Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Luke 5 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Once, as the crowd pressed around him to hear our Father's word, Jesus stood by Lake Gennesaret. Otu oge, ka Jisọs guzo nʼakụkụ ọdọ mmiri Genesaret. Igwe mmadụ gbara ya gburugburu ka ha nụrụ okwu Chineke.
2 He saw two boats standing by the lake; the fishermen had left them and were washing their nets. Ọ hụrụ nʼọnụ mmiri ahụ, ụgbọ mmiri abụọ nke ndị ọkụ azụ nwe ha hapụrụ gaa ịsa ụgbụ ha ji egbu azụ.
3 Getting into one of the boats, Simon's, he asked him to move out a little from shore, then sat down and taught the crowds from the boat. Ọ banyere nʼime otu ụgbọ mmiri ndị ahụ, nke bụ nke Saimọn, ọ rịọrọ ya ka ọ kwọrọ ya banyetụ ntakịrị nʼime mmiri. Ọ nọdụrụ ala nʼime ya bido na-ezi igwe mmadụ ihe.
4 When he stopped speaking, he told Simon, "Push out into deep water and lower your nets for a catch." Mgbe o kwusiri okwu, ọ gwara Saimọn sị, “Banyetụkwuo nʼime mmiri, tụnye ụgbụ gị ka i gbute azụ.”
5 Simon answered, "Master, we worked all night and caught nothing. But at your word, I'll let down the nets." Saimọn zara sị, “Nna anyị ukwuu, anyị rụsịrị ọrụ ike abalị niile na-egbutaghị ihe ọbụla, ma otu i sịrị kwuo, aga m awụnye ụgbụ azụ niile.”
6 Doing this, they caught so many fish their nets began tearing. Mgbe ha mere nke a, ha gbutere ọtụtụ azụ nke mere na ụgbụ azụ ha malitere ịdọkasị.
7 They signaled to partners in the other boat to come help; they came and filled both boats so that they began to sink. Ha kpọrọ ndị ọkụ azụ ibe ha nọ nʼụgbọ mmiri ọzọ ka ha bịa nyere ha aka. Ha bịara kpojuo azụ nʼụgbọ mmiri abụọ ahụ nke malitere imikpu.
8 Seeing this, Simon Peter fell at Jesus' knees and said, "Leave me, Lord, for I'm a sinful man!" Ma mgbe Saimọn Pita hụrụ nke a, ọ dara nʼukwu Jisọs sị, “Si nʼebe m nọ pụọ, Onyenwe m, nʼihi na abụ m onye mmehie.”
9 For amazement gripped him and all with him at the catch of fish they had caught, Nʼihi na o juru ya na ndị ya na ha so anya ịhụ ọtụtụ azụ ndị a ha gbutere.
10 and so were James and John, Zebedee's sons and Simon's partners. Jesus told Simon, "Don't be afraid; from now on you'll catch people." Ọ bụladị Jemis na Jọn ụmụ Zebedi, ndị ha na Saimọn na-arụkọ ọrụ, ka ihe a jukwara anya. Mgbe ahụ Jisọs gwara Saimọn sị, “Atụla egwu, nʼihi na site ugbu a gaa nʼihu, ị ga na-akụta mmadụ.”
11 So they pulled their boats up on shore, left everything, and followed him. Mgbe ha kwọpụtara ụgbọ mmiri ha nʼelu ala, ha hapụrụ ihe niile soro ya.
12 While Jesus was in one of the towns, a man covered with a serious skin disease appeared. Seeing Jesus, he fell facedown and begged, "Lord, if you're willing, you can make me clean." Mgbe Jisọs nọ nʼotu obodo, otu nwoke onye ekpenta juru ahụ, bịara daa, kpudo ihu ya nʼala mgbe ọ hụrụ ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”
13 Jesus reached out his hand, touched him: "I am willing. Be clean." At once the skin disease left him. Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị, “Achọrọ m, bụrụ onye dị ọcha!” Ngwangwa ekpenta ahụ hapụrụ ya.
14 Jesus ordered him to tell no one, "but go, show yourself to the priest and offer what Moses commanded for your cleansing, as proof to the people." O nyere ya iwu, “A gwakwala onye ọbụla, kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu maka ime ka ị dị ọcha, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.”
15 But word about him spread even more; large crowds gathered to hear him and be healed of their sicknesses. Ma akụkọ banyere ya gbasara karịa, nke mere na igwe mmadụ bịara ịnụrụ ihe ọ na-ekwu, na ka a gwọọkwa ha nrịa nrịa.
16 But Jesus often withdrew to deserted places and prayed. Ma site nʼoge ruo nʼoge, Jisọs na-ewezuga onwe ya gaa nʼebe ọ ga-anọ naanị ya ikpe ekpere.
17 One day as he taught, Pharisees and teachers of the law sat, having come from every village of Galilee, and from Judea and Jerusalem. And our Father's power was there for him to heal the sick. Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-ezi ndị mmadụ ihe, ndị Farisii na ndị ozizi iwu (sitere nʼobodo nta niile dị na Galili na Judịa na Jerusalem bịa nọdụkwa ebe) ahụ. Ike Chineke dịnyekwaara ya ịgwọ ndị ọrịa.
18 Just then, men came carrying a paralyzed man on a mat, trying to bring him in and lay him before Jesus. Nʼoge ahụ ndị ikom ụfọdụ bu otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nʼihe ndina ya, bịara gbalịa isite nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ bubata ya tọgbọ ya nʼụkwụ ya.
19 Finding no way through the crowd to bring him in, they went up on the roof and lowered him on his mat through the tiles, into the middle, right before Jesus. Mgbe ha na-enweghị ike ime nke a nʼihi igwe mmadụ, ha rigooro nʼelu ụlọ, site nʼoghere wetuo nwoke ahụ nʼute ya nʼetiti igwe mmadụ nʼihu Jisọs.
20 When Jesus saw their faith, he said, "Friend, your sins are forgiven you." Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ha, ọ sịrị, “Enyi m, a gbagharala gị mmehie gị.”
21 The scribes and Pharisees began debating, "Who is this man insulting God? Who but God alone can forgive sins?" Ndị Farisii na ndị ozizi iwu malitere iche nʼime obi ha sị, “Onye bụ onye a na-ekwulu Chineke? Onye pụrụ ịgbaghara mmadụ mmehie, ma ọ bụghị naanị Chineke?”
22 Knowing what they were thinking, Jesus answered them, "Why are you reasoning in your hearts? Mgbe Jisọs matara ihe ha na-ajụ, ọ zara ha sị, “Gịnị mere unu ji na-eche ihe ndị a nʼobi unu?
23 Which is easier: to say, 'Your sins are forgiven you,' or to say, 'Get up and walk'? Olee nke ka mfe ikwu: Ọ bụ a gbagharala gị mmehie gị niile, ka ọ bụ ị sị, Bilie jee ije?
24 But so you'll know the Son of Man has authority on earth to forgive sins"—he told the paralyzed man—"I tell you, get up, pick up your mat, and go home." Ma ka unu mata na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.” Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Asị m gị, bilie, chịrị ute gị laa nʼụlọ gị!”
25 At once he stood before them, picked up his mat, went home glorifying our Father. Ngwangwa, o biliri ọtọ nʼihu mmadụ niile, chịrị ihe ndina ya bido na-eto Chineke na-ala nʼụlọ ya.
26 Amazement seized them all; they glorified our Father, filled with awe, saying, "We saw remarkable things today." Ihe ndị a juru onye ọbụla anya, ha tokwara Chineke. Oke egwu jupụtakwara ha nʼahụ, ha sịrị, “Anyị ahụla ihe ebube taa.”
27 After this, Jesus went out and saw a tax collector named Levi sitting at the tax booth. "Follow me," he said. Mgbe nke a gasịrị, ọ pụrụ hụ otu onye ọna ụtụ aha ya bụ Livayị, ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ ya. Ọ sịrị ya, “Soro m.”
28 So Levi got up, left everything behind, and followed him. Ngwangwa, o biliri, hapụ ihe niile soro ya.
29 Then Levi hosted a great banquet for Jesus at his house, and a large crowd of tax collectors and others reclined with them. Emesịa, Livayị kwadooro Jisọs oke oriri nʼụlọ ya, ọtụtụ igwe ndị ọna ụtụ na ndị ọzọ soo ha nʼoriri ahụ.
30 But the Pharisees and their scribes grumbled to his disciples, "Why do you eat and drink with tax collectors and sinners?" Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu tamuru ntamu na-ajụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere unu ji soro ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-erikọ nri na-aṅụkọkwa ihe ọṅụṅụ?”
31 Jesus answered them, "It is not the healthy who need a doctor, but the sick. Jisọs zara sị, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike.
32 I have not come to call the righteous, but sinners to repentance." Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie ka ha chegharịa.”
33 They said to him, "John's disciples fast often and pray, likewise the Pharisees' disciples, but yours eat and drink." Ha sịrị, “Ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii na-ebu ọnụ, na-ekpe ekpere oge niile, ma ndị na-eso ụzọ gị na-eri, na-aṅụkwa.”
34 Jesus said, "Can you make the bridegroom's friends fast while he is with them? Jisọs sịrị ha, “Ndị a kpọrọ oriri nʼọlụlụ di na nwunye, ha ga-ebu ọnụ mgbe ha na onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọ?
35 But days will come when the bridegroom is taken from them, and then, in those days, they will fast." Ma oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ onye na-alụ nwunye nʼetiti ha, mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.”
36 He told them a parable too: "No one tears a patch from a new garment and sews it on an old one. Otherwise, he tears the new, and the new patch won't match the old. Ọ tụụrụ ha ilu a, “O nweghị onye na-adọkara akwa ọhụrụ were ya kwachie akwa ochie. Ọ bụrụ na e mee nke a, ọ pụtara na a dọwaala akwa ọhụrụ ahụ nʼihi na nke ahụ eji kwachie ya agaghị adaba.
37 No one puts new wine into old wineskins; otherwise the new wine will burst the skins, spill out, and the skins will be ruined. Nʼụzọ dị otu a kwa, mmadụ adịghị agbanye mmanya ọhụrụ dị ike nʼime karama akpụkpọ ochie. Nʼihi na ike si na mmanya ọhụrụ ahụ ga-eme ka karama ahụ gbawaa. Mmanya ahụ ga-awụfukwa, karama ahụ a laa nʼiyi.
38 No, new wine must be poured into new wineskins. Ma ọ dị mma ịgbanye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ.
39 And no one after drinking old wine wants the new, for he says, 'The old is good.'" O nweghị onye ṅụsịrị mmanya ochie ga-achọ ịṅụ mmanya ọhụrụ, nʼihi na ọ ga-asị, ‘Nke ochie ahụ ka mma.’ ”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]