Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Luke 7 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 After he had finished saying all this to the people, he entered Capernaum. Mgbe o kwusiri okwu ndị a nye ndị na-ege ya ntị, ọ banyere na Kapanọm.
2 A centurion's servant who was dear to him was sick and at the point of death. Ma e nwere otu ọchịagha nke nwere otu ohu nwoke ọ hụrụ nʼanya. Onye nọ nʼọrịa na nʼọnụ ọnwụ.
3 Hearing about Jesus, the centurion sent Jewish elders, asking him to come and heal his servant. Mgbe ọ nụrụ ihe banyere Jisọs, o zipụrụ ụfọdụ ndị okenye ndị Juu ka ha gaa rịọrọ ya ka ọ bịa gwọọ ohu ya.
4 Reaching Jesus, they pleaded urgently: he deserves to have you do this for him, Mgbe ha bịakwutere Jisọs, ha rịọsiri ya arịrịọ ike sị, “O kwesiri ka i mere ya ihe a.
5 for he loves our nation, and he is the one who built us our synagogue. Nʼihi na ọ hụrụ obodo anyị nʼanya. O wukwaara anyị ụlọ ekpere.”
6 Jesus went with them. He was nearly at the house when the centurion sent friends to say, "Lord, don't trouble yourself—I'm not worthy for you to enter under my roof. Jisọs sooro ha gawa. Ma mgbe ọ nọ nso nʼụlọ ya, onye ọchịagha ahụ zipụrụ ndị enyi ya ka ha ga sị ya, “Onyenwe anyị, esogbukwala onwe gị, nʼihi na etorughị m ka ị bata nʼokpuru ụlọ m.
7 So I did not presume to come to you. But say the word, and let my servant be healed. Ọ bụ ya mere na-echeghị m na m toruru ịpụta bịa zute gị. Ma kwuo okwu, ọ ga-agwọkwa odibo m.
8 For I too am a man under authority, with soldiers under me. I tell one, 'Go,' and he goes; another, 'Come,' and he comes; my servant, 'Do this,' and he does it." Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a ‘gaa,’ ọ gaa, sịkwa onye nke ọzọ ‘bịa,’ Ọ bịa. Ana m asị ohu m, ‘mee nke a,’ ọ na-emekwa ya.”
9 Hearing this, Jesus was amazed at the centurion, turned to the crowd following him, and said, "I tell you, I have not found such faith even in Israel." Mgbe Jisọs nụrụ okwu niile a, o juru ya anya nke ukwuu. Ọ tụgharịrị gwa igwe mmadụ ndị na-eso ya sị, “Asị m unu, ahụbeghị m okwukwe dị otu a ọ bụladị nʼIzrel.”
10 And when those who had been sent returned to the house, they found the servant well. Mgbe ndị ozi ahụ laghachiri nʼụlọ, ha chọpụtara na ahụ adịla ohu ahụ mma.
11 Soon after, he went to a town called Nain, with his disciples and a big crowd. O ruo mgbe nwa oge gasịrị, ọ gara nʼobodo a na-akpọ Nain. Ndị na-eso ụzọ ya na ọtụtụ igwe mmadụ ndị ọzọ sooro ya gaa.
12 As he neared the town gate, a dead man was being carried out—an only son to his mother, a widow—and a large crowd from the town was with her. Mgbe ọ na-abịaru nso nʼọnụ ụzọ e si abata nʼobodo ahụ, o nwere otu nwoke nwụrụ anwụ nke a na-ebupụ, otu nwa nke nne ya mụrụ. Nne ya ahụ bụ nwanyị di ya nwụrụ, oke igwe mmadụ si nʼobodo ahụ sonyekwara ya.
13 When the Lord saw her, he felt compassion for her and said, "Don't cry." Mgbe Onyenwe anyị hụrụ ya, o meere ya obi ebere ma sị ya, “Ebela akwa.”
14 He stepped up and touched the bier; the carriers stopped, and he said, "Young man, I tell you, get up." Mgbe ahụ ọ gara nso metụ igbe ozu ahụ aka, ndị bu ya kwụsịrị. Ọ sịrị, “Nwokorobịa, asị m gị bilie!”
15 And the dead man sat up and began to speak, and Jesus gave him to his mother. Nwoke ahụ nwụrụ anwụ biliri, nọdụ ala, bido ikwu okwu, ọ kpọnyere ya nne ya.
16 Fear gripped them all; they praised our Father: "A great prophet has risen among us!" "Our Father has visited his people!" Egwu tụrụ ha niile, ha tokwara Chineke sị, “Onye amụma dị ukwuu apụtala nʼetiti anyị, Chineke abịala inyere ndị ya aka!”
17 And this report about him spread through the whole of Judea and all the surrounding country. Akụkọ a banyere ya ruru Judịa niile na obodo nta niile gbara ya gburugburu.
18 John's disciples told him all these things. Then John called two of his disciples, Ndị na-eso ụzọ Jọn kọọrọ ya maka ihe ndị a niile. Jọn kpọrọ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya,
19 sent them to the Lord: "Are you the one who is to come, or should we look for another?" zie ha ka ha jekwuru Onyenwe anyị jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ onye ahụ ga-abịa. Ka anyị ga-ele anya ọbịbịa onye ọzọ?”
20 When the men reached him, they said, "John the Baptist sent us to you, asking, 'Are you the one who is to come, or should we expect someone else?'" Mgbe ụmụ nwoke ahụ bịakwutere ya, ha sịrị, “Jọn omee baptizim ziri anyị ka anyị jụọ gị sị, ‘Ọ bụ gị bụ onye ahụ ga-abịa ka anyị ga-ele anya ọbịbịa onye ọzọ?’ ”
21 In that hour he healed many of diseases, plagues, and evil spirits, and gave sight to many blind. Mgbe ahụ ọ gwọrọ ọtụtụ ndị nwere ọrịa, na nrịa nrịa dị iche iche, na mmụọ ọjọọ. O mekwara ka ọtụtụ ndị kpuru ìsì hụ ụzọ ọzọ.
22 He answered them, "Go tell John what you've seen and heard: the blind see, the lame walk, lepers become clean, the deaf hear, the dead rise, and the poor hear good news. Ọ zaghachiri ndị ozi ahụ sị, “Laghachinụ azụ gaa kọrọ Jọn ihe unu hụrụ na nke unu nụrụ; ndị kpuru ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwụrọ na-aga ije, ndị ekpenta ka a na-eme ka ha dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụ ihe, a na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie, a na-ezisara ndị ogbenye oziọma.
23 And blessed is the one who is not offended by me." Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-enweghị ihe mkpasu iwe nʼihi m.”
24 When John's messengers left, Jesus spoke to the crowds about John: "What did you go into the wilderness to see? A reed swaying in the wind? Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn pụrụ, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ ahụ okwu banyere Jọn sị, “Gịnị ka unu gara nʼọzara ịhụ? Ọ bụ ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị?
25 What then did you go out to see? A man dressed in soft clothes? Look—those dressed in splendor, living in luxury, are in kings' palaces. Ma gịnị ka unu pụrụ ịga ịhụ? Ọ bụ nwoke yi uwe mara mma? E e, ndị na-eyi uwe dị oke ọnụahịa, ndị na-ebikwa nʼoke oriri na oke ọṅụṅụ bi nʼụlọeze.
26 But what did you go out to see—a prophet? Yes, I tell you: more than a prophet. Ma gịnị ka unu pụrụ ka unu ga-ahụ? Ọ bụ onye amụma? E, ana m a gwa unu, unu hụrụ onye karịrị onye amụma.
27 This is the one Scripture speaks of: 'Look, I'm sending my messenger ahead of you to prepare your way before you.' Ọ bụ onye a bụ onye ahụ e dere ihe banyere ya sị, “ ‘Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị nʼihu gị.’
28 I tell you: no one born of women is greater than John—yet the least in our Father's kingdom is greater than he." Agwa m unu, nʼetiti ndị nwanyị mụrụ, ọ dịghị onye dị ukwuu karịa Jọn, ma onye dịkarịsịrị nta nʼalaeze Chineke dị ukwuu karịa ya.”
29 (When all the people, including the tax collectors, heard this, they declared our Father just, having been baptized with John's baptism, (Ndị mmadụ niile nụrụ nke a, tinyekwara ndị ọna ụtụ, nabatara nʼụzọ Chineke bụ nke ziri ezi, nʼihi na Jọn emela ha baptizim.
30 but the Pharisees and lawyers rejected our Father's purpose for themselves, not baptized by him.). Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu jụrụ imezu ebumnobi Chineke nye ha onwe ha, nʼihi na ha anabataghị ka Jọn mee ha baptizim.)
31 "To what then should I compare the people of this generation, and what are they like? Ọ gara nʼihu sị ha, “Ma gịnị ka m ga-eji tụnyere ndị bi nʼọgbọ a? Gịnị ka ha yiri?
32 They are like children sitting in the marketplace, calling to each other: 'We played the flute for you, and you didn't dance; we sang a dirge, and you didn't weep.' Ha dị ka ụmụntakịrị nọ nʼọma ahịa na-akpọ ibe ha oku na-asị, “ ‘Anyị gburu unu ọja, ma unu adịghị ete egwu. Anyị bụrụ abụ ịkwa ozu, ma unu ebeghị akwa.’
33 For John the Baptist came eating no bread, drinking no wine, and you say, 'He has a demon.' Nʼihi na Jọn omee baptizim bịara na-erighị achịcha maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ ma unu sịrị, ‘Mmụọ ọjọọ bi nʼime ya.’
34 The Son of Man came eating and drinking, and you say, 'See, a glutton and a drunkard, a friend of tax collectors and sinners!' Nwa nke Mmadụ bịara na-eri ihe oriri na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, ma unu sịrị, ‘Lee, onye oke oriri na onye oke aṅụmaṅụ, enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie.’
35 Yet wisdom is justified by all her children." Ma e sitela nʼụmụ ya niile nwapụta amamihe nʼonye ziri ezi.”
36 A Pharisee invited him to eat with him; he went into the Pharisee's house and reclined at the table. Otu onye nʼime ndị Farisii kpọrọ ya oriri. Ọ gara nʼụlọ onye Farisii ahụ, ma nọdụ ala nʼoche nri.
37 A woman in the city, a sinner, learned he was reclining at table in the Pharisee's house and brought an alabaster bottle of perfume. Ma otu nwanyị nke bi nʼobodo ahụ, onye birila ndụ mmehie, mgbe ọ matara na ọ nọ nʼụlọ onye Farisii ahụ na-eri nri, o jiri otu karama alabasta mmanụ otite bata nʼụlọ ahụ.
38 Standing behind him at his feet, weeping, she began wetting his feet with her tears, wiped them with her hair, kissed his feet, and anointed them with the perfume. Ka o guzoro nʼazụ ụkwụ ya na-ebe akwa, ọ malitere iji anya mmiri ya na-awụsa nʼụkwụ ya. O jiri agịrị isi ya hichaa anya mmiri ahụ, sutu ụkwụ ya ọnụ, ma wụsa mmanụ otite isi ụtọ ahụ na ha.
39 Seeing this, the Pharisee who'd invited him thought, "If he were a prophet, he'd know who's touching him and what kind of woman she is—a sinner." Mgbe onye Farisii ahụ kpọrọ ya oriri hụrụ ihe nke a, o kwuru nʼobi ya sị, “A sị na nwoke a bụ onye amụma, ọ gaara amata ụdị mmadụ nwanyị a na-emetụ ya aka bụ, na ọ bụ onye mmehie.”
40 Jesus replied to him, "Simon, I have something to say to you." He said, "Say it, Teacher." Jisọs zara ya sị, “Saimọn, e nwere m ihe m chọrọ ịgwa gị.” Ọ sịrị ya, “Onye ozizi gwa m ya.”
41 "A certain moneylender had two debtors. One owed 500 denarii, and the other fifty. “Ndị ikom abụọ ji onye na-ebinye ndị mmadụ ego nʼọmụrụnwa ụgwọ. Otu onye ji ya narị ego ise, onye nke ọzọ ji ya iri ego ise.
42 Since neither could pay, he canceled both debts. So which of them will love him more?" Mgbe ha na-enweghị ike ịkwụghachi ụgwọ ha ji ya, ọ gbaghara ha ụgwọ ahụ. Ugbu a, onye nʼime ha ga-ahụ ya nʼanya karịa?”
43 Simon answered, "I suppose the one he forgave the larger debt." Jesus said, "You judged rightly." Saimọn zara sị, “Ọ dị m ka ọ bụ onye nke ọ gbaghara ụgwọ dị ukwuu.” Ọ sịrị ya, “Ị kpeziri.”
44 Turning to the woman, he told Simon, "Do you see this woman? I entered your house—you gave no water for my feet, but she wet my feet with her tears and wiped them with her hair. Mgbe ahụ ọ tụgharịrị nʼebe nwanyị ahụ nọ gwa Saimọn sị, “Ị hụrụ nwanyị a? A batara nʼụlọ gị, i kunyeghị m mmiri ka m saa ụkwụ m, ma nwanyị a ejirila anya mmiri ya sachaa ụkwụ m, jirikwa agịrị isi ya hichaa ha.
45 You gave me no kiss, but she, from when I came in, hasn't stopped kissing my feet. Ị sutughị m ọnụ, ma kemgbe m batara nʼụlọ a, o zubeghị ike isutu ụkwụ m ọnụ.
46 You did not anoint my head with oil, but she has anointed my feet with perfume. Ị teghị m mmanụ ọbụla nʼisi, ma lee, o werela mmanụ otite isi ụtọ wụkwasị m nʼụkwụ.
47 So I tell you, her many sins are forgiven, because she loved much. But whoever is forgiven little loves little." Ya mere, ana m agwa gị sị, a gbagharala ya mmehie ya niile o mehiere, nʼihi na ọ nwere ịhụnanya dị ukwuu. Ma onye nwetara mgbaghara dị nta, na-enwe ịhụnanya dị nta.”
48 And he said to her, "Your sins are forgiven." Mgbe ahụ ọ gwara ya sị, “A gbagharala gị mmehie gị.”
49 Then his fellow guests began asking each other, "Who is this, who even forgives sins?" Ma ndị ọzọ soro ya nọdụ na-eri nri bidoro ikwu nʼetiti onwe ha na-asị, “Onye bụ onye a nwere ike ọ bụladị ịgbaghara mmehie?”
50 And he said to the woman, "Your faith has saved you; go in peace." Ọ sịrị nwanyị ahụ, “Okwukwe gị azọpụtala gị, laa nʼudo.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]