Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mark 7 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The Pharisees and some of the scribes who had come from Jerusalem gathered around Jesus, Mgbe ndị Farisii na ụfọdụ ndị ozizi iwu sitere Jerusalem bịa gbara ya gburugburu,
2 and they saw that some of his disciples were eating bread with unclean hands—that is, unwashed. ha hụrụ na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ji aka na-adịghị ọcha, ya bụ aka a na-akwọghị akwọ, na-eri nri.
3 (For the Pharisees and all the Jews don't eat unless they wash their hands ceremonially, keeping the elders' tradition. Ndị Farisii na ndị Juu niile adịghị eri nri ma ọ bụrụ na ha akwọghị aka, nʼihi na ha na-ejigidesi aka ike nʼozizi na omenaala nke ndị okenye.
4 When they come from the market, they don't eat without washing. They also hold to many other traditions they've received—washing cups, pitchers, and copper vessels.). Mgbe ọbụla ha si nʼahịa lọta, ha adịghị eri nri ma ọ bụghị ma ha sachara onwe ha. Ha na-edebekwa ọtụtụ omenaala ndị ọzọ dị ka ịsacha iko, na ite mmiri na ketụlụ.
5 Then the Pharisees and scribes asked him, "Why don't your disciples follow the elders' tradition, but eat bread with unclean hands?" Ya mere ndị Farisii na ndị ozizi iwu jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebi nʼusoro omenaala ndị okenye. Karịa iji aka na-adịghị ọcha rie nri ha?”
6 He replied, "Isaiah prophesied truly about you hypocrites, as written: 'These people honor me with their lips, but their heart is far from me.' Ọ sịrị ha, “Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu ndị ihu abụọ bụ eziokwu; dị ka e dere ya sị, “ ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ.
7 'They worship me in vain, teaching as doctrines the commandments of men.' Ofufe ha na-efe m bụ ihe efu, ozizi ha bụkwa ihe mmadụ nyere nʼiwu.’
8 You abandon the commandment of our Father and hold to the tradition of men." Unu atụfuola iwu Chineke ma jidesiekwa aka ike nʼomenaala nke mmadụ.”
9 He said to them, "You do a fine job setting aside our Father's commandment to keep your own tradition!" Ma ọ gwakwara ha sị, “Unu nwere ụzọ dị mma nʼanya unu nke unu ji wezuga iwu Chineke ma were omenaala unu dochie nʼọnọdụ ya.
10 For Moses said, 'Honor your father and your mother,' and 'Whoever curses father or mother must be executed.' Nʼihi na Mosis sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,’ na, ‘onye ọbụla kwujọrọ nne maọbụ nna ya ka e gbuo ya.’
11 "But you say: if anyone tells his father or mother, 'Whatever you'd have gained from me is Corban' (a gift devoted to our Father), Ma unu na-asị, na ọ bụrụ na mmadụ asị nne ya maọbụ nna ya, ‘Ihe ọbụla bụ nke ị gara erite nʼaka m bụ kọban,’ (nke pụtara onyinye dịrị Chineke).
12 then you no longer let him do anything for his father or mother. Nʼụzọ dị otu a, unu na-akwagide ndị mmadụ ka ha hapụ inyere nne na nna ha aka.
13 So you cancel the word of our Father with your handed-down tradition. You do many things like this." Nʼụzọ dị otu a, unu na-eme okwu Chineke ka ọ bụrụ ihe efu, site nʼomenaala unu nke unu nyefere nʼaka ndị ọzọ. Ọ dịkwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị ka nke a unu na-eme.”
14 He called the crowd again and said to them, "Listen to me, all of you, and understand: Ọzọkwa, ọ kpọrọ igwe mmadụ ahụ sị ha, “Geenụ m ntị onye ọbụla, ma ghọtakwanụ nke a.
15 Nothing outside a person entering him can make him unclean; rather, what comes out of a person is what makes him unclean." Ọ dịghị ihe ọbụla banyere nʼime mmadụ pụrụ imerụ mmadụ, kama ihe na-emerụ mmadụ bụ ihe ahụ na-esite nʼime ya na-apụta.”
16 Not in this edition Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.
17 When he had left the crowd and entered the house, his disciples asked him about the parable. Mgbe ọ hapụrụ igwe ndị mmadụ ahụ banye nʼime ụlọ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya maka ilu a.
18 He said to them, "Are you also this dull? Don't you understand nothing entering a person from outside can make him unclean, Ọ sịrị ha, “Unu ọ ka dị ka ndị na-enweghị nghọta? Ọ bụ unu aghọtaghị na ihe ọbụla banyere nʼime mmadụ apụghị imerụ ya.
19 since it doesn't enter his heart but his stomach, and then goes out into the sewer?" (Saying this, he declared all foods clean.). Nʼihi na ihe dị otu a anaghị abanye nʼobi ha, kama ọ na-abanye nʼime afọ ha, si nʼebe ahụ a nyụpụ ya nʼụlọ nsị.” (Site nʼikwu otu a, o mere ka ihe oriri niile dị ọcha.)
20 He said, "What comes out of a person—that makes him unclean. Ọ sịkwara, “Ọ bụ ihe sitere nʼime mmadụ pụta na-emerụ ya.
21 For from within, out of the human heart, come evil thoughts—sexual sin, theft, murder, Nʼihi na ọ bụ nʼime obi mmadụ ka echiche ọjọọ niile si apụta, ya na ịkwa iko niile dị iche iche, izu ohi, igbu mmadụ,
22 adultery, greed, malice, deceit, sensuality, envy, slander, pride, and foolishness. ịkwa iko nke ndị nwere di na nwunye, ọchịchọ ịdọtara onwe gị ihe ndị ọzọ nwere, ekworo, aghụghọ niile, adịghị ọcha niile, inwe anya ụfụ nʼebe ndị ọzọ nọ, nkwulu niile, nganga na enweghị uche ọbụla.
23 All these evils come from inside and make a person unclean." Ihe ọjọọ ndị a niile na-esite nʼime mmadụ a pụta. Ha bụkwa ihe na-emerụ mmadụ.”
24 Jesus left there for the region of Tyre. He entered a house, wanting no one to know, but couldn't stay hidden. Ọ hapụrụ ebe ahụ gaa nʼakụkụ obodo Taịa. Nʼebe ahụ ọ banyere nʼime otu ụlọ. Ma o nwekwaghị ike izo onwe ya, nʼagbanyeghị na ọ chọghị ka a mata na ọ nọ ebe ahụ.
25 Instead, a woman whose little daughter had an unclean spirit heard about him at once, came, and fell at his feet. Ngwangwa, otu nwanyị nwere otu nwa nwanyị ntakịrị nke mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya nụrụ maka ya, ọ bịara daa nʼụkwụ ya.
26 The woman was Greek, Syrophoenician by birth. She kept asking him to drive the demon out of her daughter. Nwanyị a bụ onye Griik a mụrụ nʼakụkụ Sairo-Fonisia. Ọ rịọrọ ya ka ọ chụpụrụ ya mmụọ ọjọọ ahụ bi nʼime nwa ya nwanyị.
27 He told her, "Let the children eat first, for it's not right to take their bread and toss it to the dogs." Ọ sịrị ya, “Hapụ ka ụmụntakịrị buru ụzọ rie ihe, nʼihi na o zighị ezi na a ga-ewere nri ụmụntakịrị tụpụrụ nkịta.”
28 But she replied to him, "Sir, even the dogs under the table eat the children's crumbs." Ma ọ zaghachiri ya sị, “Onyenwe m, ma ụmụ nkịta na-erikwa iberibe nri ụmụntakịrị si na tebul tụpụ nʼala.”
29 He said to her, "Because of this answer, go—the demon has left your daughter." Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Nwanyị, ị zara nke ọma, nʼihi ọsịsa gị, laa, mmụọ ọjọọ ahụ ahapụla nwa gị nwanyị ugbu a.”
30 And she went home and found the child lying on the bed, and the demon gone. Ọ laghachiri nʼụlọ ya, hụ nwantakịrị ahụ ka o dina nʼelu ihe ndina, mmụọ ọjọọ ahụ apụọkwala.
31 Then Jesus left the territory of Tyre, went through Sidon to the Sea of Galilee, into the region of the Decapolis. Emesịa, ọ hapụrụ akụkụ Taịa gabiga Saịdọn bịaruo nʼosimiri Galili ruo nʼobodo ndị dị na Dekapọlịs.
32 They brought him a deaf man who could hardly speak, begging him to lay his hand on him. Ha duteere ya otu nwoke ntị chịrị, nke na-asụkwa oke nsụ. Ha rịọrọ ya ka o bikwasị ya aka.
33 Jesus took him aside privately, away from the crowd, put his fingers in the man's ears, spit, and touched his tongue. O duuru ya pụọ nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, rụnye ya mkpịsịaka nʼime ntị ya abụọ. Mgbe ahụ ọ gbụpụkwara ọnụ mmiri metụkwa ya aka nʼire.
34 Then, looking up to heaven, he sighed deeply and said to him, "Ephphatha!" (that is, "Be opened!"). O leliri anya nʼeluigwe sụọ ude sị ya, “Ef fata,” nke pụtara “Meghee!”
35 And immediately his ears were opened, his tongue was released, and he began to speak plainly. Ngwangwa, ntị ya meghere, a tọpụkwara ire ya, ọ malite ikwu okwu nke ọma.
36 Jesus ordered them to tell no one; but the more he ordered, the more they proclaimed it. Jisọs nyere ha iwu ka ha ghara ịgwa onye ọbụla, ma mgbe ọ na-eme nke a ha gara nʼihu na-akọsa ya ebe niile.
37 They were completely amazed: "He has done everything well—he makes the deaf hear and the mute speak." Ọ tụrụ ha nʼanya nke ukwuu, ha kwuo sị, “O meela ihe niile nke ọma. Ọ na-eme ka ọ bụladị ndị ntị chiri nụ ihe, ma mee ka ndị ogbi kwuo okwu.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]