Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mark 14 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Two days before Passover and Unleavened Bread, the chief priests and scribes were looking for a way to seize Jesus by trickery and kill him. Abalị abụọ tupu e mee Mmemme Ngabiga na mmemme achịcha na-ekoghị eko, ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ aghụghọ ha ga-esi jide Jisọs gbuo ya.
2 For they said, "Not during the feast, or the people might riot." Ma ha kwuru sị, “Ọ gaghị abụ nʼoge mmemme a, ka ọgbaaghara ghara ịdị.”
3 While he was in Bethany, in Simon the leper's house, reclining at the table, a woman came with an alabaster flask of pure nard perfume, very costly. She broke the flask and poured it on his head. Ka ọ nọdụrụ nʼoche nri na Betani nʼụlọ Saimọn onye ekpenta, otu nwanyị bu karama alabasta mmanụ otite dị oke ọnụahịa, nke e jiri ezigbo naad mee, batara. Ọ kụwara karama ahụ, wụsa ya mmanụ otite ahụ nʼisi.
4 There were some who said to themselves indignantly, "Why was this perfume wasted like that? Ụfọdụ ndị nọ nʼebe ahụ were iwe nke ukwuu. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị mere e jiri laa mmanụ otite nke a nʼiyi otu a?
5 For this perfume could have sold for over 300 denarii and given to the poor." And they scolded her. A gaara ere mmanụ otite a ihe karịrị narị denarị atọ, were ego e retara ya nye ndị ogbenye.” Ha baara ya mba nʼolu ike.
6 But Jesus said, "Leave her alone. Why trouble her? She has done a beautiful thing for me. Ma Jisọs sịrị, “Hapụnụ ya aka. Gịnị mere unu ji esogbu ya? Ọ bụ ezi ọrụ ka ọ rụrụ nʼebe m nọ.
7 For the poor are always with you, and you can do good for them whenever you want; but you won't always have me. Unu na ndị ogbenye na-anọ oge niile, unu nwekwara ohere inyere ha aka mgbe ọbụla unu chọrọ. Ma mụ na unu agaghị anọ tee anya.
8 She has done what she could; she has anointed my body beforehand for burial. O mere ihe o nwere ike, ọ na-ete m mmanụ otite a ugbu a iji kwado ahụ m maka olili a ga-eli ya.
9 Truly, I tell you, wherever the gospel is preached worldwide, what she did will be told in memory of her." Nʼezie, ana m agwa unu, nʼebe ọbụla a ga-ekwusa oziọma a nʼụwa niile, ọrụ a ọ rụrụ ka a ga-akọkwa akụkọ ya, iji cheta ihe ọma a o mere.”
10 Then Judas Iscariot, one of the twelve, went to the chief priests to betray Jesus to them. Mgbe ahụ Judas Iskarịọt, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ jekwuuru ndịisi nchụaja ịgba izu otu ọ ga-esi rara ya nye ha nʼaka.
11 Hearing this, they were glad and promised him money. So he looked for a chance to betray Jesus. Mgbe ha nụrụ nke a, ha ṅụrịrị ọṅụ kwee ya nkwa inye ya ego. Site nʼụbọchị ahụ, o bidoro ịchọgharị ụzọ ọ ga-esi rara ya nye ha.
12 On the first day of Unleavened Bread, when they sacrificed the Passover lamb, his disciples asked him, "Where do you want us to go and prepare for you to eat the Passover?" Nʼụbọchị mbụ nke Mmemme achịcha na-ekoghị eko, mgbe ha na-achụ aja atụrụ ngabiga, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoro gị ihe, maka oriri ngabiga?”
13 He sent two of his disciples, "Go into the city; a man carrying a jar of water will meet you. Follow him, O zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Gaanụ nʼime obodo, otu nwoke bu ite mmiri ga-ezute unu. Soronụ ya.
14 and wherever he enters, tell the house's owner, 'The Teacher says: Where is my guest room, where I may eat the Passover with my disciples?' Ebe ọbụla ọ banyere, sịnụ onyenwe ụlọ ahụ, Onye ozizi sịrị, Olee ụlọ ọbịa a kwadoro m, ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie oriri ngabiga?
15 And he will show you a large upper room furnished and ready; there prepare for us." Ọ ga-egosi unu otu ọnụụlọ buru ibu nʼelu ụlọ ahụ, ebe e dozichara ihe niile. Kwadoonụ ihe anyị nʼebe ahụ.”
16 The disciples left, went to the city, found things as he had told them, and prepared the Passover. Ndị na-eso ụzọ ya pụrụ baa nʼime obodo, ha hụrụ ihe niile dị ka ọ gwara ha. Ma kwadokwa nri ngabiga ahụ.
17 And when it was evening, Jesus came with the twelve. Mgbe o ruru uhuruchi, ya na ndị ozi ya iri na abụọ ahụ so bịa.
18 While they reclined and ate, Jesus said, "Truly, I tell you, one of you will betray me, one eating with me." Mgbe ha nọ na-eri nri, Jisọs gwara ha sị, “Nʼezie agwa m unu, otu onye nʼime unu ga-arara m nye. E, otu onye so m ugbu a na-eri nri!”
19 They began to grieve and ask him, one by one, "Is it I?" Ha bidoro inwe obi mwute, na-asị ya nʼotu nʼotu, “Ọ bụ m? Ọ bụ m?”
20 He said to them, "One of the twelve, dipping bread with me into the dish. Ọ sịrị ha, “Ọ bụ otu onye nʼime mmadụ iri na abụọ a. Onye mụ na ya na-amanyekọta aka nʼime otu efere.
21 The Son of Man goes as the Scriptures said about him, but how terrible for that man who betrays him—better if he had never been born." Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e dere banyere ya. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”
22 As they ate, he took bread, blessed it, broke it, gave it to them, and said, "Take; this is my body." Dị ka ha na-eri nri, o weere achịcha, nye ekele, nyawa ya, nye ha sị, “Rienụ ya, nke a bụ ahụ m.”
23 He took a cup, gave thanks, gave it to them, and they all drank from it. Mgbe ahụ, o buuru iko, nye ekele bunyekwa ha. Ha niile ṅụrụ site nʼotu iko ahụ.
24 He said to them, "This is my blood of the covenant, poured out for many. Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ọbara m nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke a na-awụfu nʼihi ọtụtụ mmadụ.
25 Truly I tell you, I will not drink wine again until that day when I drink it new in the kingdom of our Father." Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, agaghị m aṅụ mmanya vaịnị ọzọ tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe m ga-aṅụ ya ọhụrụ nʼalaeze Chineke.”
26 And when they had sung a hymn, they went out to the Mount of Olives. Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv.
27 Jesus said to them, "You will all stumble, for it's written: 'I will strike the shepherd, and the sheep will be scattered.' Jisọs sịrị ha, “Unu niile ga-agbahapụ m, nʼihi na e dere ya otu a sị, “ ‘Aga m etigbu onye ọzụzụ atụrụ, igwe atụrụ ga-agbasasịkwa.’
28 But after I am raised up, I will go ahead of you to Galilee." Ma mgbe e mesịrị ka m si nʼọnwụ bilie, aga m ebu unu ụzọ gaa Galili.”
29 Peter said to him, "Even though they all fall away, I will not." Pita kwuru, “Ọ bụrụ na mmadụ niile agbahapụ gị, agaghị m eme otu a.”
30 Jesus said to him, "Truly I tell you, today, this night, before the rooster crows twice, you will deny me three times." Jisọs sịrị ya, “Ịgwa gị eziokwu, nʼụbọchị taa, nʼabalị taa, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”
31 But he insisted, "Even if I must die with you, I will never deny you." They all said the same. O kwusịrị ike sị, “Ọ bụrụkwa na ihe ọnwụ adapụta, aga m eso gị nwụọ. Agaghị m agọnarị gị!” Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha niile kwuru.
32 They arrived at a place called Gethsemane, and he told his disciples, "Sit here while I pray." Ha pụrụ garuo ebe a na-akpọ Getsameni. Nʼebe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Nọdụnụ nʼebe a ka m gaa kpee ekpere.”
33 He took Peter, James, and John, and began to feel deep distress and anguish. Ọ kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn tinyere onwe ya. Ọ malitere inwe ihe mwute dị ukwuu nakwa obi ịlọ mmiri.
34 He said to them, "My soul is crushed with grief, to death. Stay here and stay alert." Ọ sịrị ha, “Ọ na-ewute mkpụrụobi m nke ukwuu ruo nʼọnụ ọnwụ. Nọdụnụ nʼebe a na-eche nche.”
35 Going a little farther, he fell to the ground and prayed that, if possible, the hour would pass from him. Ọ gatụrụ nʼihu daa nʼala kpee ekpere, sị, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee ka oge awa ahụ gabiga ya.
36 He said, "Abba, Father, all things are possible for you. Take this cup from me—but let it be your will, not mine." O kwuru sị, “Abba, Nna, ị pụrụ ime ihe niile. Napụ m iko a, ma otu ọ dị, ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mee uche gị.”
37 He returned, found them asleep, and said to Peter, "Simon, are you asleep? Couldn't you stay awake one hour? Ọ bịara hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sịrị Pita, “Saimọn, ị na-arahụ ụra? Ọ bụ na ị nweghị ike iche nche otu awa?
38 Watch and pray, so you don't fall into temptation. The spirit is willing, but the flesh is weak." Nọrọnụ na nche, na-ekpekwanụ ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa. Mmụọ dị ike ma anụ ahụ adịghị ike.”
39 And again he went away and prayed, saying the same words. Ọ pụkwara ọzọ, gaa kpee ekpere, na-ekwukwa otu okwu ahụ.
40 Again he found them sleeping, eyes heavy, not knowing how to answer him. Mgbe ọ lọghachiri azụ ọ hụrụ na ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ nke ukwuu. Ha amakwaghị ihe ha ga-agwa ya.
41 He came a third time and said, "Still sleeping and resting? Enough—the hour has come. Look, the Son of Man is handed over into the hands of sinners. Mgbe ọ lọghachiri nke ugboro atọ, ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-arahụ ụra na-ezukwa ike? O zuola! Oge awa ahụ abịala. Lee, a rarala Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmehie.
42 Rise, let us be going; see, my betrayer is here." Bilienụ! Ka anyị gawa! Lee, onye na-arara m nye nọ nso.”
43 While he was still speaking, Judas—one of the twelve—arrived, and with him a crowd with swords and clubs from the chief priests, scribes, and elders. Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, Judas, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ batara, ya na igwe mmadụ, ndị ji mma agha na mkpọ. Ọ bụ ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu, na ndị ode akwụkwọ, na ndị okenye ndị Juu zitere ha.
44 His betrayer had given them a signal: "The one I kiss is him—seize him and take him away securely." Ma onye na-arara ya nye, nyere ha rịị ihe ịrịbama sị, “Onye ahụ nke m ga-esutu ọnụ bụ ya; jidenụ ya, kpụrụnụ ya gawa, ma jidesiekwanụ ya ike.”
45 He came up to Jesus at once, said, "Rabbi!" and kissed him. Ngwangwa o jekwuuru Jisọs, sị ya, “Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ.
46 And they laid hands on him and seized him. Ndị ikom ahụ jidere Jisọs ma sekpụrụ ya nʼike.
47 One of the bystanders drew his sword, struck the high priest's servant, and cut off his ear. Ma otu onye nʼime ndị guzo nʼebe ahụ, mịpụtara mma agha ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị ya.
48 Jesus said to them, "Have you come out with swords and clubs to seize me, like a robber? Jisọs sịrị ha, “Abụ m onyendu nke ndị na-enupu isi nke mere unu ji were mma agha na mkpọ bịa ijide m?
49 Every day I was with you in the temple teaching, and you didn't arrest me. But let the Scriptures be fulfilled." Ụbọchị niile ka mụ na unu nọ mgbe m na-ezi ihe nʼụlọnsọ ukwu, ma unu ejideghị m. Ma ihe akwụkwọ nsọ kwuru aghaghị imezu.”
50 And they all left him and fled. Mgbe ahụ, ha niile hapụrụ ya gbalaga.
51 And a young man followed him, wearing nothing but a linen cloth. And they seized the young man, Ọ dị otu nwokorobịa na-eso ya, ọ ji naanị akwa ọcha linin kpuchie onwe ya. Mgbe ha jidere ya,
52 but he left the linen cloth and ran away naked. ọ hapụụrụ ha akwa ọcha linin ya, gbara ọtọ gbalaga.
53 They led Jesus to the high priest, and all the chief priests and elders and scribes gathered. Ha duuru Jisọs gakwuru onyeisi nchụaja, ha niile bụ ndịisi nchụaja, na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ nʼebe ahụ.
54 Peter had followed at a distance, all the way into the high priest's courtyard, and sat with the guards, warming himself by the fire. Pita sooro ha, ma ọ nọ nʼebe dị anya. O sooro ha bata nʼobi onyeisi nchụaja. Nʼebe ahụ, o sooro ndị nche nọdụ ọdụ na-anya ọkụ.
55 The chief priests and the whole council sought testimony against Jesus to put him to death, but found none. Ndịisi nchụaja na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ukwu nọ na-achọ ama megide Jisọs, ka ha nwee ike gbuo ya. Ma ọ dịghị nke ha chọtara.
56 For many gave false testimony against him, but their testimony did not agree. Ọtụtụ bịara gbaa ama ụgha megide ya, ma ama ha abụghị otu.
57 And some stood up and gave false testimony against him, saying, Mgbe ahụ ụfọdụ biliri gbaa ama ụgha megide ya, sị,
58 "We heard him say, 'I will destroy this temple made by hands, and in three days build another not made by hands.'" “Anyị nụrụ mgbe o kwuru sị, ‘Aga m akwatu ụlọnsọ ukwu a nke e ji aka wuo, nʼụbọchị atọ aga m ewukwa ụlọ ọzọ, nke a na-ejighị aka wuo.’ ”
59 Yet even about this their testimony did not agree. Ọ bụladị na nke a, ama ha niile adakọtakwaghị nʼotu.
60 The high priest stood up in the midst and asked Jesus, "You have no answer? What are these men testifying against you?" Mgbe ahụ, onyeisi nchụaja biliri ọtọ nʼihu ha, jụọ Jisọs ajụjụ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị ka i nwere ikwu banyere ama ndị a a na-agba megide gị?”
61 He stayed silent, answered nothing. Again the high priest asked him, "Are you the Christ, the Son of the Blessed?" Ma ọ gbakwara nkịtị, ọ zaghị ihe ọbụla. Ọzọkwa, onyeisi nchụaja jụrụ ya sị, “Ị bụ Kraịst, Ọkpara Onye a gọziri agọzi?”
62 Jesus said, "I AM, and you will see the Son of Man seated at the right hand of the Mighty One and coming with heaven's clouds." Jisọs sịrị, “Abụ m ya, unu ga-ahụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ ala nʼaka nri nke Onye ji ike niile, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.”
63 And the high priest tore his clothes and said, "What further witnesses do we need? Onyeisi nchụaja dọwara uwe ya kwuo sị, “Gịnị mere anyị ji achọ ndị akaebe ọzọ?
64 You have heard his blasphemy. What is your decision?" And they all condemned him as deserving death. Unu anụla okwu nkwulu si ya nʼọnụ pụta! Gịnị bụ mkpebi unu?” Ha niile mara ya ikpe sị, “O kwesiri ka ọ nwụọ!”
65 Some began spitting on him, covering his face, and punching him, saying to him, "Prophesy!" Then the guards slapped him. Mgbe ahụ ụfọdụ bidoro ịgbụ ya ọnụ mmiri asọ, jiri akwa kechie ya anya, tiekwa ya aka na-asị, “Buo amụma!” Ndị nche kpụpụtara ya tiekwa ya ihe.
66 While Peter was below in the courtyard, one of the high priest's servant girls came, Dịka Pita nọ nʼobi ahụ, otu nʼime ụmụ agbọghọ na-ejere onyeisi nchụaja ozi bịara nso ebe ọ nọ.
67 seeing Peter warming himself, she looked at him and said, "You too were with the Nazarene, Jesus." Mgbe ọ hụrụ Pita ka ọ na-anya ọkụ, o leziri ya anya nke ọma, sị, “Ị bụ otu nʼime ndị na-eso Jisọs onye Nazaret ahụ.”
68 But he denied it: "I don't know or understand what you mean." Then he went out to the entrance, and a rooster crowed. Ma ọ gọrọ agọ sị, “Amaghị m, maọbụ ghọtakwa ihe ị na-ekwu.” Ma ọ pụrụ gaa nʼụzọ e si abata. Mgbe ahụ oke ọkụkụ kwara akwa.
69 The servant girl saw him and again told the bystanders, "This man is one of them." Mgbe nwaagbọghọ ahụ hụrụ Pita ọzọ, o gosiri ya ndị ọzọ nọ nʼebe ahụ sị ha, “Nwoke a bụkwanụ otu nʼime ha.”
70 But he denied it again. A little later the bystanders again told Peter, "You truly are one of them, for you're a Galilean." Ma ọ gọkwara agọ ọzọ. Mgbe oge nta gasịrị, ndị guzo Pita nso sịrị ya, “Nʼezie, ị bụ otu nʼime ha, nʼihi na ị bụ onye Galili.”
71 He began to call down curses on himself and swear, "I don't know this man you're talking about." Mgbe ahụ o bidoro ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụ iyi na-asị, “Amaghị m onye nwoke a unu na-ekwu okwu ya bụ.”
72 At once a rooster crowed a second time. Peter remembered Jesus' words: "Before the rooster crows twice, you will deny me three times." He broke down and wept. Nʼotu oge ahụ, oke ọkụkụ kwara akwa nke ugboro abụọ. Mgbe ahụ Pita chetara okwu Jisọs gwara ya sị, “Tupu oke ọkụkụ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” Obi tiwara ya mee ka ọ kwaa akwa.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]