Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mark 12 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 He began speaking to them in parables: "A man planted a vineyard, fenced it in, dug a winepress pit, built a watchtower, rented it to farmers, and left. Mgbe ahụ, ọ bidoro ịgwa ndị ahụ okwu nʼilu sị, “Otu nwoke kụrụ mkpụrụ vaịnị nʼubi ya, jiri mgbidi gbaa ubi ahụ gburugburu. O gwuru ebe ịnara mmanya si na mkpụrụ vaịnị, wuokwa ụlọ elu. Mgbe o mesịrị, o nyefere ubi vaịnị ahụ nʼaka ndị ọrụ ubi ilekọta ya ma gaa obodo ọzọ.
2 At harvest time he sent a servant to the tenants to collect some of the vineyard's fruit. Mgbe oge ịghọ mkpụrụ ruru, o zipụrụ otu onye ohu ya ka o jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata ha ụfọdụ nʼime mkpụrụ vaịnị ahụ.
3 But they seized him, beat him, and sent him away empty-handed. Ma ha jidere ya tie ya ihe, zilaga ya nʼaka efu.
4 Again he sent them another servant; they hit him on the head and dishonored him. Emesịkwa, o zigakwara onye ohu ọzọ. Ma ha tiwara ya isi, mee ya ihe ihere.
5 And he sent another, and they killed him—then many more, beating some and killing others." O zigakwara onye ọzọ, ma ha gburu ya. O zigakwara ọtụtụ ndị ozi, ma ha gburu ụfọdụ, tie ndị ọzọ ihe.
6 He had still one, a beloved son; last he sent him to them, saying, "They will respect my son." “O nwere naanị otu onye ọzọ fọdụrụ nke ọ ga-eziga, nke bụ ọkpara ya ọ hụrụ nʼanya. Nʼikpeazụ o zigara ya, buru nʼuche na ha ga-asọpụrụ ọkpara ya.
7 "But the tenants said to each other, 'This is the heir. Come, let's kill him—the inheritance will be ours.' “Ma ndị na-elekọta ubi ahụ sịrịtara onwe ha, ‘Onye a bụ onye nketa ihe niile a. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ihe nketa a bụrụzia nke anyị.’
8 So they took him and killed him and threw him out of the vineyard. Ha jidere ya gbuo ya, tufee ozu ya nʼazụ mgbidi ubi vaịnị ahụ.
9 So what will the vineyard's owner do? He'll come, destroy the tenants, and give the vineyard to others. “Gịnị ka unu chere onyenwe ubi vaịnị ahụ ga-eme? Ọ ga-abịa laa ndị ajọ mmadụ ahụ nʼiyi. Ọ ga-enyefekwa ubi vaịnị ahụ nʼaka ndị ọzọ.
10 Have you not read this Scripture: 'The stone the builders rejected has become the cornerstone; Ọ bụ na unu agụbeghị akwụkwọ nsọ a na-asị, “ ‘Nkume ndị na-ewu ụlọ jụrụ abụrụla nkume isi ntọala ụlọ.
11 this was our Father's doing, and it is marvelous in our eyes'?" Ọ bụ Onyenwe anyị rụrụ nke a, ọ dịkwa ịtụnanya nʼanya anyị’ ?”
12 They wanted to arrest him but feared the crowd, knowing he'd told the parable against them. So they left him and went away. Mgbe ahụ ndịisi nchụaja, ndị nkuzi iwu na ndị okenye chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya nʼihi na ha matara na ilu ahụ ọ tụrụ megidere ha. Ma ha tụrụ egwu igwe ndị mmadụ ahụ, ya mere ha hapụrụ ya pụọ.
13 They sent some of the Pharisees and Herodians to trap him in his words. Emesịa, ha zigara ụfọdụ mmadụ site nʼotu ndị Farisii na ndị otu Herọd, ile ma ha ga-esite nʼokwu ọnụ ya jide ya.
14 They came and said to him, "Teacher, we know you're true and don't care what anyone thinks, since you don't judge by appearance but truly teach our Father's way. Is it lawful to pay taxes to Caesar, or not? Should we pay, or should we not?" Ha bịakwutere ya, sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ onye eziokwu, ị dịghị asọkwa onye ọbụla anya, nʼihi na ị dịghị ele mmadụ anya nʼihu nʼagbanyeghị ndị ha bụ, kama ị na-ezi ụzọ Chineke nʼụzọ eziokwu. O ziri ezi nʼiwu ịtụ ụtụ nye Siza ka ọ bụ na o zighị ezi?
15 But, knowing their hypocrisy, he said to them, "Why are you testing me? Bring me a silver coin to look at." Anyị kwesiri ịkwụ ya ka ọ bụ anyị ekwesighị?” Ma ebe ọ maara ihu abụọ ha, ya mere ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji anwa m ọnwụnwa? Wetaranụ m otu mkpụrụ ego ka m lee ya anya.”
16 They brought one, and he asked them, "Whose image and inscription is this?" They told him, "Caesar's." Ha wepụtara otu mkpụrụ ego, Ọ sịrị, “Onye nwe onyinyo a? Aha onye ka e bikwasịrị nʼego a?” Ha zara sị, “Ọ bụ nke Siza.”
17 Jesus told them, "Give to Caesar what's Caesar's, and to our Father what's our Father's." They were amazed at him. Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Nyenụ Siza ihe bụ nke ya, nyekwanụ Chineke ihe bụ nke ya.” Ọsịsa ya jụkwara ha anya.
18 And the Sadducees came to him, who say there is no resurrection. And they questioned him, saying, Ụfọdụ ndị Sadusii bụ ndị sịrị na mbilite nʼọnwụ adịghị bịakwutere ya jụọ ya sị,
19 "Teacher, Moses wrote for us that if a man's brother dies leaving a wife but no child, the brother must marry her and raise up offspring for him. “Onye ozizi, Mosis nyere anyị iwu na ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwa, na nwanne ya nwoke ga-alụrụ nwunye nwoke ahụ, mụta ụmụ nʼaha nwanne ya nwoke ahụ nwụrụ anwụ.
20 There were seven brothers; the first married, and when he died, left no children. Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa, nke mbụ lụrụ nwunye ma ọ nwụrụ na-amụtaghị ụmụ ọbụla.
21 And the second married her, and he died leaving no children. And the third likewise. Nke abụọ lụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, ma ya onwe ya nwụkwara na-amụtaghị nwa.
22 And none of the seven left any children. Last of all the woman also died. Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha asaa mụtara nwa ọbụla, nʼikpeazụ nwanyị ahụ nwụkwara.
23 At the resurrection, when they rise, whose wife will she be? The seven had her as wife." Nʼoge mbilite nʼọnwụ, nwunye onye ka ọ ga-abụ, ebe ụmụnne asaa ndị a lụtụchara ya?”
24 Jesus said to them, "Isn't this why you're wrong—you know neither the Scriptures nor our Father's power? Jisọs zara ha sị, “Ọ bụ na unu adịghị ejehie ụzọ nʼihi na unu aghọtaghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, maọbụ ike Chineke?
25 For when the dead rise, they neither marry nor are given in marriage, but are like the angels in heaven. Mgbe ha ga-esite nʼọnwụ bilie, ọlụlụ di na nwunye agaghị a dị; kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nʼeluigwe.
26 About the dead being raised, haven't you read in Moses' book, in the passage about the bush, how our Father told him, 'I am the God of Abraham, of Isaac, and of Jacob'? Ma nʼokwu banyere ndị nwụrụ anwụ isite nʼọnwụ bilie, ọ bụ na unu agụtabeghị nʼakwụkwọ Mosis ebe e dere maka ọhịa ahụ na-ere ọkụ, na otu Chineke si gwa ya, Abụ m Chineke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.
27 He is not God of the dead, but of the living. You are badly mistaken." Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ kama nke ndị dị ndụ. Nʼebe ahụ ka unu dahiere nke ukwuu.”
28 One scribe approached, heard them debate, saw Jesus answered well, and asked, "Which commandment is most important of all?" Otu nʼime ndị ozizi iwu bịara nʼoge ahụ ha na-arụrịta ụka. Mgbe ọ hụrụ na o nyere ha ezi ọsịsa, ọ jụrụ ya sị, “Nʼime iwu niile olee nke kachasị mkpa?”
29 Jesus answered, "The most important is this: 'Hear, Israel: our Father is one.' Jisọs zara ya sị, “Nke kachasị mkpa bụ nke a, ‘Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu.
30 Love your Father with all your heart, with all your soul, with all your mind, with all your strength." Were obi gị niile na mkpụrụobi gị niile na uche gị niile na ike gị niile hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya.’
31 "The second is this: 'Love your neighbor as yourself.' No commandment is greater than these." Nke abụọ ya bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’ Ọ dịghị iwu ọzọ dị nke karịrị ndị a.”
32 The scribe said to him, "Well said, Teacher. You've said truly that he is one, and there's no other besides him. Onye ode akwụkwọ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, nʼezie, ị zara nke ọma na Chineke bụ otu, na enweghịkwa chi ọzọ dị karịa ya.
33 Loving him with all the heart, all the understanding, all the strength, and loving one's neighbor as oneself, matters far more than all whole burnt offerings and sacrifices." Ịhụ ya nʼanya site nʼiji obi gị niile, na nghọta gị niile, nakwa iji ike gị niile, nʼịhụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị, kachasị onyinye aja nsure ọkụ na ịchụ aja niile.”
34 Seeing he answered wisely, Jesus said to him, "You are not far from the kingdom of our Father." After that, no one dared ask him any more questions. Mgbe Jisọs hụrụ na ọ zara nke ọma, ọ gwara ya sị, “Ị nọ alaeze Chineke nso.” Site na mgbe ahụ ọ dịkwaghị onye ọbụla nwere obi ike ịjụ ya ajụjụ ọzọ.
35 Teaching in the temple, Jesus asked, "How can the scribes say the Christ is the son of David? Mgbe Jisọs nọ na-ezi ihe nʼụlọnsọ, ọ kwuru sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu ji sị na Kraịst bụ nwa Devid?
36 David himself said by the Holy Spirit: 'Our Father said to my Lord, "Sit at my right hand until I put your enemies under your feet."' Devid nʼonwe ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ kwuo sị, “ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị nʼokpuru ụkwụ gị abụọ.” ’
37 "David himself calls the Christ Lord. How can the Christ be David's son?" The large crowd enjoyed listening to him. Devid nʼonwe ya kpọrọ ya Onyenwe anyị. Oleekwanụ ụzọ o si bụrụ nwa ya?” Igwe mmadụ ahụ jiri obi ụtọ na-ege ya ntị.
38 And in his teaching he said, "Beware of the scribes, who like walking in long robes and being greeted in the marketplaces, Dịka ọ na-ezi ihe, ọ siri, “Lezienụ anya nʼebe ndị ozizi iwu nọ. Ndị iyi uwe mwụda na-ejegharị ebe niile na-amasị, na ịnara ekele pụrụ iche bụ nke a na-ekele ha nʼọma ahịa.
39 and to have the best seats in the synagogues and the places of honor at banquets, Ndị ọ na-amasịkwa ịnọkwasị nʼoche kachasị elu nʼụlọ ekpere nakwa nʼoche pụrụ iche na mmemme oriri ọbụla.
40 who devour widows' houses and make long prayers just for show. These will receive the greater condemnation." Ha na-eripịa ihe niile dị nʼụlọ ndị inyom ndị di ha nwụrụ anwụ, nʼekpe ogologo ekpere ka a hụta ha. Ndị dị otu a ka a ga-ata ahụhụ dị ukwuu.”
41 Sitting across from the treasury, he watched the crowd drop coins in; many rich people dropped in large sums. Ọ nọdụrụ ala na ncherita ihu ebe igbe onyinye dị, sị ebe ahụ na-ahụ otu igwe mmadụ ahụ si etinye ego ha nʼime igbe onyinye. Ọtụtụ ndị ọgaranya tụnyere ego buru ibu.
42 And a poor widow came and put in two small copper coins, worth a penny. Otu nwanyị bụ ogbenye, nke di ya nwụrụ anwụ, bịara tinye mkpụrụ ego ọla abụọ nke pụtara otu peni.
43 Calling his disciples, he said, "Truly, I tell you, this poor widow put in more than all who put into the offering box. Ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nʼezie agwa m unu, nwanyị a di ya nwụrụ anwụ, bụkwa ogbenye, etinyela ego nʼime igbe onyinye a karịa ndị ọzọ.
44 For they all gave from their surplus, but she gave from her poverty—all she had, her whole livelihood." Nʼihi na ndị ọzọ sitere nʼịba ụba nke ego ha nwere tinye, ma nwanyị a sitere nʼogbenye ya tinye ihe niile o nwere, ọ bụladị ihe niile o ji biri.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]