Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mark 8 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 In those days, again a large crowd gathered with nothing to eat. Jesus called his disciples and said, Nʼoge ahụ, igwe mmadụ ọzọ zukọrọ. Ebe ha na-enweghị ihe ha ga-eri, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha,
2 "I feel compassion for the crowd—they've been with me three days now and have nothing to eat. “Enwere m ọmịiko nʼebe igwe mmadụ ndị a nọ. Nke a na-eme ya ụbọchị atọ anyị na ha nọ. Ugbu a, ha enweghị ihe ha ga-eri.
3 If I send them home hungry, they'll collapse on the way—some have come from far off." Ọ bụrụ na m ezilaga ha nʼụlọ ha, ụfọdụ nʼime ha ga-ada nʼụzọ nʼihi agụụ. Nʼihi na ụfọdụ ha si nʼebe dị anya bịa.”
4 And his disciples answered him, "How can anyone feed these people with bread here in the wilderness?" Ndị na-eso ụzọ ya zara ya, “Ebee ka mmadụ ga-achọta achịcha ga-ezuru ndị a nʼime ọzara a?”
5 And he asked them, "How many loaves do you have?" They said, "Seven." Jisọs jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha zara sị, “Asaa.”
6 He told the crowd to sit on the ground, took the seven loaves, gave thanks, broke them, and gave them to his disciples to serve to the people; and they served the crowd. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. O weere ogbe achịcha asaa ahụ kpee ekpere. Ọ nyawasịrị ha, nye ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee igwe mmadụ ahụ niile. Ha kekwara ya nye igwe mmadụ ahụ.
7 They also had a few small fish; after blessing them, he told the disciples to serve these to the people. Ha nwekwara azụ ole na ole. O weere ya kpee ekpere, ọ gwara ha ka ha kesaakwa ya.
8 And they ate and were satisfied. And they took up seven baskets of the leftover pieces. Ha riri, rijuo afọ. Ha tụtụkọtara iberibe achịcha dafuru nʼebe ndị a nọ rie nri. Ha tụtụjuru nkata asaa.
9 About 4,000 people were there. And he sent them away. Ndị riri nri a ruru ihe dịka puku mmadụ anọ. Mgbe ahụ o zilagara ha.
10 Then immediately he got into the boat with his disciples and went to the district of Dalmanutha. Ngwangwa, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼụgbọ mmiri gaa nʼakụkụ obodo Dalmanuta.
11 The Pharisees came and began debating with him, testing him by demanding a sign from heaven. Ndị Farisii bịakwutere ya malite nrụrịta ụka, na-achọ ihe ịrịbama si nʼeluigwe, iji nwalee ya.
12 Sighing deeply in his spirit, he said, "Why does this generation demand a sign? Truly I tell you, no sign will be given to this generation." Ọ sụrụ ude nke ukwuu nʼime onwe ya sị, “Gịnị mere ọgbọ a ji achọ ihe ịrịbama? Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, o nweghị ihe ịrịbama a ga-egosi ọgbọ a.”
13 And he left them, got back into the boat, and went to the other side. Ọ hapụrụ ha nʼebe ahụ banyekwa nʼụgbọ mmiri ọzọ, ịgafe nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ.
14 They'd forgotten to bring bread—only one loaf was with them in the boat. Ndị na-eso ụzọ ya chefuru iwere achịcha. Ọ bụ naanị otu ogbe achịcha fọdụụrụ ha nʼime ụgbọ.
15 And he warned them, "Watch out—beware of the yeast of the Pharisees and the yeast of Herod." Ọ dọrọ ha aka na ntị sị, “Kpacharanụ anya. Lepụnụ anya maka ihe na-eko achịcha ndị Farisii na nke Herọd.”
16 And they began discussing with one another that they had no bread. Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ bụ nʼihi na anyị enweghị achịcha.”
17 Knowing this, Jesus asked, "Why discuss having no bread? Do you still not see or grasp? Are your hearts hardened? Mgbe Jisọs ghọtara isi mkparịta ụka ha, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji na-ekwu okwu maka enweghị achịcha? Ọ pụtara na unu adịghị ahụ maọbụ aghọta? Obi unu o siri ike?
18 Having eyes, do you not see? Having ears, do you not hear? And do you not remember? Unu nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ? Unu nwere ntị ma unu adịghị anụ ihe? Ọ ga-abụ na unu adịghị echeta?
19 When I broke the five loaves for the 5,000, how many baskets full of fragments did you collect?" They said, "Twelve." Mgbe m ji ogbe achịcha ise zụọ puku mmadụ ise, iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?” Ha zara sị ya, “Nkata iri na abụọ.”
20 "And when I broke the seven for the 4,000, how many basketfuls of broken pieces did you gather?" They said, "Seven." “Mgbe m ji ogbe achịcha asaa zụọ puku mmadụ anọ, iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?” Ha zara sị ya, “Nkata asaa.”
21 And he said to them, "Do you still not understand?" Ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-enweghị nghọta?”
22 They came to Bethsaida, where people brought him a blind man and begged Jesus to touch the man. Mgbe ha ruru Betsaida, ụfọdụ mmadụ kpọtaara ya otu onye ìsì rịọọ ya ka o metụ ya aka,
23 He took the blind man's hand, led him out of the village, spit on his eyes, laid hands on him, and asked, "Do you see anything?" Ọ duuru onye ìsì ahụ nʼaka pụọ nʼazụ obodo. Mgbe ahụ, ọ gbụsara ọnụ mmiri nʼanya ya metụkwa ya aka nʼanya. Ọ jụrụ ya sị, “Ị na-ahụ ihe ọbụla?”
24 He looked up and said, "I see people, but they look like trees, walking." Nwoke ahụ leliri anya elu ma sị, “Ana m ahụ ndị mmadụ ma ha dị ka osisi na-agagharị agagharị.”
25 Then Jesus put his hands on the man's eyes again; he looked intently, was restored, and saw everything distinctly. Nke ugboro abụọ Jisọs metụkwara ya aka nʼanya, mgbe ahụ anya ya meghere. O bidoro ịhụ ihe niile nke ọma.
26 And he sent him home, saying, "Do not even go into the village." Ọ zilagara ya ụlọ ya sị ya, “Abanyekwala nʼime obodo.”
27 Jesus and his disciples went to the villages of Caesarea Philippi. On the way he asked them, "Who do people say I am?" Mgbe ahụ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gara nʼobodo nta ndị ọzọ dị gburugburu Sizaria Filipai. Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na m bụ?”
28 They told him, "John the Baptist; and others say Elijah; and others, one of the prophets." Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ndị ọzọkwa sị na ị bụ Ịlaịja maọbụ otu nʼime ndị amụma.”
29 Then he asked them, "But who do you say I am?" Peter answered, "You are the Christ." Ma ọ jụrụ ha sị, “Ma unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?” Pita zara sị, “Ị bụ Kraịst ahụ.”
30 And he strictly warned them not to speak about him. Ọ dọrọ ha aka na ntị sị ha agwakwala onye ọbụla ihe banyere ya.
31 He began teaching them the Son of Man must suffer much, be rejected by the elders, chief priests, and scribes, be killed, and rise after three days. Emesịa, o bidoro izi ha ihe na Nwa nke Mmadụ aghaghị ịhụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche, ndị okenye, na ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu ga-ajụ ya, na aghaghị igbu ya, ma ọ ga-ebili nʼọnwụ mgbe ụbọchị nke atọ gasịrị.
32 He said this plainly. And Peter took him aside and began to rebuke him. Ọ gwaghere ha ihe ndị a ọnụ. Ma Pita kpọọrọ ya pụọ nʼotu akụkụ, bido ịbara ya mba.
33 But turning, he looked at his disciples and rebuked Peter: "Get behind me, Satan! For you are not setting your mind on the things of our Father, but on the things of man." Ma ọ tụgharịrị lee ndị na-eso ụzọ ya anya, baara Pita mba sị ya, “Si nʼebe m nọ pụọ ekwensu! Ihe ị na-eche echiche ya abụghị uche Chineke, ha bụ echiche mmadụ.”
34 He called the crowd and his disciples and said to them, "Whoever wants to come after me must deny himself, take up his cross, and follow me. Mgbe ahụ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya na igwe mmadụ ahụ. Ọ gwara ha sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ iso m, ya gụọ ndụ ya dị ka ihe furu efu. Mgbe ahụ, ya buru obe ya soro m nʼazụ.
35 Whoever wants to save his life will lose it; whoever loses his life for my sake and the good news will save it. Nʼihi na onye na-azọ ndụ ya ka ọ ga-efunarị, ma onye ọbụla gụrụ ndụ ya dị ka ihe furu efu nʼihi m, na nʼihi oziọma m, ga-azọpụta ya.
36 What good does it do a person to gain the whole world and forfeit his soul? Uru gịnị ka ọ ga-abara mmadụ, iritecha ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ha?
37 For what can a person give in exchange for his soul? Ọ dị ihe ọzọ dị nʼụwa mmadụ nwere ike iji gbanwere ndụ ya?
38 For whoever is ashamed of me and my words in this adulterous, sinful generation—the Son of Man will be ashamed of them too when he comes in his Father's glory with the holy angels." Ọ bụrụ na ihere na-eme onye ọbụla nʼihi m na nʼihi okwu m nʼụwa ọjọọ a, na nʼụwa mmehie a, ihere onye ahụ ga-emekwa Nwa nke Mmadụ, mgbe ọ ga-abịaghachi nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]