Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 18 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father said to Aaron, "You, your sons, and your father's house will bear the guilt of the sanctuary; you and your sons will bear the guilt of your priesthood. Onyenwe anyị gwara Erọn sị, “Gị, na ụmụ gị ndị ikom gị, na ezinaụlọ nna gị ga-ebu ahụhụ ajọ omume metụtara ebe nsọ ahụ. Gị na ụmụ gị ndị ikom naanị ka ọ dị nʼaka ịsa ajụjụ ihe ọjọọ ọbụla banyere ọrụ nchụaja.
2 Bring your brothers too—the tribe of Levi, your father's tribe—to join and serve you, you and your sons, before the tent of the testimony. Site nʼebo unu kpọbata ụmụnna gị ndị Livayị ka ha sonyere gị ma nyere gị aka mgbe gị na ụmụ gị ndị ikom na-eje ozi nʼụlọ nzute Ihe Ama.
3 They must keep your duties and all the tent's duties, but not approach the sanctuary's sacred objects or the altar, or both they and you will die. Ha ga-anọ gị nʼokpuru ije ozi niile nʼụlọ nzute, ma ha agaghị abịaru nso ngwongwo e ji chọọ ebe nsọ ahụ mma, maọbụ nʼebe ịchụ aja. Ma ọ bụghị otu a, gị na ha ga-anwụ.
4 They will join you and keep the charge of the tent of meeting, all its service—no outsider may come near you. Ha ka ọ dịrị, isonye gị nʼilekọta ụlọ ikwu ahụ, ya bụ, ihe niile metụtara ụlọ ikwu anya. O nweghị onye ọzọ nke ga-abịa nso ebe ị nọ.
5 Guard the sanctuary and altar, so wrath never again falls on Israel's people. “Gị ka ọ dịrị ilekọta ihe niile metụtara ebe nsọ ahụ, na ebe ịchụ aja ahụ, ka oke iwe Onyenwe anyị ghara ịdakwasị onye ọbụla nʼala Izrel ọzọ.
6 I have taken your fellow Levites from Israel's sons—a gift to you, given to me, to serve at the tent of meeting. Mụ onwe m ahọpụtala ụmụnna gị ndị Livayị site nʼetiti ndị Izrel, were ha nye gị dịka onyinye, ka ha bụrụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị maka ịrụ ọrụ ụlọ nzute.
7 You and your sons must guard your priesthood in all matters of the altar and behind the inner curtain; serve there. I give your priesthood as a gift; any outsider who approaches must be put to death." Ma ọ bụ naanị gị, na ụmụ gị ndị ikom, ga-aga ozi dịka ndị nchụaja, ozi metụtara ebe ịchụ aja, na ihe niile dị nʼazụ akwa mgbochi ahụ. Ana m enye gị ọrụ nchụaja dịka onyinye. Onye ọbụla ọzọ bịara nso ebe nsọ ahụ ga-anwụ.”
8 Our Father said to Aaron, "I have given you charge of my contributions, all the holy gifts of Israel's people. I have given them to you as a portion, and to your sons as a permanent share. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Erọn okwu sị ya, “Mụ onwe m emeela gị onye nlekọta onyinye niile a na-eche nʼihu m, onyinye niile dị nsọ nke ụmụ Izrel wetara m ka m na-enye gị na ụmụ gị ndị ikom dịka oke ruuru unu site nʼụkpụrụ ebighị ebi.
9 This is yours from the most holy things kept from the fire: all their offerings—every grain offering, every sin offering, and every guilt offering they bring me—are most holy, for you and your sons. Unu ga-enwere akụkụ aja ahụ kachasị nsọ nke a na-edopụ iche site nʼọkụ. Site nʼonyinye niile nke a na-ewetara m, bụ onyinye mkpụrụ ọka maọbụ aja mmehie maọbụ aja ikpe ọmụma, ndị ahụ a na-edopụ iche dịka ihe kachasị nsọ, ha ga-abụ oke gị na ụmụ gị ndị ikom.
10 Eat it in the most holy place; every male may eat it—it is holy to you. A ga-eri ha dịka ihe dịkarịrị nsọ. Nwa nwoke ọbụla ga-eri ya. Unu ga-agụ ha dịka ihe dị nsọ.
11 This too is yours: the contribution from their gifts, all Israel's wave offerings. I've given them to you, your sons, your daughters with you—a permanent law. Anyone clean in your house may eat it. “Nke a bụkwa nke gị: Ihe ọbụla nke ewezugara site nʼonyinye nke aja mfufe niile nke ndị Izrel wetara. Mụ onwe m na-ewere nke a nye gị na ụmụ gị ndị ikom, na ụmụ gị ndị inyom dịka oke unu nʼụkpụrụ ebighị ebi. Onye ọbụla nke dooro onwe ya ọcha nʼezinaụlọ nwere ike iri ya.
12 The best of the oil, new wine, and grain—the firstfruits they give me—I give you. “Ana m enye gị mmanụ oliv nke kachasị mma, na mmanya ọhụrụ nke kachasị mma na ọka, bụ mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi ha na-ewetara Onyenwe anyị.
13 The first produce of their land, brought to me, is yours. Anyone clean in your house may eat it. Mkpụrụ mbụ nke ihe niile dị nʼala nke ha na-ewebatara Onyenwe anyị, ga-abụ nke gị. Onye ọbụla nke dị ọcha nʼezinaụlọ unu nwere ike iso rie ya.
14 Every devoted thing in Israel is to be yours. “Ihe niile e doro nsọ nʼala Izrel niile nye Onyenwe anyị bụ nke gị.
15 Every firstborn of human or animal offered to me is yours—but redeem the firstborn of humans, and redeem the firstborn of unclean animals. Ihe niile e bụ ụzọ mụọ, ma mmadụ ma anụ ụlọ, nke e nyere Onyenwe anyị dịka onyinye, bụ nke gị. Ma unu aghaghị ịgbara ụmụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ, na ụmụ oke anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ ndị na-adịghị ọcha.
16 Redeem them at one month old for about two ounces of silver, by the sanctuary standard. Mgbe ha dị otu ọnwa, a ga-eji shekel ọlaọcha ise, nʼusoro shekel ebe nsọ, nke bụ iri ihe ọtụtụ gera abụọ gbapụta ha.
17 But the firstborn cow, sheep, or goat you must not buy back—they are holy. Splash their blood on the altar, burn their fat as a food offering, a pleasing aroma to me. “Ma a gaghị agbara nwa ehi mbụ, maọbụ nwa atụrụ mbụ maọbụ nwa ewu mbụ. Ha dị nsọ. Fesa ọbara ha nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, ma kpọọ abụba ha ọkụ dịka onyinye e nyere site nʼọkụ, nke na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị.
18 But their flesh is yours, as the wave-offering breast and right thigh are yours. Ozu anụ ndị a niile e gburu ga-abụ nke gị, dịka obi anụ na apata ụkwụ aka nri anụ nke aja mfufe a na-eche nʼihu Onyenwe anyị nʼebe ịchụ aja si bụrụ nke gị.
19 All the holy offerings Israel brings me I give you, your sons and daughters with you, as a lasting share. It is a salt covenant forever before me, for you and your offspring with you." Ihe ọbụla e dopụrụ iche site nʼonyinye nsọ niile ụmụ Izrel chere nʼihu Onyenwe anyị ka m na-enye gị na ụmụ gị ndị ikom, na ụmụ gị ndị inyom dịka oke ruuru unu nʼụkpụrụ ebighị ebi. Ọ bụ ọgbụgba ndụ nnu ebighị ebi nʼihu Onyenwe anyị nye gị na ụmụ ụmụ gị.”
20 Our Father said to Aaron, "You will have no inheritance in their land, no portion among them. I am your portion and inheritance among Israel's sons." Onyenwe anyị gwara Erọn okwu sị ya, “Unu agaghị enwe ihe nketa nke ala, a gaghị ekenyekwa unu ala ọbụla nʼala Izrel niile. Nʼihi na mụ onwe m bụ oke na ihe nketa unu nwere nʼetiti ụmụ Izrel.
21 "I have given the Levites all the tenth in Israel as inheritance in exchange for the service they perform, the service of the tent of meeting. “Enyela m ndị Livayị, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri ahụ ụmụ Izrel niile na-akwụbatara m. Nke a bụ ihe nketa ha nʼihi ọrụ ha na-arụ nʼụlọ nzute.
22 The Israelites must no longer approach the tent of meeting, or they will bear guilt and die. Site ugbu a gaa nʼihu, o nweghị onye Izrel ọbụla kwesiri ịbịa nso ụlọ nzute ahụ, ka ha ghara iwetara onwe ha ikpe ọmụma, mmehie na ọnwụ.
23 But the Levites will serve at the tent of meeting and bear their own guilt. This is a permanent law for your generations: they get no inheritance among Israel's people. Ọ bụ naanị ụmụ Livayị ga-arụ ọrụ nʼụlọ nzute ahụ. Ha ka ọ dịrị ibu ahụhụ ajọ omume ọbụla banyere ejezighị ozi nke ụlọ nzute. Ụkpụrụ a ga-adị ebighị ebi ruo ọgbọ niile dị nʼihu. Ndị Livayị agaghị enwe ihe nketa nke aka ha nʼetiti ụmụ Izrel.
24 For the tenth Israel's people present to me as a contribution, I have given the Levites as their inheritance. So I have told them: they will have no inheritance among Israel's people." Kama, enyela m ndị Livayị onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ahụ niile ndị Izrel na-ewetara Onyenwe anyị ka ọ bụrụ ihe nketa ha. Ọ bụ nke a mere m ji kwuo sị, ‘Ha agaghị enweta ihe nketa nʼetiti ụmụ Izrel.’ ”
25 Our Father spoke to Moses, saying, Onyenwe anyị gwakwara Mosis okwu sị,
26 "Speak to the Levites and tell them: When you take the tenth I have given you from Israel's people as your inheritance, bring a contribution from it to me—a tenth of the tenth. “Gwa ndị Livayị okwu sị, ‘Mgbe unu si nʼaka ụmụ Izrel nata onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ahụ m nyere unu dịka ihe nketa, unu aghaghị isite nʼonyinye ahụ nye otu ụzọ nʼime ụzọ iri dịka onyinye nye Onyenwe anyị.
27 Your contribution will count for you as grain from the threshing floor, as full produce from the winepress. A ga-agụ onyinye unu wetara dịka ọ bụ onyinye ọka unu si nʼebe ịzọcha ọka weta, maọbụ dịka mmanya unu si nʼebe ịzọcha mmanya weta.
28 You too must present a contribution to me from all your tenth taken from Israel's people, giving from it my contribution to Aaron the priest. Nʼụzọ dị otu a, unu onwe unu ga-eche onyinye unu nʼihu Onyenwe anyị site nʼonyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri unu si nʼaka ụmụ Izrel nata. Site nʼonyinye ndị a unu natara, unu ga-enye Erọn onye nchụaja onyinye ahụ ruuru Onyenwe anyị.
29 From all your gifts, present every offering to me—from each, the best and holiest part. Onyinye unu ga-enye dịka nke ruuru Onyenwe anyị ga-abụ akụkụ onyinye ndị ahụ kachasị mma, na ndị kachasị ịdị nsọ.’
30 "So tell them: when you offer its best part, it counts for the Levites as produce of the threshing floor and winepress. “Gwa ndị Livayị okwu sị ha, ‘Mgbe unu wetara akụkụ onyinye ndị ahụ kachasị mma, a ga-agụnyere unu ya dịka a ga-asị na ọ bụ onyinye unu si nʼebe ịzọcha ọka, na nʼebe ịzọcha mmanya vaịnị unu weta.
31 Eat it anywhere, you and your households—it is your wage for your service in the tent of meeting. Unu na ezinaụlọ unu nwere ike iri ndị fọdụrụ nʼụlọ unu, maọbụ nʼebe ọbụla masịrị unu, nʼihi na ha bụ ụgwọ ọrụ unu nʼihi ozi niile unu jere nʼụlọ nzute.
32 You incur no guilt from it once you have offered its best part. But you must not desecrate the holy things of Israel's sons, or you will die." Ikpe ọmụma agaghị adịrị unu mgbe unu na-eri ya ma ọ bụrụ na unu chere onyinye ndị ahụ kachasị mma nʼihu Onyenwe anyị. Ma kpachapụnụ anya hụ na unu e merụghị onyinye ndị a dị nsọ ụmụ Izrel webatara. Ọ bụrụ na unu emee nke a, unu ga-anwụ.’ ”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]