Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Leviticus 11 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father spoke to Moses and Aaron, saying to them, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn, sị,
2 "Speak to the Israelites: These are the living creatures you may eat among all the animals on the earth. “Gwanụ ụmụ Izrel, sị, ‘Nʼime anụmanụ niile dị nʼụwa, ndị a bụ anụmanụ unu ga-eri.
3 Among the animals, you may eat any that has a divided hoof, fully split, and chews the cud. Unu nwere ike iri anụmanụ ọbụla ụkwụ ya wara njakpa. nke na-atagharị ọnụ.
4 "But these you must not eat among those that chew the cud or have a divided hoof: the camel—it chews the cud but has no divided hoof; it is unclean for you. “ ‘Ma ọ dị ụfọdụ ndị na-atagharị nri maọbụ ndị nwere naanị ụkwụ wara njakpa, unu agaghị eri anụ ha. Ha bụ ịnyịnya kamel, ọ bụ ezie na ọ na-atagharị nri, ma ụkwụ ya awaghị njakpa. Unu agaghị eri ha nʼihi na ọ bụ anụ na-adịghị ọcha.
5 The rock badger chews the cud but has no divided hoof; it is unclean for you. Ewi: Ọ na-atagharị nri ya, ma o nweghị ụkwụ wara njakpa. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.
6 The hare, because it chews the cud but has no divided hoof—it is unclean for you. Ewi nkume: Ọ na-atagharị nri ya, ma o nweghị ụkwụ wara njakpa. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.
7 And the pig, though it has a divided, fully split hoof, does not chew the cud—unclean for you. Ezi: Ọ bụ nʼezie na ụkwụ ya wara njakpa ma ọ dịghị atagharị nri ya. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.
8 Do not eat their flesh, and do not touch their carcasses—they are unclean for you. Unu emetụkwala ozu ha aka maọbụ rie anụ ha, nʼihi na ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu.
9 "You may eat these of all in the waters: whatever has fins and scales in the waters, seas, and rivers—those you may eat. “ ‘Nʼime ihe niile e kere eke dị ndụ biri na mmiri, maọbụ nʼiyi nta na nʼoke osimiri, unu nwere ike iri ụdị ọbụla nwere ntu na akpịrịkpa nʼahụ ha.
10 But any without fins and scales in the seas and rivers, among all that swarm in the waters and all the living creatures in the waters—they are detestable to you. Ma unu ekwesighị iri ihe ọbụla nke na-enweghị ntu maọbụ akpịrịkpa, ma ha bụ anụ na-enupụta enupụta, maọbụ na ha so nʼanụ ndị ọzọ dị ndụ bi na mmiri, unu kwesiri ịsọ ha asọ.
11 They remain detestable to you; do not eat their flesh, and treat their carcasses as detestable. Ebe ha bụ ihe na-asọ oyi nye unu, unu ekwesighị iri ha, unu ga-agụkwa ozu ha ka ihe na-adịghị ọcha.
12 Whatever has no fins or scales in the waters—that is detestable to you. Ihe ọbụla bi nʼime mmiri nke na-enweghị ntu na akpịrịkpa nʼahụ ha, bụ nke unu ga-asọ asọ.
13 "Detest these birds; do not eat them—they are detestable: the eagle, the vulture, the black vulture, “ ‘Ndị a bụ nnụnụ ndị unu ga-asọ asọ, nke unu na-ekwesighị iri nʼihi na ha bụ ihe arụ a na-asọ oyi: ugo, udele na udele ojii,
14 the kite, and the falcon according to its kind, ndagbụ na ọgankwọ dị iche iche,
15 every raven according to its kind, ugolọma ọbụla dị iche iche,
16 the ostrich, the nighthawk, the seagull, and the hawk according to its kind, enyi nnụnụ, egbe abalị, nnụnụ oke osimiri na egbe dị iche iche,
17 the little owl, the cormorant, the great owl, okwukwu nta, komorant na okwukwu ukwu,
18 the white owl, the desert owl, the carrion vulture, okwukwu nwere mpi, okwolo na udele,
19 the stork, the heron according to its kind, the hoopoe, and the bat. ụgbala, utù dị iche iche, nnụnụ ọdụ nta na ụsụ.
20 "Every winged swarming creature that walks on four legs is detestable to you. “ ‘Ụmụ ahụhụ niile na-efe efe nke na-aga ije nʼụkwụ anọ bụ ihe rụrụ arụ nye unu, unu agaghị eri ya.
21 Yet these you may eat among all winged swarming creatures that walk on four legs: those with jointed legs above their feet for leaping on the ground. Ma e nwere ụfọdụ ụmụ ahụhụ na-efe efe nke na-aga ije nʼụkwụ anọ ndị unu nwere ike iri: ndị a bụ ndị nwere ogwe ụkwụ nke ha ji na-awụ awụ nʼala,
22 You may eat these: the locust, the bald locust, the cricket, and the grasshopper, each according to its kind. ndị a ka unu ga-eri nʼetiti ha, igurube dị iche iche, na akpankwụ dị iche iche, na abụzụ dị iche iche, na ụkpana dị iche iche.
23 But every other winged swarming creature that has four feet is detestable to you. Ahụhụ ndị ọzọ niile na-efe efe, ndị nwere ụkwụ anọ, bụ ihe rụrụ arụ. Unu ekwesighị iri ha.
24 "These things will make you unclean; whoever touches their carcasses will be unclean until the evening, “ ‘Iri ha ga-eme ka unu rụọ arụọ. Onye ọbụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye rụrụ arụ site nʼoge o bitụrụ ha aka tutu ruo nʼabalị nke ụbọchị ahụ.
25 whoever carries any of their carcasses must wash his clothes and be unclean until evening. Onye ọbụla metụrụ otu nʼime ozu ha aka ga-asakwa uwe ya, gụọkwa onwe ya dịka onye na-adịghị ọcha ruo uhuruchi.
26 "Every animal with a divided hoof not fully split, or that does not chew the cud, is unclean for you; whoever touches them is unclean. “ ‘Anụmanụ ọbụla ụkwụ ya na-awasaghị abụọ, maọbụ nke na-adịghị atagharị nri ya ugboro abụọ, rụrụ arụ. Onye ọbụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ.
27 Whatever walks on its paws, among all four-legged animals, is unclean for you; whoever touches their carcasses is unclean until evening, Nʼime anụmanụ niile na-aga ije nʼụkwụ anọ, anụmanụ ọbụla na-aga ije nʼọbụaka ya rụrụ arụ, unu agaghị eri ya. Onye ọbụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
28 whoever carries their carcasses must wash his clothes and be unclean until evening; they are unclean to you. Onye ọbụla ga-ebu ozu ya ga-asa uwe ya, bụrụkwa onye rụrụ arụ ruo uhuruchi, nʼihi na ọ bụ ihe rụrụ arụ nʼebe unu nọ.
29 "These are unclean for you among the swarming things that swarm on the earth: the mole rat, the mouse, the great lizard by its kind, “ ‘Nʼime anụmanụ niile na-enupụta enupụta nʼala, anụmanụ ndị a bụ ndị rụrụ arụ: nkapi, na oke, na agụ iyi dịka ụdị ha si dị,
30 the gecko, the monitor lizard, the wall lizard, the skink, and the chameleon. na ọba mmiri, na ngwere aghụ, na ngwere, na ngwere uzuzu, na ogumagala.
31 These are unclean for you among all that swarm; whoever touches them dead is unclean until evening. Nʼime ihe niile na-enupụta enupụta nʼala ndị a rụrụ arụ nʼebe unu nọ. Onye metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye rụrụ arụ tutu ruo uhuruchi ụbọchị ahụ.
32 Anything one of their dead bodies falls on becomes unclean—any wooden vessel, cloth, leather, or sackcloth, any working tool. It must be put in water and stays unclean until evening; then it is clean. Ihe ọbụla nke ozu ha dakwasịrị ga-abụ ihe rụrụ arụ, maọbụ osisi, maọbụ akwa, maọbụ akpụkpọ a na-akwa nʼala, maọbụ akpa, ihe ọbụla nke eji ya eme. A ga-etinye ya na mmiri, ọ ga-adịgide nʼime mmiri tutu ruo uhuruchi, mgbe ahụ ka ọ ga-adị ọcha.
33 Any clay pot one of them falls into—whatever is in it is unclean; break it. Ọ bụrụ na otu nʼime ihe ndị a adanye nʼite aja, a ga-etiwa ite ahụ. Ihe niile dị nʼite ahụ abụrụla ihe rụrụ arụ.
34 Any food touched by such water becomes unclean; any drink in such a vessel becomes unclean. Ihe oriri ọbụla nke mmiri si nʼite a metụrụ abụrụla ihe rụrụ arụ. Mmiri ọṅụṅụ ọbụla dị nʼime ite ahụ rụkwara arụ.
35 Anything one of their carcasses falls on becomes unclean; an oven or stove must be smashed. They are unclean, and unclean to you. Ihe ọbụla ozu anụmanụ dị otu a dakwasịrị, maọbụ ite ọkụ eji eghe ihe, maọbụ ekwu a ga-etiwa ha. Nʼihi na ha bụ ihe rụrụ arụ, unu ga-agụ ha dịka ihe rụrụ arụ.
36 Yet a spring or cistern holding water stays clean, but whoever touches their carcasses is unclean. Ọ bụrụkwa na ozu anụmanụ ahụ adaba nʼisi iyi, maọbụ nʼolulu mmiri, mmiri ahụ ga-adị ọcha, kama onye ga-emetụ anụ ahụ aka ga-abụ onye rụrụ arụ.
37 If any of their carcasses falls on seed to be planted, it stays clean. Ọ bụrụ na ozu anụ ahụ adakwasị mkpụrụ ubi a na-aga ịkụ nʼubi, ọ gaghị emerụ ha.
38 But if water has been put on the seed and part of their carcass falls on it, it is unclean for you. Ma ọ bụrụ na e tinyere mmiri nʼelu mkpụrụ ọghịgha ndị ahụ, ozu adakwasị nʼelu ya, ha ga-abụ ihe rụrụ arụ.
39 "If any animal you may eat dies, whoever touches its carcass is unclean until evening. “ ‘Ọ bụrụ na anụmanụ unu kwesiri iri eri anwụọ, onye ahụ metụrụ ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
40 Whoever eats its carcass must wash their clothes and be unclean until evening; whoever carries its carcass must wash their clothes and be unclean until evening. Onye ọbụla riri ozu anụ ahụ, maọbụ bufuo ozu ya, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya mmiri.
41 "Every swarming creature that swarms on the earth is detestable; do not eat it. “ ‘Anụmanụ ọbụla na-akpụgharị nʼala bụ ihe rụrụ arụ nye unu. Unu erikwala ha.
42 Whatever moves on its belly, walks on four legs, or has many feet—among all the swarming things that swarm on the earth—do not eat them; they are detestable. Unu agaghị eri anụmanụ ọbụla na-akpụgharị nʼala, ma ha na-akpụgharị nʼafọ ha, ma ha na-agagharị nʼụkwụ anọ, ma ha nwere ụkwụ dị ọtụtụ. Ha bụ ihe rụrụ arụ.
43 Do not make yourselves detestable with any swarming creature that swarms, and do not make yourselves unclean by them, becoming unclean through them. Unu emerụla onwe unu site nʼiri anụmanụ ndị a na-akpụgharị nʼala. Unu abụla ndị na-emerụ onwe unu site nʼanụmanụ ndị a, maọbụ mee ka unu bụrụ ndị e merụrụ site na ha.
44 For I am your Father: dedicate yourselves, be holy, since I am holy. Do not make yourselves unclean with any swarming creature crawling on the ground. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu. Doonụ onwe unu nsọ, nʼihi na adị m nsọ. Unu emerụla onwe unu site nʼimetụ anụmanụ ndị a na-akpụgharị nʼala aka.
45 I am your Father who brought you out of Egypt to be your God; be holy, for I am holy." Abụ m Onyenwe anyị, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu, ka m bụrụ Chineke unu. Unu aghaghị ịdị nsọ, nʼihi na adị m nsọ.
46 This is the law of the animals, the birds, every living creature moving in the waters, and every creature swarming on the earth, “ ‘Ndị a bụ usoro iwu metụtara ụmụ anụmanụ, na anụ ufe, na anụ bi na mmiri, na anụ ndị na-arịgharị arịgharị nʼala.
47 to distinguish between the unclean and the clean, between animals that may be eaten and those that may not. Ka unu si otu a kpaa oke nʼetiti ndị rụrụ arụ na ndị dị ọcha, nʼetiti ihe e kere eke dị ndụ ndị unu nwere ike iri nʼihi na ha dị ọcha, na ndị unu na-ekwesighị iri nʼihi na ha rụrụ arụ.’ ”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]