Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 5 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 "If anyone sins by hearing a public call to testify, and is a witness, having seen or known, yet stays silent, he bears his guilt. “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla emehie nʼihi na ọ jụrụ ikwupụta mgbe ọ nụrụ ọkwa amaara nʼọha maka ịgba ama banyere ihe ọ hụrụ maọbụ ihe ọ maara, ọ bụ onye ikpe mara.
2 "Or if someone unknowingly touches any unclean thing, or a carcass—unclean wild animal, unclean livestock, or unclean swarming creature—he becomes unclean and guilty. “ ‘Onye na-amaghị ama metụ ihe rụrụ arụ aka, dịka ozu anụ ọbụla iwu megidere, maọbụ anụ ụlọ, maọbụ anụ ọhịa, maọbụ anụ ọbụla na-akpụ akpụ nʼala. Ọ ghọọla onye rụrụ arụ, na onye ikpe mara.
3 "Or if he touches human impurity—any impurity that makes one unclean—unknowingly, then learns of it, he is guilty. Ma ọ bụrụ na ha emetụ ihe ọbụla rụrụ arụ si nʼahụ mmadụ pụta aka, ihe ọbụla ga-eme ya ka ọ hapụ ịdị ọcha, ọ bụ ezie na ha amaghị na ọ bụ ihe rụrụ arụ, mgbe ọ matara ya, ọ ga-abụ onye ikpe mara.
4 "Or if anyone rashly swears an oath to do evil or good—whatever people rashly swear—and it's hidden from him, when he realizes it, he's guilty in any of these. Ọ bụrụ na mmadụ a ṅụọ iyi nzuzu, nke ga-akwagide ya ime ihe ọbụla maọbụ ihe dị mma, maọbụ ihe dị njọ, mgbe onye ahụ ghọtara na ọ bụ iyi nzuzu ka ọ ṅụrụ, ọ bụrụla onye ikpe mara.
5 When anyone is guilty in any of these matters, he must confess the sin he has committed. Onye ọbụla sitere nʼụzọ dị otu a bụrụ onye ikpe mara, ga-ekwupụta mmehie ya, dịka o si dị.
6 He must bring our Father a penalty offering for the sin he committed—a female from the flock, a lamb or goat—as a sin offering; the priest will atone for his sin. Ọ ga-ewetara Onyenwe anyị nne atụrụ, maọbụ nne ewu site nʼigwe ewu na atụrụ, dịka aja ikpe ọmụma maka mmehie ha mere. Onye nchụaja ga-achụrụ ha aja mkpuchi mmehie maka mmehie ha.
7 "If he can't afford a lamb, he must bring our Father two turtledoves or two young pigeons as penalty for his sin—one as a sin offering, the other as a burnt offering. “ ‘Ọ bụrụ na o nweghị ike iweta atụrụ, ọ ga-ewetara Onyenwe anyị nduru abụọ, maọbụ kpalakwukwu abụọ, dịka ihe ikpe ọmụma mmehie ha. Otu nʼime nnụnụ ndị a ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ.
8 He brings them to the priest, who presents the sin offering first, wringing its head at the neck without separating it. Ọ ga-eweta ha nye onye nchụaja. Onye ga-ewere nnụnụ nke mbụ chụọ aja mmehie. Ọ ga-atụbipụ olu ya, kama ọ gaghị ekewapụcha isi nnụnụ ahụ site nʼahụ ya.
9 He sprinkles some blood from the sin offering on the altar's side; the rest drains at its base. It is a sin offering. Ọ ga-efesa ụfọdụ ọbara aja mmehie ahụ nʼakụkụ ebe ịchụ aja, ma ọbara fọdụrụ ka ọ ga-awụsa nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja. Nke a ga-abụ aja mmehie.
10 The second bird he offers as a burnt offering, per the rule. The priest atones for his sin, and he is forgiven. Onye nchụaja ga-eji nnụnụ nke ọzọ chụọ aja nsure ọkụ. Ọ ga-agbaso usoro e debere maka ịchụ aja nsure ọkụ. Ọ ga-ekpuchikwara ha mmehie ha mere. A ga-agbagharakwa ha.
11 "But if he cannot afford two doves or two young pigeons, he must bring two quarts of fine flour as his sin offering—no oil or incense on it, for it is a sin offering. “ ‘Ọ bụrụ na onye ahụ enweghị ike iweta nduru abụọ, maọbụ kpalakwukwu abụọ, ọ ga-eweta iko ọka asaa a kwọrọ nke ọma ka ọ bụrụ onyinye aja mmehie. Ọ gaghị etinye ya mmanụ oliv na ụda na-esi isi ụtọ, nʼihi na ọ bụ aja mmehie.
12 He must bring it to the priest, who takes a handful as its memorial portion and burns it on the altar atop our Father's fire offerings. It is a sin offering. Ha ga-ewere ya bịakwute onye nchụaja, onye ga-ekporo nke ga-eju ya aka ya dịka oke ncheta. Kpọọ ya ọkụ nʼebe ịchụ aja nke onyinye nsure ọkụ e chere nʼihu Onyenwe anyị. Nke a ga-abụkwa aja mmehie ya.
13 The priest will atone for him for any of these sins he committed, and he'll be forgiven; the rest belongs to the priest, like the grain offering." Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-achụrụ ya aja ikpuchi mmehie ya niile. A ga-agbagharakwa ya. Ụtụ ọka fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja, dịka e si mee ya nʼaja onyinye mkpụrụ ọka.’ ”
14 Then our Father said to Moses, Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
15 "If anyone is unfaithful and sins unintentionally against any of our Father's holy things, he must bring our Father a ram without defect from the flock as his guilt offering, valued in silver by weight by the sanctuary standard—a guilt offering. “Mgbe onye ọbụla sitere na-amaghị ama mehie, merụọ ihe nsọ niile nke Onyenwe anyị, bụrụ onye nke nʼekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị. Ọ ga-ewetara Onyenwe anyị otu ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, dịka ọnụahịa ya si dị nʼọlaọcha, nʼusoro shekel nke ebe nsọ. Ọ bụ aja ikpe ọmụma.
16 He must repay for the holy thing he sinned against, adding a fifth, and give it to the priest. The priest will atone for him with the guilt-offering ram, and he'll be forgiven. Ọ ga-akwụghachikwa ụgwọ ihe nsọ ndị ahụ niile nke ọ na-emezughị. Ọ ga-atụkwasị otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ya nʼelu ya, were ha niile nye onye nchụaja. Onye nchụaja ahụ ga-ewere ebule ahụ na ihe ndị a chụọrọ ya aja mkpuchi mmehie, nʼihi ikpe ọmụma ya. A ga-agbagharakwa ya.
17 "If anyone sins, doing what our Father commanded not to be done, even unknowingly, he is guilty and bears his wrongdoing. “Ma ọ bụrụ na mmadụ ọbụla emehie, mee ihe ọbụla megidere iwu ọbụla Onyenwe anyị nyere, ọ bụ ezie na e mere mmehie a na-amaghị ama, ma ikpe mara ha, ọ ga-atakwa ahụhụ soo ya.
18 He must bring the priest a flawless ram from the flock, at the assessed value, as a guilt offering; the priest will atone for his unwitting sin, and he'll be forgiven. Ọ ga-ewetara onye nchụaja ihe aja ikpe ọmụma nke bụ otu ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, nke ọnụahịa ga-abụ ihe o ruru. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-achụrụ ya aja mkpuchi mmehie nʼihi ihe ọjọọ o mere na-amaghị ama. A ga-agbaghara ya mmehie ya.
19 It is a guilt offering; he was certainly guilty before our Father." Ọ bụ aja ikpe ọmụma, nʼihi na onye mehiere megide Onyenwe anyị ka ọ bụ.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]