Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mark 6 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 He went out from there and came to his hometown, and his disciples followed him. Ọ sitere nʼebe ahụ pụọ laghachi nʼobodo nke a mụrụ ya. Ndị na-eso ụzọ ya sooro ya gaa.
2 On the Sabbath he began teaching in the synagogue. Many who heard were amazed: "Where did this man get this? What wisdom is this, given to him? How do such miracles happen through his hands? Nʼụbọchị izuike, ọ banyere nʼụlọ ekpere bido izi ihe. Ozizi ya juru ọtụtụ ndị gere ya ntị anya. Ha kwuru sị, “Ebee ka nwoke si mụta ihe ndị a niile? Gịnịkwa bụ amamihe nke a e nyere ya? Lekwa ọrụ ebube nke a ọ rụrụ?
3 Isn't this the carpenter, Mary's son, brother of James, Joses, Judas, and Simon? Aren't his sisters here with us?" They were offended by him. Onye a ọ bụghị onye kapinta ahụ? Ọ bụghị nwa Meri, bụrụkwa nwanne Jemis, Josef, Judas na Saimọn? Ụmụnne ya ndị inyom ha esoghị anyị nọrọ nʼebe a?” Iwe were ha nʼebe ọ nọ.
4 Jesus said to them, "A prophet lacks honor only in his hometown, among his relatives, and in his own household." Ma Jisọs zara ha sị, “Onye amụma adịghị enwe nsọpụrụ ọbụla nʼobodo a mụrụ ya, na nʼetiti ndị ikwu ya na nʼezinaụlọ o siri pụta.”
5 He could do no miracle there, except laying hands on a few sick and healing them. Ọ rụghị ọrụ ebube ọbụla nʼebe ahụ. Ihe o mere bụ naanị ibikwasị mmadụ ole na ole ahụ na-esighị ike aka nʼisi gwọọ ha.
6 He was amazed at their lack of faith. Then he went around the villages teaching. Enweghị okwukwe ha juru ya anya. O jegharịkwara nʼobodo nta niile gburugburu na-ezi ihe.
7 He called the twelve and began sending them out two by two, giving them authority over unclean spirits. Ọ kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ya, nye ha ikike zipụ ha, abụọ abụọ. O nyere ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha.
8 He ordered them to take only a staff for the road—no bread, no bag, no money in their belts, Ndị a bụ iwu o nyere: “Unu ewerekwala ihe ọbụla maka njem a, karịkwa mkpanaka. Unu ewela achịcha, maọbụ akpa, unu etinyela ego ọbụla nʼime belịt unu.
9 but to wear sandals and not put on two tunics. Yirinụ akpụkpọụkwụ unu, unu eyikwala karịa otu uwe.
10 And he said to them, "Wherever you enter a house, stay there until you leave that place. Mgbe ọbụla unu banyere nʼụlọ ọbụla, nọgidenụ nʼebe ahụ ruo mgbe unu hapụrụ obodo ahụ.
11 Whatever place refuses to welcome or hear you, leaving there, shake the dust off your feet as testimony against them." Ma ọ bụrụ na obodo ọbụla anabataghị unu maọbụ egeghị unu ntị, kụchapụnụ aja dị nʼụkwụ unu mgbe unu na-apụ, ka ọ bụrụ ihe ama megide ha.”
12 So they went out and proclaimed that people should repent. Ha pụrụ kwusara ndị mmadụ ka ha chegharịa.
13 And they drove out many demons and anointed many sick people with oil and healed them. Ha chụpụrụ ọtụtụ mmụọ ọjọọ, teekwa ọtụtụ ndị ahụ na-esighị ike mmanụ, gwọọ ha.
14 King Herod heard of it, for Jesus's name had become known. Some were saying, "John the Baptist has been raised from the dead; that is why these miraculous powers are at work in him." Eze Herọd nụrụ akụkọ banyere ya, nʼihi na aha Jisọs aghọọla okwu a kpụ nʼọnụ. Ụfọdụ na-asị, na ọ bụ “Jọn omee baptizim; na e meela ka o site na ndị nwụrụ anwụ bilie. Ọ bụkwa nke a mere ka ike ọrụ ebube ji dị nʼime ya.”
15 But others said, "He's Elijah." Others said, "He's a prophet, like one of the prophets of old." Ndị ọzọ na-asị, “Ọ bụ Ịlaịja.” Ma ndị ọzọkwa kwuru na ọ bụ onye amụma dị ka otu nʼime ndị amụma mgbe ochie.
16 But when Herod heard of it, he said, "John, whom I beheaded, has been raised." Ma mgbe Herọd nụrụ nke a, ọ sịrị, “Jọn onye ahụ m bipụrụ isi, emeela ka ọ site nʼọnwụ bilie!”
17 Herod had sent and seized John, binding him in prison because of Herodias, his brother Philip's wife, whom he had married. Nʼihi na Herọd nʼonwe ya nyererị iwu ka e jide Jọn kee ya agbụ tụba ya nʼụlọ mkpọrọ. O mere nke a nʼihi Herodịas bụrịị nwunye Filip nwanne ya, onye ọ kpọrọ dịka nwunye ya.
18 For John kept telling Herod, "It is not lawful for you to have your brother's wife." Nʼihi na Jọn gwara Herọd sị, “Ọ bụghị ihe ziri ezi nʼiwu ka ị kpọrọ nwunye nwanne gị nwoke.”
19 And Herodias held a grudge against him and wanted to kill him, but she could not, Nʼihi ya Herodịas bu iro nʼobi megide Jọn na-achọkwa ụzọ igbu ya, mana ọ pụghị ime nke a,
20 Herod feared John, knowing him righteous and holy, and protected him. Hearing John left Herod deeply puzzled, yet he gladly listened to him. nʼihi na Herọd na-atụ egwu ma na-echekwa Jọn, ebe ọ maara na ọ bụ onye ezi omume na onye dị nsọ. Mgbe ọ nụrụ okwu ya, o nweghị udo nʼobi ma ige ya ntị na-amasị ya.
21 Then a fitting day came: Herod's birthday, when he gave a banquet for his nobles, military commanders, and Galilee's leading men. Nʼikpeazụ, ohere bịara mgbe Herọd kpọrọ oriri nʼụbọchị ncheta ọmụmụ ya nye ndị ọkwa ha dị elu nʼokpuru ọchịchị ya, ndịisi ndị ọchịagha na ndị bụ ndị ndu nʼobodo Galili.
22 When Herodias's daughter entered and danced, she delighted Herod and his dinner guests. The king told the girl, "Ask me for anything you want, and I'll give it to you." Mgbe ada Herodịas bịara tee egwu, obi tọrọ Herọd na ndị niile ọ kpọrọ oriri ụtọ. Eze gwara nwaagbọghọ ahụ sị, “Rịọ m ihe ọbụla ị chọrọ aga m enyekwa gị ya.”
23 He swore to her, "Whatever you ask me, I'll give you—up to half my kingdom." O kwere ya nkwa ṅụọkwa iyi sị, “Ihe ọbụla ị rịọrọ m aga m enye gị, ọ bụladị ọkara alaeze m.”
24 She went out and said to her mother, "What should I ask?" She said, "The head of John the Baptist." Ọ jekwuru nne ya jụọ ya sị, “Gịnị ka m ga-arịọ?” Ọ zara ya sị, “Isi Jọn omee baptizim.”
25 She went in immediately, with urgency, to the king and asked, "I want you to give me this instant the head of John the Baptist on a platter." Ngwangwa, ọ bịakwutere eze rịọ ya sị, “Achọrọ m ka i nye m, ugbu a, nʼime efere, isi Jọn omee baptizim.”
26 Deeply grieved, the king still wouldn't refuse her, because of his oaths and his guests. O wutere eze nke ukwuu, ma nʼihi iyi ọ ṅụrụ, na nʼihi ndị ọ kpọrọ oriri, ọ chọghị ịjụ inye ya ihe ọ rịọrọ ya.
27 The king at once sent an executioner, ordering John's head brought. He went and beheaded him in the prison, Ngwangwa o zipụrụ onye agha na-eche nche nye ya iwu ka ọ gaa bute isi Jọn. Ọ gara, bipụ isi Jọn nʼụlọ mkpọrọ,
28 and brought his head on a platter, gave it to the girl, and the girl gave it to her mother. tinye isi ahụ nʼime efere butere nwaagbọghọ ahụ onye nara ya bunye nne ya.
29 When John's disciples heard, they came, took his body, and laid it in a tomb. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ha bịara buru ozu ya gaa lie.
30 The apostles gathered to Jesus and told him all that they had done and taught. Ndị ozi Jisọs gbara ya gburugburu kọọrọ ya ihe niile ha mere, na ihe niile ha kuziri.
31 He told them, "Come away by yourselves to a quiet place and rest a while." For many were coming and going, and they had no time to eat. Nʼoge ahụ, nʼihi na ọtụtụ ndị mmadụ na-abịa na-apụkwa nke mere na ha enweghị ohere iri nri, ọ sịrị ha, “Soronụ m, unu niile, ka anyị ga ebe dị jụụ, zuo ike nwa oge nta.”
32 And they went away in the boat to a desolate place by themselves. Ya mere ha pụrụ baa nʼime ụgbọ mmiri gaa nʼebe ha ga-anọdụrụ naanị onwe ha.
33 Many saw them leave and recognized them; they ran on foot from every town and got there ahead of them. Ma ọtụtụ mmadụ ndị hụrụ ha mgbe ha na-apụ matara ha, sitekwara nʼobodo niile dị ebe ahụ gburugburu gbara ọsọ gbaruo ebe ahụ tupu ya na ndị na-eso ụzọ ya abịaruo.
34 Stepping ashore, he saw a large crowd and felt compassion for them, for they were like sheep without a shepherd, and began teaching them many things. Mgbe o sitere nʼụgbọ mmiri rịdata, ọ hụrụ oke igwe mmadụ a ka ha zukọrọ. O nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, nʼihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. Ọ malitekwara izi ha ọtụtụ ihe.
35 When it was already late, his disciples came to him and said, "This is an isolated place, and it's already late. Nʼoge a, ọchịchịrị ebidola ịgba, nʼihi ya, ndị na-eso ụzọ ya bịara gwa ya, “Ebe a bụ ọzara, chi ejiekwala.
36 Send them away to go into the surrounding countryside and villages and buy themselves something to eat." Zilaga ndị a, ka ha gaa nʼobodo nta ndị dị gburugburu ebe a, zụtara onwe ha ihe ha ga-eri.”
37 He replied, "You give them something to eat." They said, "Should we go buy 200 denarii of bread and give them it to eat?" Ma ọ zara sị ha, “Nyenụ ha ihe ha ga-eri.” Ha sịrị ya, “Anyị ga-eje ịzụta ogbe achịcha nke narị denarị abụọ, iji nye ha ka ha rie?”
38 He asked them, "How many loaves do you have? Go and see." They found out and said, "Five, and two fish." Ma ọ jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere? Gaanụ chọpụta.” Mgbe ha chọpụtasịrị, ha sịrị, “Ogbe achịcha ise na azụ abụọ.”
39 Then he commanded them all to sit down in groups on the green grass. Mgbe ahụ o nyere ha iwu ka ha mee igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼotu nʼotu nʼelu ahịhịa ndụ.
40 So they sat down in groups, by hundreds and by fifties. Ya mere, ha nọdụrụ ala, iri mmadụ ise nʼotu ebe, narị mmadụ nʼebe ọzọ.
41 Taking the five loaves and two fish, he looked up to heaven, gave thanks and broke the loaves, gave them to the disciples to set before the people, and divided the two fish among them all. Ọ naara ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, welie anya ya elu, nye ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ. Otu aka ahụkwa ọ nyawakwara azụ abụọ ahụ nyekwa ha niile.
42 And they all ate and were satisfied. Ha niile riri rijuo afọ.
43 And they took up twelve baskets full of broken pieces and of the fish. Ha tụtụkọtara iberibe achịcha na azụ tụtụjuo nkata iri na abụọ.
44 And those who ate the loaves were 5,000 men. Ọnụọgụgụ ndị nwoke riri ogbe achịcha ahụ dị puku mmadụ ise.
45 At once he made his disciples board the boat and go ahead to the other side, toward Bethsaida, while dismissing the crowd. Ngwangwa, o mere ka ndị na-eso ụzọ ya banye nʼụgbọ mmiri buru ya ụzọ gafee nʼofe nke ọzọ nke osimiri Betsaida, ebe ya onwe ya nọdụrụ izilaga igwe mmadụ ahụ.
46 And after he had taken leave of them, he went up on the mountain to pray. Mgbe ndị a niile lachara, ọ rigooro nʼelu ugwu ikpe ekpere.
47 When evening came, the boat was out on the sea, and he was alone on the land. Mgbe uhuruchi bịara, ụgbọ mmiri ahụ nọ nʼetiti osimiri, ma naanị ya onwe ya nọ nʼelu ala.
48 He saw them straining at the oars, for the wind was against them. Around three in the morning he came to them, walking on the sea. He meant to pass by them, Mgbe ọ hụrụ na ha nọ na nsogbu nʼihi na ikuku na-emegide ha, nʼihe dị ka elekere atọ nke ụtụtụ, o bidoro ịga ije nʼelu mmiri ịbịakwute ha, ma o mere dị ka ọ chọrọ ịgafe ha.
49 but seeing him walk on the sea, they thought it was a ghost and cried out, Ma mgbe ha hụrụ ya ka ọ na-aga ije nʼelu osimiri, ha chere na ọ bụ mmụọ, tie mkpu akwa.
50 for all saw him and were terrified; but immediately he spoke to them, saying, "Take heart; it is I. Do not be afraid." Nʼihi na ha niile hụrụ ya, oke ụjọ tụkwara ha. Na-atụfughị oge, ọ gwara ha sị, “Nweenụ obi ike! Ọ bụ m. Unu atụla egwu.”
51 He got into the boat with them, and the wind stopped; they were completely amazed among themselves, Emesịa, ọ rịgokwuru ha nʼime ụgbọ mmiri ahụ, otu mgbe ahụ ikuku ahụ dara juu. Ihe ndị a jukwara ha anya nke ukwuu.
52 for they did not understand about the loaves, but their hearts were hardened. Obi ha mechiri emechi nʼihi na ha aghọtaghị ihe banyere ọrụ ebube ogbe achịcha ndị ahụ.
53 When they had crossed over, they came to land at Gennesaret and moored to the shore. Mgbe ha gafere nʼofe nke ọzọ, ha rutere nʼala Genesaret ebe ha kedoro ụgbọ ha.
54 And when they got out of the boat, the people immediately recognized him. Ma ngwangwa ha pụtara nʼụgbọ, ndị nọ nʼebe ahụ matara onye ọ bụ.
55 They ran through that whole region and began carrying the sick on mats to wherever they heard he was. Ha gbaara ọsọ gaa nʼobodo nta niile dị ebe ahụ gburugburu butere ya ndị ọrịa nʼute ebe ọbụla ha nụrụ na ọ nọ.
56 Wherever he went—villages, towns, countryside—they laid the sick in the marketplaces, begging to touch just the edge of his cloak. All who touched it were healed. Ebe ọbụla ọ bara, nʼobodo ukwu maọbụ na obodo nta, maọbụ nʼubi, ndị mmadụ na-ebute ndị ọrịa nibe ha nʼahịa. Ha rịọrọ ya ka o kwere ka ha metụ ọ bụladị ọnụnụ uwe ya aka; ndị niile metụrụ ya aka nwetara ọgwụgwọ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]