Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mark 10 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 He left there for the region of Judea and beyond the Jordan; crowds gathered to him again, and as usual he taught them once more. Ọ hapụrụ ebe ahụ gaa nʼobodo ndị dị na mpaghara Judịa ma gafeekwa nʼofe Jọdan. Igwe mmadụ bịakwutekwara ya, ọzọ, dị ka o si emekwa, o ziri ha ihe.
2 Some Pharisees came to test him, asking, "Is it lawful for a man to divorce his wife?" Ụfọdụ ndị Farisii bịara, ma nʼihi ị nwalee ya, ha jụrụ ya sị, “O ziri ezi nʼiwu ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghị m?”
3 He answered them, "What did Moses command you?" Ma ọ zara ha sị, “Gịnị ka Mosis nyere unu nʼiwu?”
4 They said, "Moses permitted a man to write a certificate of divorce and send her away." Ha sịrị, “Mosis kwenyere ka nwoke dee asambodo alụkwaghị m, nye nwunye ya ma zilaga ya.”
5 Jesus told them, "He wrote you this command because your hearts were hard. Jisọs sịrị ha, “Ọ bụ nʼihi na obi unu siri ike nke ukwuu ka o ji deere unu iwu a.
6 But from the beginning of creation, our Father made them male and female. Ma na mmalite nke okike ụwa, Chineke ‘kere ha nwoke na nwanyị.’
7 'For this reason a man will leave his father and mother and be joined to his wife, ‘Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya.
8 and the two will become one flesh.' So they are no longer two, but one flesh. Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.’ Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ.
9 Therefore what our Father has joined together, let no one separate." Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.”
10 Back in the house, the disciples asked him about this again. Mgbe ha banyere nʼụlọ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ọzọ ihe banyere okwu a.
11 He said to them, "Whoever divorces his wife and marries another commits adultery against her, Ọ sịrị ha, “Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m ma lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko megide ya.
12 and if she divorces her husband and marries another, she commits adultery." Ma ọ bụrụ na nwanyị ọbụla agbaa dị ya alụkwaghị m ma lụrụ nwoke ọzọ, ọ na-emekwa mmehie ịkwa iko.”
13 People were bringing children to him so that he might touch them, but the disciples rebuked them. Ndị mmadụ na-ekutere ya ụmụntakịrị ka o metụ ha aka, ma ndị na-eso ụzọ ya baara ha mba.
14 When Jesus saw this, he grew angry and said, "Let the children come to me; don't stop them, for the kingdom of our Father belongs to such as these. Ma mgbe Jisọs hụrụ nke a, iwe were ya nke ukwuu, ọ sịrị ha, “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m. Unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị otu a.
15 Truly I tell you, whoever doesn't receive our Father's kingdom like a child will never enter it." Nʼeziokwu asị m unu, onye ọbụla nke na-agaghị anabata alaeze Chineke dị ka nwantakịrị agaghị aba nʼime ya.”
16 And he took them in his arms and blessed them, laying his hands on them. Mgbe ahụ, o kuuru ha nʼaka ya, bikwasị ha aka ya abụọ ma gọzie ha.
17 As he started down the road, a man ran up, knelt before him, and asked, "Good Teacher, what must I do to inherit eternal life?" Mgbe ọ na-ebili njem, otu nwoke gbaara ọsọ bịa gbuo ikpere nʼihu ya. Ọ jụrụ ya sị, “Ezi onye ozizi ọma, gịnị ka m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?”
18 Jesus asked, "Why call me good? No one is good except our Father alone. Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji akpọ m ezi mmadụ? Ọ dịghị onye ọbụla bụ ezi mmadụ ma ọ bụghị naanị Chineke.
19 You know the commandments: 'don't murder, commit adultery, steal, or give false testimony; don't defraud; honor your father and mother.'" Ị maara ihe niile enyere nʼiwu: ‘Egbula mmadụ, a kwala iko, e zula ohi, a gbala ama ụgha, a ghọgbula mmadụ ibe gị, sọpụrụ nne na nna gị.’”
20 He said to him, "Teacher, all these I have kept since my youth." Ọ sịrị ya, “E, onye ozizi, Edebezuchaala m ha niile siterị na mgbe m bụ nwata.”
21 Jesus looked at him and loved him. "One thing you lack: go, sell everything you own, give to the poor—you'll have treasure in heaven—then come follow me." Jisọs lere ya anya, hụ ya nʼanya. Mgbe ahụ, ọ gwara ya sị, “Ọ fọdụrụ naanị otu ihe ị ga-eme. Laa, ugbu a, ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. I mesịa nke a, ị ga-enwe akụ nʼeluigwe. Mgbe ahụ bịaghachi soro m.”
22 At this word his face fell, and he went away grieving, for he had many possessions. Mgbe ọ nụrụ okwu a, ihu ya gbarụrụ. O sitere nʼebe ahụ pụọ na mwute, nʼihi na ọ bụ ọgaranya nke nwere ọtụtụ akụnụba.
23 Jesus looked around and told his disciples, "How hard it will be for the wealthy to enter the kingdom of our Father!" Jisọs legharịrị anya gwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Lee ka o si bụrụ ihe rara ahụ na onye ọgaranya ga-abanye nʼalaeze Chineke.”
24 The disciples were amazed at his words. Jesus said to them again, "Children, how hard it is to enter the kingdom of our Father! Okwu ya tụrụ ndị na-eso ụzọ ya nʼanya, ma Jisọs gwakwara ha ọzọ sị, “Ụmụntakịrị, ọ bụ nnọọ ihe rara ahụ ịbanye nʼalaeze Chineke.
25 A camel goes through a needle's eye easier than a rich person enters our Father's kingdom." Ọ dịrị ịnyịnya kamel mfe isite nʼanya agịga gafee, karịa onye ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.”
26 They were even more astonished and said to one another, "Then who can be saved?" Okwu a jubigara ha anya oke. Ha jụrịtara ibe ha sị, “Onye kwanụ ka a ga-azọpụta?”
27 Jesus looked at them and said, "With man, impossible; but not with our Father, for all things are possible with our Father." Ma Jisọs lere ha anya sị ha, “Nʼebe mmadụ nọ, ọ bụ ihe rara ahụ. Ma nʼebe Chineke nọ, ihe niile dị mfe. Ọ dịghị ihe rara Chineke ahụ ime.”
28 Peter began to say to him, "Look, we have left everything and followed you." Pita malitere ịgwa ya sị, “Anyị ahapụla ihe niile soro gị!”
29 Jesus said, "Truly I tell you, no one has left house or brothers or sisters or mother or father or children or fields for my sake and for the gospel, Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ dịghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ ụmụnne ya ndị nwoke, maọbụ ụmụnne ya ndị nwanyị, maọbụ nne ya, maọbụ nna ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, maọbụ ala ubi ya nʼihi m, na nʼihi oziọma a,
30 "who won't receive a hundredfold now, in this time—houses, brothers, sisters, mothers, children, fields, with persecutions—and in the age to come, eternal life. nke na-agaghị anataghachikwa nʼụwa a, ụlọ, ụmụnne ndị nwoke, ụmụnne ndị nwanyị, nne, ụmụaka na ala ubi, tinyere mkpagbu, ihe ruru okpukpu narị karịa ihe niile nke ọ hapụrụ. Ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi nʼụwa ọzọ.
31 But many who are first will be last, and the last first." Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ, ma ọtụtụ ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị bu ụzọ.”
32 On the road up to Jerusalem, Jesus walked ahead of them. They were amazed, and those following were afraid. Taking the twelve aside again, he began telling them what was about to happen to him: Ha nọ nʼụzọ na-aga Jerusalem, ma Jisọs nọ nʼihu ha, nke a juru ndị na-eso ụzọ ya nʼanya. Otu a kwa, ndị mmadụ niile na-abịa ha nʼazụ tụkwara egwu. Ọzọkwa, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ nʼakụkụ, malite ịgwa ha ihe gaje ịdakwasị ya.
33 "Look, we're going up to Jerusalem. The Son of Man will be handed over to the chief priests and scribes, who will condemn him to death and hand him over to the Gentiles. Ọ sịrị, “Leenụ, anyị na-aga Jerusalem, ebe a ga-arara Nwa nke Mmadụ nyefee nʼaka ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu. Ha ga-ama ya ikpe ọnwụ, nyefekwa ya nʼaka ndị mba ọzọ.
34 They will mock him, spit on him, flog him, and kill him; after three days he will rise." Ha ga-akwa ya emo, gbụsakwa ya ọnụ mmiri asụ, pịa ya ihe ma gbukwaa ya. Ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ ga-esite nʼọnwụ bilie.”
35 James and John, Zebedee's sons, came to him and said, "Teacher, we want you to do for us whatever we ask." Jemis na Jọn ụmụ Zebedi bịakwutere ya. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị chọrọ ka i meere anyị ihe ọbụla anyị rịọrọ.”
36 He said to them, "What do you want me to do for you?" Ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?”
37 They said to him, "Let us sit in your glory, one at your right, one at your left." Ha sịrị ya, “Kwere ka otu onye nʼime anyị nọrọ nʼaka nri gị, onye nke ọzọ nʼaka ekpe gị nʼime ebube gị.”
38 Jesus said to them, "You don't know what you're asking. Can you drink the cup I drink, or be baptized with the baptism I'm baptized with?" Ma Jisọs sịrị ha, “Unu amataghị ihe unu na-arịọ. Unu pụrụ ịṅụ iko ahụ mụ onwe m ga-aṅụ maọbụ bụrụ ndị a ga-eme ụdị baptizim a ga-eme m?”
39 "We can," they said. Jesus said to them, "The cup I drink, you will drink; the baptism I'm baptized with, you will be baptized with, Ha zaghachiri ya, “Anyị pụrụ.” Jisọs sịrị ha, “Unu ga-aṅụ iko m ga-aṅụ, a ga-emekwa unu baptizim nke a ga-eme m.
40 but sitting at my right or left isn't mine to give - that's for those it's prepared for." Ma ịnọdụ nʼaka nri m maọbụ nʼaka ekpe m abụghị ihe dịrị m inye, kama ọnọdụ ndị a dịịrị ndị a kwadooro ha.”
41 Hearing this, the ten grew indignant at James and John. Mgbe mmadụ iri ndị ọzọ nụrụ nke a, iwe jupụtara ha obi nʼihi Jemis na Jọn.
42 Jesus called them together and said, "You know that those regarded as rulers of the Gentiles dominate them, and their great ones wield power over them. Ma Jisọs kpọkọtara ha niile sị ha, “Dị ka unu onwe unu maara, ndị eze nke ndị mba ọzọ, na ndị a maara aha ha, na-eji aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha.
43 But it isn't so among you. Instead, whoever wants to be great among you must be your servant, Ma nʼetiti unu ọ gaghị adị otu a. Kama onye ọbụla chọrọ ịdị ukwuu nʼetiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.
44 and whoever wants to be first among you must be slave of all. Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ onye mbụ nʼetiti unu, ga-abụ ohu mmadụ niile.
45 For even the Son of Man came not to be served, but to serve, and to give his life as a ransom for many." Nʼihi na Nwa nke Mmadụ abịaghị ka e jeere ya ozi. Kama ka o jee ozi ma nyekwa ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nke ọtụtụ mmadụ.”
46 They came to Jericho. As Jesus and his disciples were leaving with a large crowd, blind Bartimaeus son of Timaeus sat begging by the road. Mgbe ha ruru Jeriko, dị ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na ọtụtụ igwe mmadụ sitere nʼobodo Jeriko na-apụ, otu nwoke kpuru ìsì aha ya bụ Batimiọs (aha ya pụtara “nwa nwoke Timiọs”), onye arịrịọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ.
47 Hearing it was Jesus of Nazareth, he began to cry out, "Jesus, Son of David, have mercy on me!" Mgbe ọ nụrụ na ọ bụ Jisọs onye Nazaret na-agafe, o bidoro iti mkpu na-asị, “Jisọs, nwa Devid, meere m ebere!”
48 Many scolded him to be silent, but he shouted even louder, "Son of David, have mercy on me!" Ọtụtụ mmadụ bara ya mba ka o mechie ọnụ. Ma ọ nọgidesịrị ike na-eti mkpu na-asị, “Nwa Devid, meere m ebere!”
49 Jesus stopped and said, "Call him." So they called the blind man: "Courage! Get up—he's calling you." Jisọs kwụsịrị kwuo sị, “Kpọọnụ ya.” Ya mere ha kpọrọ onye ìsì ahụ, sị ya, “Mesaa ihu gị bilie nʼụkwụ gị, ọ na-akpọ gị.”
50 Throwing off his cloak, he jumped up and came to Jesus. Ọ tufuru uwe mwụda ya, wulie nʼụkwụ ya, bịakwute Jisọs.
51 Jesus told him, "What do you want me to do for you?" The blind man told him, "Rabboni, let me see again." Jisọs sịrị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Onye ìsì ahụ sịrị ya, “Onye ozizi m, achọrọ m ka m hụ ụzọ.”
52 Jesus told him, "Go; your faith has healed you." At once he regained his sight and followed Jesus on the road. Jisọs sịrị ya, “Laa, okwukwe gị azọpụtala gị.” Nʼotu oge ahụ, o bidoro ịhụ ụzọ, sorokwa ya gawa nʼụzọ ahụ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]