Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Luke 8 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Soon after, he traveled through towns and villages, preaching and announcing the good news of our Father's kingdom. The twelve were with him, Mgbe ihe ndị a gasịrị, ọ gara nʼobodo ukwu niile na nʼobodo nta niile na-ekwusa ma na-ewetakwara ndị mmadụ oziọma nke alaeze Chineke. Ndị ozi iri na abụọ ahụ sokwa ya,
2 and some women healed of evil spirits and illnesses: Mary, called Magdalene, from whom seven demons had left, na ụmụ nwanyị ụfọdụ ndị a chụpụrụ mmụọ ọjọọ site nʼime ha, gwọkwa ha nrịa nrịa: Meri Magdalin onye e sitere nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa,
3 and Joanna, wife of Chuza, manager for Herod, and Susanna, and many others, who supported them from their own resources. na Joana nwunye Chuza onye na-elekọta ụlọeze Herọd na akụ ya niile, na Suzana, na ọtụtụ ndị ọzọ ndị ji akụ ha na-enyere ha aka.
4 As a large crowd gathered, with people from every town coming to him, he spoke in a parable: Mgbe oke igwe mmadụ gbakọrọ ha na ndị mmadụ si nʼobodo dị iche iche bịakwute ya. Ọ tụụrụ ha ilu a sị,
5 "A sower went out to sow. As he sowed, some seed fell on the path, got trampled, and birds of the sky ate it. “Ọgha mkpụrụ pụrụ ịkụ mkpụrụ ya, mgbe ọ nọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nʼime mkpụrụ ahụ dara nʼakụkụ ụzọ ebe ndị mmadụ zọrọ ha ụkwụ, ụmụ nnụnụ bịakwara tụrịa ha loo.
6 Other seed fell on rock; sprouting, it withered from lack of moisture. Ụfọdụ nʼime ha dakwasịrị nʼelu nkume. Mgbe ha puputara chọọ ito, ha kpọnwụrụ nʼihi na mgbọrọgwụ ha enweghị ike ịmịta mmiri mkpụrụ ahụ ga-eji dị ndụ.
7 Some fell among the thorns, and the thorns grew up with it and choked it. Ụfọdụ dara nʼetiti ogwu, ogwu ndị a sooro ha puo ma kpagbuo ha.
8 Other seed fell on good soil, grew, and yielded a hundredfold." Saying this, he called out, "Whoever has ears to hear, let him hear." Ụfọdụ nʼime mkpụrụ dara nʼezi ala. Ha puputara, too, mịa mkpụrụ dị otu narị nʼọnụọgụgụ.” Mgbe o kwusiri nke a, ọ sịrị ha, “Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”
9 His disciples asked him what this parable meant. Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ihe ilu a pụtara.
10 He said, "You've been given to know the secrets of our Father's kingdom; the rest get parables, so that 'seeing they may not see, and hearing they may not understand.'" Ọ sịrị, “Ọ bụ unu ka e nyere ịmata ihe omimi niile nke alaeze Chineke, ma ndị ọzọ ga-anụ ya naanị nʼilu. Site nʼụzọ dị otu a, “ ‘ha ga na-ele anya, ma ha agaghị ahụ ihe ọbụla. Ha ga na-anụ ntị ma ha agaghị aghọta ihe ọbụla.’
11 "Now the parable is this: The seed is the word of our Father. “Nke a bụ nkọwa ilu ahụ. Mkpụrụ ahụ bụ okwu Chineke.
12 Those along the path are the ones who hear; then the devil comes and takes the word from their hearts, so they won't believe and be saved. Mkpụrụ dara nʼakụkụ ụzọ nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke, ma ekwensu bịara napụ ha okwu ahụ nʼobi ha, ka ha ghara ikwere ma nwetakwa nzọpụta.
13 Those on the rock hear the word and receive it with joy, but have no root; they believe for a while, then fall away in time of testing. Mkpụrụ ndị ahụ dara nʼelu nkume nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke jiri ọṅụ nabata ya, ma ha enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha. Ha na-ekwere naanị nwa oge nta, ma mgbe ọnwụnwa bịara ha na-adachapụ.
14 What fell among thorns: these are those who hear, but as they go, life's worries, wealth, and pleasures choke them, and their fruit never matures. Mkpụrụ nke dara nʼetiti ogwu nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke, ma mgbe ha na-aga nʼụzọ ha, echiche banyere akụ na ihe ụtọ nke ụwa na-akpagbu okwu ahụ, mee ka ha ghara ịmị mkpụrụ.
15 But the one in good soil: these hear the word with an honest, good heart, hold it firmly, and bear fruit through perseverance." Ma mkpụrụ ndị ahụ dara nʼezi ala nọchiri anya ndị jiri obi ghere oghe na mmụọ ziri ezi nabata okwu ahụ ma werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.
16 "No one lights a lamp, covers it with a jar, or puts it under a bed; instead, he sets it on a stand, so those entering can see the light. “Ọ dịghị onye ọbụla, nke na-amụnye oriọna zoo ya nʼime igbe maọbụ dọnye ya nʼokpuru ihe ndina. Kama, ọ na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba ọkụ ka ndị ọbụla na-abata nʼụlọ ahụ jiri ya hụ ụzọ.
17 For nothing is hidden that won't be revealed, nothing secret that won't be known and brought to light. Ọ dịghị ihe ọbụla zoro ezo nke na-agaghị emesịa pụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe ọbụla dị nzuzo nke a na-aghaghị eme ka ọ pụta ìhè.
18 So watch how you listen, for whoever has, more will be given to him; whoever has not, even what he thinks he has will be taken away." Ya mere, kpacharanụ anya otu unu si ege ntị. Nʼihi na ọ bụ onye ahụ nwere ihe ka a ga-enye karịa, ma onye ahụ na-enweghị, ọ bụladị nke o nwere, ka a ga-anapụ ya.”
19 His mother and brothers came to him but couldn't reach him because of the crowd. Nʼoge a, nne ya na ụmụnne ya nwoke bịakwutere ya. Ma ha enweghị ike ịbịaru ya nso nʼihi igwe mmadụ.
20 And he was told, "Your mother and your brothers are standing outside, wanting to see you." Otu onye gwara ya sị, “Nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke guzo nʼezi, ha chọrọ ịhụ gị.”
21 But he answered them, "My mother and my brothers are those who hear the word of our Father and do it." Ọ zara sị, “Nne m na ụmụnne m ndị nwoke bụ ndị ahụ na-anụ okwu Chineke ma jiri ya mere ihe.”
22 One day he and his disciples got into a boat. He said to them, "Let us cross over to the other side of the lake." So they set out. Otu ụbọchị, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼụgbọ mmiri, ọ sịrị ha, “Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ nke osimiri.” Nke a mere ha ji nụpụ ụgbọ,
23 As they sailed, he fell asleep. A windstorm swept down on the lake; the boat filled with water, and they were endangered. ma mgbe ha na-aga, ọ rahụrụ ụra. Oke ifufe malitere ife nʼelu ọdọ mmiri ahụ, nke mere na mmiri na-awụbanye nʼime ụgbọ ha, mee ka ha nọrọ nʼoke nsogbu.
24 They woke him, saying, "Master, Master, we're dying!" He got up, rebuked the wind and the raging water; they stopped, and it grew calm. Ha gara kpọtee ya na-eti mkpu, “Nna anyị ukwu! Nna anyị ukwu! Lee na anyị nʼala nʼiyi!” O biliri, baara ifufe na ebili mmiri ahụ mba. Ha dara jụụ, ebe niile dekwara jii.
25 He asked them, "Where is your faith?" Afraid and amazed, they said to each other, "Who then is this? He commands even the winds and water, and they obey him." Ọ sịrị ha, “Ebee ka okwukwe unu dị?” Ha ji oke egwu na oke iju anya jụrịta onwe ha sị, “Onye bụ onye a? Ọ na-enye ọ bụladị ifufe na ebili mmiri iwu, ha na-aṅakwa ya ntị.”
26 Then they sailed to the region of the Gerasenes, which is opposite Galilee. Ha kwọrọ ụgbọ mmiri rute nʼala Gerazin, nke dị nʼofe mmiri Galili.
27 As Jesus stepped onto land, a demon-possessed man from the city met him. For a long time he'd worn no clothes and stayed not in a house but among the tombs. Mgbe o si nʼụgbọ mmiri rịpụta nʼelu ala, otu nwoke obodo ahụ onye mmụọ ọjọọ bi nʼime ya zutere ya. Nwoke a ebighị nʼụlọ maọbụ yie uwe ogologo oge, ma ebe obibi ya bụ ebe a na-eli ozu.
28 Seeing Jesus, he cried out, fell before him, and said loudly, "What do you want with me, Jesus, Son of the Most High God? I beg you, don't torment me!" Mgbe ọ hụrụ Jisọs, ọ bịara daa nʼihu ya, tie mkpu nʼoke olu sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ Jisọs, Ọkpara Chineke Onye kachasị ihe niile elu? Biko arịọ m gị, atala m ahụhụ.”
29 Jesus had ordered the unclean spirit out of the man, for it had often seized him; though guarded and bound with chains and shackles, he would break them and be driven by the demon into the wilderness. Nʼihi na o nyela mmụọ ahụ na-adịghị ọcha iwu ka o site nʼime ya pụta. Ọtụtụ oge, mmụọ ọjọọ a na-ejidesi ya ike, nʼagbanyeghị na eji ụdọ igwe kee ya aka na ụkwụ, debe ebe a na-eche ya nche, ọ na-adọbisi ụdọ igwe e ji kee ya, mmụọ ọjọọ a na-eduru ya gaa nʼime ọzara.
30 Jesus asked him, "What is your name?" He said, "Legion," for many demons had entered him. Jisọs jụrụ ya sị, “Gịnị bụ aha gị?” Ọ zara sị, “Lijiọn,” nʼihi na igwe mmụọ ọjọọ bi nʼime ya.
31 And they begged him not to command them to depart into the abyss. Ha rịọsiri ya arịrịọ ike ka ọ ghara inye ha iwu ka ha banye nʼAbis.
32 A large herd of pigs was feeding on the hillside there. The demons begged him to let them enter the pigs, and he allowed it. Igwe ezi nọ nʼakụkụ ugwu dị ebe ahụ nso na-akpa nri. Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ Jisọs ka o nye ha ike ka ha banye nʼime ha. Jisọs nyere ha ike.
33 So the demons left the man and entered the pigs; the herd rushed down the cliff into the lake and drowned. Mmụọ ọjọọ ndị ahụ sitere nʼime nwoke a pụọ banye nʼime ezi ndị ahụ, igwe ezi ahụ niile sitere na mkputamkpu ala ọnụ mmiri ahụ gbara ọsọ dabanyechaa nʼime mmiri ebe osimiri riri ha.
34 Herdsmen saw it, fled, and reported it in the city and in the countryside. Mgbe ndị na-elekọta ezi ahụ hụrụ ihe mere, ha gbara ọsọ gaa nʼime obodo na nʼobodo nta niile dị gburugburu ebe ahụ kọsaa ihe mere.
35 The crowd came out to see what had happened. Reaching Jesus, they found the man freed of demons sitting at Jesus' feet, dressed and clear-minded—and fear seized them. Ndị mmadụ pụtara ịhụ ihe mere. Mgbe ha rutere ebe Jisọs nọ, ha hụrụ nwoke ahụ e si nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ, ebe ọ nọdụrụ ala yiri uwe ma nọrọkwa nʼezi uche ya. Egwu tụrụ ha.
36 And those who had seen it told them how the demon-possessed man had been healed. Ndị hụrụ ka ihe a si mee kọọrọ ha ka e siri gwọọ onye ahụ mmụọ ọjọọ na-esogbu.
37 All the people of the Gerasene region asked him to leave them, because great fear gripped them. So he boarded the boat and went back. Mgbe ahụ, ndị niile bi na Gerazin na nʼobodo gbara ebe ahụ gburugburu rịọrọ Jisọs ka ọ hapụrụ ha obodo ha, nʼihi na egwu dị ukwuu tụrụ ha. Ọ banyekwara nʼime ụgbọ mmiri ahụ laghachi.
38 The man the demons had left begged to go with him, but Jesus sent him away, saying, Nwoke a e sitere nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ rịọrọ ya ka o soro ya ma o zilagara ya, sị ya,
39 "Return home; tell how much our Father has done for you." He went, proclaiming throughout the whole city how much Jesus had done for him. “Laghachi nʼezinaụlọ gị kọọrọ ha ihe niile Chineke meere gị.” Nwoke ahụ lara, gbasaa akụkọ ihe Jisọs meere ya nʼobodo ahụ niile.
40 Now when Jesus returned, the crowd welcomed him, for they were all waiting for him. Mgbe Jisọs lọghachiri, igwe mmadụ nabatara ya nʼihi na ha niile na-eche ya.
41 A man named Jairus, a synagogue leader, came and fell at Jesus' feet, begging him to come to his house, Mgbe ahụ otu nwoke nke aha ya bụ Jairọs, onye bụ onyeisi nʼụlọ ekpere, bịara daa nʼala nʼụkwụ Jisọs na-arịọ ya ka ọ bịa nʼụlọ ya.
42 for he had an only daughter, about twelve years old, dying. As Jesus went, crowds pressed around him. Nʼihi na otu nwata nwanyị ọ mụtara naanị ya, nke gbara afọ iri na abụọ nọ nʼọnụ ọnwụ. Mgbe ọ na-aga, igwe mmadụ ahụ na-akpagbu ya.
43 A woman had bled for twelve years; she had spent her whole livelihood on doctors, but none could heal her. Ọ dị otu nwanyị nʼetiti ha nke nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ, onye mefuru ihe niile o ji nʼaka ndị dibịa, ma ọ dịghị onye nwere ike ịgwọ ya.
44 Coming up behind him, she touched the tassel of his cloak, and her bleeding stopped instantly. O sitere nʼazụ ya metụ ọnụ uwe ya aka. Ngwangwa, ọrịa oruru ọbara ahụ kwụsịkwara.
45 Jesus said, "Who touched me?" When all denied it, Peter said, "Master, the crowds crowd and press against you." Jisọs sịrị, “Onye metụrụ m aka?” Mgbe ọ na-enweghị onye pụtara kwuo sị na ọ bụ ya. Pita gwara ya sị, “Nna anyị ukwu, igwe mmadụ gbara gị gburugburu na-adakwasịkwa gị.”
46 But Jesus said, "Someone touched me, for I felt that power had gone out from me." Ma Jisọs sịrị, “Otu onye metụrụ m aka; amatara m na ike esitela nʼime m pụọ.”
47 Seeing she couldn't stay hidden, the woman came trembling, fell before him, and declared in front of everyone why she'd touched him and how she was instantly healed. Mgbe nwanyị ahụ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe o nwere ike ime iji zoo onwe ya, o ji ịma jijiji bịa daa nʼụkwụ ya. Nʼihu mmadụ niile, ọ kọrọ ihe mere o ji metụ ya aka na otu e sị gwọọ ya nʼotu ntabi anya.
48 And he said to her, "Daughter, your faith has healed you; go in peace." Ọ gwara ya sị, “Ada m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Laa nʼudo.”
49 While he was still speaking, someone from the synagogue leader's house said, "Your daughter has died; don't bother the Teacher anymore." Mgbe ọ ka nọ na-ekwu okwu, otu onye si nʼụlọ Jairọs bụ onyeisi ụlọ ekpere, bịara sị, “Ada gị nwanyị anwụọla, enyekwala onye ozizi nsogbu ọzọ.”
50 But Jesus heard and answered him, "Don't be afraid; just believe, and she'll be saved." Ma mgbe Jisọs nụrụ ozi a, ọ zara ya sị, “Atụla egwu, naanị kwere, a ga-agwọkwa ya.”
51 Arriving at the house, he let no one enter with him except Peter, John, James, and the child's father and mother. Mgbe o rutere nʼụlọ Jairọs, o kweghị ka onye ọbụla soro ya baa nʼime ụlọ ahụ ma ọ bụghị naanị Pita, Jọn, Jemis, nne na nna nwata ahụ.
52 All were weeping and mourning her, but he said, "Don't weep, for she's not dead, only asleep." Nʼoge ahụ, ha niile nọ na-ebe akwa na-eru ụjụ maka nwata ahụ. Ọ sịrị ha, “Unu ebezila akwa, nʼihi na ọ nwụghị anwụ kama ọ nọ nʼụra.”
53 And they laughed at him, knowing that she was dead. Ha chịrị ya ọchị, nʼihi na ha matara na ọ nwụrụ anwụ.
54 But he took her by the hand and called out, "Child, get up." Ma o jidere ya nʼaka, sị, “Nwa m, bilie!”
55 Her spirit returned, and she got up instantly. He told them to give her something to eat. Mmụọ ya lọghachiri, o bilitekwara mgbe ahụ. Ọ gwakwara ha ka ha chọọrọ ya nri ka o rie.
56 Her parents were amazed, but he ordered them to tell no one what had happened. Ihe a gbara ndị mụrụ ya gharịị ma ọ nyere ha iwu ka ha ghara ịkọrọ onye ọbụla ihe mere.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]