Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Luke 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 In Tiberius Caesar's fifteenth year, when Pontius Pilate was governor of Judea, Herod was tetrarch of Galilee, his brother Philip of the region of Ituraea and Trachonitis, and Lysanias of Abilene, Nʼafọ nke iri na ise nke ọchịchị Tiberiọs Siza, mgbe Pọntiọs Pailet bụ onye na-achị Judịa, ebe Herọd bụkwa onye na-achị akụkụ Galili, ma nwanne ya nwoke bụ Filip na-achị akụkụ Iturịa na Trakona, Laisania bụkwa onye na-achị akụkụ Abilin,
2 under high priests Annas and Caiaphas, our Father's word came to John son of Zechariah in the wilderness. mgbe ahụ Anas na Kaịfas bụ ndịisi nchụaja, okwu Chineke bịakwutere Jọn nwa Zekaraya nʼime ọzara.
3 He went through the whole Jordan region, preaching a baptism of repentance for the forgiveness of sins, Ọ gara nʼime obodo niile gbara Jọdan gburugburu na-ekwusa banyere baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie.
4 as it is written in the book of the words of Isaiah the prophet: "A voice of one calling in the wilderness: Prepare the way for the Lord, make his paths straight. Dịka e dere ya nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị, “Otu onye na-eti mkpu nʼọzara na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.
5 Every valley will be filled in, and every mountain and hill made low. The crooked roads will become straight, and the rough ways smooth, A ga-ekpoju ndagwurugwu ọbụla, ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala. Ụzọ gbagọrọ agbagọ ka a ga-eme ka o guzozie nke ọma, meekwa ka ụzọ ọjọọ niile dị larịị.
6 and all flesh will see the salvation of our Father." Mmadụ niile ga-ahụkwa nzọpụta Chineke.’ ”
7 John said then to the crowds coming to be baptized by him: "You brood of vipers! Who warned you to flee the coming wrath? Jọn sịrị igwe mmadụ ndị na-apụta ka o mee ha baptizim sị, “Unu ụmụ ajụala! Onye dọrọ unu aka na ntị sị unu gbanarị ọnụma nke na-abịa?
8 So produce fruit worthy of repentance. Don't start telling yourselves, 'We have Abraham as our father.' For I tell you, our Father can raise up children for Abraham from these stones. Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu. Unu amalitekwala na-asị onwe unu, ‘Anyị nwere Ebraham dịka nna.’ Nʼihi na agwa m unu na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Ebraham ụmụ.
9 Already the axe lies at the root of the trees; every tree not bearing good fruit is cut down and thrown into the fire." Ọ bụladị ugbu a, atụkwasịla anyụike na mgbọrọgwụ osisi, osisi ọbụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ ka a ga-egbutu tụba ya nʼime ọkụ.”
10 And the crowds asked him, "What then should we do?" Ma igwe mmadụ ahụ jụrụ ya sị, “Gịnị ka anyị kwesiri ime?”
11 He replied, "Whoever has two shirts, share with the one who has none; whoever has food, do the same." Ọ zara ha sị, “Onye ọbụla nwere uwe abụọ, ya nye onye ọ na-adịghị nke o nwere otu. Onye nwere nri ya meekwa otu ahụ.”
12 Tax collectors also came to be baptized, and they said to him, "Teacher, what should we do?" Ọ bụladị ndị ọna ụtụ bịakwara ka e mee ha baptizim. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, gịnị ka anyị kwesiri ime?”
13 "Collect no more than you are required to," he told them. Ọ sịrị ha, “Unu anatala karịa otu unu kwesiri ịnata.”
14 Soldiers also asked him, "And us—what should we do?" He said to them, "Don't extort anyone by force or false charges; be satisfied with your wages." Ndị agha bịakwara jụọ ya sị, “Gịnịkwa ka anyị kwesiri ime?” Ọ sịrị ha, “Unu ejikwala ike apụnara ndị mmadụ ego ha; unu ebokwala ndị mmadụ ebubo ụgha, ka afọ ju unu nʼụgwọ a na-akwụ unu.”
15 The people were expectant, all wondering in their hearts whether John himself might be the Christ. Ndị mmadụ ji olileanya na-eche na-atulekwa nʼobi ha ma Jọn ọ bụ Kraịst ahụ.
16 John answered them all, "I baptize you with water. But one stronger than I is coming—I'm not worthy to untie his sandal strap. He will baptize you with the Holy Spirit and fire. Ma Jọn zara sị ha, “Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma otu onye dị ike karịa m ga-abịa, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptizim.
17 Winnowing fork in hand, he will clear his threshing floor, gather the wheat into his barn, but burn the chaff with fire that can't be put out." Ihe ịfụcha ọka ya dị nʼaka ya, iji zachaa ebe ịzọcha ọka ya nke ọma, ka e kponye ezi mkpụrụ ọka wiiti nʼime ọba, ma kpoba igbugbo ọka nʼime ọkụ nke a na-apụghị imenyụ emenyụ.”
18 And with many other words of exhortation, John proclaimed the good news to the people. O ji ọtụtụ okwu ọzọ dị iche iche dụọ ha ọdụ ma kwusaakwara ha oziọma.
19 But John confronted Herod the tetrarch about Herodias, his brother's wife, and about all the evil Herod had done, Ma Eze Herọd, onye ọ tara ụta maka Herodịas nwunye nwanne ya nwoke, nakwa maka ihe ọjọọ dị iche iche ndị o mere,
20 Herod added this to all the rest: he locked John up in prison. tụkwasịkwara ihe nʼelu ihe ndị a niile, site na ịtụnye Jọn nʼụlọ mkpọrọ.
21 When all the people were baptized, Jesus was baptized too. As he prayed, heaven opened, Mgbe e mechara ndị niile baptizim, ma mechakwa Jisọs baptizim, mgbe ọ na-ekpe ekpere, eluigwe meghere.
22 and the Holy Spirit descended on him in bodily form like a dove. And a voice came from heaven: "You are my beloved Son; in you I delight." Mmụọ Nsọ sikwa nʼelu rịdata dị ka nduru, bekwasị ya, mgbe ahụ, otu olu sitere nʼeluigwe daa sị, “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.”
23 Jesus was about thirty when he began his ministry, the son—so it was thought—of Joseph, son of Heli, Jisọs agbaala ihe dị ka iri afọ atọ mgbe o bidoro ọrụ ya. Ọ bụ nwa (dịka ndị mmadụ chere) Josef, onye bụ nwa Heli;
24 the son of Matthat, the son of Levi, the son of Melchi, the son of Jannai, the son of Joseph, Heli abụrụ nwa Matat, nwa Livayị, nwa Meliki, nwa Janayi, nwa Josef;
25 the son of Mattathias, the son of Amos, the son of Nahum, the son of Esli, the son of Naggai, nwa Matatiyas, nwa Emọs, nwa Nehum, nwa Esili, nwa Nagayị;
26 the son of Maath, the son of Mattathias, the son of Semein, the son of Josech, the son of Joda, nwa Maat, nwa Matatiyas, nwa Semein, nwa Josek, nwa Joda;
27 the son of Joanan, the son of Rhesa, the son of Zerubbabel, the son of Shealtiel, the son of Neri, nwa Joanan, nwa Resa, nwa Zerubabel, nwa Shealtiel, nwa Neri;
28 the son of Melchi, the son of Addi, the son of Cosam, the son of Elmadam, the son of Er, nwa Meliki, nwa Adi, nwa Kosam, nwa Elmadam, nwa Er,
29 the son of Joshua, the son of Eliezer, the son of Jorim, the son of Matthat, the son of Levi, nwa Joshua, nwa Elieza, nwa Jorim, nwa Matat, nwa Livayị;
30 the son of Simeon, the son of Judah, the son of Joseph, the son of Jonam, the son of Eliakim, nwa Simiọn, nwa Juda, nwa Josef, nwa Jonam, nwa Eliakịm;
31 the son of Melea, the son of Menna, the son of Mattatha, the son of Nathan, the son of David, nwa Melea, nwa Mena, nwa Matata, nwa Netan, nwa Devid;
32 the son of Jesse, the son of Obed, the son of Boaz, the son of Salmon, the son of Nahshon, nwa Jesi, nwa Obed, nwa Boaz, nwa Salmọn, nwa Nashọn;
33 the son of Amminadab, the son of Admin, the son of Arni, the son of Hezron, the son of Perez, the son of Judah, nwa Aminadab, nwa Ram, nwa Hezrọn, nwa Perez, nwa Juda;
34 the son of Jacob, the son of Isaac, the son of Abraham, the son of Terah, the son of Nahor, nwa Jekọb, nwa Aịzik, nwa Ebraham, nwa Tera, nwa Nahọ;
35 the son of Serug, the son of Reu, the son of Peleg, the son of Eber, the son of Shelah, nwa Serug, nwa Reu, nwa Peleg, nwa Eba, nwa Shela;
36 the son of Cainan, the son of Arphaxad, the son of Shem, the son of Noah, the son of Lamech, nwa Kenan, nwa Aafaksad, nwa Shem, nwa Noa, nwa Lamek;
37 the son of Methuselah, the son of Enoch, the son of Jared, the son of Mahalalel, the son of Cainan, nwa Metusela, nwa Enọk, nwa Jared, nwa Mahalalel, nwa Kenan;
38 the son of Enosh, the son of Seth, the son of Adam, the son of our Father. nwa Enọsh, nwa Set, nwa Adam, nwa Chineke.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]