Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 6 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father spoke to Moses: Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
2 "If anyone sins, unfaithful to your Father, by deceiving his neighbor about a deposit, a pledge, or stolen goods, or by cheating him, “Ọ bụrụ na onye ọbụla emehie bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, site nʼiduhie onye agbataobi ya banyere ihe e tinyere ya nʼaka idebe, maọbụ izunarị mmadụ ihe, maọbụ iji aghụghọ nara mmadụ ibe ya ihe;
3 or if he finds lost property and lies about it, swearing falsely—any such act by which a person sins. maọbụ site nʼijide ihe furu efu nke ọ chọtara ghaa ụgha banyere ya. Ma ọ bụrụ na ha a ṅụọ iyi na ha ejighị ya, maọbụ gbasara ụdị mmehie mmadụ pụrụ ime.
4 When he sins and is guilty, he must return what he stole, or extorted, or the deposit entrusted to him, or the lost item he found, Mgbe ha mehiere nʼụzọ ọbụla nʼime ụzọ ndị a niile, ghọta na ikpe mara ha. Ha aghaghị inyeghachi onye nwe ihe ahụ ha zuru nʼohi, maọbụ ihe ha pụnara nʼike, maọbụ ihe e nyere ya idebe, ma ọ bụkwanụ ihe ahụ furu efu ọ chọtara,
5 or whatever he swore falsely about, he must repay it in full, add a fifth to it, and give it to its owner on the day he admits his guilt. maọbụ ihe ọbụla ọ ṅụrụ nʼiyi ụgha. Ọ ga-akwụghachi ihe ndị a niile nʼuju, tụkwasịkwa otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ihe ahụ, nyeghachi ya onye nwe ya, nʼụbọchị ahụ ọ ga-eweta aja ikpe ọmụma ya.
6 He must bring his guilt offering to your Father: a ram without defect from the flock, at your valuation, as a guilt offering, to the priest. Ọ ga-ewetara onye nchụaja nʼihu Onyenwe anyị, aja ikpe ọmụma ya nke bụ ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, nke ọnụahịa ya ga-abụ ihe ahụ e gbubiri iji ịkwụ ụgwọ mmehie.
7 The priest will atone for him before your Father, and he'll be forgiven for whatever he did that made him guilty." Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchikwara ya mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, a ga-agbaghakwara ha nʼihi ihe ọbụla ha mere nke ikpe ji maa ha.”
8 Then our Father spoke to Moses: Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
9 "Command Aaron and his sons: This is the law for the burnt offering. It stays on the altar's hearth all night until morning, and the altar fire must keep burning on it. “Nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom iwu sị: ‘Ndị a bụ usoro iwu metụtara aja nsure ọkụ. Aja nsure ọkụ ga-adịgide nʼekwu ahụ dị nʼebe ịchụ aja site nʼabalị ruo nʼụtụtụ. A ga-akwanyekwa ọkụ na-adị nʼebe ịchụ aja hapụ ya ka o nwuo abalị niile.
10 The priest is to wear his linen garment, with linen undergarments against his skin, then remove the ashes left after the fire consumes the burnt offering on the altar, and place them beside the altar. Mgbe chi bọrọ, onye nchụaja ga-eyiri uwe ime ahụ ya nke akwa ọcha, nakwa uwe elu ahụ ya, gaa kpopu ntụ dị nʼekwu nke ebe ịchụ aja nsure ọkụ ahụ, wụsa ha nʼakụkụ ebe ịchụ aja ahụ.
11 Then he removes his garments, puts on others, and carries the ashes outside the camp to a clean place. Mgbe o mesịrị nke a, ọ ga-agbanwe uwe ya, kporo ntụ ahụ, buru ya pụọ nʼazụ ogige ahụ gaa wufuo ya nʼebe ahụ e mere ka ọ dị ọcha.
12 The altar fire must keep burning; it must not go out. Every morning the priest adds wood on it, arranges the burnt offering on it, and burns the fat of the peace offerings on it. Ọkụ dị nʼebe ịchụ aja ga na-enwu mgbe niile, a gaghị ekwe ka ọ nyụọ. Nʼụtụtụ niile onye nchụaja ga-akwanye ya nkụ ọhụrụ, tụkwasịkwa aja nsure ọkụ nʼelu ya surekwaa abụba aja udo nʼelu ya.
13 The fire must be kept burning on the altar continually; it must not go out. Ọkụ ga-enwugide nʼebe ịchụ aja mgbe niile. A gaghị ekwe ka ọ nyụọ mgbe ọbụla.’
14 "This is the law of the grain offering: Aaron's sons must bring it before your Father, in front of the altar. “ ‘Ndị a bụ usoro iwu gbasara onyinye mkpụrụ ọka. Ụmụ Erọn ndị ikom ga-eguzo nʼihu ebe ịchụ aja iche ya nʼihu Onyenwe anyị.
15 The priest takes a handful of the grain offering's fine flour and oil, with all its frankincense, and burns this memorial portion on the altar as a pleasing aroma to your Father. Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-ekpoju ọka ahụ a kwọrọ nke ọma, na ụfọdụ mmanụ oliv, tinyere ụda na-esi isi ụtọ nʼaka ya dịka oke ncheta. Kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ka ọ nọchie anya onyinye ahụ niile, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi mma.
16 Aaron and his sons eat what remains; it must be eaten without yeast in a holy place, eaten in the courtyard of the tent of meeting. Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri nke fọdụrụnụ. Ma a ga-eri ya na-ejighị ihe na-eko achịcha, nʼime ebe nsọ, nʼogige ụlọ nzute ka a ga-anọ eri ya.
17 Do not bake it with yeast. I've given it as their share of my food offerings, like the sin and guilt offerings; it is most holy. Agaghị etinye ya ihe na-eko achịcha ma a na-eghe ya. Enyela ya ka ọ bụrụ oke ruuru ha site nʼonyinye nsure ọkụ e chere nʼihu m. Ha bụkwa ihe dịkarịsịrị nsọ, dịka aja ikpe ọmụma na aja mmehie.
18 Every male of Aaron's descendants may eat it—a lasting portion through your generations from your Father's food offerings. Whatever touches them becomes holy." Nwoke ọbụla sitere nʼagbụrụ Erọn, onye nchụaja, nwere ike iri ya. Ọ bụ oke ọ ga na-eketa site nʼonyinye nsure ọkụ niile echere nʼihu Onyenwe anyị ruo nʼọgbọ niile na-abịa. Ihe ọbụla metụrụ ha ahụ ga-aghọ ihe dị nsọ.’ ”
19 Our Father said to Moses: Onyenwe anyị gwakwara Mosis sị,
20 "This is Aaron and his sons' offering to your Father on the day he is anointed: about two quarts of fine flour as a regular grain offering, half in the morning, half in the evening. “Nke a bụ aja Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-achụrụ Onyenwe anyị nʼụbọchị a ga-ete ya mmanụ. Ọ ga-abụ ọtụtụ ruru lita abụọ nke ọka dị ezi mma dịka aja onyinye a na-achụ mgbe niile. Ha ga-enye otu ọkara ya nʼụtụtụ, nye nke ọzọ nʼuhuruchi.
21 Prepare it with oil on a griddle, bring it well-kneaded, present the grain offering in broken pieces—a pleasing aroma to your Father. Ha ga-etinye ya mmanụ, ghee ya nʼite. Ị ga-ebubata ya mgbe a gwọkọrọ ya nke ọma, chee ya dịka aja ọka a nyawasịrị anyawasị nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi mma.
22 The anointed priest who succeeds him from among his sons must prepare it—a lasting decree before your Father: it must be burned completely. Nwa nwoke ahụ nke ga-anọchi ya dịka onye nchụaja e tere mmanụ bụ onye ga-akwado ya. Ọ bụ oke ruuru Onyenwe anyị ebighị ebi, bụrụkwa nke a ga-esure ọkụ kpamkpam.
23 Every grain offering of a priest is to be burned completely; it must not be eaten." Onyinye mkpụrụ ọka ọbụla nke onye nchụaja nyere ka a ga-akpọ ọkụ kpamkpam. A gaghị eri ya eri.”
24 Again our Father spoke to Moses: Onyenwe anyị sịrị Mosis,
25 "Tell Aaron and his sons: this is the law of the sin offering: slaughter it before your Father, where the burnt offering is slaughtered; it is most holy. “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom, sị, ‘Ndị a bụ usoro iwu unu ga-edebe banyere aja mmehie. A ga-egbu anụ aja mmehie nʼihu Onyenwe anyị, nʼebe ahụ a na-egbu anụ aja nsure ọkụ. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
26 The priest who offers it for sin must eat it; it must be eaten in a holy place, in the tent of meeting's courtyard. Onye nchụaja chụrụ ya ga-eri anụ ya, ọ bụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, ya bụ nʼogige ụlọ nzute ahụ ka a ga-anọ rie ya.
27 Whatever touches its flesh becomes holy. If its blood spatters a garment, wash the spattered spot in a holy place. Ihe ọbụla metụrụ anụ nke ọbụla aka, ga-aghọ ihe dị nsọ. Ọ bụrụkwa na ọbara ya efesa nʼuwe ọbụla, ị ga-asụ uwe ahụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ.
28 The clay pot it is boiled in must be broken; if boiled in a bronze pot, it must be scoured and rinsed with water. A ghaghị itiwa ite aja e ji sie anụ ahụ. Ọ bụrụkwanụ nʼite bronz ka e siri ya, a ga-asa ite ahụ mmiri nke ọma, saa ya ka ọ dị ezi ọcha.
29 Every male among the priests may eat it; it is most holy. Nwoke ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị nchụaja nwere ike iri anụ ahụ, ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
30 No sin offering whose blood is brought into the tent of meeting to atone in the Holy Place may be eaten; it must be burned with fire." Ma a gaghị eri anụ aja mmehie ọbụla, bụ nke e webatara ọbara ya nʼime ụlọ nzute maka ikpuchi mmehie nʼEbe nsọ ahụ. Aghaghị ịkpọ ya ọkụ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]