Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Luke 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 In those days Caesar Augustus issued a decree to register the whole inhabited world. Nʼoge ahụ, Siza Ọgọstọs nyere iwu ka a gụọ ọnụ, detuo aha mmadụ niile bi nʼụwa dum.
2 This was the first registration, when Quirinius was governor of Syria. (Nke a bụ ịgụ ọnụ na ide aha nke mbụ e mere mgbe Kwirinus bụ onye na-achị Siria.)
3 Everyone went to be registered, each to his own town. Onye ọbụla gara nʼobodo ya, ka e denye aha ya nʼakwụkwọ.
4 Joseph too went up from Galilee, from the town of Nazareth, to Judea, to the city of David called Bethlehem, since he belonged to David's house and family, Ya mere Josef hapụrụ Nazaret nke dị na Galili, gaa Betlehem nke dị na Judịa, nke bụkwa obodo Devid, nʼihi na o si nʼụlọ na agbụrụ Devid pụta.
5 to be registered with Mary, his fiancée, who was expecting a child. Ya na Meri, nwaagbọghọ o kwere nkwa ịlụ, nke dịkwa ime, soro gaa ka o denye aha ha.
6 While they were there, the time came for her to give birth. Mgbe ha nọ ebe ahụ, oge ọ ga-eji mụọ nwa ya zuru.
7 She gave birth to her firstborn son, wrapped him in cloths, and laid him in a manger, because the inn had no place for them. Ọ mụrụ nwa nwoke mbụ ya. O ji akwa kee ya, nibe ya nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri, nʼihi na ha enwetaghị ebe ndina nʼụlọ ndị ije.
8 Shepherds were in that same region, staying out in the fields, keeping watch over their flock by night. Ma e nwere ndị ọzụzụ atụrụ bi nʼọhịa nʼakụkụ ebe ahụ, ndị na-eche igwe atụrụ ha nche nʼabalị.
9 An angel of our Father stood before them; the glory of our Father shone around them, and great fear seized them. Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị pụtara ihe nye ha. Ebube Onyenwe anyị mụwara gburugburu ha, oke egwu tụrụ ha.
10 The angel told them, "Don't be afraid—I bring good news of great joy for everyone: Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Ana m ewetara unu oziọma nke oke ọṅụ nke ga-adịrị mmadụ niile.
11 Today in the city of David, a Savior was born to you—Christ the Lord. Nʼihi na taa, nʼobodo Devid ka a mụrụ Onye nzọpụta nye unu; ọ bụ Kraịst, Onyenwe anyị.
12 This is your sign: you'll find a baby wrapped in cloths, lying in a manger." Nke a ga-abụrụ unu ihe ịrịbama, unu ga-ahụ nwata ọhụrụ e kechiri nʼakwa, dina nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri.”
13 Suddenly there was with the angel a multitude of the heavenly host, praising our Father and saying, Na mberede, igwe ndị mmụọ ozi nke eluigwe pụtara soro mmụọ ozi a, bido na-eto Chineke na-asị,
14 "Glory to our Father in the highest, and on earth peace among those with whom he is pleased!" “Otuto dịrị Chineke nʼebe kachasị elu nke eluigwe. Udo nʼelu ụwa nye ndị niile ihe ha dị Chineke ezi mma.”
15 When the angels left them for heaven, the shepherds said to each other, "Let's go straight to Bethlehem and see this thing that has happened, which our Father has made known to us." Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ hapụrụ ha, laghachi nʼeluigwe, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ sịrịtara onwe ha, “Bịanụ ka anyị jeruo Betlehem, ka anyị jiri anya anyị hụ ihe ndị a merenụ, nke Onyenwe anyị mere ka anyị mara.”
16 They hurried off and found Mary and Joseph, and the baby lying in the manger. Ha gara ọsịịsọ hụ Meri na Josef, na nwata ahụ ka o dina nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri.
17 When they saw him, they made known what had been told them about this child. Mgbe ha hụrụ nke a, ha mere ka a mata ihe niile a gwara ha banyere nwantakịrị a.
18 All who heard were amazed at what the shepherds told them. Ihe ndị ọzụzụ atụrụ a kwuru juru ndị niile nụrụ ya anya.
19 But Mary treasured up all these things, pondering them in her heart. Ma Meri debere ihe ndị a niile nʼobi ya, na-atụgharị ihe banyere ha nʼobi ya.
20 The shepherds returned, glorifying and praising our Father for all they'd heard and seen, just as they were told. Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ laghachiri, na-eto Chineke na-ebulikwa aha ya elu nʼihi ihe niile ha nụrụ ma hụkwa, nke dịkwa ka a gwara ha.
21 When eight days for his circumcision were complete, he was named Jesus, the name the angel gave before he was conceived in the womb. Mgbe ụbọchị asatọ gasịrị, mgbe oge ruru ibi nwata ahụ ugwu, ha gụkwara ya aha. Aha ha nyere ya bụ Jisọs, aha ahụ mmụọ ozi nyere tupu a dị ime ya.
22 When their days of purification under the Law of Moses ended, they brought him up to Jerusalem to present him to our Father, Mgbe oge zuru maka mmemme nke ịdị ọcha dị ka iwu Mosis siri dị, ha kutere ya na Jerusalem iche ya nʼihu Onyenwe anyị
23 (as it is written in our Father's Law, "Every firstborn male will be called holy to our Father"), (dịka e dere ya nʼiwu nke Onyenwe anyị, “Nwa mbụ ọbụla nke bụ nwoke ka a ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị”),
24 and to offer a sacrifice as the Law of our Father says: a pair of turtledoves or two young pigeons. ha chụrụ aja dị ka e nyere nʼiwu Onyenwe anyị: “Ụmụ kpalakwukwu abụọ maọbụ ụmụ nduru abụọ.”
25 In Jerusalem lived a man named Simeon, righteous and devout, waiting for Israel's comfort, with the Holy Spirit on him. Ma lee, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem aha ya bụ Simiọn, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ bụ onye ezi omume bụrụkwa onye ji obi ya niile na-efe Chineke. Ọ bụkwa onye na-ele anya maka nkasiobi nke ndị Izrel.
26 The Holy Spirit had revealed to him he wouldn't die before seeing our Father's Christ. Ma Mmụọ Nsọ Chineke mere ka ọ mata na ọ gaghị anwụ ruo mgbe ọ hụrụ Kraịst nke Onyenwe anyị.
27 Prompted by the Spirit, he entered the temple. As the parents brought in the child Jesus to do for him what the Law required, Site nʼodudu nke Mmụọ Nsọ, ọ batara nʼụlọnsọ ukwu, ma mgbe nne na nna nwata ahụ bụ Jisọs kubatara ya dị ka omenaala iwu si dị,
28 Simeon took him up in his arms and blessed our Father, saying, Simiọn kuuru ya nʼaka, kelee Chineke sị,
29 "Sovereign Father, now you are letting your servant depart in peace, according to your word. “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe dị ka i kwere na nkwa, ugbu a zilaga nwaodibo gị nʼudo.
30 For my eyes have seen your salvation, Nʼihi na anya m ahụla nzọpụta gị,
31 which you have prepared in the presence of all peoples: nke i kwadoro nʼihu mba niile.
32 a light for revelation to the Gentiles, and for glory to your people Israel." Ìhè nke ga-egosi ndị mba ọzọ ụzọ, na ebube nke ndị gị Izrel.”
33 His father and mother were amazed at what was said about him. O juru nne na nna nwantakịrị ahụ anya ịnụ ihe ndị a e kwuru banyere ya.
34 And Simeon blessed them and told Mary, his mother, "This child is appointed for the fall and rising of many in Israel, and to be a sign that is opposed, Mgbe ahụ, Simiọn gọziri ha, sịkwa Meri nne ya, Lee, “Nwatakịrị a bụ onye e zitere ka ọ bụrụ ọdịda na mbili nye ọtụtụ mmadụ nʼIzrel, ọ ga-abụkwa ihe ama nke ọtụtụ ga-ekwujọ.
35 and a sword will pierce through your own soul also—so that thoughts from many hearts may be revealed." Ọ bụkwa site nʼụzọ dị otu a ka a ga-ekpughe echiche nke dị ọtụtụ nʼobi. Mma agha ga-adụwakwa mkpụrụobi nke gị onwe gị.”
36 Also there was Anna, a woman prophet, daughter of Phanuel of Asher's tribe, very old, having lived with her husband seven years after her virginity, O nwekwara onye amụma nwanyị, aha ya bụ Ana, ada Fanuel nke si nʼebo Asha. Ọ bụ ezigbo agadi nwanyị na-enweghị di, nʼihi na di ya nwụrụ mgbe ha biri naanị afọ asaa.
37 and a widow until eighty-four, never leaving the temple, worshiping with fasting and prayer night and day. Ọ nọọla dị ka nwanyị na-enweghị dị iri afọ asatọ na anọ. Ọ hapụghị ụlọnsọ, kama ọ nọgidere nʼefe ofufe ehihie na abalị, na-ibu ọnụ na-ekpe ekpere.
38 Coming up at that same hour, she gave thanks to our Father and spoke of the child to all awaiting Jerusalem's redemption. Nʼoge ahụ ọ bịarutere nʼebe ha nọ, nye Chineke ekele, kwuo okwu banyere nwantakịrị ahụ nye ndị niile na-ele anya maka mgbapụta Jerusalem.
39 When they finished everything required by our Father's Law, they returned to Galilee, to their own town of Nazareth. Mgbe ha mesịrị ihe niile otu ọ dị nʼiwu Onyenwe anyị, ha laghachiri obodo ha bụ Nazaret nke dị nʼime Galili.
40 The child grew, becoming strong, filled with wisdom, and our Father's favor was on him. Ma nwata ahụ toro bụrụ onye dị ike; o jupụtara nʼamamihe, amara Chineke dịnyekwaara ya.
41 Now his parents went to Jerusalem every year at the Feast of Passover. Nʼafọ niile, ndị mụrụ ya na-aga Jerusalem nʼihi Mmemme Ngabiga.
42 When he was twelve years old, they went up according to the custom of the feast. Mgbe o ruru afọ iri na abụọ, ha gara maka mmemme dị ka omenaala si dị.
43 When the festival ended and they left for home, the boy Jesus stayed behind in Jerusalem, unknown to his parents. Mgbe e mesịrị mmemme ahụ, ka ndị mụrụ ya na-alaghachi, nwata ahụ bụ Jisọs nọdụrụ na Jerusalem. Ndị ha amataghị na o soghị ha na-alọta.
44 Thinking he was in the group, they traveled a day's journey, then searched for him among relatives and acquaintances. Ha chere na o sonyere nʼetiti njem. Ha gara ije otu ụbọchị tupu ha a malite ịchọ ya nʼetiti ndị ikwu na ibe, na ndị enyi ha.
45 When they did not find him, they returned to Jerusalem, searching for him. Ma mgbe ha na-ahụghị ya, ha laghachiri Jerusalem na-achọkwa ya.
46 After three days they found him in the temple, sitting among the teachers, listening to them and asking them questions. Ka ụbọchị atọ gasịrị, ha hụrụ ya nʼụlọnsọ ukwu ebe ọ nọdụrụ nʼetiti ndị ode akwụkwọ, na-ege ha ntị na-ajụkwa ha ajụjụ.
47 All who heard him were amazed at his understanding and his answers. Nghọta na ọsịsa ya juru ndị niile nụrụ okwu ya anya.
48 When his parents saw him, they were astonished. His mother said, "Child, why have you done this to us? Look, your father and I have been anguished, searching for you." Mgbe ndị mụrụ ya hụrụ ya, ọ tụrụ ha nʼanya, ma nne ya sịrị ya, “Nwa m, gịnị mere i ji mesoo anyị mmeso dị otu a? Mụ na nna gị nọ na-achọgharị gị?”
49 He said to them, "Why were you searching for me? Didn't you know I must be in my Father's house?" Ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji na-achọ m? Unu amaghị na aghaghị m ịnọ nʼụlọ Nna m?”
50 But they did not understand the saying that he spoke to them. Ma ha aghọtaghị ihe ọ gwara ha.
51 Then he went down with them and came to Nazareth, remaining obedient to them. His mother kept all these things in her heart. Mgbe ahụ, o sooro ha laghachi Nazaret ma na-erubekwara ha isi. Ma nne ya dobere ihe ndị a niile nʼobi ya.
52 Jesus increased in wisdom and stature and in favor with our Father and with people. Jisọs na-aga nʼihu nʼamamihe na ogologo, ya na ihuọma nʼebe Chineke na nke mmadụ nọ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]