Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mark 9 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 He said to them, "Truly I tell you: some standing here will not taste death before they see the kingdom of our Father come with power." Ma ọ gwara ha sị, “Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe a, agaghị edetụ ọnwụ ire tupu ha ahụ alaeze Chineke mgbe ọ ga-abịa nʼike.”
2 Six days later Jesus took Peter, James, and John, and led them up a high mountain alone, and he was transfigured before them. Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita na Jemis na Jọn, duru ha rigoro nʼelu ugwu dị elu. Nʼebe ahụ ka ha nọdụrụ naanị ha. Nʼebe ahụ, a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha.
3 His clothes became radiant, dazzling white—whiter than anyone on earth could bleach them. Uwe ya na-enwu ọcha karịa ụdị ọcha ọbụla anya hụrụla. Ọ dịkwa ọcha karịa nke onye ọbụla nʼụwa nwere ike ime ka ihe dị ọcha.
4 And Elijah appeared to them along with Moses, and they were talking with Jesus. Ha hụrụ Ịlaịja na Mosis ka ha pụtara soro Jisọs na-ekwu okwu.
5 Peter said to Jesus, "Rabbi, it's good that we're here. Let's make three shelters—one for you, one for Moses, and one for Elijah." Pita gwara Jisọs sị, “Onye ozizi, ọ dị mma ka anyị nọdụ nʼebe a. Ka anyị wuo ụlọ ikwu atọ. Otu ga-abụ nke gị, otu a bụrụ nke Mosis, nke ọzọkwa a bụrụ nke Ịlaịja.”
6 He did not know what to say, for they were terrified. (Ọ makwaghị ihe ọ ga-ekwu nʼihi na oke egwu tụrụ ha.)
7 A cloud appeared and overshadowed them, and a voice came from the cloud: "This is my beloved Son. Listen to him!" Mgbe ahụ, igwe ojii pụtara kpuchie ha. Olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya. Geenụ ya ntị.”
8 Suddenly, when they looked around, they no longer saw anyone with them except Jesus. Na mberede, mgbe ha lere anya gburugburu, ọ dịkwaghị onye ọzọ ha hụrụ, karịa naanị Jisọs.
9 Coming down the mountain, he ordered them to tell no one what they'd seen until the Son of Man rose from the dead. Mgbe ha si nʼelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs nyere ha iwu ka ha ghara ịgwa onye ọbụla ihe ha hụrụ, tutu ruo mgbe Nwa nke Mmadụ ga-esi nʼọnwụ bilie.
10 So they kept the matter to themselves, questioning what rising from the dead could mean. Ha zobere ihe a nʼetiti onwe ha, na-ekwurịtara okwu na-atule ihe isi nʼọnwụ bilie pụtara.
11 And they asked him, "Why do the scribes say that Elijah must come first?" Ma ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu jiri sị na Ịlaịja aghaghị ibu ụzọ bịa?”
12 He said, "Elijah does come first and restores everything. Then why is it written the Son of Man must suffer much and be treated with contempt? Ọ gwara ha sị, “Ọ bụ ezie, Ịlaịja ga-ebu ụzọ bịa, na-emekwa ka ihe dị ka ọ dị na mbụ. Ma gịnị mere e jiri dee na Nwa nke Mmadụ ga-ahụ ọtụtụ ahụhụ, bụrụkwa onye a jụrụ ajụ?
13 But I tell you, Elijah has come, and they did to him whatever they pleased, as it is written about him." Ka m gwa unu, Ịlaịja abịalarị. Ma ha mesokwara ya mmeso otu ha chọrọ dị ka e dere banyere ya.”
14 Coming to the other disciples, they saw a large crowd around the disciples, and scribes arguing with them. Mgbe ha bịarutere nʼebe ndị na-eso ụzọ ya nọ, ha hụrụ oke igwe mmadụ ka ha gbara ha gburugburu, hụkwa ụfọdụ ndị ozizi iwu ka ha na ha na-arụrịta ụka.
15 As soon as the whole crowd saw Jesus, they were astonished and ran to greet him. Ngwangwa, mmadụ ahụ niile hụrụ ya, ụdịdị ya juru ha anya. Ha gbaara ọsọ gaa kelee ya.
16 He asked them, "What are you arguing about with the scribes?" Ọ jụrụ ha sị, “Unu na ha ọ na-arụrịta ụka banyere gịnị?”
17 Someone in the crowd answered him, "Teacher, I brought my son to you; he has a spirit that won't let him speak. Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ zara ya sị, “Onye ozizi akpọtaara m gị nwa m nwoke, nke mmụọ ọjọọ bi nʼime ya, nke mekwara ka ọ daa ogbi.
18 Whenever it seizes him, it throws him down. He foams at the mouth, grinds his teeth, and stiffens. I asked your disciples to drive it out, but they couldn't." Mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ ahụ malitere isogbu ya, ọ na-atụda ya nʼala. Mgbe ahụ, ọ na-agbọ ụfụfụ nʼọnụ ya, na-ata ikikere eze, anụ ahụ ya na-esikwa ike. Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ mmụọ ọjọọ a, ma ha enweghị ike.”
19 He replied, "You unbelieving generation, how long must I stay with you? How long must I endure you? Bring him to me." Ọ zaghachiri ha sị, “Unu ọgbọ na-enweghị okwukwe. Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anagide unu? Kpọtaranụ m ya!”
20 They brought the boy to him. Seeing Jesus, the spirit instantly convulsed him; he fell to the ground, thrashing and foaming at the mouth. Ya mere, ha kpọtaara ya nwata ahụ. Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hụrụ ya, ngwangwa, o nugharịrị nwata ahụ nke ukwuu, ọ daa nʼala na-atụrụ onwe ya nʼala, na-agbọkwa ụfụfụ nʼọnụ ya.
21 Jesus asked the boy's father, "How long has this been happening to him?" "From childhood," he said. Jisọs jụrụ nna nwata ahụ sị, “Olee mgbe ihe a bidoro?” Ọ zara sị, “Site na mgbe ọ bụ nwata nta.
22 "It has often thrown him into fire and water to destroy him. But if you can do anything, pity us and help us." Ọ na-eme ya ka ọ daba nʼọkụ, maọbụ na mmiri, ka ọ laa ya nʼiyi. Ọ bụrụ na ọ dị ihe i nwere ike ime, biko meere anyị ebere, nyere anyị aka.”
23 Jesus said to him, "'If you can'? Everything is possible for the one who believes." Jisọs sịrị ya, “ ‘Ọ bụrụ na i nwere ike’? Ihe niile pụrụ ime nʼebe onye kwere ekwe nọ.”
24 Immediately the boy's father cried, "I believe; help my unbelief!" Ngwangwa, nna nwata ahụ tiri mkpu sị, “Ekweere m, biko nyere ekweghị ekwe m aka!”
25 Seeing a crowd running together, Jesus rebuked the unclean spirit: "Mute and deaf spirit, I command you—come out of him and never enter him again!" Mgbe Jisọs hụrụ na igwe mmadụ na-agba ọsọ na-abịa nʼebe ahụ, ọ baara mmụọ ahụ na-adịghị ọcha mba sị, “Gị mmụọ ọjọọ ntị ike na ịda ogbi, ana m enye gị iwu, site nʼime nwata a pụta! Abanyekwala nʼime ya ọzọ!”
26 Crying out and convulsing him hard, it came out. He looked like a corpse, so many said, "He's dead." O tiri mkpu nʼoke olu, nugharịa nwata ahụ nke ukwuu ma site nʼime ya pụta. Nwata ahụ tọgbọrọ nʼala dị ka onye nwụrụ anwụ nke mere na ndị niile nọ nʼebe ahụ sịrị, “Ọ nwụọla!”
27 But Jesus took him by the hand and raised him up, and he stood. Ma Jisọs jidere ya nʼaka selite ya elu, mee ka o guzo nʼụkwụ ya. O guzokwara.
28 When Jesus had gone indoors, his disciples asked him privately, "Why couldn't we drive it out?" Ma mgbe ọ banyere nʼime ụlọ ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya na nzuzo sị, “Gịnị mere o jiri siere anyị ike ịchụpụ ya?”
29 He told them, "This kind can come out only by prayer." Ọ sịrị ha, “Ọ bụ naanị site nʼike ekpere ka a pụrụ ịchụpụ ụdị a.”
30 They left there and passed through Galilee. Jesus did not want anyone to know where they were, Ha siri nʼebe ahụ pụọ gafee Galili. Ọ chọghị ka onye ọbụla mata maka ya,
31 because he was teaching his disciples, telling them, "The Son of Man is being handed into human hands. They will kill him, and three days later he will rise." nʼihi na ọ na-ezi ndị na-eso ụzọ ya ihe. Ọ sịrị ha, “A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ụmụ mmadụ, ha ga-egbukwa ya ma ọ ga-ebili nʼọnwụ mgbe mkpụrụ ụbọchị atọ gasịrị.”
32 But they did not understand what he meant, and they were afraid to ask him. Ma ha aghọtaghị ihe ọ na-agwa ha. Egwu tụkwara ha ị jụ banyere ya.
33 They came to Capernaum. In the house he asked them, "What were you arguing about on the way?" Emesịa, ha bịaruru Kapanọm. Mgbe ọ banyere nʼụlọ, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu na-arụrịta ụka banyere ya nʼokporoụzọ?”
34 But they were silent, since they had argued along the way about who was greatest. Ma ha gbara nkịtị, nʼihi na ha rụrịtara ụka nʼokporoụzọ banyere onye dị ukwuu karịa ibe ya.
35 He sat down, called the Twelve, and told them, "Anyone who wants to be first must be last of all and servant of all." Ọ nọdụrụ ala kpọọ mmadụ iri na abụọ ahụ, sị ha, “Ọ bụrụ na onye ọbụla chọrọ ịbụ onye mbụ, ọ ghaghị ịbụ onye ikpeazụ, bụrụkwa onye na-ejere mmadụ niile ozi.”
36 He took a little child, stood him among them, took the child in his arms, and said to them: Mgbe ahụ o kuuru otu nwantakịrị mee ka o guzoro nʼetiti ha. O kuuru nwata ahụ nʼaka ya sị ha,
37 "Whoever accepts one of these little children in my name accepts me; whoever accepts me accepts not me but the one who sent me." “Onye ọbụla nabatara otu nʼime ụmụntakịrị ndị a nʼaha m, na-anabata m. Ma onye ọbụla nabatara m, ọ bụghị m ka ọ nabatara, kama ọ na-anabata onye zitere m.”
38 John said to him, "Teacher, we saw someone driving out demons in your name and tried to stop him, since he doesn't follow us." Jọn sịrị ya, “Onye ozizi, anyị hụrụ otu onye na-achụpụ mmụọ ọjọọ nʼaha gị, ma anyị gbalịrị igbochi ya nʼihi na ọ bụghị otu onye nʼime anyị.”
39 But Jesus said, "Don't stop him—no one who does a miracle in my name can soon speak evil of me. Ma Jisọs gwara ha sị, “Unu egbochila ya, nʼihi na onye ọbụla ji aha m na-arụ ọrụ ebube agaghị ekwu okwu ọjọọ megide m.
40 For whoever is not against us is for us. Nʼihi na onye ọbụla na-adịghị emegide anyị dịnyeere anyị.
41 Truly I tell you, whoever gives you a cup of water to drink because you belong to Christ will never lose his reward. Nʼeziokwu asị m unu, onye ọbụla ga-ekunye unu otu iko mmiri nʼaha m, nʼihi na unu bụ ndị nke Kraịst, ga-anatakwa ụgwọ ọrụ ya.
42 Whoever trips up one of these little ones who believe in me—better for him to have a large millstone hung around his neck and be thrown into the sea. “Ọ bụrụkwa na onye ọbụla emee ka otu nʼime ndị a dị nta kweere na m jehie, ọ ga-akara onye ahụ mma ma ọ bụrụ na e kenyere nkume igwe nri buru ibu nʼolu ya, tụnye ya nʼime oke osimiri.
43 If your hand trips you up, cut it off. Better to enter life maimed than with two hands to go into hell, into the unquenchable fire. Ọ bụrụ na aka gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya. Ọ ga-akara gị mma inwe ọrụsị baa na ndụ karịa inwe aka abụọ banye nʼọkụ ala mmụọ, ebe ọkụ ya na-adịghị anyụ anyụ;
44 Not in this edition ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’
45 If your foot trips you up, cut it off. Better to enter life lame than be thrown into hell with two feet. Ọ bụrụ na ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya, tufukwaa ya, nʼihi na ọ ga-akara gị mma ịba na ndụ na ngwụrọ karịa inwe ụkwụ abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ;
46 Not in this edition ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’
47 If your eye trips you up, throw it out. Better to enter the kingdom of our Father with one eye than be thrown into hell with two, Ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa nʼalaeze Chineke, karịa inwe anya abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ,
48 where 'their worm never dies and the fire never goes out.' ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’
49 For everyone will be salted with fire. A ga-eji ọkụ nụchaa onye ọbụla dị ka nnu.
50 Salt is good, but if it loses its saltiness, how can you season it again? Keep salt among yourselves, and be at peace with each other." “Nnu dị mma, ma ọ bụrụ na ọ dịghị atọkwa ụtọ, olee ka ị ga-esi mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ? Ya mere, nweenụ nnu nʼime onwe unu. Unu na ibe unu biri nʼudo.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]