Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Matthew 28 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 After the Sabbath, at dawn on the first day of the week, Mary Magdalene and the other Mary came to see the tomb. Mgbe ụbọchị izuike gasịrị, nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nʼime izu ụka, Meri Magdalin na Meri nke ọzọ, gara ka ha lee ili ahụ.
2 Suddenly a great earthquake struck, for an angel of our Father came down from heaven, rolled back the stone, and sat on it. Na mberede, oke ala ọma jijiji malitere. Nʼihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe rịdata, kpụgharịa nkume ahụ e ji mechie ọnụ ili ahụ, nọkwasịkwa nʼelu ya.
3 His appearance was like lightning, and his clothing white as snow. Ihu ya na-enwu dị ka amụma. Uwe ya na-achakwa ọcha dị ka akụmmiri igwe.
4 The guards trembled in fear of him and became like dead men. Nʼihi egwu ya, ndị nche makwara jijiji. Daa nʼala nọrọ dị ka ndị nwụrụ anwụ.
5 But the angel said to the women, "Don't be afraid, for I know you're looking for Jesus, who was crucified. Ma mmụọ ozi ahụ gwara ụmụ nwanyị ahụ sị ha, “Unu atụla egwu, nʼihi na amaara m na ọ bụ Jisọs onye a kpọgburu nʼelu obe ka unu na-achọ.
6 He isn't here—he's risen, as he said. Come, see the place where he was lying. Ọ nọkwaghị nʼebe a. O sitela nʼọnwụ bilie, dị ka o si kwuo. Bịanụ lee ebe ọ tọgbọburu.
7 Go quickly, tell his disciples: He has risen from the dead. Look, he is going ahead of you to Galilee; you will see him there. Listen, I have told you." Gaanụ ngwangwa gwa ndị na-eso ụzọ ya na e meela ka o si nʼọnwụ bilie. Lee, o burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya. Chetakwanụ ihe m gwara unu.”
8 So they left the tomb quickly, with fear and great joy, and ran to tell his disciples. Ha ji oke egwu na ọṅụ pụọ ọsịịsọ site nʼili ahụ, gbara ọsọ gawa ịkọrọ ndị na-eso ụzọ ya.
9 Suddenly Jesus met them, saying, "Greetings!" They came to him, grasped his feet, and worshiped him. Na mberede, Jisọs zutere ha sị ha, “Ndeewonụ!” Ha bịakwutere ya, jide ụkwụ ya abụọ aka, kpọọkwa isiala nye ya.
10 Then Jesus told them, "Don't be afraid. Go, tell my brothers to leave for Galilee—they will see me there." Ya mere Jisọs gwara ha sị, “Unu atụla egwu. Gaanụ, gwanụ ụmụnne m ka ha gaa Galili. Ha ga-ahụ m nʼebe ahụ.”
11 While on the way, some guards entered the city and reported to the chief priests all that had happened. Mgbe ha na-aga, ụfọdụ ndị agha chere ili ahụ nche batara nʼime obodo. Ha gara kọọrọ ndịisi nchụaja ihe niile mere.
12 After meeting with the elders and forming a plan, they paid the soldiers a large sum, Emesịa, ndị nchụaja na ndị okenye zukọtara kwekọrịtaa inye ndị agha ahụ ọkpụrụkpụ ego,
13 telling them, "Say: His disciples came at night and stole him while we slept. sị ha, “Ihe a ka unu ga-ekwu, ‘Ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼabalị zuru ya nʼohi mgbe anyị nọ na-arahụ ụra.’
14 If this reaches the governor, we'll persuade him and keep you free of trouble." Ọ bụrụ na nke a eruo gọvanọ ntị, anyị ga-emeta ya mma, ma mee ka unu pụọ na nsogbu.”
15 They took the money and did as they were told; this report spread among the Jews to this day. Ha naara ego ahụ, meekwa dị ka e ziri ha. Akụkọ a ka a gbasara nʼetiti ndị Juu ruo taa.
16 Then the eleven disciples went to Galilee, to the mountain where Jesus had directed them. Ma ndị ikom iri na otu ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ya gara Galili, nʼelu ugwu ebe Jisọs gwara ha gaa.
17 When they saw him, they worshiped him, but some doubted. Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọrọ isiala nye ya. Ma ụfọdụ nʼime ha nwere obi abụọ.
18 Jesus came and said to them, "All authority in heaven and on earth has been given to me. Jisọs bịara ha nso, gwa ha sị, “E werela ikike niile dị nʼeluigwe na nke dị nʼelu ụwa nye m.
19 Therefore go and make disciples of all nations, baptizing them in the name of the Father and of the Son and of the Holy Spirit, Ya mere, gaanụ mee ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha baptizim nʼaha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ.
20 teaching them to obey all I've commanded you. Remember, I'm with you always, to the end of the age." Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe niile m nyere unu nʼiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe niile, ruo ọgwụgwụ oge.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]