Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mark 5 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 They came to the other side of the sea, to the region of the Gerasenes. Ha gafere nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ nʼakụkụ obodo Gerazin.
2 As Jesus left the boat, a man with an unclean spirit met him at once, from the tombs. Mgbe Jisọs sitere nʼụgbọ ahụ pụta, otu nwoke mmụọ na-adịghị ọcha si nʼebe a na-eli ozu bịa zute ya.
3 He lived among the tombs, and no one could bind him anymore, not even with a chain. Nwoke a bi nʼetiti ili ndị ahụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ ike ya agbụ, ọ bụladị iji eriri igwe kee ya.
4 For he'd often been bound with shackles and chains, but tore the chains apart and shattered the shackles—no one had strength to subdue him. Nʼihi na e keela ya agbụ ụkwụ nʼaka ọtụtụ oge ma ọ dọbisiri eriri igwe ndị ahụ, gbajisiekwa mkpọrọ igwe dị ya nʼụkwụ. Ọ dịkwaghị onye nwere ike ijideli ya.
5 Night and day, among the tombs and on the mountains, he cried out constantly, cutting himself with stones. Ọ na-agagharị nʼetiti ili ahụ ehihie na abalị na nʼugwu dị ya gburugburu, na-eti mkpu, na-eji nkume dị nkọ na-egbukasị onwe ya ahụ.
6 And when he saw Jesus from a distance, he ran and fell down before him. Mgbe o sitere nʼebe dị anya hụ Jisọs, ọ gbaara ọsọ gaa gbuo ikpere nʼihu ya.
7 Shouting loudly, he said, "What do you want with me, Jesus, Son of the Most High God? I beg you by God, don't torment me!" O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ, Jisọs, Ọkpara Chineke Onye kachasị ihe niile elu? Eji m aha Chineke na-arịọ gị, biko, atala m ahụhụ.”
8 For Jesus had been saying to him, "Come out of the man, you unclean spirit!" Nʼihi na o nyela ya iwu sị, “Si nʼime nwoke a pụta, gị mmụọ na-adịghị ọcha!”
9 Jesus asked, "What is your name?" "Legion," he said, "we are many." Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ya sị, “Gịnị bụ aha gị?” Mmụọ ọjọọ ahụ zaghachiri ya sị, “Aha m bụ Lijiọn, nʼihi na anyị dị ọtụtụ.”
10 He kept begging him not to send them out of the region. Ma ọ rịọsiri ya arịrịọ ike ka ọ ghara ịchụpụ ha site nʼobodo ahụ.
11 Now a great herd of pigs was feeding there on the hillside. Igwe ezi nọ nso nʼebe ahụ na-akpa nri, na ndịda ugwu dị nʼebe ahụ.
12 And they begged him, "Send us to the pigs; let us enter them." Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ ya sị, “Biko ziga anyị nʼetiti igwe ezi ndị a, ma hapụ anyị ka anyị banye nʼime ha.”
13 He gave permission. The unclean spirits came out and entered the pigs; the herd—about 2,000—rushed down the cliff into the sea and drowned in the sea. Ọ hapụrụ ha; mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha pụtara baa nʼime igwe ezi ndị ahụ. Igwe ezi ahụ niile, ọnụọgụgụ ha ruru puku abụọ, gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri dakpuo nʼime osimiri ebe mmiri riri ha niile.
14 The herders fled and told it in town and country; people came to see what happened. Ndị na-elekọta igwe ezi ahụ gbaara ọsọ laa, kọsaa ihe mere nʼime obodo nakwa nʼala ahụ niile. Nʼihi nke a, ọtụtụ mmadụ pụtara ilere ihe mere.
15 They came to Jesus and saw the man who had been possessed by the demons, the one who'd had the legion, sitting there, dressed and thinking clearly—and they were afraid. Ha bịakwutere Jisọs, hụ nwoke ahụ nke igwe mmụọ ọjọọ bibu nʼime ya. O yi uwe, nọdụ ala, bụrụkwa onye uche ya zuruoke; egwu jidere ha.
16 Eyewitnesses told them what had happened to the demon-possessed man, and about the pigs. Ndị hụrụ ihe mere kọọrọ ihe niile mere nwoke ahụ mmụọ ọjọọ bibu nʼime ya. Ha kọkwaara ihe mere igwe ezi ndị ahụ.
17 And they began to beg Jesus to leave their region. Mgbe ahụ, ha bidoro ịrịọ Jisọs ka ọ pụọra ha nʼakụkụ ala ha.
18 As he was getting into the boat, the once-possessed man begged to be with him. Dị ka ọ na-achọ ịbanye nʼime ụgbọ, nwoke ahụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ bibu nʼime ya rịọrọ ya ka o soro ha.
19 But Jesus refused, telling him instead, "Go home to your own people and tell them how much our Father has done for you, and how he has had mercy on you." Ma Jisọs ekweghị, kama ọ sịrị ya, “Laa nʼụlọ, lakwuru ndị enyi gị, kọọrọ ha ihe ọma Onyenwe anyị meere gị, na otu o si meere gị ebere.”
20 He went and began proclaiming in the Decapolis all Jesus had done for him, and everyone was amazed. Ya mere, o si nʼebe ahụ pụọ, malitekwa ịkọsa nʼime mpaghara Dekapọlịs ihe ọma Jisọs meere ya. Ihe a juru mmadụ niile anya.
21 When Jesus crossed again by boat to the other side, a large crowd gathered around him by the sea. Mgbe Jisọs jiri ụgbọ mmiri gafee nʼakụkụ nke ọzọ, ọtụtụ igwe mmadụ zukọrọ gbaa ya gburugburu mgbe ọ nọ nʼakụkụ osimiri.
22 One of the synagogue leaders, named Jairus, came, saw Jesus, and fell at his feet, Ma otu nʼime ndịisi ụlọ ekpere nke aha ya bụ Jairọs bịara, mgbe ọ hụrụ ya, ọ dara nʼala nʼụkwụ ya,
23 and begged him urgently, "My little daughter is dying. Come, lay your hands on her, so she may be healed and live." rịọsie ya arịrịọ ike sị, “Ada m nwanyị nke nta nọ nʼọnụ ọnwụ ugbu a. Biko, bịa ka ị bikwasị ya aka gị ka agwọ ya, ka ọ dịkwa ndụ.”
24 So Jesus went with him. And a great crowd followed him and pressed around him. Ya mere, Jisọs soro ya gawa. Oke igwe mmadụ sokwa ya na-akpagbu ya.
25 And there was a woman with a discharge of blood that had gone on for twelve years. Ma otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ.
26 She had suffered much under many doctors, spent all she owned, gained nothing, and only grew worse. Ọ taala ahụhụ dị ukwuu nʼaka ndị dibịa, mefukwaa ihe niile o nwere. Ma kama ọrịa ya ịdị mma, ọ na-aga nʼihu ịdị njọ.
27 Hearing about Jesus, she came up behind him in the crowd and touched his cloak. Ebe ọ nụrụla akụkọ banyere Jisọs, o sooro igwe mmadụ ndị ahụ, sitere nʼazụ metụ uwe ya aka.
28 For she kept saying, "If I just touch his garments, I will be made well." Nʼihi na o kwuolarị nʼime obi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m enwe ike metụ naanị uwe ya aka, a ga-agwọkwa m.”
29 Her flow of blood dried up instantly, and she felt in her body that she was healed of her suffering. Ngwangwa oruru ọbara ya kwụsịrị. Ọ matakwara nʼime onwe ya na ya enwerela onwe ya site nʼọrịa ya.
30 At once Jesus, aware that power had left him, turned around in the crowd and asked, "Who touched my clothes?" Nʼotu oge ahụ Jisọs matara na ike esitela ya nʼahụ pụọ. Ọ tụgharịrị gburugburu nʼetiti igwe mmadụ ahụ jụọ sị, “Onye metụrụ uwe m aka?”
31 His disciples said to him, "You see the crowd crushing you, yet you ask, 'Who touched me?'" Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Lee ọtụtụ igwe mmadụ gbara gị gburugburu, i sikwa aṅaa na-ajụ, ‘Onye metụrụ uwe m aka?’ ”
32 And he looked around to see who had done it. Ma Jisọs gara nʼihu na-ele anya gburugburu ịhụ onye mere ya.
33 But the woman, afraid and trembling, knowing what had happened to her, came, fell before him, and told him the whole truth. Ma nwanyị ahụ, ebe ọ matara ihe mere nʼahụ ya, bịara nʼegwu nʼịma jijiji daa nʼụkwụ ya, gwa ya eziokwu niile.
34 He told her, "Daughter, your faith made you well. Go in peace, healed of your suffering." Ọ sịrị ya, “Ada m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Laa nʼudo nwerekwa onwe gị site nʼọrịa gị.”
35 While he was still speaking, people came from the synagogue leader's house, saying, "Your daughter has died. Why bother the Teacher any longer?" Mgbe ọ ka nọ na-ekwu okwu, ụfọdụ ndị mmadụ sitere nʼụlọ onyeisi ụlọ ekpere bịara sị, “Ada gị nwanyị anwụọla, olee ihe mere i ji esogbu onye ozizi a ọzọ?”
36 But Jesus overheard what they said and told the synagogue leader, "Don't fear, only believe." Ma ka ọ nụrụ ihe ha kwuru, Jisọs gwara onyeisi ụlọ ekpere ahụ sị ya, “Atụla egwu, naanị kwere.”
37 And he allowed no one to follow him except Peter, James, and John the brother of James. O kweghị ka onye ọbụla ọzọ soro ya ma ọ bụghị Pita, na Jemis na Jọn nwanne Jemis.
38 They came to the synagogue leader's house and Jesus saw chaos—people weeping, wailing loudly. Mgbe ha bịarutere nʼụlọ onyendu ụlọ ekpere ahụ, ọ nụrụ ụzụ hụkwa ọtụtụ mmadụ ka ha nọ na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa.
39 Entering, he said to them, "Why this commotion and crying? The child isn't dead, just asleep." Mgbe ọ batara, ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa? Nwatakịrị a anwụghị anwụ, ọ na-arahụ ụra!”
40 They laughed at him. But he sent them all out, took the child's father and mother and his companions, and entered where the child was. Ma ha chịrị ya ọchị. Mgbe ọ chụpụsịrị ha niile nʼezi, ọ kpọọrọ nne na nna nwantakịrị ahụ, na ndị ya na ha so, banye nʼime ụlọ ebe nwantakịrị ahụ dina.
41 He took her hand and said to her, "Talitha koum," which means, "Little girl, I say to you, get up!" O jidere ya nʼaka sị ya, “Talita koum!” (nke pụtara, “Nwa agbọghọ nta, asị m gị bilie!”).
42 At once the girl got up and walked—for she was twelve—and they were instantly overwhelmed with great amazement. Otu mgbe ahụ nwaagbọghọ nta ahụ biliri ọtọ bido ijegharị (ọ gbara afọ iri na abụọ). Nke a jụrụ ha niile anya nke ukwuu.
43 He strictly ordered them to tell no one of this, and said to give her something to eat. Ma ọ dọsiri ha aka na ntị ike, ka ha ghara ịgwa onye ọbụla ihe mere. Ọ sịrị ha, “Nyenụ ya nri ka o rie.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]