Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mark 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 A few days later, when Jesus came back to Capernaum, word spread that he was home. Mgbe ụbọchị ole na ole gafesịrị, ọ bataghachiri na Kapanọm. Ndị mmadụ nụrụ na ọ lọghachila.
2 So many gathered that there was no room left, not even at the door, and he was speaking the word to them. Igwe mmadụ zukọtara nʼime ụlọ ahụ nke mere na ohere afọdụghị ọ bụladị nʼọnụ ụzọ. O kwusakwaara ha oziọma.
3 Then some men came, bringing to him a paralyzed man carried by four of them. Ndị ikom ụfọdụ buteere ya otu nwoke ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ bụ mmadụ anọ bu ya.
4 Unable to bring him to Jesus because of the crowd, they removed the roof over him, dug through it, and lowered the mat the paralyzed man lay on. Ebe ha na-enweghị ike ibutere ya Jisọs nʼihi igwe mmadụ, ha gwupuru oghere nʼelu ụlọ ebe ahụ ọ nọ. Mgbe ha gwupusiri ya, ha budatara onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nʼute o jiri dina.
5 When Jesus saw their faith, he said to the paralyzed man, "Son, your sins are forgiven." Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ha, ọ sịrị onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Nwa m nwoke, agbagharala gị mmehie gị.”
6 Now some of the scribes were sitting there, reasoning in their hearts, Ma ụfọdụ ndị ozizi iwu nọdụrụ ala nʼebe ahụ na-eche nʼime obi ha sị,
7 "Why does this man speak this way? He is blaspheming! Who can forgive sins but God alone?" “Gịnị mere onye a ji na-ekwulu Chineke? Onye pụrụ ịgbaghara mmehie ma ọ bụghị naanị Chineke?”
8 Immediately Jesus knew in his spirit they were reasoning this way within themselves, and said to them, "Why are you reasoning these things in your hearts? Ngwangwa Jisọs matara nʼime mmụọ ya na ha na-atule okwu a nʼime obi ha. Ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-eche ihe dị otu a nʼobi unu?
9 Which is easier—telling the paralyzed man, 'Your sins are forgiven,' or, 'Get up, take your mat, and walk'? Olee nke ka mfe: ọ bụ ịgwa onye a akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, ‘A gbagharala gị mmehie gị niile,’ ka ọ bụ i sị, ‘Bilie chịrị ute gị jegharịa?’
10 But so you'll know the Son of Man has authority on earth to forgive sins"—he told the paralyzed man, Ma igosi unu na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.” Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ,
11 "I say to you, get up, take your mat, and go home." “Ana m asị gị, bilie, chịrị ute gị laa nʼụlọ gị.”
12 He got up, immediately took his mat, and went out before them all, so that everyone was amazed and praised our Father, saying, "We've never seen anything like this." O biliri, chịrị ute ya pụọ nʼihu mmadụ niile. Nke a juru ndị niile nọ nʼebe ahụ anya. Ha toro Chineke na-asị, “Anyị ahụbeghị ihe dị otu a mbụ!”
13 Jesus went out beside the sea again; the whole crowd came to him, and he taught them. Emesịa, Jisọs pụrụ gaa nʼakụkụ osimiri ahụ. Igwe mmadụ bịakwutere ya. Ọ malitere izi ha ihe.
14 Passing by, he saw Levi son of Alphaeus sitting at the tax booth and said, "Follow me." He got up and followed him. Mgbe ọ na-aga nʼihu, ọ hụrụ Livayị nwa Alfiọs ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ. Ọ sịrị ya, “Soro m,” o biliri sooro ya.
15 While Jesus reclined at the table in Levi's house, many tax collectors and sinners reclined with Jesus and his disciples, since many were following him. Mgbe ọ na-eri nri uhuruchi nʼụlọ Livayị, ọtụtụ ndị ọna ụtụ na ndị mmehie soro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọrọ ebe ahụ, nʼihi na ndị na-esogharị ya dị ọtụtụ.
16 Seeing him eat with sinners and tax collectors, the Pharisees' scribes asked his disciples, "Why does he eat with tax collectors and sinners?" Mgbe ndị ozizi iwu nke ndị Farisii hụrụ ya ka o so ndị mmehie na ndị ọna ụtụ na-eri nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere o ji eso ndị mmehie na ndị ọna ụtụ na-erikọ nri?”
17 Hearing this, Jesus said to them, "The healthy don't need a doctor, but the sick do. I didn't come to call the righteous, but sinners." Mgbe ọ nụrụ nke a, Jisọs sịrị ha, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike. Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume kama ndị mmehie.”
18 John's disciples and the Pharisees were fasting. They came and asked him, "Why do John's disciples and the Pharisees' disciples fast, but yours don't?" Nʼoge a, ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị Farisii na-ebu ọnụ. Ndị mmadụ bịara jụọ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii ji ebu ọnụ, ma ndị nke gị adịghị ebu ọnụ?”
19 Jesus said to them, "Can wedding guests fast while the bridegroom is with them? As long as they have the bridegroom with them, they cannot fast. Jisọs sịrị ha, “O kwesiri na ndị a kpọrọ oriri ọlụlụ di na nwunye ga-ebu ọnụ mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọ nʼetiti ha? Ha apụghị ibu ọnụ ogologo oge ya na ha nọ.
20 But days will come when the bridegroom is taken from them; then, on that day, they will fast. Ma oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ onye na-alụ nwunye ọhụrụ. Nʼụbọchị ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.
21 No one sews unshrunk cloth on an old garment; otherwise the new patch tears away from the old, and the tear worsens. “Ọ dịghị onye na-eji akwa ọhụrụ kwachie ebe akwa ochie siri dọkaa. Ọ bụrụ na o mee nke a, akwa ọhụrụ ahụ ga-adọkapụ site na nke ochie mee ka ndọka ya dị njọ karịa.
22 No one puts new wine into old wineskins; the wine bursts the skins, and both are ruined. New wine goes into new wineskins." Ọ dịghị onye na-agbanye mmanya ọhụrụ na karama akpụkpọ ochie. O mee nke a, mmanya ahụ ga-agbawa karama akpụkpọ ochie ahụ, mee ka karama na mmanya laa nʼiyi. Ee, a na-agbanye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ.”
23 One Sabbath, he walked through the grainfields, and as they went, his disciples began picking heads of grain. Otu ụbọchị izuike, ya na ndị na-eso ụzọ ya na-agafe nʼubi a kụrụ ọka. Dị ka ha na-agafe, ndị na-eso ụzọ ya malitere ịghọ ụfọdụ ogbe ọka nʼime ọka ndị ahụ.
24 The Pharisees said to him, "Look, why are they doing what's not lawful on the Sabbath?" Ndị Farisii siri ya, “Lee, gịnị mere ha ji na-eme ihe megidere iwu nʼụbọchị izuike.”
25 And he said to them, "Have you never read what David did when he was in need and hungry, he and those with him, Ma ọ sịrị ha, “Unu agụtaghị ihe Devid na ndị so ya mere mgbe agụụ gụrụ ha?
26 how he entered the house of our Father in the days of Abiathar the high priest, ate the bread of the Presence—which only priests may eat—and gave some to those with him?" Nʼoge Abịata bụ onyeisi nchụaja, ọ banyere nʼụlọ Chineke taa achịcha e chere nʼihu ya, nke ziri ezi na ọ bụ naanị ndị nchụaja kwesiri ịta ya. O nyetụkwara ndị ya na ha so.”
27 And he said to them, "The Sabbath was made for people, not man for the Sabbath. Mgbe ahụ, ọ gwakwara ha sị, “E mere ụbọchị izuike maka mmadụ, emeghị mmadụ maka ụbọchị izuike.”
28 So the Son of Man is Lord even of the Sabbath." Ya mere, Nwa nke Mmadụ bụ Onyenwe ọ bụladị ụbọchị izuike.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]