Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Luke 4 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Jesus, full of the Holy Spirit, returned from the Jordan, led by the Spirit in the wilderness. Jisọs, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, sitere na Jọdan lọta. Mmụọ nsọ duuru ya baa nʼọzara.
2 Forty days, tempted by the devil, eating nothing in those days; when they ended, he was hungry. Ebe ahụ ka ekwensu nwara ya ọnwụnwa iri ụbọchị anọ. Nʼụbọchị ndị ahụ niile o righị nri ọbụla. Nʼikpeazụ agụụ gụrụ ya.
3 The devil told him, "If you're the Son of God, tell this stone to become bread." Ekwensu sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume a ka ọ ghọọ achịcha.”
4 And Jesus answered him, "It is written, 'Man shall not live by bread alone.'" Jisọs zara ya sị, “E dere ya, ‘Ọ bụghị naanị site na achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ.’ ”
5 Then the devil led him up and showed him all the kingdoms of the world in an instant. Ekwensu duuru ya rigoo nʼebe dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa, nʼotu ntabi anya.
6 He said to him, "I will give you all this authority and their glory, for it has been entrusted to me, and I give it to whomever I want. Ọ gwara ya sị, “M ga-enye gị ikike niile ndị a na ebube ha. Ọ bụ m ka e nyere ha, e nwere m ike inye ha onye ọbụla m chọrọ inye ha.
7 If you, then, will worship me, it will all be yours." Ya mere, ọ bụrụ na ị kpọọ isiala nye m, ha ga-abụ nke gị.”
8 And Jesus answered him, "It is written, 'You will worship your Father, and serve only him.'" Jisọs zara ya sị, “E deela ya: ‘Ị ga-akpọ isiala nye Onyenwe anyị Chineke gị, naanị ya ka ị ga-efekwa.’ ”
9 Then he led him to Jerusalem, stood him on the temple's highest point, and said, "If you're the Son of God, throw yourself down from here, Ekwensu duuru ya gaa Jerusalem, mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, si nʼebe a tụda onwe gị nʼala.
10 for it is written, 'He will command his angels concerning you, to guard you,' Nʼihi na e dere ya, “ ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ichekwa gị nke ọma;
11 and 'On their hands they will bear you up, so that you won't strike your foot against a stone.'" ha ga-ebuli gị elu nʼaka ha, ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.’”
12 And Jesus answered him, "It is said, 'You shall not put your Father to the test.'" Jisọs zara ya sị, “E kwuola ya, Anwala Onyenwe anyị Chineke gị ọnwụnwa. ”
13 And when the devil had ended every temptation, he departed from him until an opportune time. Mgbe ekwensu nwasịrị ya ọnwụnwa ndị a niile, ọ hapụrụ ya ruo mgbe ohere ọzọ dapụtara.
14 Jesus returned to Galilee in the Holy Spirit's power, and news of him spread through the whole region. Jisọs lọghachiri na Galili nʼike nke Mmụọ Nsọ. Akụkọ banyere ya gbasara ruo akụkụ obodo niile.
15 And he taught in their synagogues, and everyone glorified him. O ziri ihe nʼọtụtụ ụlọ ekpere ha, mmadụ niile na-etokwa ya.
16 He came to Nazareth, where he was raised, and as usual entered the synagogue on the Sabbath, then stood to read. Mgbe o rutere Nazaret ebe ọ nọrọ too, nʼụbọchị izuike, ọ gara nʼụlọ ekpere dị ka ọ dị mbụ eme. O guzoro ọtọ ịgụ akwụkwọ nsọ.
17 He was handed the scroll of the prophet Isaiah, unrolled it, and found where it was written: E nyere ya akwụkwọ nke onye amụma Aịzaya dere. O meghere ya chọta ebe e dere sị,
18 "The Spirit of our Father is upon me, because he has anointed me to proclaim good news to the poor. He has sent me to proclaim freedom for the captives and recovery of sight to the blind, to set free those who are oppressed, “Mmụọ nke Onyenwe anyị dị nʼahụ m, nʼihi na o teela m mmanụ ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye. O zitela m ikwupụta inwere onwe nye ndị mkpọrọ, ya na ịhụ ụzọ nye ndị kpuru ìsì, ime ka ndị a na-emegbu emegbu nwere onwe ha.
19 to proclaim the year of our Father's favor." Ikwupụta afọ Onyenwe anyị ga-eme amara.”
20 He rolled up the scroll, gave it back to the attendant, and sat down. Every eye in the synagogue was fixed on him. O mechiri akwụkwọ ahụ nyeghachi ya onye ahụ na-eje ozi, nọdụ ala. Ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ nzukọ ahụ legidere ya nnọọ anya.
21 And he began to say to them, "Today this Scripture has been fulfilled in your hearing." Ma o bidoro ịgwa ha sị, “Taa ka ihe ndị a e dere nʼakwụkwọ nsọ a mezuru na ntị unu.”
22 All spoke well of him, amazed at the gracious words from his mouth, and said, "Isn't this Joseph's son?" Mmadụ niile kwuru okwu ọma banyere ya nʼihi okwu amara niile si ya nʼọnụ pụta nke mere na ha jụrịtara onwe ha sị, “Onye a, ọ bụghị nwa nwoke Josef?”
23 He said to them, "Surely you'll quote this proverb to me: 'Doctor, heal yourself.' Do here in your hometown, too, what we heard happened in Capernaum." Ọ sịrị ha, “Nʼezie, amaara m na unu ga-atụrụ m ilu a: ‘Dibịa, gwọọ onwe gị!’ Sikwa m, ‘Ihe ndị ahụ niile anyị nụrụ ị na-eme na Kapanọm mee ha nʼebe a bụ obodo gị.’ ”
24 And he said, "Truly, I say to you, no prophet is acceptable in his hometown. Ọ gara nʼihu sị, “Ma ị gwa unu eziokwu, o nweghị onye amụma ọbụla a na-anabata nke ọma nʼobodo a mụrụ ya.
25 But truly I tell you, many widows lived in Israel in Elijah's days, when the sky was shut three years and six months and a great famine struck the whole land, Nʼezie, chetakwanụ na e nwere ọtụtụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ nʼoge Ịlaịja onye amụma. Nʼoge oke ụnwụ dara nʼala ahụ dum, mgbe e mechiri eluigwe na mmiri ezoghị nʼala Izrel afọ atọ na ọnwa isii.
26 and Elijah was sent to none of them but only to a widow in Zarephath of Sidon. Ma e zigaghị Ịlaịja ka o jekwuru onye ọbụla nʼime ha karịakwa nwanyị di ya nwụrụ anwụ nʼobodo Zarefat nʼakụkụ Saịdọn.
27 Many had leprosy in Israel in the days of the prophet Elisha, yet none was made clean except Naaman the Syrian." Nʼoge Ịlaisha onye amụma, e nwere ọtụtụ ndị ekpenta nʼala Izrel, ma o nweghị onye e mere ka ọ dị ọcha nʼetiti ha karịakwa Neeman onye Siria.”
28 When they heard these things, everyone in the synagogue was furious. Mgbe ndị nọ nʼụlọ ekpere ahụ nụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu.
29 They got up, drove him out of town, and took him to the edge of the hill their town was built on, to throw him off the cliff. Ha biliri, kwapụ ya site nʼobodo ahụ, dọkpụrụ ya gaa nʼelu ugwu nke e wukwasịrị obodo ahụ ka ha nwee ike tụpụ ya site nʼugwu ahụ.
30 But he walked through the crowd and went away. Ma o sitere nʼetiti igwe mmadụ ahụ pụọ, gawara onwe ya.
31 He went down to Capernaum, a town in Galilee, and taught them on the Sabbath, O sitere nʼebe ahụ gaa Kapanọm, obodo dịkwa na Galili. Nʼụbọchị izuike, o bidoro izi ha ihe.
32 and they were astonished at his teaching, for his word possessed authority. Ozizi ya juru ha anya, nʼihi na okwu ya nwere ikike.
33 In the synagogue was a man with the spirit of an unclean demon; he cried out in a loud voice, Otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ, onye mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya. O tiri mkpu nʼoke olu,
34 Ha! What do you want with us, Jesus of Nazareth? Have you come to destroy us? I know who you are—God's Holy One. “Hapụ anyị! Gịnị ka ị na-achọ nʼebe anyị nọ, gị, Jisọs onye Nazaret? Ị bịara ka ị laa anyị nʼiyi? Ama m onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke!”
35 Jesus rebuked him: "Be silent and come out of him!" The demon threw him down before them all, came out, and did him no harm. Jisọs baara ya mba sị, “Nọrọ jii! Si nʼime ya pụta.” Mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ahụ tụdara ya nʼala nʼihu ha niile, o sikwa nʼime ya pụọ ma o merụghị ya ahụ.
36 All were amazed and asked each other, "What word is this? With authority and power he orders unclean spirits, and they leave!" Ihe ndị a juru ha niile anya, ha jụrịtara ibe ha sị, “Gịnị bụ ozizi nke a? O ji ịchị isi na ike na-enye mmụọ na-adịghị ọcha ndị a iwu, ha na-apụtakwa!”
37 And reports about him went out into every place in the surrounding region. Akụkọ banyere ya gbasara jeruo obodo niile dị ebe ahụ gburugburu.
38 And he arose and left the synagogue and entered Simon's house. Now Simon's mother-in-law was ill with a high fever, and they asked him to help her. Mgbe ọ hapụrụ ụlọ ekpere ahụ gaa nʼụlọ Saimọn. Nne nwunye Saimọn nwere ahụ ọkụ, ha rịọrọ ya ka o nyere ya aka.
39 He stood over her and rebuked the fever; it left her, and she rose at once and began serving them. O guzoro nʼihu ya, ma baara ahụ ọkụ ahụ mba, ọ hapụrụ ya nʼotu ntabi anya ahụ. O bilikwara lee ha ọbịa.
40 As the sun set, all who had someone sick with various diseases brought them to him; laying his hands on each one, he healed them. Mgbe anyanwụ na-ada, ọtụtụ ndị nwere ndị na-arịa ọrịa dị iche iche kpọọrọ ha bịakwute Jisọs. O bikwasịrị ha niile aka nʼotu nʼotu, gwọọ ha.
41 Demons also came out of many, shouting, "You are the Son of God!" He silenced them, forbidding them to speak, since they knew he was the Christ. Mmụọ ọjọọ dị iche iche si nʼime ọtụtụ mmadụ pụta na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara Chineke.” Ma ọ baara ha mba, o kweghị ka ha kwuo okwu, nʼihi na ha matara na ọ bụ Kraịst.
42 At daybreak he went out to a remote place. Crowds looked for him, came to him, and tried to keep him from leaving them. Mgbe chi bọrọ, ọ pụrụ gaa ebe naanị ya nọ. Ndị mmadụ nọ na-achọgharị ya; mgbe ha bịaruru ebe ọ nọ, ha gbalịsịrị ike ime ka ọ ghara ịhapụ ha.
43 But he told them, "I must announce the good news of our Father's kingdom to the other towns too—this is why I was sent." Ma ọ sịrị ha, “Aghaghị m ikwusa oziọma alaeze Chineke nʼobodo ndị ọzọ, nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka e zitere m.”
44 And he was preaching in the synagogues of Judea. Ọ gara nʼihu na-ekwusa oziọma nʼụlọ ekpere niile dị na Judịa.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]