Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mark 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The beginning of the gospel of Jesus Christ, the Son of our Father. Mmalite oziọma maka Jisọs Kraịst, Ọkpara Chineke.
2 As written in Isaiah the prophet: "Look, I send my messenger ahead of you, who will prepare your way. Dịka e dere ya rịị nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị, “Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị.”
3 A voice calling out in the wilderness: 'Prepare the way of the Lord, make his paths straight.'" “Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’ ”
4 John appeared, baptizing in the wilderness and proclaiming a baptism of repentance for the forgiveness of sins. Jọn omee baptizim pụtara na-eme baptizim nʼọzara, ma na-ekwusa baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie.
5 All Judea and everyone in Jerusalem went out to him, and he baptized them in the Jordan River as they confessed their sins. Ndị mmadụ si nʼakụkụ Judịa niile na ndị niile bi na Jerusalem pụrụ jekwuru ya. Ka ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan.
6 John was dressed in camel's hair, with a leather belt around his waist, eating locusts and wild honey. Uwe Jọn yi nʼahụ ya bụ nke e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike e ji akpụkpọ anụ mee nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ.
7 He announced: "After me comes one stronger than I; I'm not worthy to stoop and untie his sandal strap. O kwusara sị: “Onye dị ike karịa m na-abịa nʼazụ m. Onye m na-erughị ihudata ala tọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.
8 I have baptized you with water, but he will baptize you with the Holy Spirit." Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma ọ ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.”
9 In those days Jesus came from Nazareth of Galilee and was baptized by John in the Jordan. Nʼoge ahụ, Jisọs sitere na Nazaret nke Galili bịa nʼosimiri Jọdan, ebe Jọn mere ya baptizim.
10 Immediately, as he came up out of the water, he saw the heavens split open and the Holy Spirit come down on him like a dove. Ma mgbe o si nʼime mmiri ahụ na-apụta, ọ hụrụ ka eluigwe meghere. Hụkwa Mmụọ Nsọ dị ka nduru ka ọ rịdatara bekwasị ya nʼisi ya.
11 And a voice came from heaven: "You are my beloved Son; in you I delight." Otu olu si nʼeluigwe daa, “Ị bụ Ọkpara m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.”
12 And immediately the Holy Spirit drove him out into the wilderness. Ngwangwa, Mmụọ Nsọ duuru ya baa nʼime ọzara.
13 He was in the wilderness forty days, tempted by Satan, with the wild animals, and the angels served him. Ọ nọkwara nʼime ọzara ahụ iri ụbọchị anọ, ebe ekwensu nwara ya ọnwụnwa. Ya na ụmụ anụ ọhịa nọkwa. Ma ndị mmụọ ozi jeere ya ozi.
14 Now after John was arrested, Jesus came into Galilee, proclaiming the gospel of our Father, Mgbe e tinyesịrị Jọn nʼụlọ mkpọrọ, Jisọs gara na Galili, na-ekwusa oziọma Chineke.
15 and saying, "The time is fulfilled, and our Father's kingdom is near; repent and believe the good news." Ọ sịrị, “Oge ahụ eruola, alaeze Chineke dị nso. Chegharịanụ ma kwerekwanụ nʼoziọma.”
16 Passing the Sea of Galilee, he saw Simon and his brother Andrew casting a net in the sea, for they were fishermen. Mgbe Jisọs na-aga nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ Saimọn na Andru nwanne ya, ka ha na-awụnye ụgbụ ha nʼime mmiri nʼihi na ha bụ ndị ọkụ azụ.
17 And Jesus said to them, "Follow me, and I will make you become fishers of people." Jisọs siri ha, “Bịanụ soro m, m ga-emekwa unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.”
18 And immediately they left their nets and followed him. Ngwangwa ha hapụrụ ụgbụ azụ ha ma soro ya.
19 Going a little farther, he saw James son of Zebedee and John his brother in their boat, mending the nets. Mgbe ọ gatụrụ nʼihu nke nta, ọ hụrụ Jemis nwa Zebedi na nwanne ya bụ Jọn ndị nọ nʼime ụgbọ mmiri, na-ekezi ụgbụ azụ ha.
20 At once he called them; leaving their father Zebedee in the boat with the hired hands, they followed him. Ngwangwa, ọ kpọrọ ha, ha hapụrụ nna ha Zebedi na ndị o goro ọrụ nʼime ụgbọ soro ya.
21 They went to Capernaum. At once, on the Sabbath, he entered the synagogue and began teaching. Ha gara Kapanọm, mgbe ụbọchị izuike ruru, ọ bara nʼime ụlọ ekpere ma malite izi ha ihe.
22 They were amazed at his teaching, for he taught them with authority, not like the scribes. Ozizi ya juru ha anya nke ukwuu, nʼihi na o ziri ha ihe dịka onye nwere ikike, ọ bụghị dị ka nke ndị ozizi iwu.
23 And immediately there was in their synagogue a man with an unclean spirit, and he cried out. Ma nʼotu oge ahụ, otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ nke mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya, tiri mkpu nʼoke olu,
24 Why meddle with us, Jesus of Nazareth? Have you come to destroy us? I know who you are—God's Holy One! sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, gị Jisọs onye Nazaret? Ị bịala ịla anyị nʼiyi? Amaara m onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke.”
25 But Jesus rebuked him, saying, "Be silent, and come out of him!" Ma Jisọs baara ya mba sị ya, “Mechie ọnụ sikwa nʼime ya pụta!”
26 And the unclean spirit, convulsing him and crying out with a loud voice, came out of him. Mmụọ ahụ na-adịghị ọcha seere ya, mee ka ahụ ya maa jijiji, o tiri mkpu nʼoke olu, ma sikwa nʼime ya pụta.
27 All were amazed, and they questioned each other: "What is this? A new teaching with authority - he commands even the unclean spirits, and they obey him!" Ha niile bụ ndị nọ nʼọnọdụ ihe iju anya ma na-ajụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a? Ozizi ọhụrụ ya na ikike! Ọ na-enye ọ bụladị mmụọ na-adịghị ọcha iwu. Ha na-erubekwara ya isi.”
28 And at once his fame spread everywhere throughout all the surrounding region of Galilee. Akụkọ banyere ya gbasara ngwangwa ruo akụkụ niile nke Galili.
29 Immediately he left the synagogue and went to Simon and Andrew's house, with James and John. Ngwangwa ha hapụrụ ụlọ ekpere ahụ, ha na Jemis na Jọn soro banye nʼụlọ Saimọn na Andru.
30 Now Simon's mother-in-law lay sick with a fever, and immediately they told him about her. Nʼoge a, nne nwunye Saimọn dina nʼakwa ndina. Ahụ ọkụ jikwa ya. Ha mere ka ọ mata banyere ya.
31 He came, took her hand, raised her up. The fever left her, and she served them. Ọ gakwuru ya, jide ya nʼaka selite ya elu. Ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya. Ọ malitekwara ile ha ọbịa.
32 That evening, when the sun set, they brought him all who were sick and those oppressed by demons. Nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dara, ha kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike na ndị mmụọ ọjọọ bi nʼime ha.
33 And the whole city was gathered together at the door. Obodo ahụ niile gbakọrọ nʼọnụ ụzọ.
34 He healed many sick with various diseases and drove out many demons, not letting the demons speak, since they knew him. Ọ gwọrọ ọtụtụ ndị bu ọrịa dị iche iche, ọ chụpụkwara ọtụtụ mmụọ ọjọọ ma o kweghị ka mmụọ ọjọọ ndị ahụ kwuo okwu nʼihi na ha matara onye ọ bụ.
35 Long before dawn, while still dark, he got up, went out to a deserted place, and prayed there. Nʼisi ụtụtụ, mgbe ọchịchịrị ka gbachiri, o biliri, ga ebe ọ ga-anọrọ onwe ya, naanị ya. Nʼebe ahụ kwa ka ọ nọ kpee ekpere.
36 And Simon and those who were with him searched for him, Saimọn na ndị ya na ha nọ pụrụ na-achọgharị ya.
37 and they found him and said to him, "Everyone is looking for you." Ma mgbe ha hụrụ ya, ha sịrị ya, “Mmadụ niile na-achọgharị gị!”
38 He said, "Let us go elsewhere, to the neighboring towns, so I can preach there too, for that is why I came." Ọ zaghachiri ha sị, “Ka anyị gaanụ ebe ọzọ, nʼobodo ndị ọzọ dị anyị gburugburu, ka m zisakwaara ha oziọma. Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji bịa.”
39 And he went throughout all Galilee, preaching in their synagogues and casting out demons. Ya mere, ọ pụrụ jegharịa na Galili niile na-ekwusa oziọma nʼụlọ ekpere ha niile, na-achụpụkwa mmụọ ọjọọ.
40 A man with leprosy came, knelt, and begged him, "If you're willing, you can make me clean." Otu onye ekpenta bịakwutere ya gbuo ikpere nʼala rịọọ ya sị, “Ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”
41 Moved with deep compassion, he stretched out his hand, touched him, and said to him, "I am willing; be clean." Ebe o jupụtara nʼọmịiko, Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị, “Achọrọ m, dị ọcha!”
42 And immediately the leprosy left him, and he was made clean. Ngwangwa ekpenta ya hapụrụ ya, e mekwara ka ọ dị ọcha.
43 Sternly warning him, he sent him away at once, Mgbe ahụ, Jisọs ji ịdọ aka na ntị zilaga ya,
44 and told him, "Make sure you tell no one—but go, show yourself to the priest, and offer what Moses commanded for your cleansing, as proof to the people." ọ gwara ya sị, “Hụkwa na ọ dịghị onye ọbụla ị ga-agwa ihe a. Kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị. Chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu, maka ime ka ị dị ọcha gị, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.”
45 But he went out, proclaiming it freely and spreading the news, so Jesus could no longer enter a town openly, but stayed in lonely places. Yet people came to him from everywhere. Ma ọ pụrụ malite ịkọsa akụkọ banyere ọgwụgwọ ya ebe niile. Nʼihi ya Jisọs enwekwaghị ike ịbanye nʼobodo, kama ọ gara nọrọ nʼebe zoro ezo. Ma ndị mmadụ na-abịakwutekwa ya site nʼebe niile dị iche iche.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]