Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 "If someone's offering is a peace offering from the herd, male or female, he must present it without defect before me. “ ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ inye onyinye aja udo, o nwere ike jiri anụ ụlọ si nʼigwe ehi, oke ehi maọbụ nwunye ehi. Ma anụ ahụ ọ ga-ewebata nʼihu Onyenwe anyị aghaghị ịbụ ehi na-enweghị nkwarụ.
2 He lays his hand on his offering's head and slaughters it at the tent of meeting's entrance, and Aaron's sons the priests splash the blood against all sides of the altar. Onye ahụ wetara ya, ga-ebikwasị aka ya nʼisi anụ ahụ, gbuo ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Mgbe ahụ ụmụ Erọn ndị ikom, bụ ndị nchụaja, ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja.
3 From the peace offering he must present to me a food offering made by fire: the fat covering the inner parts and all the fat on them, Site nʼonyinye aja udo, ị ga-eweta onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị: abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya, na abụba niile nke metụtara ha,
4 both kidneys with the fat on them near the flanks, and the long lobe of the liver, which he removes with the kidneys. akụrụ ya abụọ na abụba nke dị nʼelu ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na umeju ya na abụba kpuchiri umeju ya, nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya.
5 Aaron's sons will burn it on the altar atop the burnt offering on the wood over the fire—a food offering, a pleasing aroma to me. Mgbe ahụ, ụmụ Erọn ga-esunye ha ọkụ nʼelu aja nsure ọkụ a tụkwasịrị nʼosisi e sunyere ọkụ, ọ bụ onyinye nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị.
6 "If his peace offering to me is from the flock, male or female, he must present it without defect. “ ‘Ọ bụrụ na onyinye aja udo a na-achụrụ Onyenwe anyị bụ site nʼigwe ewu maọbụ atụrụ, ọ ghaghị ịbụ mkpi maọbụ nne ewu na-enweghị ntụpọ.
7 If he brings a lamb as his offering, he is to present it before me, Ọ bụrụ onyinye atụrụ, onye ahụ ga-ewebata ya nʼihu Onyenwe anyị.
8 lay his hand on the head of his offering and slaughter it before the tent of meeting; Aaron's sons will splash its blood on all sides of the altar. Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi atụrụ ahụ, gbuo ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ndị nchụaja, ụmụ Erọn, ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ.
9 From the peace offering he must present a food offering to me by fire: its fat, the whole fat tail cut off close to the backbone, the fat covering the inner parts, and all the fat on them, Ị ga-esite nʼonyinye aja udo a, weta onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị: abụba ya, na abụba niile dị nʼọdụdụ ya nke a ga-esite nʼakụkụ ọkpụkpụ azụ ya bepụta, na abụba kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya; na abụba niile nke metụtara ha,
10 both kidneys with the fat near the loins, and the liver's long lobe, which he removes with the kidneys. na akụrụ ya abụọ, na abụba kpuchiri ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na umeju ya, na abụba kpuchiri ya; nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya.
11 The priest will burn it on the altar as food, an offering made to me by fire. Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja dịka ihe oriri, onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
12 "If his offering is a goat, he is to present it before me, “ ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla eweta ewu dịka onyinye ọ na-eche nʼihu Onyenwe anyị,
13 lay his hand on its head and slaughter it in front of the tent of meeting; Aaron's sons will splash its blood on all sides of the altar. ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi ewu ahụ, gbuo ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ụmụ Erọn ndị ikom ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja.
14 From it he must present a food offering to me by fire: the fat covering the inner parts and all the fat on them, Ọ bụ site nʼonyinye nke i wetara ka ị ga-esi chee onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị: abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya na abụba niile metụtara ha,
15 both kidneys with their fat near the loins, and the liver's long lobe, which he removes with the kidneys. na akụrụ ya abụọ, na abụba kpuchiri ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na ihe kpuchiri umeju ya; nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya.
16 The priest will burn them on the altar as food, an offering by fire, a pleasing aroma. All fat is mine. Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka ihe oriri, onyinye nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ. Abụba niile bụ nke Onyenwe anyị.
17 "This is a lasting rule for all generations, wherever you live: never eat any fat or any blood." “ ‘Iwu ndị a ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Unu ga-edebezu ya nʼebe ọbụla unu bi. Unu agaghị eri abụba maọbụ ọbara ọbụla.’ ”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]