Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mark 11 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Nearing Jerusalem, at Bethphage and Bethany by the Mount of Olives, Jesus sent two of his disciples ahead, Mgbe ha na-abịaru Jerusalem nso, ha rutere Betfeji na Betani nʼUgwu Oliv. Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya.
2 telling them, "Go into the village ahead of you, and as soon as you enter it, you'll find a tied colt no one has ever ridden. Untie it and bring it here." Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nʼime obodo nta dị nʼihu unu. Mgbe unu na-abanye nʼime ya, unu ga-ahụ nwa ịnyịnya e kedoro nʼebe ahụ nke onye ọbụla na-arịkwasịbeghị nʼelu ya. Tọpụnụ ya nʼagbụ, kpụtaranụ m ya.
3 If anyone asks you, 'Why are you doing this?' say, 'The Lord needs it and will send it back here at once.' Ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Gịnị mere unu ji na-atọpụ ya nʼagbụ?’ sịnụ onye ahụ, ‘Ọ dị Onyenwe anyị mkpa, ọ ga-akpụghachitekwa ya ngwangwa.’ ”
4 They went and found a colt tied at a doorway outside in the street, and untied it. Ha ruru ma hụ otu nwa ịnyịnya e kedoro nʼakụkụ ụzọ, nʼihu otu ụlọ nke dị nʼama. Dị ka ha na-atọpụ ya,
5 Some of those standing there asked them, "What are you doing, untying that colt?" ụfọdụ mmadụ guzo nʼebe ahụ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-eme, unu na-atọpụ nwa ịnyịnya a?”
6 They answered as Jesus had told them, and the people let them go. Ha gwara ha ihe Jisọs kwuru, ha hapụkwara ha ka ha tọrọ ịnyịnya ibu ahụ.
7 They brought the colt to Jesus and threw their cloaks over it, and he sat on it. Ha kpụtaara Jisọs nwa ịnyịnya ahụ, ma wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ya, ọ nọkwasịrị nʼelu ya.
8 Many spread their cloaks on the road; others spread leafy branches cut from the fields. Ọtụtụ mmadụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ, ma ndị ọzọ tụsara alaka osisi ha gbutere nʼọhịa.
9 Those who went ahead and those who followed were shouting, "Hosanna! Blessed is he who comes in the name of our Father! Ndị na-aga nʼihu na ndị na-esokwa nʼazụ, tiri mkpu na-asị, “Hozanna!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!”
10 Blessed is the coming kingdom of our father David! Hosanna in the highest!" “Ngọzị dịrị alaeze ahụ na-abịa nke nna anyị Devid!” “Hozanna nʼebe kachasị ihe niile elu!”
11 Jesus entered Jerusalem and the temple, looked around at everything, and—since it was already late—went out to Bethany with the Twelve. Mgbe ọ batara na Jerusalem, ọ gara nʼime nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe o legharịchara anya nʼihe niile dị nʼebe ahụ, ma ebe ọ bụ na chi ejiela, ya na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ gaa Betani.
12 The next day, as they were leaving Bethany, Jesus was hungry. Nʼechi ya, mgbe ha si Betani na-apụta, agụụ gụrụ ya.
13 Seeing a leafy fig tree in the distance, he went to see if it had anything on it. Reaching it, he found nothing but leaves, since it wasn't fig season. Site nʼebe dị anya, ọ hụrụ otu osisi fiig nke nwere akwụkwọ ndụ. Mgbe ọ bịaruru osisi ahụ nso, ọ gagharịrị nʼukwu ya niile ma ọ ga-achọta mkpụrụ nʼelu ya, ma ọ hụghị mkpụrụ ọbụla, naanị akwụkwọ ndụ, nʼihi na oge a abụghị oge osisi a ji amị mkpụrụ.
14 Then he told it, "May no one ever eat fruit from you again." His disciples heard him say it. Mgbe ahụ, ọ gwara osisi ahụ sị, “Ka mmadụ ọbụla ghara iri mkpụrụ sitere na gị ruo ebighị ebi.” Ndị na-eso ụzọ ya nụrụ mgbe o kwuru okwu a.
15 They arrived in Jerusalem, and Jesus entered the temple and began driving out the sellers and buyers there. He overturned the money-changers' tables and the seats of those selling doves, Mgbe ha ruru Jerusalem, ọ banyere nʼime ụlọnsọ ukwu, bido ịchụpụ ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ahịa nʼebe ahụ. O kpugharịrị tebul ndị na-agbanwe ego, kwatuokwa oche niile nʼọdụ ahịa ndị na-ere nduru.
16 and he would not allow anyone to carry merchandise through the temple courts. O gbochikwara onye ọbụla iwebata ngwongwo ahịa orire nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ.
17 And he taught them, saying, "Isn't it written: 'My house will be called a house of prayer for all the nations'? But you've made it a den of robbers." Ma dị ka ọ na-ezi ha ihe, ọ sịrị, “Ọ bụ na-edeghị ya sị, Ụlọ m ka a ga-akpọ ụlọ ekpere nye mba niile? Ma unu emeela ya ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike.”
18 The chief priests and scribes heard this and sought a way to destroy him, for they feared him, since the whole crowd was amazed at his teaching. Mgbe ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nụrụ nke a, ha malitere na-achọ ụzọ igbu ya ma ha tụrụ egwu ya nʼihi na ozizi ya juru igwe mmadụ niile ahụ anya.
19 And when evening came, they went out of the city. Mgbe uhuruchi bịara, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya siri nʼobodo ahụ pụọ.
20 In the morning, as they passed by, they saw the fig tree withered from its roots. Nʼisi ụtụtụ echi ya, mgbe ha na-agafe, ha hụrụ na osisi fiig a esitela na mgbọrọgwụ ya kpọnwụọ.
21 Peter remembered and said to him, "Rabbi, look! The fig tree you cursed has withered." Pita chetara ihe merenụ ma sị ya, “Onye ozizi, lee! Osisi fiig ahụ ị bụrụ ọnụ akpọnwụọla!”
22 Jesus answered them, "Have faith in our Father. Jisọs zara ha sị, “Nweenụ okwukwe nʼime Chineke.
23 Truly I tell you, whoever tells this mountain, 'Be lifted up and thrown into the sea,' without doubting in his heart but believing what he says will happen—it will be done for him. Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na onye ọbụla asị ugwu a, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa dabanye nʼoke osimiri,’ nke na-enweghị obi abụọ nʼime ya, kama o kweere na ihe o kwuru ga-emezu, ihe ahụ ọ kwuru ga-emezukwa.
24 So I tell you: whatever you pray and ask for, believe you've received it - it will be yours. Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọbụla unu rịọrọ nʼekpere, kwerenụ na unu anatala ya, ọ ga-abụkwa nke unu.
25 When you stand praying, forgive whatever you hold against anyone, so your Father in heaven may also forgive you your sins." Ma mgbe ọbụla unu guzoro na-ekpe ekpere, gbagharanụ, ma ọ bụrụ na unu nwere ihe ọbụla megide onye ọbụla, ka Nna unu nke bi nʼeluigwe gbagharakwa unu mmehie unu.
26 Not in this edition Ma ọ bụrụ na unu agbagharaghị, Nna unu nke bi nʼeluigwe agaghị agbagharakwa unu mmehie unu.”
27 They returned to Jerusalem. While Jesus walked in the temple, the chief priests, scribes, and elders came to him, Mgbe ha rutere Jerusalem ọzọ, ọ nọ na-ejegharị nʼime ogige ụlọnsọ ukwu ahụ, ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu bịakwutere ya.
28 and asked, "By what authority are you doing this? Or who gave you this authority to do it?" Ha sịrị ya, “Olee ikike i ji eme ihe ndị a ị na-eme? Onye nyere gị ikike ime ha?”
29 Jesus said to them, "I'll ask you one question. Answer me, and I'll tell you by what authority I do these things. Jisọs sịrị ha, “Aga m ajụ unu otu ajụjụ, unu zaa m ya, aga m agwakwa unu onye nyere m ikike m ji eme ihe ndị a.
30 John's baptism—was it from heaven, or of human origin? Answer me." Baptizim nke Jọn, o sitere nʼeluigwe ka ọ bụ nʼaka mmadụ? Gwanụ m.”
31 They discussed it among themselves: "If we say, 'From heaven,' he'll ask, 'Then why didn't you believe him?' Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha ma sị, “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘O sitere nʼeluigwe,’ ọ ga-asị anyị, ‘Gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’
32 But if we say, 'From humans'"—they feared the crowd, since all considered John a true prophet. Ma ọ bụrụ na anyị asị, ‘O sitere nʼaka mmadụ.’ ” (Ha na-atụ egwu ndị mmadụ, nʼihi na ha niile kwenyere na Jọn bụ onye amụma nʼezie.)
33 They answered Jesus, "We don't know." Jesus said, "Neither will I tell you by what authority I do these things." Ya mere ha zara Jisọs sị, “Anyị amaghị.” Jisọs zaghachikwara ha sị, “Agakwaghị m agwa unu ụdị ikike m ji na-eme ihe ndị a.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]