Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 10 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Nadab and Abihu, Aaron's sons, each took his censer, put fire in it, added incense, and offered unauthorized fire before our Father, which he had not commanded them. Ma ụmụ Erọn, Nadab na Abihu, were ọkụ tinye nʼihe ịgụ ọkụ ha, tinyekwa ụda na-esi isi nʼọkụ ahụ, si otu a chee ọkụ na-adịghị nsọ nʼihu Onyenwe anyị, nʼụzọ megidere ihe e nyere nʼiwu.
2 Fire came out from our Father's presence and consumed them, and they died before our Father. Nʼihi ya, ọkụ sitere nʼihu Onyenwe anyị daa rechapụ ha, ha nwụrụ nʼihu Onyenwe anyị.
3 Moses said to Aaron, "This is what our Father spoke: 'Among those near me I will show myself holy, and before all the people I will be honored.'" Aaron was silent. Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị bu nʼobi mgbe o kwuru sị, “ ‘Nʼetiti ndị niile na-abịaru m nso ka a ga-edo m nsọ ọ bụkwa nʼihu ọha mmadụ, ka a ga-asọpụrụ m.’ ” Ma Erọn gbara nkịtị.
4 Moses called Mishael and Elzaphan, sons of Uzziel, Aaron's uncle, and said to them, "Come near, carry your brothers from in front of the sanctuary, outside the camp." Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Mishael na Elzafan, ụmụ Uziel, nwanne nna Erọn sị ha, “Bịanụ nso. Gaanụ buputa ozu ụmụnne unu site nʼihu ebe nsọ, buru ha gaa nʼazụ ebe obibi.”
5 They came near and carried them still in their tunics out of the camp, as Moses had said. Ha bịara ghanye aka nʼuwe ime ahụ ha buru ha bupụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, dịka Mosis nyere nʼiwu.
6 Moses said to Aaron and his sons Eleazar and Ithamar, "Don't let your hair hang loose or tear your clothes, or you will die and wrath will come on the whole community. But your relatives, the whole house of Israel, may weep for the burning our Father kindled. Mosis tụgharịrị sị Erọn na ụmụ ya, Elieza na Itama, “Unu ekwekwala ka ntutu isi unu kpasaa akpasa izipụta na unu na-eru ụjụ. Unu adọwakwala uwe unu. Nʼihi na ọ bụrụ na unu emee otu a, unu ga-anwụ. Iwe Onyenwe anyị ga-abịakwasịkwa ọgbakọ Izrel niile. Ma ndị ikwu gị, ụmụ Izrel ndị ọzọ, nwere ike ruo ụjụ nʼihi Nadab na Abihu.
7 Don't leave the Tent of Meeting entrance, or you'll die—our Father's anointing oil is on you." They did as Moses said. Ọzọ, unu ahapụla ọnụ ụzọ ụlọ nzute, ka unu ghara ịnwụ, nʼihi na mmanụ nsọ nke Onyenwe anyị dị nʼahụ unu.” Ha mere dịka Mosis gwara ha.
8 Our Father spoke to Aaron, saying, Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Erọn sị,
9 "You and your sons must not drink wine or strong drink when you enter the tent of meeting, or you will die. This is a lasting statute for your generations, “Gị na ụmụ gị ndị ikom agaghị aṅụ mmanya, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya mgbe unu na-aba nʼụlọ nzute ka unu ghara ịnwụ. Agbụrụ unu niile ga-esogide iwu a ruo ọgbọ niile na-abịa.
10 to distinguish holy from common, and unclean from clean, Ọrụ unu ka ọ bụ ịkpa oke nʼetiti ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ, na nʼetiti ihe dị ọcha na ihe na-adịghị ọcha.
11 and so you can teach the people of Israel all the statutes I told them through Moses." Ọrụ unu bụkwa izi ụmụ Izrel ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere ha site nʼaka Mosis.”
12 Moses told Aaron and his surviving sons, Eleazar and Ithamar: "Take the grain offering left from the fire offerings to our Father, and eat it without yeast beside the altar—it is most holy. Mosis sịrị Erọn na ụmụ ya ndị ikom fọdụrụ, bụ Elieza na Itama, “Werenụ onyinye mkpụrụ ọka nke fọdụrụ site na onyinye nsure ọkụ, nke a kwadoro na-etinyeghị ihe iko achịcha ọbụla, bụ nke e nyere Onyenwe anyị. Rienụ ya nʼakụkụ ebe ịchụ aja, nʼihi na ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
13 Eat it in a holy place—it is your portion and your sons' portion from the fire offerings to our Father, for that is what I was commanded. Rienụ ya nʼime ebe nsọ ahụ, nʼihi na ọ bụ oke ruru unu na ụmụ unu ndị ikom site nʼonyinye nsure ọkụ e nyere Onyenwe anyị; nʼihi na nke a bụ ihe e nyere m nʼiwu.
14 But you, your sons, and your daughters may eat the waved breast and the raised thigh in a clean place; they are given as your portion and your sons' portion from Israel's peace offerings. Ma unu na ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom ka ọ dịkwara iri obi anụ na apata ya, nke e fufere nʼihu Onyenwe anyị. Kama, ọ bụ nʼebe dị ọcha ka unu ga-anọ rie ya. Nke a bụ oke enyere unu na ụmụ unu site nʼaja udo nke ụmụ Izrel.
15 They must bring the raised thigh and the waved breast, with the fat offerings burned by fire, waving them as a wave offering before our Father; they are yours and your sons' as a lasting portion, as our Father commanded." Apata ụkwụ anụ nke aja mbuli na obi anụ ahụ nke e fufere, ka a ga-eweta ya na abụba ya nye dịka onyinye sitere nʼọkụ. A ga-efufe ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Nke a ga-abụ oke ruuru unu na ụmụ unu mgbe niile, dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.”
16 Moses carefully inquired about the sin offering's goat and found it burned up. He was angry with Eleazar and Ithamar, Aaron's remaining sons, and said, Mgbe Mosis jụrụ ajụjụ banyere mkpi ahụ e ji chụọ aja mmehie, ọ chọpụtara na a kpọọla ya ọkụ. O wesoro Elieza na Itama ụmụ ndị ikom Erọn iwe sị ha,
17 "Why didn't you eat the sin offering in the place of the sanctuary? Since it is most holy, our Father gave it to you to remove the congregation's guilt and make atonement for them before our Father. “Gịnị mere unu erighị anụ ahụ e ji chụọ aja mmehie nʼakụkụ ebe nsọ ahụ? Ọ bụ nke dịkarịsịrị nsọ; e nyere unu ya maka iwepụ ọmụma ikpe dịrị ọgbakọ Izrel, na ikpuchi mmehie ha nʼihu Onyenwe anyị.
18 Since its blood wasn't brought into the sanctuary, you should have eaten it in the sanctuary, as I commanded." Ebe ọ bụ na e webataghị ọbara ya nʼime Ebe Nsọ ahụ, unu gaara anọ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ rie anụ ewu ahụ, dịka m nyere unu nʼiwu.”
19 Aaron said to Moses, "Look, today my sons offered their sin offering and their burnt offering before our Father, and yet all this happened to me. Had I eaten the sin offering today, would it have pleased our Father?" Ma Erọn zara Mosis sị ya, “Lee, taa ka ha chụrụ aja mmehie na aja nsure ọkụ ha nʼihu Onyenwe anyị. Ma lee ụdị ihe dakwasịrị m. Ọ gaara atọ Onyenwe anyị ụtọ ma a sị na m riri anụ aja mmehie ndị a nʼụbọchị dị otu a?”
20 When Moses heard that, he was satisfied. Mgbe Mosis nụrụ nke a, o nwere afọ ojuju nʼihi ọsịsa Erọn nyere.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]