Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 9 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 On the eighth day Moses called Aaron and his sons and the elders of Israel. Nʼụbọchị nke asatọ, Mosis kpọrọ Erọn na ụmụ ya ndị ikom, na ndị okenye Izrel.
2 He told Aaron, "Take a bull calf for yourself as a sin offering, a ram as a burnt offering, both without defect, and offer them before our Father. Ọ gwara Erọn sị, “Site nʼime igwe ehi were nwa oke ehi ị ga-eji chụọ aja mmehie. Werekwa ebule na-enweghị ntụpọ ị ga-eji chụọ aja nsure ọkụ, nke m ga-eche nʼihu Onyenwe anyị.
3 Tell the Israelites: Take a male goat for a sin offering, and a yearling calf and lamb, without defect, for a burnt offering. Ọ gwakwara ụmụ Izrel sị ha, ‘Họrọnụ mkpi a ga-eji chụọ aja mmehie, na nwa ehi, na nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ, ndị gbara naanị otu afọ, a ga-eji chụọ aja nsure ọkụ,
4 An ox and a ram for a peace offering, to sacrifice before our Father, plus a grain offering mixed with oil—for today our Father will appear to you." na ehi, na ebule a ga-eji chụọ aja udo nʼihu Onyenwe anyị, tinyere mkpụrụ ọka a gwara mmanụ. Nʼihi na taa ka Onyenwe anyị ga-eme ka unu hụ ya anya.’ ”
5 They brought what Moses commanded to the tent of meeting's entrance; the whole assembly drew near and stood before our Father. Ha wetara ihe ndị a niile bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute dịka Mosis nyere nʼiwu. Ọgbakọ ụmụ Izrel niile bịara nso guzo nʼihu Onyenwe anyị.
6 Moses said, "Do what our Father commanded, so the glory of our Father will appear to you." Mgbe ahụ, Mosis sịrị ha, “Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị nyere unu nʼiwu idebe, ka ebube ya si otu a pụta ìhè nʼihu unu.”
7 Moses told Aaron, "Come to the altar. Offer your sin offering and burnt offering, atone for yourself and the people. Offer the people's offering and atone for them, as our Father commanded." Mosis sịrị Erọn, “Bịa nso nʼebe ịchụ aja. Chụọ aja mmehie, na aja nsure ọkụ nke a ga-eji kpuchie mmehie gị na mmehie ndị ahụ niile. Chụọ aja onyinye dịrị ndị ahụ, maka ikpuchiri ha mmehie ha, dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.”
8 So Aaron approached the altar and slaughtered the sin-offering calf, which was for himself. Erọn bịara nso nʼebe ịchụ aja, gbuo nwa ehi ahụ ka ọ bụrụ aja mmehie nke ya.
9 Aaron's sons brought him the blood; he dipped his finger in it, put it on the altar's horns, and poured the rest at its base. Ụmụ Erọn buteere ya ọbara ehi ahụ. O tinyere mkpịsịaka ya nʼime ọbara ahụ tee ya na mpi dị nʼebe ịchụ aja. Ọ wụrụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja ahụ.
10 But he burned the sin offering's fat, kidneys, and liver lobe on the altar, as our Father commanded Moses. Ọ kpọrọ abụba ya, na akụrụ ya abụọ, na ihe kpuchiri umeju si nʼaja mmehie ahụ ọkụ nʼebe ịchụ aja dịka Onyenwe anyị nyere Mosis iwu.
11 He burned the flesh and the skin with fire outside the camp. Ma anụ ahụ ya, na akpụkpọ ya, ka ọ kpọrọ ọkụ nʼazụ ebe obibi.
12 He killed the burnt offering. Aaron's sons handed him the blood, and he splashed it against the altar's sides. Emesịa, o gburu anụ e wetara maka aja nsure ọkụ ahụ. Ụmụ ya ndị ikom nyere ya ọbara anụ ahụ, nke o fesara gburugburu ebe ịchụ aja.
13 They handed him the burnt offering in pieces, with the head, and he burned them on the altar. Ha nyefere ya aja nsure ọkụ ahụ nʼaka nʼotu ha sị bọọ ya, tinyere isi ya. Ọ kpọrọ ihe niile ọkụ nʼebe ịchụ aja.
14 He washed the intestines and legs, burning them on the altar with the burnt offering. Ọ sachara ihe dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya, kpọọ ha ọkụ, dịka aja nsure ọkụ.
15 Then he brought the people's offering: took their sin-offering goat, slaughtered it, and offered it for sin, like the first. Emesịa, Erọn wetara onyinye nke dị maka ndị mmadụ, o were ewu ahụ bụ maka mmehie ndị mmadụ, gbuo ya, were chụọ aja mmehie, dịka o mere nke mbụ.
16 He presented the burnt offering and offered it as prescribed. Ọ chụkwara aja nsure ọkụ nʼusoro dịka iwu e nyere si dị.
17 He brought the grain offering, took a handful, and burned it on the altar, besides the morning burnt offering. O webatakwara aja mkpụrụ ọka ahụ, kporo nke juru ya aka, kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja, tinyekwara aja nsure ọkụ nke ụtụtụ ahụ.
18 He slaughtered the ox and the ram, the people's peace offering sacrifice, and Aaron's sons brought him the blood, which he threw against the altar's sides. Nʼikpeazụ, o gburu ehi na ebule ahụ, nke bụ aja udo ndị Izrel. Ụmụ Erọn buteere ya ọbara nke o fesara gburugburu ebe ịchụ aja.
19 But the fat of the ox and ram: the fat tail, fat covering, kidneys, and long liver lobe, Ọ chịkọtara abụba niile dị ehi na ebule ndị ahụ nʼahụ, na ọdụdụ ha, na abụba kpuchiri ihe ime ha, ya na akụrụ ha, na abụba kpuchiri umeju ha,
20 they placed the fat portions on the breasts, and he burned the fat portions on the altar. tụkwasị ha nʼobi anụ ndị ahụ, kpọọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja.
21 But Aaron waved the breasts and the right thigh as a wave offering before our Father, as Moses had commanded. Mgbe ahụ, Erọn fufere, dịka onyinye mfufe, obi anụ ahụ, na apata aka nri ha nʼihu Onyenwe anyị dịka Mosis nyere nʼiwu.
22 Aaron raised his hands toward the people and blessed them, then came down from making the sin, burnt, and peace offerings. Erọn weliri aka ya elu nʼebe ụmụ Izrel nọ, gọzie ha. Emesịa, mgbe ọ chụchara aja mmehie, na aja nsure ọkụ na aja udo, o sitere nʼebe ịchụ aja ahụ rịdata.
23 Moses and Aaron entered the tent of meeting, came out, and blessed the people; the glory of our Father appeared to all the people. Mosis na Erọn bara nʼime ụlọ nzute. Mgbe ha pụtara, ha gọziri ọha mmadụ ahụ. Mgbe ahụ kwa, ebube Onyenwe anyị pụtara ìhè nye mmadụ niile nʼọgbakọ ahụ.
24 Fire came from our Father's presence and consumed the burnt offering and fat on the altar. All the people saw it, shouted for joy, and fell facedown. Ọkụ sitekwara nʼebe Onyenwe anyị nọ daa, rechapụ aja nsure ọkụ ahụ, na abụba ahụ dị nʼebe ịchụ aja. Mgbe ndị Izrel hụrụ ya, ha tiri mkpu ọṅụ. Daa, kpuo ihu nʼala.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]