1Since many have undertaken to compile an ordered account of what has been accomplished among us.OICBEbe ọ bụ nʼọtụtụ mmadụ agbalịala otu ha nwere ike i detu nʼusoro ihe niile mezuru nʼetiti anyị.
2Just as eyewitnesses from the beginning and servants of the word handed these accounts to us,OICBDị ka e nyefere ha nʼaka anyị idebe bụ ndị ahụ sitere na malite jiri anya ha hụ ihe niile, ndị jikwa okwu a eje ozi.
3I too, having traced everything accurately from the start, decided to write it in order for you, most excellent Theophilus,OICBEkpebikwara m, ebe mụ onwe m nyocharala ihe niile nke ọma site na mmalite, ka m dere gị ihe niile nʼusoro, Tiofilọs, gị onye dị elu a na-asọpụrụ.
4so that you may know the certainty of the things you have been taught.OICBNke a ga-eme ka ị mata nke bụ eziokwu banyere ihe ndị ahụ e ziri gị.
5In the days of Herod, king of Judea, a priest named Zechariah was in Abijah's priestly division. His wife Elizabeth descended from Aaron.OICBNʼoge Herọd bụ eze Judịa, ọ dị otu onyeisi nchụaja aha ya bụ Zekaraya, onye si nʼotu ndị nchụaja nke Abija. Elizabet bụ nwunye ya, site nʼagbụrụ Erọn.
6They were both righteous before our Father, walking blamelessly in all his commandments and ordinances.OICBHa abụọ bụ ndị ezi omume nʼihu Chineke. Ha debere iwu na ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere na-enweghị ntụpọ ọbụla.
7But they had no child, because Elizabeth was barren, and both were very old.OICBMana ha amụtaghị nwa, nʼihi na Elizabet bụ nwanyị agaa, ha abụọ emeela nnọọ agadi.
8Now while he was serving as priest before our Father when his division was on duty,OICBO ruru mgbe ọ bụ ndị otu Zekaraya ga-eje ozi, ọ nọ dịka onye nchụaja na-eje ozi nʼihu Chineke.
9by priestly custom, lot chose him to enter his sanctuary and burn incense.OICBA họpụtara ya site nʼife nza dị ka omenaala ndị nchụaja si dị ka ọ bụrụ ya ga-abanye nʼime ime ụlọnsọ Onyenwe anyị ịchụ aja nsure ọkụ nke e ji ụda na-esi isi ụtọ achụ.
10And the whole crowd of the people were praying outside at the hour of incense.OICBMgbe oge ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ ruru, igwe ndị mmadụ bịara nọ nʼezi na-ekpe ekpere.
11Then an angel of our Father appeared to him, standing at the right of the altar of incense.OICBMgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị, onye guzo nʼaka nri nke ebe ịchụ aja nke ihe na-esi isi ụtọ mere ka ọ hụ ya anya.
12Zechariah was shaken when he saw him, and fear came over him.OICBMgbe Zekaraya hụrụ ya, obi fepụrụ ya, ọ tụkwara oke egwu.
13The angel said to him, "Don't be afraid, Zechariah—your prayer has been heard. Your wife Elizabeth will bear you a son; name him John.OICBMa mmụọ ozi ahụ gwara ya sị, “Zekaraya atụla egwu, Chineke anụla ekpere gị. Elizabet nwunye gị ga-atụrụ ime mụtara gị nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jọn.
14You will have joy and gladness; many will rejoice at his birth.OICBỌ ga-abụrụ gị ihe oke ọṅụ na obi ụtọ, ọtụtụ mmadụ ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ọmụmụ ya.
15He will be great before our Father, must never drink wine or other alcoholic drinks, and he will be filled with the Holy Spirit even from his mother's womb.OICBNʼihi na ọ ga-abụ onye dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gaghị aṅụkwa mmanya ọbụla, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-egbu egbu nʼihi na site nʼafọ nne ya ọ ga-abụ onye emejupụtara na Mmụọ Nsọ.
16And he will turn many of the children of Israel back to their Father.OICBỌ ga-akpọghachite ọtụtụ ụmụ Izrel nye Onyenwe ha bụ Chineke ha.
17He will go before our Father in Elijah's spirit and power, turning fathers' hearts to their children, and the disobedient to the wisdom of the righteous, to prepare a people ready for our Father."OICBMa ọ ga-aga nʼihu Onyenwe anyị nʼike mmụọ na ike nke Ịlaịja, tụgharịa obi ndị bụ nna nʼebe ụmụ ha nọ. Meekwa ka ndị isiike tụgharịa obi, lekwasị anya nʼamamihe nke ndị ezi omume, na ijikere ụmụ mmadụ nʼihi Onyenwe anyị.”
18Zechariah said to the angel, "How will I know this? I'm old, and my wife is well along in years."OICBZekaraya sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu m ga-esi mata na nke a ga-adị otu a? Abụrụla m agadi. Nwunye m akakwaala nka.”
19The angel answered him, "I am Gabriel, who stands in our Father's presence, sent to speak to you and bring you this good news.OICBMmụọ ozi zara ya sị, “Abụ m Gebrel. Ana m eguzo nʼihu Chineke. Ezitere m ka m bịa gwa gị okwu ma wetara gị oziọma a.
20And now you will be silent, unable to speak, until the day these things happen, because you did not believe my words, which will come true in their time."OICBMa lee, ị ga-ada ogbi, ị gaghị ekwukwa okwu ọbụla, tutu ruo mgbe ihe ndị a ga-emezu nʼihi na i kwenyeghị nʼokwu m, nke ga-emezu mgbe oge ya ruru.”
21Meanwhile the people waited for Zechariah, wondering why he stayed so long in the sanctuary.OICBMgbe ihe ndị a niile na-eme, mmadụ ndị ahụ nọkwa na-eche Zekaraya ka ọ pụta. O juru ha anya na ọ nọọla ọdụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ.
22When he came out, he could not speak to them, and they knew he had seen a vision in the sanctuary. He kept motioning to them and stayed mute.OICBMgbe o mesịrị pụta, o nwekwaghị ike ikwuru ha okwu. Ha ghọtara na ọ hụrụ ọhụ nʼime ụlọnsọ ahụ nʼihi na ọ bụ aka ka o ji gwa ha okwu.
23And when his days of service were ended, he went home.OICBMgbe oge ịrụ ọrụ ya gwụsịrị, ọ laghachiri nʼụlọ ya.
24After these days his wife Elizabeth became pregnant, and for five months she kept herself hidden, saying,OICBMgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị, Elizabet bụ nwunye ya tụụrụ ime. O zoro onwe ya nʼime ụlọ ọnwa ise.
25"This is what our Father did for me, in the days he looked on me, to remove my disgrace among people."OICBỌ sịrị, “Onyenwe anyị emeerela m nke a. O gosila m ihuọma ya nʼụbọchị ndị a, ma wepụkwara m ihere nʼetiti ndị nke m.”
26In month six our Father sent the angel Gabriel to a Galilee town called Nazareth,OICBMa nʼọnwa isii ya, Chineke zigara mmụọ ozi ya, bụ Gebrel, ka ọ gaa nʼobodo Nazaret nke dị nʼime Galili.
27to a virgin engaged to a man named Joseph, of the house of David; the virgin's name was Mary.OICBKa o jekwuru otu nwaagbọghọ na-amaghị nwoke bụ onye otu nwoke aha ya bụ Josef, onye sitere nʼagbụrụ Devid, kwere nkwa ịlụ. Aha nwaagbọghọ a bụ Meri.
28And he came to her and said, "Greetings, favored one! Our Father is with you."OICBO jekwuru ya sị ya, “Ekele! Gị onye ihuọma dịkwasịrị. Onyenwe anyị nọnyekwara gị.”
29But she was greatly troubled by his words, and wondered what kind of greeting this might be.OICBMa obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu nʼihi okwu ya. O bidokwara ịtụgharị nʼuche ya ihe ekele a pụtara.
30The angel said to her, "Don't be afraid, Mary, for you have found favor with our Father.OICBMa mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Atụla egwu Meri, nʼihi na i chọtala ihuọma nʼebe Chineke nọ.
31You will conceive in your womb and bear a son, and you will call his name Jesus.OICBMa lee ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jisọs.
32He will be great and called Son of the Most High, and our Father will give him the throne of his father David,OICBỌ ga-abụ nnukwu mmadụ onye a ga-akpọ Ọkpara Onye kachasị ihe niile elu. Onyenwe anyị Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid.
33and he will reign over Jacob's house forever; his kingdom will never end."OICBỌ ga-achị ụlọ Jekọb ruo ebighị ebi, alaeze ya agaghị enwekwa ọgwụgwụ.”
34And Mary said to the angel, "How will this be, since I am a virgin?"OICBMeri sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe m bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke?”
35The angel answered her, "The Holy Spirit will come over you, and the Most High's power will shadow you; so the holy child born will be called the Son of our Father.OICBMmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye kachasị ihe niile elu ga-ekpuchikwa gị. Ya mere onye nsọ ahụ a ga-amụ, a ga-akpọ ya Ọkpara Chineke.
36Look, your relative Elizabeth has also conceived a son in her old age—this is the sixth month for her called barren.OICBLekwa Elizabet onye ikwu gị atụrụla ime nwa nwoke nʼagadi ya. Nke a bụ ọnwa isii ya, bụ onye ahụ ha na-akpọ nwanyị aga.
37For nothing will be impossible with our Father."OICBNʼihi na ọ dịghị okwu sitere na Chineke nke na-agaghị ere.”
38Mary said, "I am the servant of our Father; let it happen to me as you said." Then the angel left her.OICBMeri zaghachiri sị, “Abụ m ohu Onyenwe anyị, ka ọ dịrị m dị ka i kwuru.” Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya laa.
39In those days Mary got up and hurried to the hill country, to a town in Judah,OICBNʼoge ahụ, Meri biliri gaa ọsịịsọ nʼotu obodo dị nʼugwu Juda.
40and she entered the house of Zechariah and greeted Elizabeth.OICBNʼebe ahụ, ọ banyere nʼụlọ Zekaraya, kelee Elizabet.
41When Elizabeth heard Mary's greeting, her baby leaped in her womb, and she was filled with the Holy Spirit.OICBMgbe Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa nọ ya nʼafọ megharịrị ahụ. E mere ka Elizabet jupụta na Mmụọ nsọ.
42She cried out with a loud voice, "Blessed are you among women, blessed is the fruit of your womb!OICBO tiri mkpu nʼoke olu sị, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nʼetiti ụmụ nwanyị niile. Onye a gọziri agọzi ka nwa ahụ ị bu nʼafọ bụkwa.
43And why is this granted to me, that the mother of my Lord should come to me?OICBOnye kwanụ ka m bụ na ihuọma dị otu a kpọrọ m na nne Onyenwe m ga-abịa ileta m?
44For the moment I heard your greeting, the baby in my womb leaped for joy.OICBNgwangwa m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m nʼafọ wuliri elu nʼọṅụ.
45Blessed is she who believed that there would be a fulfillment of what our Father spoke to her."OICBNgọzị ga-adịrị onye ahụ kwere na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kweere ya na nkwa ime.”
46And Mary said, "My soul magnifies our Father,OICBMa Meri sịrị, “Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu
47and my spirit rejoices in our Father, my Savior,OICBmmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m,
48for he has looked on the humble estate of his servant. For from now on all generations will call me blessed;OICBnʼihi na o ledatala anya, lekwasị m, bụ odibo ya dị ala. Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi.
49for the Mighty One has done great things for me, and holy is his name.OICBNʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu. Aha ya dịkwa nsọ.
50And his mercy is for those who fear him from generation to generation.OICBEbere ya na-erute ndị niile na-atụ egwu ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
51He has shown strength with his arm; he has scattered the proud in the thoughts of their hearts;OICBO gosila ike aka ya; ọ chụsasịala ndị dị mpako nʼime echiche obi ha.
52he has brought down the mighty from their thrones and lifted up the humble;OICBO sitela nʼocheeze ndị eze dị ike kwatuo ha, buliekwa ndị dị umeala nʼobi elu.
53he has filled the hungry with good things, and the rich he has sent away empty.OICBO jirila ihe dị mma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ ma ndị ọgaranya ka o zipụrụ nʼaka efu.
54He has helped his servant Israel, in remembrance of his mercy,OICBO nyerela odibo ya bụ Izrel aka, ọ na-echetakwa imere ya ebere.
55just as he spoke to our fathers, to Abraham and to his offspring forever."OICBDị ka ọ gwara nna nna anyị ha, nye Ebraham na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.”
56And Mary remained with her about three months and then returned to her home.OICBMeri nọnyeere ya ihe dịka ọnwa atọ ma mesie laghachi nʼụlọ ya.
57Now the time came for Elizabeth to give birth, and she bore a son.OICBMgbe oge zuru ka Elizabet mụọ nwa, ọ mụrụ nwa nwoke.
58Her neighbors and relatives heard our Father had shown her great mercy, and rejoiced with her.OICBNdị agbataobi ya na ndị ikwu ya, ndị nụrụ otu Chineke si gosi ya ebere dị ukwuu, bịara soro ya ṅụrịa ọṅụ.
59On the eighth day they came to circumcise the child, and were going to call him Zechariah after his father,OICBNʼabalị nke asatọ ha bịara ibi nwata ahụ ugwu na ịgụ ya aha. Ha na-achọ ịgụ ya Zekaraya bụ aha nna ya,
60but his mother answered, "No; he will be called John."OICBma Nne ya sịrị, “Mba, a ga-agụ ya Jọn.”
61And they said to her, "None of your relatives is called by this name."OICBHa sịrị ya, “Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ndị ikwu gị na-aza aha ahụ.”
62And they made signs to his father, asking what Zechariah wanted the child to be called.OICBYa mere, ha jiri ife aka jụọ nna ya, ihe ọ chọrọ ka akpọ nwata ahụ.
63He asked for a tablet and wrote, "His name is John." And everyone was amazed.OICBỌ rịọrọ ka e nye ya mbadamba ihe e ji ede ihe, o deere “Aha ya bụ Jọn.” Nke a jukwara mmadụ niile anya.
64And immediately his mouth was opened and his tongue loosed, and he spoke, blessing our Father.OICBNgwangwa, ọnụ ya meghere, atọpụkwara ire ya. Ya ebido ikwu okwu ma na-etokwa Chineke.
65Fear fell on all their neighbors, and all these things were talked about throughout Judea's hill country.OICBIbubo wụrụ ndị agbataobi ha niile nʼahụ, ndị mmadụ kọkwara akụkọ banyere ihe ndị a niile ruo obodo niile dị nʼakụkụ ugwu Judịa.
66And all who heard kept these things in their hearts, saying, "What then will this child become?" For our Father's hand was with him.OICBNdị niile nụrụ akụkọ a chere nʼobi ha na-ajụ sị, “Gịnịkwa ka nwa nke a gaje ịbụ?” Nʼihi na aka Onyenwe anyị dịnyeere ya.
67And his father Zechariah was filled with the Holy Spirit and prophesied, saying,OICBE mere ka Zekaraya bụ nna ya jupụta na Mmụọ Nsọ. O buru amụma sị,
68"Blessed be our Father of Israel, for he has visited and redeemed his people,OICB“Ngọzị dịrị Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel, nʼihi na ọ bịala leta ma gbapụtakwa ndị nke ya.
69and has raised up a mighty Savior for us in the house of his servant David,OICBO welielara anyị Onye nzọpụta site nʼụlọ odibo ya bụ Devid.
70as he spoke through the mouth of his holy prophets long ago,OICB(Dị ka o kwuru na mgbe ochie, site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ).
71that we should be saved from our enemies and from the hand of all who hate us;OICBNa ọ ga-azọpụta anyị site nʼaka ndị iro anyị na sitekwa nʼaka ndị niile kpọrọ anyị asị.
72to show the mercy promised to our fathers and to remember his holy covenant,OICBO meere ndị nna nna anyị ha ebere site nʼicheta ọgbụgba ndụ ya dị nsọ.
73the oath that he swore to our father Abraham, to grant us,OICBIyi nke ọ ṅụụrụ nna anyị bụ Ebraham, kwekwa nkwa:
74that we, being delivered from the hand of our enemies, might serve him without fear,OICBNa ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, nyekwa anyị ike ife ya ofufe na-atụghị egwu.
75in holiness and righteousness before him all our days.OICBNʼịdị nsọ na ezi omume nʼihu ya ụbọchị niile nke ndụ anyị.
76And you, child, will be called the prophet of the Most High; for you will go before the Lord to prepare his ways,OICB“Ma gị nwa m, a ga-akpọ gị onye amụma nke Onye kachasị ihe niile elu; nʼihi na ị ga-aga nʼihu Onyenwe anyị kwadoro ya ụzọ.
77to give his people the knowledge of salvation through the forgiveness of their sins,OICBIme ka ndị nke ya nwee amamihe nke nzọpụta site na ịgbaghara mmehie ha.
78because of the tender mercy of our Father, by which the sunrise from on high will visit us,OICBNʼihi oke obi ebere Chineke anyị, nke ọwụwa anyanwụ ga-ewetara anyị site nʼigwe.
79to give light to those who sit in darkness and in the shadow of death, to guide our feet into the way of peace."OICBKa ọ chakwasị ndị bi nʼọchịchịrị na nʼonyinyo nke ọnwụ, na iduzi ụkwụ anyị nʼụzọ nke udo.”
80The child grew, became strong in spirit, and lived in the wilderness until the day he appeared publicly to Israel.OICBNwata ahụ toro, bụrụ onye dị ike nʼime mmụọ. O biri nʼime ọzara tutu ruo mgbe oge zuru igosi ụmụ Izrel onwe ya.