Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 7 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 "This is the law of the guilt offering. It is most holy. “ ‘Ndị a bụ usoro iwu banyere aja ikpe ọmụma, bụ nke dịkarịsịrị nsọ.
2 Where they slaughter the burnt offering, they must slaughter the guilt offering; splatter its blood on all sides of the altar. A ga-egbu anụ aja ikpe ọmụma ahụ nʼebe a na-egbu anụ aja nsure ọkụ, were ọbara ya fesaa nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja.
3 All its fat is offered: the fat tail and fat covering the inner organs, Abụba ya niile ka a ga-enye dịka onyinye: abụba dị nʼọdụdụ ya, na abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya,
4 the two kidneys and their fat at the loins, and the liver's long lobe, removed with the kidneys. na akụrụ abụọ ya, na abụba nke dị nʼelu ha, ruo nʼakụkụ ukwu ya, na umeju ya, na abụba kpuchiri ya.
5 The priest burns them on the altar as a food offering to our Father; a guilt offering. Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị. Ọ bụ aja ikpe ọmụma.
6 Any male priest may eat it, eaten only in a holy place; it is most holy. Nwoke ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị nchụaja nwere ike iri anụ fọdụrụ na ya, maọbụ nʼebe nsọ ka aghaghị ịnọ rie ya. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
7 "The sin offering and guilt offering share one law: it belongs to the priest who makes atonement with it. “ ‘Otu iwu a metụtakwara aja ikpe ọmụma na aja mmehie. Anụ ọbụla fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja ahụ nke ji ha chụọ aja mkpuchi mmehie. Oke ya ka ọ bụ.
8 The priest who offers anyone's burnt offering keeps its hide for himself. Onye nchụaja nke chụrụ aja nsure ọkụ nʼisi onye ọbụla, ka ọ dịrị iwere akpụkpọ niile si nʼanụ ahụ o ji chụọ aja nye onwe ya.
9 Any grain offering baked in an oven, and all made in a pan or on a griddle, belongs to the priest who offers it. A ga-ebunye onye nchụaja chụrụ aja mkpụrụ ọka nke e ji ụtụ ọka chụọ, ụtụ ọka fọdụrụ. Otu a ka ọ ga-adịkwa nʼaja achịcha ọbụla a nụrụ anụ, maọbụ nke e siri esi, maọbụ nke e ghere eghe. Ihe ọbụla fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja ahụ.
10 Every grain offering, mixed with oil or dry, belongs equally to all Aaron's sons. Aja mkpụrụ ọka ọbụla, ma nke e tinyere mmanụ, ma nke a na-etinyeghị mmanụ, nke fọdụrụ ga-abụ nke ụmụ ndị ikom Erọn.
11 "This is the law of the sacrifice of peace offerings that anyone may bring to our Father. “ ‘Ndị a bụ usoro iwu gbasara aja udo nke mmadụ ọbụla nwere ike chụọrọ Onyenwe anyị nʼaja:
12 If he presents it as a thank offering, with it he must offer unleavened cakes mixed with oil, unleavened wafers coated with oil, and cakes of fine flour well kneaded and mixed with oil. “ ‘Ọ bụrụ na ha enye ya dịka aja ekele, tinyere aja ekele a ha ga-eweta ogbe achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke a gwakọtara ya na mmanụ oliv, na mbadamba achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke e tere mmanụ nʼelu ya, nakwa achịcha e ji ọka a kwọrọ nke ọma a gwakọtara ya na mmanụ nʼime ya.
13 He must bring loaves of leavened bread with his thanksgiving sacrifice of peace offerings. Ọ ga-ewetakwa onyinye achịcha ọzọ nke e ji ihe na-eko achịcha, ya bụ, yiist mee, tinyere aja udo nke ekele ha.
14 From it he must give one of each as a contribution to our Father; it belongs to the priest who spatters the blood of the peace offerings. Ha ga-esikwa na ya weta otu nʼime onyinye ọbụla, chee nʼihu Onyenwe anyị, dịka onyinye. Ọ bụ nke ndị nchụaja ahụ na-efesa ọbara anụ e ji chụọ aja udo nʼelu ebe ịchụ aja.
15 The meat of his thanksgiving peace offerings must be eaten the day it's offered; none of it may remain until morning. Ma anụ ahụ eji chụọ aja onyinye udo nke ekele, ka a ga-eri nʼotu ụbọchị ahụ e ji ha chụọ aja. O nweghị nke a ga-ahapụ ka ọ bọọ chi.
16 "If his offering is a vow or voluntary sacrifice, it must be eaten the day he offers it; what remains may be eaten the next day. “ ‘Ma ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ onyinye afọ ofufu, maọbụ onyinye o wetara nʼihi nkwa o kwere, a ga-eri anụ aja ahụ nʼụbọchị ahụ a chụrụ ya, nweekwa ike rie nke fọdụrụ ma chi bọọ.
17 But any sacrifice flesh remaining on the third day must be burned in fire. Ma anụ ọbụla fọdụrụ nʼime anụ aja ahụ, nke a na-erichapụghị nʼụbọchị nke abụọ ahụ ka a ga-akpọ ọkụ.
18 If any of his peace offering's meat is eaten on the third day, it won't be accepted, it won't count for the offerer—it's tainted, and whoever eats it bears his guilt. Ọ bụrụ na e rie anụ aja udo ahụ nʼụbọchị nke atọ, a gaghị anabata ya. A gaghị agụnyere ya onye ahụ wetara ya nʼihi na ihe rụrụ arụ ka ọ bụ. Onye ọbụla riri ya ga-abụ onye ikpe mara.
19 "Flesh that touches anything unclean must not be eaten—burn that flesh in fire. But other flesh: anyone clean may eat it. “ ‘Anụ ọbụla nke metụrụ ihe rụrụ arụ aghọọla ihe na-adịghị ọcha. A gaghị eri ya. A ga-akpọ ya ọkụ. Ma nʼebe anụ ndị ọzọ dị, onye ọbụla e mere ka ọ dị ọcha nwere ike iri ya.
20 Anyone who eats meat of our Father's peace offering while unclean will be cut off from his people. A ga-esite nʼetiti ndị m kewapụ onye ọbụla riri anụ e ji chụọ aja udo nye Onyenwe anyị mgbe onye ahụ nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha.
21 Whoever touches anything unclean—human impurity, an unclean animal, or any unclean, detestable thing—then eats meat from our Father's peace offering, that person will be cut off from his people." Onye ọbụla metụrụ ihe ọbụla rụrụ arụ aka, ma ịrụ arụ ahụ o si na mmadụ, ma o si nʼanụ ọhịa, ma o si nʼihe ọbụla ọzọ, a ga-esite nʼetiti ndị ya kewapụ ya ma ọ bụrụ na onye ahụ anọrọ nʼọnọdụ ahụ rie anụ e ji chụọ aja udo nye Onyenwe anyị.’ ”
22 Our Father spoke to Moses: Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
23 "Tell the people of Israel: Do not eat any fat from ox, sheep, or goat. “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Unu erila abụba ehi, maọbụ nke ewu, maọbụ nke atụrụ.
24 Fat from a carcass or animal mauled by a predator may serve any purpose, but never eat it. Abụba anụ ọbụla nwụrụ anwụ maọbụ nke anụ ọhịa gburu adịghị mma oriri. E nwere ike jiri ha mee ihe ọzọ.
25 Anyone who eats fat from an animal offered to me by fire will be cut off from his people. A ga-ekewapụ mmadụ ọbụla site nʼetiti ndị ya, bụ onye na-eri abụba anụmanụ nke a ga-esite na ya chee onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
26 You must not eat any blood at all, from bird or animal, wherever you live. Ọzọkwa, unu erila ọbara nnụnụ maọbụ nke anụmanụ nʼebe ọbụla unu bi.
27 Anyone who eats any blood will be cut off from his people." Onye ọbụla riri ọbara ka a ga-ekewapụ site nʼetiti ndị ya.’ ”
28 Our Father spoke to Moses: Onyenwe anyị gwakwara Mosis sị,
29 "Speak to the Israelites: Whoever presents his peace offering to me must bring his offering to me from that sacrifice. “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Onye ọbụla wetaara Onyenwe anyị onyinye aja udo aghaghị iweta ụfọdụ nʼime onyinye ahụ dịka onyinye pụrụ iche nye Onyenwe anyị.
30 With his hands he must bring my food offerings; the fat with the breast he must bring, to wave the breast as a wave offering before me. Ha ga-eji aka ha chee onyinye nsure ọkụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ga-eweta abụba ahụ, ya na obi anụ, fufee obi anụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
31 The priest burns the fat on the altar; the breast belongs to Aaron and his sons. Onye nchụaja ga-akpọ abụba ahụ ọkụ nʼebe ịchụ aja, ma obi anụ ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya ndị ikom.
32 You are to give the right thigh to the priest as a contribution from your peace offerings. Unu ga-enye onye nchụaja apata aka nri nke anụ aja udo ahụ, dịka onyinye.
33 Whichever son of Aaron offers the peace offering's blood and fat gets the right thigh as his portion. Nwa Erọn, onye ji ọbara na abụba chụọ aja udo ahụ ga-ewere apata aka nri ya dịka oke ruuru ya.
34 For I have taken the breast of the wave offering and thigh of the contribution from Israel's peace offerings, and given them to Aaron the priest and his sons as a permanent share from Israel." Site nʼonyinye ụmụ Izrel na-enye nʼoge aja udo, ewerela m obi anụ ahụ a na-efufe efufe, na apata anụ a na-eche nʼihu m nye Erọn, onye nchụaja na ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ oke ruuru ha mgbe ọbụla ụmụ Izrel na-achụ aja udo.’ ”
35 This is Aaron and his sons' portion from our Father's food offerings, from the day they were presented to serve our Father as priests. Nke a bụ akụkụ anụ ahụ e ji chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nke e nyekwara Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼụbọchị ahụ e chere ha nʼihu Onyenwe anyị ijere ya ozi dịka ndị nchụaja.
36 Our Father commanded this be given them from the Israelites, the day he anointed them—a permanent share for all their generations. Nʼihi na nʼụbọchị ahụ e tere ha mmanụ ka Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel iwu sị ha nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom oke ndị a oge niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
37 This is the law for burnt offerings, grain offerings, sin offerings, guilt offerings, ordination offerings, and peace offerings, Ndị a bụ usoro iwu metụtara aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka, na aja mmehie, na aja ikpe ọmụma, na onyinye ido nsọ, na aja udo.
38 which our Father commanded Moses on Mount Sinai, the day he commanded the people of Israel to bring their offerings to our Father in the Wilderness of Sinai. Onyenwe anyị nyere Mosis iwu ndị a nʼugwu Saịnaị nʼụbọchị ahụ o nyere ụmụ Izrel iwu sị ha, wetara Onyenwe anyị onyinye nʼọzara Saịnaị.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]