Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mark 13 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Leaving the temple, one of his disciples said to him, "Teacher, look! What huge stones, what magnificent buildings!" Mgbe o sitere nʼụlọnsọ ukwu ahụ na-apụ, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya siri ya, “Onye ozizi, ị hụkwara otu ụlọ a si maa mma. Lee ụdị nkume buru ibu e ji wuo ha.”
2 Jesus said to him, "Do you see these great buildings? Not one stone will remain here on another; all will be torn down." Jisọs zara ha, “Ị hụrụ ụlọ ukwu ndị a? Oge na-abịa mgbe ọ na-adịghị nkume ga-atụkwasị nʼelu ibe ya, nʼihi na a ga-ala ha niile nʼiyi.”
3 As he sat on the Mount of Olives facing the temple, Peter, James, John, and Andrew asked him privately, Mgbe ọ nọdụrụ ala nʼelu Ugwu Oliv, na ncherita ihu ụlọnsọ ukwu, Pita na Jemis, na Jọn na Andru bịakwutere ya na nzuzo jụọ ya sị,
4 tell us, when will these things happen, and what sign shows all this is about to be fulfilled? “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama izi na o ruola mgbe ha niile ga-emezu?”
5 Jesus began to tell them: "Watch out that no one deceives you. Jisọs malitere ịgwa ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie unu.
6 Many will come in my name, claiming, 'I am he,' and they will deceive many. Nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m sị, ‘Abụ m ya.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ụzọ.
7 When you hear of wars and rumors of wars, don't be troubled—these must happen, but the end isn't yet. Mgbe unu nụrụ maka agha na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu. Ihe ndị a aghaghị ime ma oge ọgwụgwụ ihe niile erubeghị.
8 Nation will rise against nation, kingdom against kingdom, earthquakes in various places, famines—these are the beginning of birth pains. Mba ga-ebili megide mba ibe ya. Alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ibe ya. Ala ọma jijiji na ụnwụ ga-adị nʼebe dị iche iche. Ihe ndị a bụ mmalite nke oke ihe mgbu.
9 Watch yourselves. They'll hand you to councils and beat you in synagogues. Because of me you'll stand before governors and kings, as a testimony to them. “Unu aghaghị ịbụ ndị nọ na nche. A ga-enyefe unu nʼaka ndị na-achị achị, pịakwa unu ihe nʼụlọ ekpere. Nʼihi m, unu ga-eguzo nʼihu ndịisi ọchịchị na ndị eze dị ka ndị ama nye ha.
10 And the gospel must first be proclaimed to all nations. Aghaghị ibu ụzọ kwusaa oziọma a nye mba niile.
11 When they arrest and hand you over, don't worry beforehand what to say. Say whatever you're given in that hour—it's not you speaking, but the Holy Spirit. Ma mgbe ha jidere unu kpụta unu nʼụlọikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu, kwuonụ naanị ihe batara unu nʼọnụ unu ikwu nʼoge ahụ. Nʼihi na ọ bụghị unu ga-ekwu okwu, kama ọ bụ Mmụọ Nsọ ga-esite nʼọnụ unu kwuo okwu.
12 Brother will betray brother to death, father his child. Children will rise against parents and have them put to death. “Nwanne ga-arara nwanne ya nye ka e gbuo ya. Nna ga-ararakwa nwa ya nye. Ụmụ ga-ebili megide ndị mụrụ ha mee ka e gbuo ha.
13 All will hate you for my name, but whoever endures to the end will be saved. Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m, ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.
14 When you see the abomination of desolation standing where it should not be (reader, take note), those in Judea must flee to the mountains. “Mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi ka ọ na-eguzo nʼebe ọ na-ekwesighị (onye na-agụ ya nwee nghọta), mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu
15 Let no one on the housetop go down or enter the house to take anything out. Onye ọbụla nọ nʼelu ụlọ ya ghara ịrịdata maọbụ baa nʼime ụlọ ya iwepụta ihe ọbụla.
16 Let no one in the field go back to get their coat. Ka onye ọbụla nọ nʼubi ghara ịlọghachi ịchịrị uwe ya.
17 How dreadful it will be in those days for pregnant women and nursing mothers! Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime, na ndị na-enye ụmụaka ara, nʼụbọchị ahụ.
18 Pray that it will not happen in winter, Kpeenụ ekpere ka ihe ndị a hapụ ime nʼoge oke oyi.
19 for those days will bring suffering unmatched since our Father created the world until now—and never to be matched again. Nʼihi na oke mkpagbu nke ụbọchị ahụ ga-abụ nke na-adịbeghị na mbụ site na mgbe Chineke kere ụwa ruo ugbu a. Ọ dịkwaghị ihe ga-adịkwa ka ya ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.
20 Had the Sovereign not shortened those days, no one would survive; but the Sovereign shortened them for the elect he chose. “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị emeghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ, ọ dịghị onye a ga-azọpụta. Ma nʼihi ndị ya, ndị ọ họpụtara, o meela ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ.
21 Then if anyone tells you, 'Look, here is the Christ!' or 'Look, there!' don't believe it. Nʼoge ahụ, ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘Lee, ọ nọ nʼebe ahụ,’ unu ekwela.
22 False christs and false prophets will appear, performing signs and wonders to deceive the elect, if possible. Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha, ga-apụta ma rụọkwa ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị iche iche iji duhie ndị a họpụtara ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee.
23 So be on your guard; I have told you everything ahead of time. Ya mere, unu nọrọ na nche; nʼihi na agwala m unu ihe niile mgbe ha na-emebeghị.
24 But in those days, after that suffering, the sun will darken, and the moon will not give its light; “Nʼụbọchị ndị ahụ, nke na-esote oge mkpagbu ahụ, “ ‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya;
25 the stars will fall from the sky, and the powers in the heavens will be shaken. kpakpando ga-esi na mbara eluigwe na-ada, ike niile dị na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji.’
26 Then they will see the Son of Man coming in clouds with great power and glory. “Nʼoge ahụ, ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ, ka ọ na-abịa nʼigwe ojii nʼoke ike na ebube.
27 He will send his angels and gather his chosen from the four winds, from earth's ends to heaven's ends. Mgbe ahụ, ọ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya ka ha kpokọta ndị a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke ụwa. Site na nsọtụ niile nke ụwa ruo na nsọtụ niile nke eluigwe.
28 Learn this from the fig tree: once its branch softens and leaves sprout, you know summer is near. “Ugbu a, mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya dị nro malite iwepụta akwụkwọ ndụ, unu maara na ọkọchị dị nso.
29 So also, when you see these things happening, know it's near, at the door. Nʼụzọ dị otu a, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha bidoro ime, matanụ na ọ nọ nso, ọ nọkwa nʼọnụ ụzọ.
30 Truly I tell you, this generation will certainly not pass away until all these things have happened. Ana m agwa unu eziokwu na ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo.
31 Heaven and earth will pass away, but my words will never pass away. Eluigwe na ụwa ga-agabiga ma okwu m ga-adịgide.
32 But no one knows that day or hour—not the angels in heaven, not the Son, only the Father. “Ma banyere ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ, o nweghị onye ọbụla maara, ọ bụladị ndị mmụọ ozi nke eluigwe, maọbụ Ọkpara ahụ, kama naanị Nna ahụ maara ya.
33 Be on guard! Stay alert! For you do not know when that time will come. Ebe ọ bụ na unu amaghị mgbe ha ga-emezu, nọrọnụ na nche! Mụrụkwanụ anya!
34 Like a man on a journey: he leaves his house, gives his servants authority—each his own task—and orders the doorkeeper to stay alert. Ọ dị ka nwoke hapụrụ ụlọ ya na-aga njem, tinye nʼaka ndị ohu ya ilekọta ihe, onye ọbụla nʼime ha ka o nyere ọrụ ọ ga-arụ ma nyekwa onye nche ọnụ ụzọ iwu ka ọ nọ na nche.
35 So stay alert, since you don't know when the master of the house comes—evening, midnight, rooster's crow, or dawn. “Ya mere nọrọnụ na nche, nʼihi na unu amaghị mgbe Onyenwe ụlọ ga-alọta. Ma ọ bụ nʼuhuruchi maọbụ nʼetiti abalị. Maọbụ mgbe ọkụkụ kwara akwa, maọbụ nʼisi ụtụtụ.
36 Otherwise, if he comes suddenly, he may find you sleeping. Ọ bụrụ na ọ lọta na mberede, unu ekwela ka ọ lọkwute unu mgbe unu nọ nʼụra.
37 What I say to you, I say to everyone: Keep watch!" Ihe m gwara unu ka m na-agwakwa mmadụ niile. ‘Nọrọnụ na nche.’ ”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]