Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 8 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father spoke to Moses: Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
2 "Take Aaron and his sons with him, the garments, the anointing oil, the bull of the sin offering, the two rams, and the basket of yeast-free bread, “Kpọta Erọn na ụmụ ya ndị ikom, chịtakwa uwe ha, weta mmanụ nsọ, oke ehi nke aja mmehie na ebule abụọ ahụ, na nkata achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
3 and assemble the whole congregation at the entrance of the tent of meeting." Kpọkọtaa ọgbakọ ụmụ Izrel niile ka ha bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.”
4 Moses did as our Father commanded him; the assembly gathered at the entrance of the tent of meeting. Mosis mere ihe Onyenwe anyị gwara ya ka o mee. Ọgbakọ ụmụ Izrel zukọtara nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
5 And Moses said to the congregation, "This is what our Father has commanded to be done." Mosis gwara ọgbakọ ahụ sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu ka e mee.”
6 Then Moses brought Aaron and his sons forward and washed them with water. Mgbe ahụ, Mosis kpọpụtara Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼihu, jiri mmiri saa ha ahụ.
7 He put the tunic on Aaron, tied the sash around him, dressed him in the robe, put the ephod on him, tied the ephod's skillfully woven band around him, and fastened it to him. O yikwasịrị Erọn uwe ime ahụ, kee ya ihe okike a na-eke nʼukwu, yikwasịkwa ya uwe mwụda na efọọd ahụ, jiri ihe okike ahụ a chọrọ mma kegidesie efọọd ahụ ike nʼahụ ya.
8 He placed the breastpiece on him, and in the breastpiece he put the Urim and the Thummim. O tụkwasịrị ya ihe igbochi obi ahụ nʼahụ, tinye Urim na Tumim nʼime ihe igbochi obi ahụ.
9 He set the turban on Aaron's head, and on its front he set the gold plate, the holy crown, as our Father commanded Moses. Ọ tụhịkwara akwa ike nʼisi ahụ nʼisi Erọn, tinye nʼihu akwa ike nʼisi ahụ, okpu nsọ e ji ọlaedo kpụọ, nke bụ akara ido nsọ, dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu.
10 Then Moses took the anointing oil and anointed the tabernacle and everything in it, and consecrated them. Mgbe ahụ, Mosis weere mmanụ nsọ ahụ tee nʼụlọ nzute ahụ, na nʼihe niile dị nʼime ya, ido ha nsọ.
11 He sprinkled some of it on the altar seven times, anointing the altar, all its utensils, and the basin with its stand, to dedicate them. Ọ fesakwara ụfọdụ nʼime mmanụ ahụ ugboro asaa nʼebe ịchụ aja, fesakwa ya ugboro asaa nʼelu ngwongwo niile dị nʼebe ịchụ aja, na nʼefere e ji asa ihe, na ụkwụ ya, ido ha nsọ.
12 He poured some anointing oil on Aaron's head and anointed him to dedicate him. Ọ wụsara Erọn ụfọdụ mmanụ nsọ ahụ nʼisi, tee ya mmanụ, nʼihi ido ya nsọ.
13 Then Moses brought Aaron's sons forward, dressed them in tunics, tied on sashes, and put caps on their heads, as our Father had commanded Moses. Ọ kpọtara ụmụ ndị ikom Erọn nso, o yikwasịrị ha uwe ime ahụ, kee ha ihe okike nke ukwu, kekwasị ha ihe okike nʼisi, dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
14 He brought the bull of the sin offering, and Aaron and his sons laid their hands on its head. Ọ kpụtara oke ehi e ji achụ aja mmehie, mee ka Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasị aka ha nʼelu isi ya.
15 Moses slaughtered it, took the blood, and with his finger applied it to the altar's horns all around, purifying the altar. He poured the rest of the blood at the altar's base and dedicated the altar, making atonement for it. Mosis gburu oke ehi ahụ, were ụfọdụ nʼime ọbara ahụ, jiri mkpịsịaka ya rụta ọbara tee na mpi niile dị nʼebe ịchụ aja, ido ebe ịchụ aja ahụ nsọ. Ọ wụpụrụ ọbara nke fọdụrụ nʼụkwụ ala ala nke ebe ịchụ aja ahụ. Otu a ka o si doo ya nsọ, ikpuchiri ya mmehie.
16 He took all the fat on the inner organs, the liver's lobe, and the two kidneys with their fat, and burned it on the altar. Mosis wekwara abụba niile dị gburugburu ihe dị nʼime afọ ehi ahụ, mba-umeju nke umeju ya, akụrụ abụọ ya na abụba dị nʼelu ha, kpọọ ya ọkụ nʼebe ịchụ aja.
17 But the bull—hide, flesh, and waste—he burned outside the camp, as our Father commanded Moses. Ma oke ehi ahụ, akpụkpọ ya, anụ ya na mgbịrị afọ ya, ka ọ kpọrọ ọkụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ahụ dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
18 He brought the ram for the burnt offering; Aaron and his sons laid their hands on its head. O weere ebule ahụ, chee nʼihu Onyenwe anyị, dịka aja nsure ọkụ. Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasịrị aka ha nʼelu isi ya.
19 Moses slaughtered it and threw the blood against the sides of the altar. Mgbe ahụ, Mosis gburu ebule ahụ, fesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja.
20 He cut the ram into pieces and burned the head, the pieces, and the fat. Ọ bọwasịrị ebule ahụ ntakịrị ntakịrị, kpọọ isi ya, iberibe anụ ya na abụba ya ọkụ.
21 He washed the inner organs and legs in water, then burned the whole ram on the altar—a burnt offering, a pleasing aroma, a food offering to our Father, as our Father commanded Moses. Ọ sachara ihe dị nʼime afọ ya na ụkwụ ya niile mmiri, kpọọ ebule ahụ niile ọkụ nʼebe ịchụ aja. Nʼihi na ọ bụ aja nsure ọkụ nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi mma, nʼihi na ọ bụ dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
22 He brought the second ram, the ram of ordination, and Aaron and his sons laid their hands on its head. O kpụpụtara ebule nke ọzọ, bụ ebule nke ido nsọ, Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasịrị aka ha nʼelu isi ya.
23 Moses slaughtered it, took some of its blood, and put it on Aaron's right earlobe, right thumb, and right big toe. Mgbe ahụ, Mosis gburu ya, were ụfọdụ nʼime ọbara ya tee Erọn nʼọnụ ntị aka nri, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya.
24 Moses brought Aaron's sons near and put blood on their right earlobes, thumbs, and big toes, then splashed the rest against the altar's sides. Mosis kpọtara ụmụ ndị ikom Erọn nso, weere ụfọdụ ọbara ahụ tee nʼọnụ ntị aka nri ha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ha, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ha. O fesakwara ọbara nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ.
25 He took the fat, the fat tail, all the fat on the intestines, the liver's long lobe, the two kidneys with their fat, and the right thigh. O weere abụba ya, akụkụ ọdụdụ ya nwere abụba, na abụba niile nke kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya, na mba-umeju nke dị nʼumeju ya, akụrụ ya abụọ na abụba ha, na apata aka nri ya
26 From the basket of unleavened bread before our Father, he took one cake, one oiled cake, and one wafer, and put them on the fat and the right thigh. O sitere na nkata achịcha ahụ a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke dị nʼihu Onyenwe anyị, wepụta otu ogbe achịcha, na otu ogbe achịcha a gwakọtara mmanụ oliv, na otu mbadamba ogbe achịcha, tụkwasị ha nʼelu abụba ndị ahụ, na nʼelu apata aka nri ahụ.
27 He put all these in Aaron's and his sons' hands, and waved them as a wave offering before our Father. O tinyere ihe ndị a niile nʼaka Erọn na ụmụ ya ndị ikom, ha fufere ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
28 Moses took them from their hands and burned them on the altar with the burnt offering—an ordination offering, a pleasing aroma, a food offering to our Father. Mosis naara ya site nʼaka ha, kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja, ya na aja nsure ọkụ, ka ọ bụrụ aja ido nsọ nke isisi ya dị ezi mma, onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
29 Moses took the breast and waved it as a wave offering before our Father—Moses's portion from the ram of ordination, as our Father commanded him. Mosis werekwara obi ebule ido nsọ ahụ, fufee ya nʼihu Onyenwe anyị, dịka aja mfufe, dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu. Nke a bụ oke Mosis.
30 Moses took some anointing oil and some blood from the altar and sprinkled it on Aaron and his garments, on his sons and their garments. So he consecrated Aaron and his garments, and his sons and their garments with him. Mgbe ahụ, Mosis weere ụfọdụ nʼime mmanụ nsọ ahụ, na ụfọdụ nʼime ọbara ahụ dị nʼebe ịchụ aja fesa ya Erọn na uwe ya, fesakwa ya ụmụ ndị ikom Erọn nʼuwe ha. Otu a ka o si doo Erọn na uwe ya, na ụmụ ya ndị ikom na uwe ha nsọ.
31 Moses told Aaron and his sons, "Boil the meat at the tent of meeting's entrance, eat it there with the bread from the ordination-offering basket, as I commanded: Aaron and his sons will eat it. Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn na ụmụ ya ndị ikom sị, “Sienụ anụ ahụ nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Nọrọkwanụ nʼebe ahụ rie ya na achịcha ahụ dị nʼime nkata onyinye ido nsọ, dịka a gwara m, sị, ‘Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri ya.’
32 Whatever is left of the meat and the bread, burn it with fire. Ihe ọbụla fọdụrụ na anụ ahụ na achịcha ahụ, ka unu ga-akpọ ọkụ.”
33 Do not leave the Tent of Meeting's entrance for seven days, until your ordination days end, for it takes seven days to ordain you. Ọ sịrị ha: “Unu esikwala nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute a pụọ ruo ụbọchị asaa, tutu ruo mgbe ụbọchị ido nsọ unu zuruoke, nʼihi na ido nsọ unu ga-anọ ụbọchị asaa.
34 What has been done today, our Father has commanded to be done to make atonement for you. Ihe niile e mere nʼụbọchị taa bụ ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu, banyere ịchụ aja maka mkpuchi mmehie unu.”
35 Stay at the tent of meeting's entrance day and night, seven days, doing what our Father requires, so you do not die—this is what I was commanded." Unu aghaghị ịnọgide nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ehihie na abalị ụbọchị asaa, mezuokwa ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu, ka unu ghara ịnwụ. Nʼihi na nke a bụ iwu e nyere m.
36 So Aaron and his sons did everything our Father had commanded through Moses. Ya mere, Erọn na ụmụ ya ndị ikom mezuru ihe niile dịka Onyenwe anyị si nye nʼiwu site nʼọnụ Mosis.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]