Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 4 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father spoke to Moses, saying: Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
2 "Tell the Israelites: If a person sins unintentionally against any of our Father's commands, doing what must not be done, and breaks one of them, “Gwa ụmụ Izrel okwu, sị ha, ‘Mgbe onye ọbụla mehiere na-amaghị ama, megide ihe ọbụla Onyenwe anyị nyere nʼiwu:
3 if the anointed priest sins, bringing guilt on the people, he must bring our Father a young bull without defect as a sin offering for the sin he committed. “ ‘Ọ bụrụ na onye nchụaja e tere mmanụ emehie na-amaghị ama, si otu a weta ikpe ọmụma nʼisi ọha mmadụ. Ọ ga-ewetara Onyenwe anyị otu oke ehi na-enweghị ntụpọ dịka aja mmehie, nʼihi mmehie ahụ o mere.
4 He is to bring the bull to the tent of meeting's entrance before our Father, lay his hand on its head, and slaughter it before our Father. Ọ ga-ewere oke ehi ahụ bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, nʼihu Onyenwe anyị. Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi ya, gbuo ya nʼebe ahụ nʼihu Onyenwe anyị.
5 The anointed priest takes some of the bull's blood and brings it into the tent of meeting. Mgbe ahụ, onye nchụaja e tere mmanụ ga-eburu ụfọdụ ọbara oke ehi ahụ baa nʼime ụlọ nzute.
6 He is to dip his finger in the blood, sprinkling it seven times before our Father in front of the sanctuary veil. Ọ ga-edenye mkpịsịaka ya nʼime ọbara ahụ, fesa ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu akwa mgbochi nke ebe nsọ ahụ.
7 The priest is to put some of the blood on the horns of the altar of fragrant incense before our Father, which is in the tent of meeting, and pour all the rest of the bull's blood at the base of the burnt-offering altar at the entrance of the tent of meeting. Onye nchụaja ga-etekwasị ụfọdụ ọbara ahụ na mpi dị nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ, nʼihu Onyenwe anyị nʼime ụlọ nzute. Ọbara fọdụrụ nʼoke ehi ahụ ka ọ ga-awụsa nʼụkwụ ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ, nʼọnụ ụzọ ịba ụlọ nzute.
8 He is to remove all the fat of the sin offering bull: the fat covering the entrails, and all the fat on the entrails. Ọ ga-ewepụ abụba niile site nʼoke ehi aja mmehie, abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya na nke jikọtara ha,
9 The two kidneys, the fat on them near the loins, and the liver's lobe—he removes with the kidneys, na akụrụ ya abụọ na abụba kpuchiri ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na ihe kpuchiri umeju ya, nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya,
10 as removed from the ox of the peace offering; the priest is to burn them on the altar of burnt offering. dịka e si ewepụ abụba oke ehi e ji chụọ aja udo. Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ.
11 But the bull's hide, all its flesh, head, legs, intestines, and dung. Ma akpụkpọ anụ oke ehi ahụ na ahụ ya niile, ma isi ya, na ụkwụ ya, na ihe dị nʼime afọ ya, na mgbịrị afọ ya,
12 He must carry all the rest of the bull outside the camp to a clean place where ashes are dumped, and burn it on a wood fire; it must be burned where ashes are dumped. ihe niile fọdụrụ nʼoke ehi ahụ, ka a ga-ebupu nʼazụ ebe obibi ụmụ Izrel, ebe dị ọcha, ebe a na-ekpofu ntụ. Ebe ahụ ka a ga-anọ kpọọ ya ọkụ, nʼọkụ a kwanyere nʼebe a na-ekpofu ntụ.
13 "If Israel's whole congregation sins unintentionally, and the matter is hidden from the assembly's eyes, and they do one of the things our Father commanded not to be done, and become guilty. “ ‘Ọ bụrụ na nzukọ Izrel niile emehie na-amaghị ama, mee ihe ọbụla megidere ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu nke a na-adịghị eme eme, ọ bụ ezie na ndị obodo amaghị okwu a, mgbe ha ghọtara ikpe ọmụma ha
14 When the sin they committed becomes known, the assembly must offer a young bull as a sin offering and bring it before the tent of meeting. matakwa mmehie ha mehiere, nzukọ ahụ aghaghị iweta nwa oke ehi dịka aja mmehie, duru ya chee ya nʼihu ụlọ nzute.
15 The elders of the community lay hands on the bull's head before our Father; then it is slaughtered before our Father. Ndị okenye nzukọ Izrel ga-ebikwasị aka ha nʼisi oke ehi ahụ nʼihu Onyenwe anyị. A ga-egbu ehi ahụ nʼihu Onyenwe anyị.
16 Then the anointed priest is to bring some of the bull's blood into the tent of meeting. Mgbe ahụ, onye nchụaja e tere mmanụ ga-ewere ụfọdụ nʼime ọbara ya baa nʼụlọ nzute.
17 He is to dip his finger in the blood and sprinkle seven times before our Father, in front of the veil. Ọ ga-edenye mkpịsịaka ya nʼime ọbara ahụ fesa ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu akwa mgbochi ahụ.
18 He is to put some of the blood on the altar's horns before our Father in the tent of meeting, then pour all the rest of it at the base of the altar of burnt offering, at the tent of meeting's entrance. Ọ ga-ete ọbara ụfọdụ nʼelu mpi nke dị nʼebe ịchụ aja nke dị nʼihu Onyenwe anyị, nʼụlọ nzute. Ọ ga-awụ ọbara nke fọdụrụ nʼụkwụ ala ala, nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
19 He is to remove all its fat and burn it on the altar. Ọ ga-ewepụta abụba niile dị ya nʼahụ kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja.
20 He is to do the same with this bull as with the sin offering's bull. So the priest will atone for them, and they'll be forgiven. Ọ ga-eme oke ehi ahụ ihe o mere oke ehi aja mmehie. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchi mmehie ndị Izrel. A ga-agbagharakwa ha.
21 He is to carry the bull outside the camp and burn it as he burned the first bull; it is the assembly's sin offering. Emesịa, onye nchụaja ga-eburu ozu oke ehi ahụ gaa nʼazụ obodo kpọọ ya ọkụ nʼebe ahụ, dịka o mere oke ehi nke mbụ. Nke a bụ aja mmehie nʼihi nzukọ Izrel.
22 "When a leader sins, unintentionally doing anything our Father commanded not to do, and becomes guilty, “ ‘Mgbe otu nʼime ndịisi obodo mehiere na-amaghị ama, si otu a megide ihe Onyenwe anyị Chineke nyere nʼiwu banyere ihe a na-agaghị eme, mgbe ọ ghọtara ikpe ọmụma ya.
23 if he learns of the sin he committed, he must bring as his offering a male goat without defect. Ọ bụrụkwa na-eme ka ọ mata mmehie ya, ọ ghaghị iweta mkpi na-enweghị nkwarụ dịka onyinye nʼihi mmehie ya.
24 He is to lay his hand on the goat's head and slaughter it where the burnt offering is slaughtered before our Father—a sin offering. Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi mkpi ahụ. Gbuo ya nʼebe a na-egbu anụ aja nsure ọkụ, nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ aja mmehie.
25 The priest will take some sin-offering blood with his finger, and put it on the burnt-offering altar's horns, then pour the rest at its base. Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-arụrụ ụfọdụ nʼime ọbara aja mmehie ahụ na mkpịsịaka ya tee ya nʼelu mpi ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ. Nke fọdụrụ ka ọ ga-awụpụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja.
26 He is to burn all its fat on the altar, like the fat of the peace offering. The priest will atone for his sin, and he will be forgiven. Ọ ga-akpọ abụba ya niile ọkụ nʼebe ịchụ aja dịka o si kpọọ abụba anụ e ji chụọ aja udo ọkụ. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchiri onyeisi ahụ mmehie ya. A ga-agbaghara ya.
27 "If anyone of the common people sins unintentionally, doing any one of the things our Father commanded not to do, and incurs guilt, “ ‘Ọ bụrụ na otu onye nʼetiti ndị obodo ahụ emehie na-amaghị ama, mee ihe megidere ihe ọbụla Onyenwe anyị nyere nʼiwu nke a na-adịghị eme eme, mgbe ha ghọtara ikpe ọmụma ha,
28 when he becomes aware of his sin, he must bring a female goat without defect as his offering for the sin he committed. ọ bụrụkwa na-amata mmehie ha mere, ha ga-eweta nne ewu na-enweghị ntụpọ dịka onyinye nʼihi mmehie ya.
29 He is to lay his hand on the sin offering's head and slaughter it at the burnt offering's place. Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼelu isi aja mmehie ahụ, e gbuo ya nʼebe a na-achụ aja nsure ọkụ.
30 With his finger the priest puts some of its blood on the burnt-offering altar's horns, then pours all the rest at its base. Onye nchụaja ga-ewere ụfọdụ ọbara ahụ na mkpịsịaka ya tee ya na mpi nke ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, ọ ga-awụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja.
31 He is to remove all its fat, as fat is removed from the peace offering; the priest is to burn it on the altar—a pleasing aroma to our Father—and make atonement for him, and he will be forgiven. Ọ ga-ewepụ abụba ya niile dịka a na-eme nʼaja udo. Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja, dịka ihe na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja a ga-ekpuchikwara ha mmehie. A ga-agbagharakwa ha.
32 "If he brings a lamb as his sin offering, he is to bring a female without defect. “ ‘Ma ọ bụrụ na mmadụ eweta otu atụrụ dịka onyinye nʼihi aja mmehie ya, ọ ghaghị ịbụ nne atụrụ na-enweghị ntụpọ.
33 He is to lay his hand on the sin offering's head and slaughter it as a sin offering where the burnt offering is slaughtered. Ọ ga-eweta ya nʼebe a na-egbu anụ aja nsure ọkụ. Ọ ga-ebikwasị ya aka nʼisi, gbuo ya nʼebe ahụ, ka ọ bụrụ aja mmehie ya.
34 With his finger the priest is to take some of the blood from the sin offering and apply it to the horns of the altar where burnt offerings are made, then pour out all the remaining blood at the altar's base. Onye nchụaja ga-ewere ụfọdụ ọbara anụ aja mmehie ahụ na mkpịsịaka ya, tee ya na mpi dị nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ. Ọ ga-awụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala nke ebe ịchụ aja.
35 He must remove all its fat, as the lamb's fat is removed from the peace offering; the priest will burn it on the altar atop the fire offerings to our Father. So the priest will atone for him for the sin he committed, and he will be forgiven." Ha ga-ewepụ abụba ya niile, dịka a na-eme nʼatụrụ aja udo. Onye nchụaja ga-akpọ abụba ahụ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka onyinye nsure ọkụ a chụrụ nye Onyenwe anyị. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchikwara ha mmehie nʼihi iwu ha dara. A ga-agbaghara ha mmehie ha.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]