ bụkwanụ metụ ọkpụkpụ, maọbụ ili onye nwụrụ anwụ aka, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa.
17 "For the unclean person, they are to take ashes from the burned purification offering, put them in a vessel, and add fresh running water. “Ma banyere onye ahụ na-adịghị ọcha, kporo ntụ site nʼime aja mmehie ahụ a kpọrọ ọkụ, tinye ya nʼime ite, wụkwasị ya mmiri e si nʼiyi na-eru eru kute.
18 A clean person is to take hyssop, dip it in the water, and sprinkle it on the tent, on all the vessels, on everyone who was there, and on whoever touched a bone, a slain person, a corpse, or a grave. Mgbe ahụ, nwoke nke nọ nʼọnọdụ ịdị ọcha ga-ewere ụfọdụ hisọp, denye ya na mmiri ahụ fesaa ya nʼime ụlọ ikwu ahụ, na ngwongwo niile e ji dozie ụlọ ahụ, na ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ. Ọ ga-efesakwa ya nʼahụ onye ọbụla metụrụ ọkpụkpụ, maọbụ onye e gburu egbu, maọbụ onye nwụrụ anwụ ma ọ bụkwanụ ili aka.
19 The clean person is to sprinkle the unclean one on the third and seventh day, purifying him on the seventh day. He must wash his clothes, bathe in water, and be clean by evening. Nwoke ahụ dị ọcha ga-efesakwa ndị ahụ rụrụ arụ nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa. Nʼụbọchị nke asaa ka ọ ga-eme ka ha dị ọcha. Ndị ahụ a na-edo ọcha ga-asa uwe ha mmiri, saa ahụ ha, nʼuhuruchi ụbọchị ahụ ka ha ga-adị ọcha.
20 Anyone unclean who doesn't purify himself must be cut off from the assembly, for he has made our Father's sanctuary unclean; the water of purification wasn't sprinkled on him—he is unclean. Ma ọ bụrụ na ndị ahụ merụrụ onwe ha e doghị onwe ha ọcha, aghaghị iwepụ ha site nʼetiti ọgbakọ Izrel. Nʼihi na ha merụrụ ebe nsọ Onyenwe anyị. E fesakwaghị ha mmiri nke ịdị ọcha nʼahụ, nke mere na ha adịghị ọcha.
21 This is a lasting statute for them: whoever sprinkles the water of purification must wash his clothes; whoever touches the water of purification is unclean until evening. Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide mgbe ebighị ebi. “Nwoke ahụ na-efesa mmiri ahụ e ji edo mmadụ ọcha, aghaghị ịsacha uwe ya niile. Onye ọbụla metụrụ mmiri nke ịdị ọcha ahụ aka, ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi.
22 Whatever the unclean person touches becomes unclean; whoever touches that is unclean until evening." Ihe ọbụla kwa onye na-adịghị ọcha metụrụ aka, ga-aghọ ihe na-adịghị ọcha, onye ọbụla metụkwara ya aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]