Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mark 15 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 At dawn the chief priests, elders, scribes, and the whole council consulted together, bound Jesus, led him away, and handed him over to Pilate. Nʼezigbo isi ụtụtụ, ndịisi nchụaja na ndị okenye na ndị ozizi iwu, na ndị nzukọ ndị okenye niile, nwere mkpebi. Ha kere Jisọs agbụ, duru ya nyefee nʼaka Pailet.
2 Pilate asked him, "Are you the King of the Jews?" "You say so," Jesus replied. Pailet jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Ọ zara sị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.”
3 The chief priests kept accusing him of many things. Mgbe ahụ ndịisi nchụaja boro ya ebubo banyere ọtụtụ ihe.
4 So Pilate questioned him again: "Have you no answer? See how many charges they bring against you." Pailet jụrụ ya ajụjụ ọzọ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ọsịsa ọbụla? Lee ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị.”
5 But Jesus said nothing more, and Pilate was amazed. Ma Jisọs azaghị ihe ọzọ. Nke a juru Pailet anya.
6 Now at the festival, Pilate used to release one prisoner for them—whoever they asked for. Ugbu a, ọ bụ omenaala nʼoge mmemme, na a ga-ahapụ otu onye mkpọrọ, bụ onye ha rịọrọ ka a hapụ.
7 A man called Barabbas was in prison with the rebels who had committed murder during the uprising. Nʼoge ahụ kwa, otu nwoke a na-akpọ Barabas nọ nʼụlọ mkpọrọ, ya na ụfọdụ ndị biliri megide isi ọchịchị, ndị gbukwara mmadụ nʼoge ọgbaaghara ahụ.
8 The crowd came up and began asking Pilate to do for them what he always did. Igwe mmadụ gbakọrọ na-arịọ Pailet ka o mezuoro ha omenaala ha.
9 "Do you want me to release for you the King of the Jews?" Pilate answered, Mgbe ahụ ọ jụrụ ha sị, “Unu chọrọ ka m hapụrụ unu eze ndị Juu?”
10 for he knew it was out of envy that the chief priests had handed him over. Ebe ọ maara na ọ bụ nʼihi ekworo ka ndịisi nchụaja ji nyefee Jisọs nʼaka ya.
11 But the chief priests stirred up the crowd to have him release Barabbas for them instead. Ma ndịisi nchụaja kpaliri igwe mmadụ ahụ ka ha kwagide ya ka ọ hapụrụ ha Barabas.
12 "So what do you want me to do with the one you call King of the Jews?" Pilate asked them again. Pailet jụrụ ha ọzọ sị, “Gịnị ka m ga-eme nwoke a unu kpọrọ eze ndị Juu?”
13 Crucify him!" they shouted back. Ma ha tiri mkpu ọzọ sị, “Kpọgide ya nʼobe!”
14 "Why? What evil has he done?" Pilate asked. But they shouted all the louder, "Crucify him!" Ma Pailet jụrụ ha sị, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha tiri mkpu karịa ka ha si eti na mbụ, na-asị, “Kpọgide ya nʼobe!”
15 To satisfy the crowd, Pilate released Barabbas to them. He had Jesus flogged, and handed him over to be crucified. Ma ebe Pailet chọrọ ime ihe ga-atọ igwe mmadụ ahụ ụtọ, ọ hapụụrụ ha Barabas, nyefee ha Jisọs nʼaka ka ha pịa ya ihe ma kpọgidekwa ya nʼobe.
16 Soldiers led him away into the palace (the governor's headquarters) and called together the whole company of soldiers. Ndị agha ahụ duuru ya pụọ baa nʼime ụlọeze a na-akpọ Pritoriọm. Ha kpọkọtakwara ndị agha ndị otu ha ndị ọzọ.
17 They dressed him in purple, twisted together a crown of thorns, and set it on him. Ha yinyere ya uwe mwụda na-acha odo odo, kpukwasịkwa ya okpueze nke e ji ogwu kpaa nʼisi.
18 And they began to salute him: "Hail, King of the Jews!" Emesịa, ha malitere na-ekele ya sị, “Ekele, eze ndị Juu.”
19 They kept beating his head with a staff, spat on him, and knelt in mock homage to him. Ha ji osisi kụọ ya nʼisi ọtụtụ mgbe, na-agbụ ya ọnụ mmiri asọ. Ha gbukwara ikpere nʼihu ya, na-akpọ isiala na-enye ya.
20 After mocking him, they stripped off the purple and put his own clothes on him, then led him out to crucify him. Mgbe ha ji ya mechaa ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe odo odo ahụ, yinyekwa ya uwe nke ya. Emesịa, ha duuru ya pụọ gawa ịkpọgide ya nʼobe.
21 They forced a passerby coming from the countryside—Simon of Cyrene, father of Alexander and Rufus—to carry his cross. Ha zutere otu onye na-agata nʼụzọ, aha ya bụ Saimọn, onye Sirini, bụ nna Alegzanda na Rufọs. Ha manyere ya ka o buru obe ya.
22 They brought Jesus to the place called Golgotha (which means Place of a Skull). Nʼikpeazụ, ha duuru Jisọs ruo ebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara “ebe okpokoro isi”).
23 They offered him wine mixed with myrrh, but he did not take it. Ha nyere ya mmanya a gwara máá, ma ọ jụrụ ịṅụ ya.
24 They crucified him. They divided his clothes among them, casting lots for what each would get. Emesịa, ha kpọgidere ya nʼobe, ma kee uwe ya nʼetiti onwe ha site nʼife nza onye ga-enwe nke ọ ga-ewe.
25 It was nine in the morning when they crucified him. Ha kpọgidere ya nʼobe nʼelekere itoolu nke ụtụtụ.
26 The written notice of the charge against him read: THE KING OF THE JEWS. Ha depụtara ebubo ha boro ya kwụba ya nʼelu obe ahụ, nke bụ: Eze ndị Juu.
27 They crucified two rebels with him, one on his right and one on his left. Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe, otu nʼaka nri ya, nke ọzọ nʼaka ekpe ya.
28 Not in this edition A gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu.
29 Those passing by insulted him, shaking their heads, saying, "Ha! You who tear down the temple and build it in three days, Ndị mmadụ si nʼebe ahụ gafee fufere isi ha na-ekwutọ ya, na-asị, “Leenụ gị! Onye ga-akwada ụlọnsọ ma wugharịa ya nʼabalị atọ.
30 save yourself and come down from the cross!" Zọpụtanụ onwe gị! Si nʼelu obe ahụ rịdata.”
31 Likewise the chief priests and scribes mocked him among themselves: "He saved others; himself he can't save. Ọ bụladị ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị ode akwụkwọ nọ na-akwa ya emo nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma ọ pụghị ịzọpụta onwe ya!
32 Let the Christ, King of Israel, come down from the cross now, so we can see and believe." Those crucified with him also insulted him. Ka Kraịst a, bụ Eze Izrel, si nʼelu obe a rịdata ka anyị hụ ma kwerekwa.” Ndị ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya.
33 At noon, darkness came over the whole land until three in the afternoon. Mgbe ọ kụrụ elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile. Ọchịchịrị a dịgidere ruo nʼelekere atọ nke ehihie.
34 At three in the afternoon Jesus cried out loudly, "Eloi, Eloi, lema sabachthani?" meaning, "My God, my God, why have you forsaken me?" Nʼelekere atọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu akwa nʼoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani!” (nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?”).
35 When some of those standing nearby heard this, they said, "Listen, he's calling Elijah." Ma ụfọdụ ndị guzo nso nʼebe ahụ, mgbe ha nụrụ nke a, sịrị, “Lee, ọ na-akpọ Ịlaịja!”
36 One ran, filled a sponge with sour wine, put it on a reed, and gave him a drink. "Let him be," he said, "let's see if Elijah comes to take him down." Ya mere, otu onye gbaara ọsọ gaa weta ogbo, denye ya nʼime mmanya gbara ụka, fanye ya na okporo osisi, nye ya ka ọ ṅụọ, ma na-asị, “Hapụnụ ya, ka anyị lee ma Ịlaịja ọ ga-abịa tọtuo ya.”
37 With a loud cry, Jesus breathed his last. Ma Jisọs tiri mkpu nʼolu ike, kubie ume.
38 And the curtain of the temple was torn in two from top to bottom. Akwa mgbochi nke ụlọnsọ ukwu sitere nʼelu gbawaa abụọ ruo nʼọnụ ala ala ya.
39 The centurion facing Jesus saw how he breathed his last and said, "Truly this man was the Son of God." Mgbe ọchịagha guzo nʼihu ya, hụrụ otu o si kubie ume, o kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke.”
40 Women were also watching from a distance, including Mary Magdalene, Mary the mother of James the younger and Joses, and Salome. O nwere ụfọdụ ụmụ nwanyị guzo nʼebe dị anya na-ele ihe na-eme, nʼetiti ha bụ Meri Magdalin, Meri nne Jemis nke nta, na Josef, na Salomi.
41 These women had followed him in Galilee and served him; many others who came up with him to Jerusalem were also there. Ndị a bụ ndị naara eso ya na-ejekwara ya ozi, mgbe ọ nọ na Galili. Ọ dịkwa ndị inyom ọzọ nọkwa nʼebe ahụ, bụ ndị sooro ya bịa na Jerusalem.
42 Evening had come, and since it was Preparation Day—the day before the Sabbath. Nʼoge uhuruchi (ya bụ ụbọchị na-abọta ụbọchị izuike), ebe ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe,
43 Joseph of Arimathea, a prominent council member who himself was waiting for the kingdom of our Father, dared to go to Pilate and ask for Jesus' body. Josef onye Arimatia, otu nʼime ndị otu nʼụlọ nzukọ, onye a na-asọpụrụ, onye na-echere ọbịbịa nke alaeze Chineke, ji obi ike jekwuru Pailet rịọ ya ka o bunye ya ahụ Jisọs.
44 Pilate was surprised he was already dead; summoning the centurion, he asked if Jesus had been dead long. Ọ juru Pailet anya ịnụ na ọ nwụọla. Ọ kpọrọ ọchịagha ahụ jụọ ya ma ọ nwụọla.
45 When he learned from the centurion that it was so, he granted the body to Joseph. Mgbe ọchịagha ahụ gwara ya na ọ nwụọla, o kwere ka Josef buru ahụ ya.
46 Joseph bought linen, took the body down, wrapped it in the cloth, and laid it in a tomb cut from rock. Then he rolled a stone against the tomb's entrance. Josef zụtara akwa ọcha linin, wedata ahụ ya jiri akwa ahụ fụchie ya. O buuru ya buba ya nʼime ili nke o gwuru nʼime nkume. Emesịa o nuketara otu nkume buru ibu, jiri ya mechie ọnụ ụzọ ili ahụ.
47 Mary Magdalene and Mary the mother of Joses saw where he was laid. Meri Magdalin na Meri nne Josef hụkwara ebe e bubara ahụ ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]