Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mark 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Once again Jesus entered the synagogue, and a man with a withered hand was there. Nʼoge ọzọ, ọ banyere nʼụlọ ekpere, otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ nọkwa nʼebe ahụ.
2 They watched closely to see if he'd heal the man on the Sabbath, to accuse Jesus. Ụfọdụ ha nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi boo ya ebubo, ya mere ha lekwasịrị ya anya ịhụ ma ọ ga-agwọ ya ọrịa nʼụbọchị izuike.
3 Jesus said to the man with the withered hand, "Stand up and come forward." Ma ọ gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị, “Bilie guzoro nʼetiti ebe a.”
4 Then he asked them, "Is it lawful on the Sabbath to do good or to do harm, to save life or to kill?" But they stayed silent. Mgbe ahụ ọ jụrụ ha sị, “Olee nke ziri ezi nʼiwu ime nʼụbọchị izuike: ọ bụ ime ezi ihe ka ọ bụ ime ihe ọjọọ, ịzọpụta ndụ ka ọ bụ ịla ndụ nʼiyi?” Ma ha gbachiri nkịtị.
5 He looked around at them in anger, grieved by their hardness of heart, and told the man, "Stretch out your hand." He stretched it out, and his hand was restored. O lere ha anya nʼiwe, o wutere ya nʼihi na obi ha kpọrọ nkụ. Ọ sịrị nwoke ahụ, “Setịpụ aka gị.” O setịpụrụ aka ya, aka ya dizikwara nke ọma.
6 Then the Pharisees went out and immediately began plotting with the Herodians how they might destroy him. Ngwangwa, ndị Farisii sitere nʼebe ahụ pụọ nʼiwe. Gaa soro ndị otu Herọd gbaa izu otu ha ga-esi laa ya nʼiyi.
7 Jesus withdrew with his disciples to the sea; a large crowd from Galilee followed, and from Judea, Ma Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya sitere nʼebe ahụ pụọ gaa nọdụ nʼakụkụ osimiri. Igwe mmadụ ndị sitere na Galili sooro ya.
8 from Jerusalem, Idumea, beyond the Jordan, and the region around Tyre and Sidon—hearing all he was doing, a great crowd came to him. Mgbe ha nụrụ ihe niile ọ na-eme, ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya site na Judịa, na Jerusalem, na Idumia na obodo ndị dị nʼofe Jọdan, na gburugburu Taịa na Saịdọn.
9 He told his disciples to keep a small boat ready, because of the crowd, so they wouldn't crush him. Nʼihi ịdị ukwuu nke igwe mmadụ ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha debere ya ụgbọ mmiri nta nso ka ọ banye, iji gbochie igwe mmadụ ahụ ịkpagbu ya.
10 For he had healed so many that all who had diseases were pressing forward to touch him. Nʼihi na ọ gwọọla ọtụtụ ndị ọrịa, nke mere na ndị bu ọrịa dị iche iche na-agbalịsị ike ịmetụ ya aka.
11 Whenever the unclean spirits saw him, they fell before him, shouting, "You are the Son of God!" Mgbe ọbụla kwa ndị mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ha hụrụ ya, ha na-ada nʼala nʼihu ya na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara Chineke!”
12 But he firmly warned them not to reveal him. Ma ọ na-enyesi ha iwu ike ka ha hapụ ịkọwa onye ọ bụ.
13 Jesus went up the mountain and called those he wanted; they came to him. Ọ rigooro nʼelu ugwu ma kpọrọ ndị ọ chọrọ nye onwe ya. Ha bịakwutekwara ya.
14 He appointed twelve, named apostles, so they could be with him and he could send them out to preach, Ọ họpụtara mmadụ iri na abụọ ndị ya na ha ga-anọ, mee ha ndị ozi. Ndị ọ ga-ezipụ ikwusa oziọma,
15 and to have authority to drive out demons. nakwa ndị ga-enwe ikike ịchụpụ mmụọ ọjọọ.
16 These are the twelve he appointed: Simon, to whom he gave the name Peter; Ndị a bụ mmadụ iri na abụọ ndị ọ họpụtara. Saimọn (onye ọ kpọrọ Pita).
17 James son of Zebedee, and John his brother, whom he named Boanerges, meaning Sons of Thunder; Jemis nwa Zebedi na Jọn nwanne ya (ndị ọ gụgharịrị aha Boanajis, nke pụtara “ụmụ egbe eluigwe”),
18 Andrew, Philip, Bartholomew, Matthew, Thomas, James son of Alphaeus, Thaddaeus, Simon the Zealot, Andru, Filip, Batalomi, Matiu, Tọmọs, Jemis nwa Alfiọs, Tadiọs, Saimọn onye a na-akpọ Zilọt,
19 and Judas Iscariot, who betrayed him. na Judas Iskarịọt, onye raara ya nye.
20 He went home; the crowd gathered again, so he and his disciples couldn't even eat. Emesịa, ọ lọtara nʼụlọ, ma igwe mmadụ gbakọtakwara ọzọ nke mere na ha enweghị ohere iri nri.
21 When his family heard, they went out to restrain him, for they said, "He's out of his mind." Mgbe ndị ikwu ya nụrụ nke a, ha bịara gbalịa idulata ya nʼụlọ ha, nʼihi na ndị mmadụ na-asị, “Isi adịghị ya mma.”
22 The scribes who came down from Jerusalem said, "He has Beelzebul," and, "By the prince of demons he drives out demons." Ma ndị ozizi iwu si Jerusalem bịa sịrị, “Mmụọ Belzebub bi nʼime ya! Ọ bụkwa nʼike onyeisi ndị mmụọ ọjọọ ka o ji achụpụ mmụọ ọjọọ.”
23 So Jesus called them to him and spoke in parables: "How can Satan drive out Satan? Ma ọ kpọrọ ha jiri ilu gwa ha okwu sị, “Ekwensu ọ pụrụ ịchụpụ ekwensu?
24 If a kingdom is divided against itself, that kingdom cannot stand. Ọ bụrụ na alaeze ekewa megide onwe ya alaeze ahụ apụghị iguzo.
25 And if a house is divided against itself, that house will not be able to stand. Ọ bụrụ na ezinaụlọ ekewa megide onwe ya, ezinaụlọ ahụ apụghị iguzo.
26 And if Satan opposes himself and is divided, he cannot stand; his end has come. Ọ bụrụkwa na ekwensu ebilie megide onwe ya si otu a nwee nkewa, o nweghị ike iguzo; kama ọgwụgwụ oge ya abịala nso.
27 No one can enter a strong man's house and take his goods without first tying up the strong man—then he can plunder the house. Nʼezie, ọ dịghị onye nwere ike ịbanye nʼụlọ nwoke dị ike kwakọrọ ngwongwo ya niile, ma o bughị ụzọ kee nwoke ahụ siri ike agbụ. Mgbe ahụ ọ ga-enwe ike ịbanye nʼụlọ ya, zukọrọ ngwongwo ya niile.
28 Truly I tell you, all sins and insults against God will be forgiven children of mankind, whatever they say, Nʼezie agwa m unu, na a ga-agbaghara ụmụ mmadụ mmehie na nkwulu niile nke ha kwuru.
29 but whoever blasphemes against the Holy Spirit never has forgiveness; they are guilty of an eternal sin," Ma onye ọbụla ga-ekwulu Mmụọ Nsọ, enweghị ike ịgbaghara ya. Ọ bụ onye ikpe mmehie ebighị ebi mara.”
30 for they were saying, "He has an unclean spirit." O kwuru nke a nʼihi na ha na-asị, “Mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya.”
31 His mother and brothers arrived and, standing outside, sent to him, calling him. Mgbe ahụ, nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke bịara, guzoro nʼezi. Ha ziri ozi ka a kpọọ ya.
32 A crowd sat around him and said to him, "Look, your mother and your brothers are outside, asking for you." Igwe mmadụ gbara ya gburugburu mgbe ahụ gwara ya sị, “Lee, nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke na ndị nwanyị guzo nʼezi. Ha chọrọ ịhụ gị.”
33 He answered them, "Who are my mother and my brothers?" Ọ zara sị, “Onye bụ nne m, ndị ole bụkwa ụmụnne m ndị nwoke?”
34 Looking around at those sitting in a circle around him, he said, "Here are my mother and my brothers! Mgbe ahụ, o lere ndị nọ ya gburugburu anya ma sị, “Ndị a bụ nne m, na ụmụnne m ndị nwoke!
35 Whoever does the will of our Father is my brother and sister and mother." Onye ọbụla na-eme uche Chineke bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, na nne m.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]