Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Luke 6 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 On a Sabbath, Jesus walked through grainfields; his disciples picked heads of grain, rubbed them in their hands, and ate. Nʼotu ụbọchị izuike, mgbe Jisọs na-agafe nʼubi a kụrụ ọka. Ndị na-eso ụzọ ya malitere ịghọrọ ụfọdụ nʼime ogbe ọka ndị ahụ, na-amazu ha nʼaka, ma na-ata ha.
2 Some of the Pharisees said, "Why are you doing what is not lawful on the Sabbath?" Ụfọdụ ndị Farisii sịrị, “Gịnị mere unu ji na-eme ihe megidere iwu nʼụbọchị izuike?”
3 Jesus answered them, "Haven't you read what David did when he and those with him were hungry, Jisọs zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtaghị ihe Devid mere mgbe agụụ gụrụ ya na ndị so ya?
4 how he entered our Father's house, took the bread of the Presence, ate it, gave some to his companions, though it's not lawful for any but the priests to eat it?" Otu o si banye nʼụlọ Chineke, were achịcha a na-eche nʼihu ya, nyetụkwa ndị ya na ha so, achịcha nke onye ọbụla na-ekwesighị ịta ma ọ bụghị naanị ndị nchụaja.”
5 Then he said to them, "The Son of Man is Lord of the Sabbath." Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Nwa nke Mmadụ bụ Onyenwe Ụbọchị Izuike.”
6 On another Sabbath he entered the synagogue and taught; a man was there with a withered right hand. Nʼụbọchị izuike ọzọ, ọ banyere nʼụlọ ekpere na-ezi ihe. Otu nwoke nọkwa nʼebe ahụ onye aka nri ya kpọnwụrụ akpọnwụ.
7 The scribes and Pharisees watched him closely to see if he would heal on the Sabbath, so they could find a charge against him. Ndị Farisii na ndị ode akwụkwọ na-achọ ụzọ ha ga-esi boo ya ebubo, ya mere ha lekwasịrị ya anya ịhụ ma ọ ga-agwọ ọrịa nʼụbọchị izuike.
8 But knowing their thoughts, he told the man with the withered hand, "Get up and stand here." So he got up and stood there. Ma ebe ọ maara ihe ha na-ezube nʼobi ha, ọ kpọrọ nwoke ahụ nke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị ya, “Bilie bịa guzoro nʼetiti ebe a.” Nwoke ahụ pụtara bịa guzoro ebe ahụ.
9 Then Jesus said to them, "I ask you: is it lawful on the Sabbath to do good or do harm, to save a life or destroy it?" Mgbe ahụ Jisọs sịrị ha, “Ka m jụọ unu, gịnị ziri ezi nʼiwu ime nʼụbọchị izuike; ọ bụ ime ihe ọma ka ọ bụ ime ihe ọjọọ; ịzọpụta ndụ ka ọ bụ ịla ndụ nʼiyi?”
10 Looking around at them all, he told the man, "Stretch out your hand." He did, and his hand was restored. Mgbe o lesiri ha niile anya gburugburu, ọ sịrị ya, “Setịpụ aka gị.” O mere nke a, aka ya dịkwara mma ọzọ.
11 But filled with rage, they discussed with each other what to do to Jesus. Ha were iwe nke ukwuu ma malite na-ekwurịtara nʼetiti onwe ha ihe ha nwere ike ime Jisọs.
12 In those days Jesus went out to the mountain to pray, spending the whole night in prayer to our Father. Nʼụbọchị ndị ahụ, ọ gara rigoro nʼelu ugwu ikpe ekpere. Ọ nọrọ abalị ahụ niile na-ekpe ekpere nye Chineke.
13 At daybreak he called his disciples and chose twelve of them, naming them apostles: Mgbe chi bọrọ, ọ kpọrọ ndị niile na-eso ụzọ ya, site nʼime ha họrọ mmadụ iri na abụọ ndị ọ kpọrọ ndị ozi ya.
14 Simon, whom he named Peter, and his brother Andrew; James and John; Philip and Bartholomew; Saimọn (onye ọ kpọrọ Pita) na Andru nwanne ya, Jemis Jọn, Filip Batalomi.
15 Matthew and Thomas; James son of Alphaeus, and Simon who was called the Zealot; Matiu Tọmọs, Jemis nwa Alfiọs, Saimọn onye a na-akpọ Zilọt.
16 Judas son of James, and Judas Iscariot, who became a traitor. Judas nwa Jemis na Judas Iskarịọt onye raara ya nye.
17 He came down with them and stood on a level place, with a large crowd of his disciples and a large multitude of people from all Judea, Jerusalem, and the coast of Tyre and Sidon. Ya na ha rịdatara ga nʼebe ala dị larịị. Igwe ndị na-eso ụzọ ya na oke igwe mmadụ sitere na Judịa, na Jerusalem nakwa obodo dị na nsọtụ mmiri nke Taịa na Saịdọn.
18 They came to hear him and be healed of their diseases; those troubled by unclean spirits were also cured. Ndị bịara ịnụrụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. A gwọkwara ọtụtụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-esogbu.
19 The whole crowd tried to touch him, since power went out from him, healing everyone. Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile.
20 Looking up at his disciples, he said: "Blessed are you who are poor, for yours is the kingdom of our Father. O weliri anya lee ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Ngọzị na-adịrị unu bụ ndị ogbenye, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke unu.
21 "Blessed are you who hunger now, for you will be satisfied. Blessed are you who weep now, for you will laugh. Ngọzị na-adịrị unu ndị agụụ na-agụ ugbu a, nʼihi na afọ ga-eju unu. Ngọzị na-adịrị unu ndị na-ebe akwa ugbu a, nʼihi na unu ga-achị ọchị.
22 Blessed are you when people hate you, and when they exclude you and revile you and reject your name as evil, because of the Son of Man. Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị, mgbe ha na-achụpụ unu, na-akparị unu, na-ajụ aha unu, nʼihi Nwa nke Mmadụ.
23 Rejoice in that day and leap for joy, for your reward is great in heaven; for that is how the persecutors' ancestors treated the prophets. “Ṅụrịanụ ọṅụ ma wuliekwanụ elu nʼihi ọṅụ nʼụbọchị ahụ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na otu a ka ndị nna nna ha mesoro ndị amụma.
24 But woe to you who are rich, for you have already received your comfort. “Ma ahụhụ na-adịrị unu ndị ọgaranya, nʼihi na unu eketala nkasiobi unu.
25 Woe to you who are full now, for you will be hungry. Woe to you who laugh now, for you will mourn and weep. Ahụhụ na-adịrị ndị afọ juru ugbu a, nʼihi na agụ ga-agụkwa unu. Ahụhụ na-adịrị ndị na-achị ọchị ugbu a, nʼihi na unu ga-eru ụjụ, bee akwa.
26 Woe to you when everyone speaks well of you, for that is how the flatterers' ancestors treated the false prophets. Ahụhụ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ niile na-ekwu okwu ọma gbasara unu, nʼihi na otu a ka ndị bụ nna ha mesoro ndị amụma ụgha.”
27 But I tell you who listen: love your enemies, do good to those who hate you, “Ma a na m agwa unu ndị na-ege m ntị: hụnụ ndị iro unu nʼanya, mekwaaranụ ndị kpọrọ unu asị ihe ọma.
28 bless those who curse you, pray for those who mistreat you. Gọzienụ ndị na-abụ unu ọnụ, ma kpekwaaranụ ndị na-akparị unu ekpere.
29 Whoever strikes you on one cheek, offer the other too; whoever takes your coat, do not hold back your shirt. Ọ bụrụ na onye ọbụla a maa gị ụra nʼotu ntị, tụgharịara ya ntị gị nke ọzọ. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla anara gị uwe ahụ gị, nyekwa ya uwe ime ahụ gị.
30 Give to everyone who asks you, and don't demand back what is taken from you. Nye onye ọbụla rịọrọ gị ihe. Ọ bụrụkwa na mmadụ ewere ihe bụ nke gị, agala ịnapụta ya.
31 Do to others as you would have them do to you. Dịka unu si chọọ ka ndị mmadụ mesoo unu, sitekwanụ otu a na-emeso ha.
32 Loving those who love you—what credit is that? Even sinners love those who love them. “Ọ bụrụ naanị ndị hụrụ unu nʼanya ka unu na-ahụ nʼanya, gịnị ga-abụ uru unu? Nʼihi na ọbụladị ndị mmehie, ọ bụ ndị hụrụ ha nʼanya ka ha na-ahụkwa nʼanya.
33 If you do good to those doing you good, what credit is that to you? Even sinners do the same. Ọ bụrụkwa naanị ndị na-emere unu ihe ọma ka unu na-emere ihe ọma, gịnị ga-abụ uru unu? Nʼihi na ndị mmehie na-enyekwara ndị na-enyere ha aka aka.
34 And if you lend expecting repayment, what credit is that? Even sinners lend to sinners to get back the same amount. Ọ bụrụkwa na unu agbazinye naanị ndị nwere ike ịkwụghachi unu ihe, gịnị ga-abụ uru unu? Nʼihi na ndị mmehie na-agbazinyekwa ndị mmehie ibe ha na-atụ anya ka a kwụghachikwa ha nʼozuzu oke.
35 But love your enemies, do good, and lend expecting nothing back; your reward will be great, and you will be children of the Most High, for he is kind to the ungrateful and evil. Hụnụ ndị iro unu nʼanya, na-emekwa ezi ihe nye ha, gbazinyenụ ndị nọ na mkpa ihe ha chọrọ, na-eleghị anya na ha ga-akwụghachi unu. Mgbe ahụ, ụgwọ ọrụ unu ga-adị ukwuu, unu ga-egosikwa na unu bụ ụmụ nke Onye kachasị ihe niile elu, nʼihi na ebere ya na-adịrị ndị ajọ omume na ndị na-enweghị mmụọ ekele nʼime ha.
36 Be merciful, just as your Father is merciful. Nweenu obi ebere dị ka Nna unu si nwee obi ebere.
37 Do not judge, and you will not be judged. Do not condemn, and you will not be condemned. Forgive, and you will be forgiven. “Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe. Unu amala ndị ọzọ ikpe ka a ghara ịma unu ikpe. Gbagharanụ ndị ọzọ, a ga-agbagharakwa unu.
38 Give, and it will be given to you: a good measure—pressed down, shaken, overflowing—will be poured into your lap. For the measure you use will be measured back to you." Nyenụ, nʼihi na a ga-enyekwa unu. Onyinye unu ga-anata ga-abụ nke juru eju, nke a bịadara nke ọma, yọkọtakwa ayọkọta nke na-ejubiga oke ka a ga-adọkwasị gị nʼahụ; nʼihi na ọ bụ ihe i na-eji atụ ihe ka a ga-eji tụọrọ gị.”
39 He also gave them a parable: "Can a blind person guide a blind person? Won't both fall into a pit? Ọ tụkwaara ha ilu a, “Onye ìsì ọ pụrụ idu onye ìsì ibe ya? Ha abụọ ọ gaghị adaba nʼime olulu?
40 No student surpasses their teacher; whoever is fully trained becomes like their teacher. Onye na-eso ụzọ onye ozizi anaghị akarị onye nkuzi ya, kama mgbe ọ mụtasịrị ọ ga-amata ihe dị ka onye nkuzi ya.
41 Why do you see the speck in your brother's eye, yet miss the beam in your own eye? “Gịnị mere i ji elee ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nʼanya, ma ị dịghị ahụta obodobo osisi dị gị onwe gị nʼanya?
42 How can you tell your brother, 'Brother, let me remove the speck from your eye,' when you don't see the beam in your own eye? Hypocrite! First remove the beam from your own eye—then you'll see clearly to remove the speck from your brother's eye. Ị ga-esi aṅaa sị nwanna gị, ‘Nwanna a, ka m wepụ gị ntakịrị ahịhịa dị gị nʼanya,’ mgbe gị onwe gị na-ahụghị obodobo osisi dị gị nʼanya? Gị onye ihu abụọ, buru ụzọ wepụ obodobo osisi dị gị nʼanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ nke ọma wepụ ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nʼanya.
43 For no good tree bears bad fruit, nor again does a bad tree bear good fruit. “Ezi osisi adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Ọ dịkwaghị osisi ọjọọ na-amị mkpụrụ ọma.
44 Each tree is known by its own fruit; figs aren't gathered from thornbushes, nor grapes picked from a bramble. Ọ bụ mkpụrụ osisi mịrị ka e ji ama ụdị osisi ọ bụ. Ndị mmadụ adịghị aghọta fiig site nʼosisi ogwu, otu a kwa o nweghị onye na-aghọta mkpụrụ grepu nʼobi ogwu.
45 A good person produces good from the heart's good store; an evil person produces evil from the evil store; for the mouth speaks from the heart's overflow. Ezi mmadụ na-esite nʼakụ ọma juru ya obi na-arụpụta ezi ọrụ, otu a kwa, ajọ mmadụ na-esite nʼobi ọjọọ ya na-arụpụta ajọ ọrụ. Nʼihi na ihe ọbụla dị mmadụ nʼobi bụ ihe na-apụta nʼọnụ ya.
46 Why do you call me 'Lord, Lord,' and not do what I say? “Gịnị mere unu ji na-akpọ m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ma unu adịghị eme ihe m kwuru?
47 Everyone coming to me, hearing my words, and doing them—I'll show you what he's like: Achọrọ m igosi unu ihe onye ọbụla na-abịakwute m nke na-anụ okwu m, ma na-ejikwa ihe ọ na-anụ akpọrọ ihe, yiri.
48 He's like a man building a house, who dug deep and laid its foundation on rock. When the flood came, the river crashed into that house but couldn't shake it—it was built well. Onye ahụ yiri nwoke wuru ụlọ, onye gwumiri ala, doo ntọala ụlọ ahụ nʼelu oke nkume. Mgbe idee mmiri bịara were ike ya tie nʼụlọ ahụ, o nweghị ike ime ka ọ maa jijiji nʼihi na e wusiri ya ike.
49 But whoever hears my words and doesn't act on them is like a man who built a house on the ground, without a foundation. The flood crashed against it, and it collapsed at once—that house's ruin was great." Ma onye ahụ nụrụ okwu m, nke na-ejighị ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke wukwasịrị ụlọ ya nʼelu ala, nke na-enweghị ntọala ọbụla. Mgbe idee mmiri bịara were ike ya tie nʼụlọ ahụ, ụlọ ahụ dara daruo ala, ọdịda ya dị ukwuu.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]