Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mark 4 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Jesus again taught by the sea. So large a crowd gathered around him that he got into a boat on the water and sat, while the whole crowd was on land by the sea. Nʼoge ọzọ, ọ malitere izi ihe nʼakụkụ osimiri. Igwe mmadụ dị ukwuu gbara ya gburugburu, nke mere na ọ banyere nʼime ụgbọ nọdụ ala nʼime ya nʼelu mmiri ahụ, ma igwe mmadụ ahụ nọkwa nʼakụkụ osimiri ahụ.
2 He taught them many things in parables, and in his teaching he said to them: O bidoro i kuziri ha ọtụtụ ihe nʼilu, ma nʼozizi ya, ọ sịrị ha,
3 "Listen! A sower went out to sow. “Geenụ ntị! Otu onye ọrụ ubi pụrụ gaa ịkụ mkpụrụ ya.
4 And as he sowed, some seed fell along the path, and the birds came and devoured it. Mgbe ọ na-agha mkpụrụ, ụfọdụ mkpụrụ dara nʼakụkụ ụzọ, ụmụ nnụnụ bịara tụtụrịa ha.
5 Other seed fell on rocky ground, lacking much soil, and sprang up at once since the soil had no depth. Ụfọdụ mkpụrụ dara nʼala nkume, ebe aja ntakịrị dị. Ha puputara ngwangwa nʼihi na ala dị nʼebe ahụ emighị emi.
6 When the sun rose, the plants were scorched, and since they had no root, they withered. Ma mgbe anwụ wara, ọ chagburu ha, ha kpọnwụọ nʼihi na ha enweghị mgbọrọgwụ.
7 Other seed fell among thorns, and the thorns grew up and choked it, yielding no grain. Mkpụrụ ndị ọzọ dara nʼetiti ogwu; ogwu ahụ tolitere kpagbuo ha. Ha amịkwaghị mkpụrụ.
8 Other seed fell into good soil, producing grain that sprouted, grew, and yielded thirty, sixty, one hundred times what was sown." Mkpụrụ ndị ọzọ nke dara nʼezi ala, puru, tolite, ma mịa mkpụrụ na mmụba iri atọ, iri isii, ọ bụladị otu narị.”
9 And he said, "Whoever has ears to hear, let him hear." Ọ sịrị ha, “Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”
10 When he was alone, those around him, together with the Twelve, asked him about the parables. Ma mgbe ọ nọ naanị ya, ndị ozi iri na abụọ ahụ na ndị ọzọ nọ ya gburugburu jụrụ ya ajụjụ banyere ilu ahụ.
11 He said to them, "To you is given the secret of the kingdom of our Father, but to those outside, everything comes in parables, Ọ gwara ha sị, “Enyela unu ihe omimi nke alaeze Chineke. Ma ndị nọ nʼezi, a na-agwa ha ihe niile nʼilu,
12 so that 'they may look but not perceive, and hear but not understand, and not turn and be forgiven.'" nke mere na, “ ‘Ha ga na-ele anya, hụkwa, ma ha agaghị ahụ ihe ọbụla, ha ga na-anụ, nụkwa, ma ha agaghị aghọta ihe ọbụla, ma ọ bụghị ya, ha nwere ike chigharịa bụrụ ndị a gbaghaara.’ ”
13 He said to them, "You don't understand this parable? Then how will you understand all the parables? Mgbe ahụ, ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ na unu aghọtaghị ilu a? Unu ga-esikwa aṅaa ghọta ilu ndị ọzọ?
14 The sower sows the word. Ọgha mkpụrụ ahụ na-agha okwu Chineke.
15 These are the ones on the path where the word is sown: once they hear, Satan comes immediately and takes away the word sown in them. Mmadụ ụfọdụ dị ka mkpụrụ ndị ahụ dara nʼakụkụ ụzọ, ebe a kụrụ okwu ahụ. Ngwangwa ha nụrụ ya, ekwensu na-abịa napụ ha okwu ahụ nke a kụrụ nʼime ha.
16 These are the ones sown on rocky ground, who hear the word and immediately receive it with joy. Ndị ọzọ dị ka mkpụrụ a kụrụ nʼala nkume. Ha nụrụ okwu ahụ, were ọṅụ nabata ya nʼotu mgbe ahụ.
17 But they have no root in themselves, lasting only briefly; when trouble or persecution comes because of the word, they fall away at once. Ma ebe ha na-enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha, ha na-anọ nwa oge nta. Mgbe nsogbu maọbụ mkpagbu bịara nʼihi okwu ahụ, ngwangwa ha na-adachapụ.
18 And others are the ones sown among thorns. These are those who hear the word, Ndị nke ọzọkwa, dị ka mkpụrụ dara nʼetiti ogwu, nụrụ okwu ahụ;
19 but worries of this age, the deceit of wealth, and desires for other things enter and choke the word, and it produces no fruit. ma nchekasị nke ndụ a, na nghọgbu nke akụnụba, na oke ọchịchọ, nakwa ihe ndị ọzọ na-abata, kpagbuo okwu ahụ, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ.
20 And these are the ones sown on good soil: they hear the word, accept it, and produce fruit—thirty, sixty, one hundred times over." Ndị ọzọ, dị ka mkpụrụ a kụrụ nʼezi ala, nụrụ okwu ahụ, nabata ya ma mịa mkpụrụ dị iri atọ, iri isii, maọbụ otu narị.”
21 He told them, "Does anyone bring in a lamp to put it under a basket or bed—not on a stand? Ọ sịrị ha, “A na-ebute oriọna ka e jiri efere kpuchie ya maọbụ dọnye ya nʼokpuru akwa ndina? Ọ bụghị ka a dọba ya nʼelu ihe ịdọba iheọkụ?
22 Nothing is hidden except to be revealed; nothing is secret except to surface. Nʼihi na ihe niile e zoro ezo ga-apụta ihe ma ihe niile e kpuchiri ekpuchi ka a ga-emesịa kpughee.
23 If anyone has ears to hear, let him hear." Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”
24 He told them, "Watch what you hear. The measure you use will be measured to you—and more added. Ọ sịrị ha, “Kpacharanụ anya ihe unu na-anụ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu, maọbụ karịa.
25 For whoever has will be given more; whoever doesn't, even what he has will be taken from him." Onye nwere ihe ka a ga-enye karịa; onye na-enweghị, ọ bụladị nke o nwere ka a ga-anapụ ya.”
26 He said, "This is what the kingdom of our Father is like: a man scatters seed on the ground. Ọ sịkwara, “Alaeze Chineke yiri ihe dị otu a. Ọ dịka mgbe otu onye ghara mkpụrụ nʼala ubi.
27 Night and day, asleep or awake, the seed sprouts and grows, though he doesn't know how. Ehihie na abalị, ma ọ nọ nʼụra ma o tetara, mkpụrụ ahụ na-epupụte na-etokwa, ma ọ maghị ka o si na-eme.
28 The soil yields grain on its own—first blade, then head, then full kernel in the head. Ala ahụ nʼonwe ya na-eme ka mkpụrụ ahụ puo. Ọ na-epupụte na mbụ, too oko, emesịa isi ọka, nʼikpeazụ ọ mịkwara mkpụrụ kara aka nʼoko ya.
29 But when the grain ripens, he immediately sends the sickle, since harvest has come." Mgbe ọka ahụ chara ịghọ ya, o na-eji mma iwe ihe ubi ya bịa gbutuo ọka ahụ, ghọrọkwa ogbe ọka laa, nʼihi na oge iwe ihe nʼubi eruola.”
30 He said, "What can we compare the kingdom of our Father to, or what parable can we use for it? Ọzọkwa, ọ sịrị, “Gịnị ọzọ ka anyị pụrụ ịsị na alaeze Chineke yiri? Ụdị ilu dị aṅaa ka anyị ga-eji kọwaa ya?
31 It's like a mustard seed, the smallest of all seeds when sown on the ground. Ọ dị ka mkpụrụ mọstaadị, nke bụ mkpụrụ dịkarịsịrị nta nke a na-akụ nʼala.
32 Yet once sown, it grows up and becomes the largest of all garden plants, producing branches so big that birds of the air can nest in its shade." Ma mgbe a kụrụ ya, ọ na-eto bukarịa ihe niile a kụrụ nʼubi, ọ na-enwe alaka dị ukwuu nke bụ na ụmụ anụ ufe nke eluigwe na-ezukwa ike nʼokpuru ya.”
33 With many such parables he spoke the word to them, as they were able to hear. O jiri ọtụtụ ilu yiri ndị a gwa ha okwu dị ka ha pụrụ ịghọta.
34 He spoke to them only in parables, but privately explained everything to his own disciples. O nweghị oge ọbụla ọ gwara ha okwu hapụ iji ilu. Ma ya na ndị na-eso ụzọ ya naanị nọdụ, ọ na-akọwara ha ihe niile.
35 That day, when evening came, he said to them, "Let us cross over to the other side." Nʼụbọchị ahụ nʼoge uhuruchi, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ.”
36 They left the crowd and took him along, just as he was, in the boat, other boats accompanying him. Ha hapụrụ igwe mmadụ ahụ ma kpọrọ ya, otu ọ dị, ya na ha banyere nʼime ụgbọ. Ụgbọ ndị ọzọ dịkwa na-eso ya.
37 A fierce windstorm came up. Waves broke over the boat, so that it was already being swamped. Oke ifufe dị ike bidoro ife, ebili mmiri na-awụbakwa nʼụgbọ ahụ ruo na ụgbọ ha fọdụrụ ntakịrị ka mmiri mie ya.
38 But Jesus was asleep in the stern on the cushion. They woke him and said, "Teacher, don't you care that we're dying?" Ma Jisọs nọ nʼazụ azụ ụgbọ ahụ na-arahụ ụra nʼelu ohiri isi. Ndị na-eso ụzọ ya kpọtere ya sị ya, “Onye ozizi, o metụghị gị nʼobi na anyị nʼala nʼiyi?”
39 He got up, rebuked the wind, and told the sea, "Peace! Be still!" The wind stopped, and it grew totally calm. Ọ biliri ọtọ, baara ifufe ahụ mba sịkwa osimiri ahụ, “Kwụsị! Dere jii!” Ifufe ahụ kwụsịrị, ebe niile dajụrụ deere jii.
40 He said to them, "Why are you so afraid? Do you still have no faith?" Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Gịnị mere unu ji atụ oke egwu? Ọ bụ na unu enwebeghị okwukwe?”
41 They were terrified and asked one another, "Who then is this, that even the wind and the sea obey him?" Ha niile tụrụ egwu, jụrịta onwe ha sị, “Onye bụ onye a? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-erubere ya isi!”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]